Ọgbakọ Zuru ọha
Nkọwa Ngalaba Nnyocha nke Nzukọ nsọ, 2020
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2021


Nkọwa Ngalaba Nnyocha nke Nzukọ nsọ, 2020

Nye Otú Ndịisi Mbụ nke Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazu a

Ụmụnne ndị Nwoke: Dịka mkpughe sịrị dị, dịka e dere nime nkeji 120 nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, Òtù Kansụl maka Imefu Otu-ụzọ n’ụzọ iri nile—nke ndị mejupụtara ya bụ Otu Ndịisi Mbụ, ndị Kworum nke Ndị Ozi Iri Na Abụọ, na nke Otu Bishọp Nduzi—bụ ndị enyere ikike ịmefu ego nile nke Nzukọ-nsọ. Ngalaba Nzukọ nsọ nile, n’emefu ego nile dịka atụmatụ akwadoro maka mkpata na mmefu siri dị, dịkakwa otu iwu na usoro nile akwadoro sịrị dị.

Nnyocha Nzukọ nsọ, nke ndị nọ n’ime ya bụ ndị ọka-mmụta ịhe gbasara ego, ma ha enweghi ngalaba ọzọ nke Nzukọ nsọ nke ha nọ na okpuru ya, ha nwere oke-n’ọrụ ị mee nnyocha maka ị doo onye ọbụla anya gbasara ego niile e nwetara, mmefu nile e mere, makwa nchekwa akụ-n’ụba niile nke Nzukọ nsọ.

N’ihi nnyocha nile e mere, Nnyocha Nzukọ-nsọ kwekọtara na, n’ihe nile sịrị dị, ego nile a natara, mmefu nile e mere, ma akụ-n’ụba nile nke Nzukọ nsọ nke afọ 2020 ka edeworo ma mezuo dịka atụmatụ nke Nzukọ nsọ kwadoro maka mkpata na mmefu siri dị, dịkakwa otu iwu na usoro nile akwadoro sịrị dị. Nzukọ nsọ n’esoro nkuzi nile nke ha n’akụziri ndị otu ya maka ibi ndụ dịka otu akpa-ego ha ha, hapụ iji ụgwọ, ma n’echekwa ego maka oge ọ gadị mkpa.

Enyefere na nkwanye ugwu,

Ngalaba Nnyocha nke Nzukọ-nsọ

Jared B. Larson

Onyeisi Njikwa