Ọgbakọ Zuru ọha
Ili Enweghị Mmeri
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2021


Ili Enweghị Mmeri

Site na Aja mgbaghara mmehie nke mgbapụta na Mbilite nọnwụ nke Jizọs Kraịst dị ebube, obi ndị tiwara etiwa nwere ike nweta ọgwụgwọ, oke ntaram ahụhụ nwere ike ịghọ udo, ma ịda mba nwere ike ịghọ olileanya.

Na Ista Sọnde nke a dị ebube, ụmụaka anyị ji ọńụ ekwe, “Noge udu mmiri na-amụke amụke, Jizọs Kraịst tetara ma hapụ ili ebe o dinaworo; agbụ nke ọnwụ ka ọ dọbiri.”1

Anyị juru na ekele maka mmụta nke Mbilite nọnwụ nke Jizọs Kraịst anyị nwere. Mana, oge ụfọdụ na ndụ anyị, anyị na-enwe obi mgbawa mgbe onye anyị hụrụ naanya nke ukwuu hapụrụ. Site na ọrịa mkpochapụ ụwa enwere ugbu a na gburugburu ụwa, ọtụtụ niime anyị enwego ndị anyị hụrụ naanya nwụgoro—ọ ga-abụ ndị otu ezi na ụlọ ma ọbụ ndị enyi.2 Anyị na ekpe kwa ekpere maka ndị ahụ na-eru uju maka ụdịrị nfunahu ahụ.

Onyeisi Russell M. Nelson e kwuwo:

“Na-agbanyeghị afọ ole agbara, anyị na-eru uju maka ndị ahụ anyị hụrụ naanya nwụrụ anwụ. Iru uju bụ otu ụzọ dị omimi esi egosị ịhụnaanya na-enweghị ntụpọ.

Kaosiladị, anyị agaghị aghọtazu nke ọma nhụrita anya na nzukọrịta nọńụ ma emesịa ma-ejighị anya mmiri ekewa ugbu a. Naanị ụzọ esi ewepụ iru uju site nọnwụ bụ iwepụ ịhụnaanya site na ndụ.”3

Foto, oyiyi
Ndịinyom na-eso ụzọ Jizọs Kraịst ruru uju maka Jizọs.

Anyị nwere ike iche echiche banyere otu ndị enyi Jizọs, ndị nke soworo Ya ma lekọta Ya,4 jiri nwee mmetụta mgbe ha hụrụ ọnwụ Ya.5 Anyị ma na “ha ruru uju ma beekwa akwa.”6 Nụbọchị nke Mkpọgbu nobe ahụ, na-amaghị ihe ga-eme na Sọnde, ọ ga-abụ na ụjọ na nnukwu nsogbu zuru ha ahụ, ha ana eche otu ha ga-esi aganiihu ebe Onyenwe ha na-anọghị ya. Na-agbanyeghị nke a, ha garaniihu ilekọta Ya ọbụna nọnwụ.

Josef onye Aramatia rịọrọ Paịlet ka onye ya ahụ Jizọs. O budatara ahụ ahụ ala, fụchie ya na ọmarịcha akwa, lie ya nili ọhụrụ nke ya, ma nuru nnukwu okwute bichie ọnụ ụzọ ili nkume ahụ.7

Nekọdemọs wetere myrrh na aloes. O nyeere josef aka buru ahụ ahụ ma fụchie ya akwa nwere isi ụtọ.8

Meri Magdalin na ndịinyom ndị ọzọ sooro Josef na Nekọdemọs, lee anya ebe e nyiwara ahụ Jizọs ma kwadoo ihe ndị na-esi isi ụtọ na mmanụ dị nsọ ite ya mmanụ.9 Dị ka usoro iwu siri ike nke ụbọchị ahụ siri dị, ha cheere maka ịganiihu kwadoo ma tee ahụ ahụ mmanụ niihi na Satọde bụ Ụbọchị izu ike.10 Ma, nisi ụtụtụ Sọnde, ha gara ebe ili ahụ. Mgbe ha matachara na ahụ nke Onye Nzọpụta anọkwaghị ebe ahụ, ha gara ịgwa ndị na-eso ụzọ ahụ, bụ Ndị ozi nke Jizọs. Ndị ozi ahụ sooro ha bịa nili ahụ ma hụta na onweghị ihe nọ ya. Ha niile pụrụ ewezuga Meri Magdalin, nọ na-eche ihe mere ahụ nke Onye Nzọpụta.11

Meri Magdalin nọọrọ nebe ili ahụ nonwe ya. Naanị abalị ole na ole gara aga, ọ hụwo ọnwụ ike nke enyi ya na Nna ya ukwu. Ugbu a ili Ya enweghị ihe nọ ya, ma ọ maghị ebe Ọ nọ. O nyere ya nsogbu ikweta, ma o wee kwaa akwa. Noge ahụ, Onye Nzọpụta si nọnwụ bilie bịakwutere ya ma jụọ ihe mere o ji ebe akwa na onye ọ na-achọ. Na-eche na onye na-elekọta ubi gwara ya okwu, ọ jụrụ na, ọbụrụ na o buruwo ahụ nke Onyenwe ya, ka ọ gwa ya ebe ọ nọ ka ya nwee ike ga buru ya.12

Foto, oyiyi
Meri Magdalin

Chegodu echiche na Onyenwe anyị nwererịị ike kwe ka Meri Magdalin ruu uju ma kwupụta mgbu ya.13 Mgbe ahụ ka Ọ kpọrọ ya aha ya, ya wee tụgharịa ebe Ọ nọ ma kọta Ya. Ọ hụrụ Kraịst bilitere nọnwụ ma bụrụ onye aka ebe nke Mbilite nọnwụ Ya dị ebube.14

Dị ka gị, o nwere ụzọ m nwere ike ịkọwa ụdịrị obi mgbawa Meri na ndị enyi ya nwere dị ka ha na-eru uju ọnwụ nke Nna ha ukwu. Mgbe m gbara afọ itolu, nwanne m nwoke nke tọrọ m nwụrụ noge ala ọma jijiji mebisịrị ihe. Niihi na o mere na mberede, o were m ọtụtụ oge ịghọta na-ezia ihe mere. Obi gbawara m site na obi ọjọọ, ma a ga m ajụ onwe m, “Gịnị mere nwanne m nwoke? Ebee ka ọ nọ? Ebee ka ọ gara? Aga m ahụkwa ya ọzọ?”

Noge ahụ, amabughị m ihe gbasara atụmatụ nke mgbapụta, ma e nwere m ọchịchọ ịma ebe anyị si bịa, ihe ebum nuuche nke ndụ anyị bụ, na ihe ga-eme anyị mgbe anyị nwụchara. Ọbụ na anyị enweghị agụụ ndị ahụ mgbe onye anyị hụrụ naanya ma ọbụ mgbe anyị na-agabiga ihe isi ike na ndụ anyị?

Mgbe afọ ole na ole gasịrị, a malitere m iche echiche banyere nwanne m nwoke nụzọ pụrụ iche. A ga m ahụ ya na-echiche m ebe ọ na-akụ aka nọnụ ụzọ m. A ga m emepe ụzọ, ọ ga-eguzoro ebe ahụ, ma ọ ga-asị m, “a nwụbeghị m. A dị m ndụ. E nweghị m ike abịakwute gị, mana ugbua a aga m anọnyere gị ma agaghị m enwe ike ahapụ gị ọzọ.” Ihe ahụ m na-eche, dị nnọọ ka nrọ, nyeere m aka idi mgbu ahụ nke metụtara m maka ọnwụ ya. Echiche ahụ na ọ ga-anọnyere m batara m nobi mgbe na mgbe. Mgbe ụfọdụ a ga m anọ nnọọ na-ekoropụ anya nọnụ ụzọ, na-atụanya na ọ ga-akụ aka nụzọ m wee hụ ya ọzọ.

Mgbe iri afọ anọ gasịrị, noge Ista, a nọọrọ m na-atụgharị uche banyere Mbilite nọnwụ nke Jizọs Kraịst ma malite iche echiche gbasara nwanne m nwoke. Noge ahụ, otu ihe gbatara m nobi. Echetara m ihụ ya nuche obi m ebe ọ na-abịa nihụ m.

Ụbọchị ahụ a matara m na Mmụọ ahụ enyewo m nkasi obi noge ihe isi ike. A natawo m ihe aka ebe na mmụọ nke nwanne m nwoke a nwụghị anwụ; ọ dị ndụ. Ọ ka na-aganiihu na ịdị ndụ ebighụ ebi ya. Ugbu a ka maara m na “nwanne [m] nwoke ga-ebilite ọzọ”15 nọmarịcha oge ahụ mgbe, niihi Mbilite nọnwụ nke Jizọs Kraịst, anyị niile ga-ebilite nọnwụ. Na mgbakwunye, O mewo ka ọdị mfe maka anyị niile ijikọtakwa ọnụ ọzọ dị ka ndị ezi na ụlọ ma nwee ọńụ dị ebighị ebi niihu Chineke ma ọbụrụ na anyị ga-ahọrọ ime ma dobe ọgbụgba ndụ niile dị nsọ anyị na Ya.

Onyeisi Russell M. Nelson akụziwo:

“Ọnwụ bụ akụkụ ihe dị mkpa maka ịdị ndụ ebighị ebi anyị. O nweghị onye maara mgbe ọ ga-abịa, mana ọ dị oke mkpa na nnukwu atụmatụ ọńụ nke Chineke. Ekele dịrị Aja mgbaghara mmehie nke Onyenwe anyị, mbilite nọnwụ ga-abịa bụ eziokwu ma ndụ ebighị ebi ga-ekwe omume maka ụmụ mmadụ niile.

“… Maka ndị na-eru uju ahụrụnaanya a hapụrụ … ọgbụgba nke ọnwụ ka abịajụrụ site na iguzosị ike niime Kraịst, ihe nke olileanya na-enweghị ntụpọ, ịhụnaanya nke Chineke na nke mmadụ niile, na ọchịchọ dị omimi nke ife ya ofufe. Okwukwe ahụ, olileanya ahụ, ịhụnaanya ahụ ga-eme anyị etozuo oke ịbata niihu Chineke dị nsọ ma, anyị na onye otu anyị dị ebighị ebi na ndị ezi na ụlọ anyị, wee binyere Ya ruo ebighị ebi.”16

Foto, oyiyi
Ogige ili

Ana m agba ama na “ọ bụrụ na Kraịst esịghị na ndị nwụrụ-anwụ bilie, ma-ọbụ dobisie agbụ nile nke ọnwụ ka ili ghara inwe mmeri, ma na ọnwụ ekwesịghị inwe ihe ọgbụgba, agaraghị enwe mbilite n’ọnwụ.

Mana e nwere mbilite n’ọnwụ, ya mere ili enweghị mmeri, ma ihe ọgbụgba nke ọnwụ ka e loro n’ime Kraịst.

Ọ bụ ìhè na ndụ nke ụwa; ee, ìhè nke agwụgh-agwụ, nke na-enweghị ike ime ka o jie oji; ee, na kwa ndụ nke agwụgh-agwụ, ka a ghara inwe ọnwụ ọzọ.”17

Foto, oyiyi
Onye Nzọpụta si nọnwụ bilie

Jizọs Kraịst n’Onwe Ya mara ọkwa, “A bụ m mbilite nọnwụ, na ndụ: onye nke kwenyere na m, n’agbanyeghị na ọ nwụrụ anwụ, emesịa ọ ga-adị ndụ.”18

Ana m agba ama na site na site na Aja mgbaghara mmehie nke mgbapụta na Mbilite nọnwụ nke Jizọs Kraịst dị ebube, obi ndị tiwara etiwa nwere ike nweta ọgwụgwọ, oke ntaram ahụhụ nwere ike ịghọ udo, ma ịda mba nwere ike ghọọ olileanya. O nwere ike bie anyị ọma naka ebere Ya, na-akasi obi, enye anyị ike, na-agwọ onye ọbụla niime anyị. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen