Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
NAJS, Matiu 4


NAJS, Matiu 4:1, 5-6, 8-9 (tụlee ihe dị iche na Matiu 4:1, 5-6, 8-9; mgbanwe nile dị otua ka e mere na Luk 4:2, 5–11)

(Mụọ ahụ duuru Jisus, ọbughị Setan duuru ya.)

1 Mgbe ahụ Jisus ka Mụọ ahụ duuru rigo, nime ọzara ka ya na Chineke nọrịa.

5 Mgbe ahụ Mụọ ahụ buuru Jisus baa n’ime nnukwu obodo nsọ ahụ, Mụọ ahụ wee guzokwa ya n’elu akụkụ nke temple.

6 Mgbe ahụ ekwensu wee bịakwute ya sị kwa, Ọbụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, tụda onwe gị n’ala; n’ihi na-edewo ya, Ọ ga-enye ndị mụọ-ozi ya iwu gbasara gị; ọbụ kwa n’ime aka ha nile ka ha ga-ebuli gị elu, adịghị ama ama n’oge ọbụla ka ị ghara ịkpọbi ụkwụ gị na nkume.

8 Ọzọ kwa, Jisus wee nọdụ n’ime Mụọ, ma o wee kpọrọ ya gaa n’elu nnukwu ugwu dị oke elu, gosi kwa ya ala-eze nile nke ụwa na ebube ha.

9 Ekwensu wee bịakwute kwa ya ọzọ, sị kwa, Ihe ndị a nile ka m ga-enye gị, ma ọbụrụ na ị ga-ada n’ala sekpuo kwa ra m.

NAJS, Matiu 4:11 (tụlee ihe dị iche na Matiu 4:11)

(Jisus zigara ndị mụọ-ozi ikwusa ozi-ọma nye Jọn O Me Baptism.)

11 Na ugbua Jisus matara na a tụbara Jọn n’ime ụlọ mkpọrọ, o wee ziga kwa ndị mụọ-ozi, na, lee ha bịara kwusaa kwara ya ozi.

NAJS, Matiu 4:18 (tụlee ihe dị iche na Matiu 4:19)

(Ndị amụma Testament Ochie kwuru banyere Jisus.)

18 Na o wee sị ha, abụ m onye ahụ nke ndi amụma dere gbasara ya; soro nụ m, m ga-eme kwa unu ndị ọkụ-azụ na-akụta ndị mmadụ.

NAJS, Matiu 4:22 (tụlee ihe dị iche na Matiu 4:23)

(Jisus gwọrọ ndị mmadụ n’etiti ndị ahụ bụ ndị kwere n’aha ya.)

22 Na Jisus wee na-ejegharị na Galili dum na-akụzi ihe n’ime ụlọ-nzukọ ha nile, na-ekwusa ozi-ọma nke ala-eze ahụ; na-agwọ ọrịa nile dị iche iche, na nriria nile dị iche iche n’etiti ndị ahụ nke kweere n’aha ya.