Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
NAJS, Matiu 17


NAJS, Matiu 17:10–14 (tụlee ihe dị iche na Matiu 17:11–13)

(Elaịas abụọ ga-abịa—otu maka ikwadobe ụzọ na otu maka iweghachi.)

10 Na Jisus wee zaa sị kwa ha, Ọbụ ezie na Elaịas ga-abịa mbụ, weghachi kwa ihe nile, dịka ndị amụma deworo.

11 Ọzọ kwa asị m unu na Elaịas abịaworị, onye nke e dere banyere ya, Lee, aga m ezite onye-ozi m, ọ ga-akwadobe kwa ụzọ n’iru m; ha amaghị kwa ya, ha mekwara n’arụ ya, ihe ọbụla ha chọrọ.

12 Ọbụkwa otu a ka Ọkpara nke Mmadụ gaje ịhụ ahụhụ n’aka ha.

13 Kama asị m unu, Onye bụ Elaịas? Lee, nke a bụ Elaịas, onye m na-ezite ịkwadobe ụzọ n’iru m.

14 Mgbe ahụ ndị na-eso ụzọ ahụ ghọtara na ọ gwara ha okwu banyere Jọn O Me Baptism, na kwa banyere onye ọzọ onye ga-abịa iweghachị kwa ihe nile, dịka ndị amuma dere ya.