Ọgbakọ Zuru ọha
Kedu Ihe Onye Nzọpụta Anyị Mewooro Anyị?
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2021


Kedu Ihe Onye Nzọpụta Anyị Mewooro Anyị?

Jizọs Kraist emewo ihe niile nke dị mkpa maka njem anyị site na ndụ anụ ahụ gaa na akara aka edepụtaworo nime atụmatụ nke Nna anyị nke Eluigwe.

N’otu nzukọ mgbede Satọde na otu ọgbakọ stek ọtụtụ afọ gara aga, e zutere m otu nwanyị onye kwuru na ndị enyi ya arịọwo ya ka ọ bịaghachi na nzukọ nsọ mgbe ọtụtụ afọ nke abịaghị nzukọ gasịrị, mana o nweghị ike iche maka ihe ọbụla ga-eme ka ọ bịa. Iji gbaa ya ume, e kwuru m, “Mgbe ị na-atule ihe niile nke Onye Nzọpụta mewooro maka gị, i nwere ọtụtụ ihe kpatara i ji alaghachị ife ma jeere Ya ozi.” O juru m anya mgbe ọ zaghachịrị, “Kedu ihe O mewooro m?”

Foto, oyiyi
Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ

Kedu ihe Jizọs Kraịst mewooro onye ọbụla n’ime anyị? O mewo ihe niile nke dị mkpa maka njem anyị site na ndụ anụ ahụ gaa na akara aka edepụtaworo nime atụmatụ nke Nna anyị nke Eluigwe. A ga m ekwu maka isi njirimara anọ nke atụmatụ ahụ. Na nke ọbụla nime ndịa, Ọkpara Ọ Mụrụ Nanị Ya, Jizọs Kraịst, bụ onye nọ n’etiti. Ihe na-akpali akpali nihe niile nke a bụ “ịhụnaanya nke Chineke, nke wụpụtara onwe ya n’ebe niile n’ime obi niile nke ụmụ nke mmadụ; ya mere, ọ bụ ihe kwesịrị onwunwe karịsịa ihe niile” (1 Nifaị 11:22).

I.

Nanị tupu Sọnde Ista, oge zuru ibu uzọ kwuo maka Mbilite n’ọnwụ nke Jizọs Kraịst Mbilite site na ndị nwụrụ anwụ bụ ogidi mmesi obi ike nke onwe nke okwukwe anyị. Ọ na-agbakwunye nghọta nye ozizi anyị, na-akpali agwa anyị, na olileanya maka ọdịniihu anyị.

N’ihi na anyị kwenyere na nkọwa Baịbụụl na Akwụkwọ nke Mọmọn banyere Mbilite n’ọnwụ nkịtị nke Jizọs Kraịst, anyị nakwa anabata imerime nkuzi nke akwụkwọ nsọ na otu ụdị mbilite n’ọnwụ ahụ ga-abịara mmadụ anụ ahụ niile ndị biworo n’elu ụwa nke a.1 Dị ka Jizọs Kraịst kuziri, “N’ihi na m dị ndụ, unu ga-adịkwa ndụ” (Jọn 14:19 Ma Ndị Ozi Ya kuziri na “ndị nwụrụ anwụ ka a ga-akpọlite n’ọnwụ n’enweghị iru unyi” ma “ndụ anụ ahụ nkea ga-eyiri anwụghị anwụ” (1 Ndị Kọrint 15:52, 54).

Foto, oyiyi
Mbilite n’ọnwụ Ahụ

Mana Mbilite n’ọnwụ ahụ na-enye anyị karịa ka mmesị obi ike nkea nke anwụghị anwụ. Ọ na-agbanwe ụzọ anyị si ahụta ndụ anụ ahụ.

Mbilite n’ọnwụ ahụ na-enye anyị ucheobi na mgbam ume ịnagide aka mgba niile nke ndụ anụ ahụ onye ọbụla n’ime anyị na ndị anyị hụrụ n’anya na-ezute. Ọ na-enye anyị ụzọ ọhụrụ eji ahụta ezughị oké niile nke anụ ahụ, uche, ma ọ bụ nke na-emetụ n’obi anyị nwere n’oge amụrụ anyị ma ọbụ enwetere na ndụ anụ ahụ. Ọ na-enye anyị mgbam ume iji nagide iru uju, ọdịda, na nkụda mmụọ niile. N’ihi onye ọbụla n’ime anyị ka ekwere nkwa mbilite n’ọnwụ, anyị maara na ezughị oké na mmegide nke ndụ anụ ahụ bụ nanị nke ugbua.

Mbilite n’ọnwụ ahụ nakwa enye anyị ihe nrite dị ike iji debe iwu nsọ niile nke Chineke n’oge ndụ anụ ahụ anyị. Mgbe anyị bilitere site n’ọnwụ ma bido njem nke Ọmụmaikpe Ikpeazụ anyị e buru na-amụma, anyị chọrọ itozu maka ngọzi e kwere ndị bilitere n’ọnwụ nkwa kachasị ibe ya.2

Foto, oyiyi
Anyị nwere ike biri dịka ndị ezinaụlọ ruo ebighị ebi.

Na mgbakwunye, nkwa ahụ na Mbilite n’ọnwụ nwere ike gunye ohere ị nọ n’etiti ndị otú ezinaụlọ anyị—di, nwunye, ụmụ, ndị nne na nna, na ụmụ ụmụ—bụ otu mgbam ume dị ike iji mejupụta ọrụ ezinaụlọ anyị n’ime ndụ anụ ahụ. Ọ na-enyekwara anyị aka bikọta ọnụ n’ịhụnaanya n’ime ndụ nke a, ma ọ na-akasi anyị obi n’ọnwụ nke ndị anyị hụrụ n’anya. Anyị maara na nkewa nke ndụ anụ ahụ ndịa bụ nanị nke ugbua, ma anyị n’echekwube nzukọta na mmekọ ihe jupụtara na ọńụ n’ọdịniihu Mbilite n’ọnwụ n’ewetere anyị olileanya na mgbam ume e ji enwe ndidi dị ka anyị n’eche. Ọ jikwa mgbam ume na ugwu akwado anyị izute ọnwụ nke onwe anyị—ọbụna ọnwụ nke e nwere ike ịkpọ erughị eru.

Mmetụta ndịa niile nke Mbilite n’ọnwụ bụ akụkụ nke aziza mbụ nye ajụjụ ahụ “Kedụ ihe Jizọs Kraịst mewooro anyị?”

II.

Nye ọtụtụ n’ime anyị, ohere inwete mgbaghara mmehie anyị bụ ihe kacha mkpa nke Aja-mgbaghara-mmehie nke Jizọs Kraịst. Na ofufe, na nsọpụrụ anyị na-ekwe:

Ọbara Ya dị oke ọnụ ahịa ka ọ na-akwafu n’efu;

Ndụ Ya ka o nyere n’efu,

Aja n’enweghị njọ maka ọmụma ikpe,

Ụwa n’anwụ anwụ a ga-azọpụta.3

Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta anyị nagidere ntaram ahụhụ n’enweghị nghọta ịbụrụzi aja maka njọ niile nke mmadụ anụ ahụ ndị ga-echegharị. Aja mgbaghara mmehie nkea wetere ihe ọma kachasị, nwa atụrụ ahụ n’enweghị ntukpọ, maka ntụnyere kachasị nke njọ, njọ niile nke ụwa. Ọ na-emepere onye ọbụla n’ime anyị ụzọ ka asachaa njọ nke onwe anyị ka e wee nwee ike nabataghachi anyị n’ihu Chineke, Nna anyị nke Ebighị ebi. Ụzọ nkea mepere emepe dịịrị ụmụ Chineke niile. Na ofufe, anyị na-ekwe:

O juru m n’anya na ọ ga-agbadata site na ocheeze ya dị nsọ

Ị napụta mkpụrụ obi dị nnupu isi na mpako dị ka mụ,

Na ọ ga-esetipụ ịhụnaanya ya dị ukwuu nye onye dị ka m.4

Mmetụta ahụ dị ebube n’enweghị nghọta nke Aja-mgbaghara-mmehie nke Jizọs Kraịst dabeere n’ịhụnaanya nke Chineke maka onye ọbụla n’ime anyị. Ọ na-ekwenye nkwupụta ahụ na “ọnụ-ahịa nke mkpụrụ-obi niile”—onye niile—“dị ukwuu n’anya nke Chineke” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18:10). N’ime bịabụụl, Jizọs Kraịst kọwara nkea n’usoro ịhụnaanya nke Nna anyị nke Eluigwe: “N’ihi na Chineke hụrụ ụwa n’anya, na o nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, na onye ọbụla nke kwere na ya agaghị anwụ, kama ga-enwe ndụ ebighị ebi” (Jọn 3:16). Na mkpughe nke oge a, Onye Mgbapụta anyị, Jizọs Kraịst, mara ọkwa na “hụrụ ụwa n’anya na ọ nyere ndụ nke onwe ya, na dị ka ọtụtụ ga ekwere nwere ike bụrụzie ụmụ nke Chineke” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 34:3

Ọ bụ ihe ijuanya, mgbe ahụ, na Akwụkwọ nke Mọmọn, Agba Ọzọ nke Jizọs Kraịst jiri nkuzi a mechie na ịghọ onye “tozuru oké” na onye “asachara n’ime Kraịst” anyị garịrị “ahụ Chineke n’anya jiri ike [anyị], uche na ume”? (Moronaị 10:32–33). Atụmatụ Ya nke ịhụnanya kwaliri ka a ga-anabatarịrị n’ịhụnaanya.

III.

Kedu ihe ọzọ Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst, mewooro anyị? Site na nkuzi niile nke ndị amụma Ya na site na ozi nke onwe Ya, Jizọs kuziiri anyị atụmatụ nke nzọpụta. Atụmatụ nke a tinyere Okike ahụ, ebumnobi nke ndụ, ịdị mkpa nke mmegide, na onyinye nke ohere nhọrọ. Ọ kuzikwaara anyị iwu nsọ na ọgbụgba ndụ ndị anyị garịrị enye nrube isi na emume nsọ ndị anyị garịrị eme ịkpọghachị anyị n’ebe nne na nna anyị nke eluigwe nọ.

Foto, oyiyi
Nkuzi ozi ọma n’elu Ugwu

N’ime Bịabụụl anyị na-agụ nkuzi Ya, “A bụ m é nke ụwa: onye nke n’eso agaghị aga ije nọchịchịrị, kama ga-enwe ihé nke ndụ” (Jọn 8:12). Na mkpughe nke oge a, anyị na-agụ, “Lee, a bụ m Jizọs Kraịst, … ihé nke enweghị ike izokpu n’ime ọchịchịrị” (Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 14:9). Ọ bụrụ na anyị soro nkuzi Ya niile, Ọ na-enye ihé n’ụzọ anyị na ndụ nke a ma kwee nkwa maka akara aka anyị n’ime nke ọzọ.

N’ihi na Ọ hụrụ anyị n’anya, ọ na-ama anyị aka itinye uche na Ya na-abụghị n’ihe ndị nke ndụ anụ ahụ nke ụwa a. N’okwuchukwu Ya ukwuu banyere achịcha nke ndụ, Jizọs kuziri na anyị anọkwala n’etiti ndị ahụ ihe nke ụwa na-amasị karịsịa—ihe ndị na-akwado ndụ n’elu ụwa mana enweghị ihe ọ na-enye maka ndụ ebighị ebi.5 Dị ka Jizọs kpọkuru anyị ọzọ ma ọzọ ma ọzọ, “Soro m.”6

IV.

N’ikpeazụ, Akwụkwọ nke Mọmọn na-akuzi na dị ka akụkụ nke Aja mgbaghara mmehie Ya, Jizọs Kraịst “na-ata ahụhụ mgbu niile na mkpagbu niile na ọnwụnwa niile n’ụdị ọbụla; ma nke a ka e wee mezuo okwu ahụ nke sịrị na ọ ga ebukwasị onwe ya ihe mgbu niile na ọrịa niile nke ndị ya” (Alma 7:11).

Gịnị mere Onye Nzọpụta anyị si taa ahụhụ ihe aka mgba niile ndịa “n’ụdị ọbụla”? Alma kọwara: “Ma ọ ga ebukwasị onwe ya adịghị ike ha nile, ka afọ ya nile wee jupụta n’ebere, dịka n’anụ ahụ, ka o wee mata dịka n’anụ ahụ otu ọ ga-esi nyere [nke pụtara i nye enyem aka] ndị ya aka dịka adịghị ike ha nile siri dị” (Alma 7:12).

Foto, oyiyi
Kraịst n’ime Getsemane

Onye Nzọpụta anyị na-enwe mmetụta ma mara ọnwụnwa anyị niile, ndọli anyị niile, obi mgbu anyị niile, na ntaram ahụhụ anyị niile, n’ihi na Ọ gabigara ha niile n’onwe ya dị ka otu akụkụ nke Aja mgbaghara mmehie Ya. Akwụkwọ nsọ ndị ọzọ ekwe nkwa nkea. Agba Ọhụrụ mara ọkwa, “N’ebe ya onwe ya tara ahụhụ ịnwa ọnwụnwa, o nwere ike inye ndị a na-anwa ọnwụnwa enyem aka” (Ndị Hibru 2:18). Aịzaya na-akuzi, “Atụla egwu; n’ihi na A nọnyeere m gị: … A ga m agba gị ume; ee, A ga m enyere gị aka” (Aịzaya 41:10). Ndị niile na ata ahụhụ nkwarụ nke anụ ahụ kwesịrị ịcheta na Onye Nzọpụta anyị gabigara ụdị mgbu ahụ kwa, ma na site na Aja mgbaghara mmehie Ya, Ọ na-enye onye ọbụla nime anyị ume iji die ya.

Onye amụma Josef Smith chịkọtara okwu ndịa niile nime ndepụta nke okwukwe anyị nke atọ: “Anyị kwere na site na Aja mgbaghara mmehie nke Kraịst, mmadụ niile ka e nwere ike ịzọpụta, site na nrube isi nye iwu niile na emume nsọ niile nke Oziọma”

“Kedụ ihe Jizọs Kraịst mewooro m?” nwanne nwanyị ahụ jụrụ. N’okpuru atụmatụ nke Nna anyị bi n’Eluigwe, O kere eluigwe na ụwa” (Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 14:9) nke mere na onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike nwete nhumiihe nke ndụ anụ ahụ dị mkpa iji chọọ akara aka anyị si na chi. Dị ka otu akụkụ atụmatụ nke Nna, Mbilite n’ọnwụ nke Jizọs Kraịst meriri ọnwụ iji kwee onye ọbụla n’ime anyị nkwa anwụghị anwụ. Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst na-enye onye ọbụla n’ime anyị ohere ịchegharị site na njọ anyị ma dị ọcha laghachị ebe obibi eluigwe anyị. Iwu nsọ na ọgbụgba ndụ Ya niile na-egosi anyị ụzọ, ma ọkwa nchụaja Ya na-enye ikike ime emume nsọ niile dị mkpa irute akara aka ahụ. Ma Onye Nzọpụta anyị ji obi ya gabiga mgbu na nkwarụ niile nke anụ ahụ ka O wee mara otu esi agba anyị ume n’ime mkpagbu anyị niile.

Foto, oyiyi
Jizọs Kraịst

Jizọs Kraịst mere ihe ndịa niile n’ihi na Ọ hụrụ ụmụ niile nke Chineke n’anya. Ịhụnaanya bụ mkpali maka ihe niile, ma ọ dịịrị otu a site na mbụ. Chineke a gwawo anyị na mkpughe nke oge a na “o kere … nwoke na nwanyị, dị ka otu ọdịdị ya … ; ma nye ha iwu nsọ na ha ga-ahụ ya n’anya ma jeere ya ozi” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:18-19).

A na m agba ama nke a ma na-ekpe ekpere na anyị niile ga-echeta ihe Onye Nzọpụta anyị mewooro onye ọbụla n’ime anyị ma na anyị niile ga-ahụ Ya n’anya ma jeere Ya ozi, n’aha Jizọs Kraịst, amen.