Ọgbakọ Zuru ọha
Jizọs Kraịst: Onye Nlekọta nke Mkpụrụ obi Anyị
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2021


Jizọs Kraịst: Onye Nlekọta nke Mkpụrụ obi Anyị

Dị ka anyị ji obi anyị niile na-echegharị maka njọ anyị, anyị n’ekwe ka aja mgbaghara mmehie nke Kraịst zuo oke n’ime ndụ anyị.

Ezi ụmụnne m nwoke na ụmụnne m nwanyị, n’ụtụtụ Ista nke a na amuke amuke obi m na an̄ụrị ọn̄ụ n’icheta ihe ahụ mere kachasị dị ebube, nke kachasị enye ugwu, nke kachasị n’enweghị atụ meworo n’agụgụala ndụ mmadụ—aja mgbaghara mmehie nke Onyenwe anyị, Jizọs Kraist. Okwu ahụ ama ama nke onye amụma Aịzaya na-emelite ịdị ukwuu na achọghị ọdịmma onwe onye nanị nke mgbadata na ichu aja nke Onye Nzọpụta mere maka ụmụ Chineke niile:

N’ezie o buruwo arịrị anyị, ma buru mwute anyị niile; mana anyị weere ya dịka onye e meriri emeri, onye Chineke tiri otiti-ihe, ma kpagbuo ya.

“Mana e merụrụ ya arụ n’ihi njehie anyị, e chiri ya ọnụ n’ala n’ihi ajọọ-omume anyị: ịta nnukwu ahụhụ nke udo anyị dị n’isi ya, ma site na ụnya ya a gwọwo anyị.”1

N’iji obiọma wekwasị onwe Ya njọ niile nke ụmụ mmadụ, akpọgide ya n’obe na-obi ọjọọ, na inwe mmeri megide ọnwụ n’ụbọchị nke atọ,2 Jizọs nyere nghọta dị nsọ karịa na emume nsọ Ngabiga nke enyekwasịworo Izrel n’oge ochie.3 Na mmejupụta nke amụma, O nyere ahụ nke onwe Ya na ọbara Ya dị oke ọnụ ahịa dị ka aja dị ukwuu na nke ikpeazụ,4 na-akwado ọdịmara omenaala ejiri mee ihe na mmemme nke Ngabiga nke Onyenwe anyị.5 Site na-ime otu a, Kraịst nwetara nhụmiihe ntaram ahụhụ nke anụ ahụ na nke ime mmụọ nke na-apụghị ịkọwa n’uche nke ụmụ mmadụ. Onye Nzọpụta n’Onwe Ya kwuru:

“N’ihi na lee, Mụ, Chineke, atawo ahụhụ ihe ndịa maka onye niile, …

“Ahụhụ nke mere ka mụ onwe m, ọbụna Chineke, onye kachasị elu, maa jijiji n’ihi mgbu, ma gbaa ọbara site na ntakịrị oghere ọbụla, ma taa ahụhụ ma na ahụ ma na mmụọ—ma chọọ ka m ghara ịn̄ụ iko ilu ahụ, ma kpọnwụọ—

“N’agbanyeghị nke ahụ, otuto dịrị Nna, ma eso m keta ma mesịa nkwadobe m niile nye ụmụ nke mmadụ.”6

Kraịst n’ebube mejupụtara uche nke Nna7 site na-aja Ya na obi ebere Ya n’enweghị ọgwụgwụ. O merịrị mgbu ọnwụ nke anụ ahụ na nke ime mmụọ,8 nke ewebatara n’ụwa site na Ọdịda ahụ,9 na-enye anyị nzọpụta dị ebube nke ebigbị ebi pụrụ omume.10

Jizọs bụụrụ nanị Onye nwere ike imata aja nke a dị ebighị ebi ma zuo oke maka anyị niile.11 A họọrọ ma buzọ chie Ya echichi na Kansụl Ukwu dị n’Eluigwe, ọbụna tupu ekee ụwa.12 Ọzọkwa, n’ebe nne nke anụ ahụ mụrụ ya, O ketara oke nke ọnwụ anụ ahụ, mana site n’aka Chineke, dị ka Ọkpara Nna Mụrụ Nanị Ya, O ketara ike ịtọgbọ ndụ nke onwe Ya ma wereghachi ya ọzọ.13 Na mgbakwunye, Kraịst biri ndụ zuru oke nke n’enweghị ntụpọ ma, ya mere, ewezugara ya site na mkpa nke ikpe ziri ezi si n’igwe.13 N’ụfọdụ oge Onye-amụma Joseph Smith kuziri:

“Nzọpụta agaraghị abịa nụwa ma ewezuga nkwuchite nke Jizọs Kraist.

“Chineke … kwadoro aja site na onyinye nke Ọkpara nke Ya , onye nke a ga-eziga mgbe oge ruru … imeghe ụzọ nke mmadụ ga-esi abata n’ihu Onyenwe anyị.”14

N’agbanyeghị na Onye Nzọpụta wepụrụ ndapụta nke ọnwụ anụ ahụ site na aja Ya,16 O kpochapụghị oke na ọrụ nke onwe anyị ichegharị maka mmehie anyị na-eme.17 Kama, O nyere anyị ọkpụkpọ oku mara mma anyị ime udo n’etiti Nna anyị nke Eluigwe. Site na Jizọs Kraist na aja mgbaghara mmehie Ya, anyị nwere ike nwete mgbanwe uche na obi dị ike, na-ewete akparam agwa dị ọhụrụ, ma n’ebe Chineke nọ ma na gburugburu ndụ.18 Mgbe anyị chegharịrị n’ezie site na njọ anyị ma tụgharịa obi na uche anyị nye Chineke na iwu nsọ Ya niile, anyị nwere ike nata mgbaghara Ya ma nwete mmetụta nke Mmụọ Nsọ ebe o buru ibu. Na obi ebere, anyị n’ezere inwete mmetụta ntaram ahụhụ dị omimi nke Onye Nzọpụta nagidere.19

Onyinye nke nchegharị bụ nkọwapụta obiọma nke Chineke nwere n’ebe ụmụ Ya nọ, ma ọ bụ ngosipụta nke ike Ya n’enweghị atụ iji nyere anyị aka merịe njọ niile anyị na-eme. Ọ bụkwa akaebe nke ndidi na ogologo ntachi obi nke Nna dị ịhụnaanya nwere maka adịghị ike na enweghị ike nke anụ ahụ anyị. Onyeisi Russell M. Nelson, onye amụma anyị hụrụ n’anya, kpọrọ onyinye nke a dị ka “ọtụghe esi enwe an̄ụrị na udo nke ime mmụọ.”20

Ezigbo ndị enyi m, a na m agbara unu ama na dị ka anyị ji obi anyị niile na-echegharị maka njọ anyị,20 anyị n’ekwe ka aja mgbaghara mmehie nke Kraịst zuo oke n’ime ndụ anyị.22 Anyị ga-enwere onwe anyị site na agbu nke njọ, chọta ọn̄ụ n’ime njem elu ụwa anyị, ma tozuo oke ịnata nzọpụta dị ebighị ebi, bụ nke akwadoro site na ntọala nke ụwa maka ndị niile kwere n’ime Jizọs Kraist ma bịakwute Ya.23

Na mgbakwunye nye iwete onyinye nke nzọpụta dị ebube, Onye Nzọpụta na-enye anyị enyem aka na nkasi obi dị ka anyị na-ezute mkpagbu anyị, ọnwụnwa, na adịghị ike nke ndụ anụ ahụ, tinyere ọnọdụ ndị anyị nweteworo na nso nso a n’oge ọrịa mkpochapụ ụwa e nwere ugbu a. A na m ekwe unu nkwa na Kraịst maara mgbe niile banyere nsogbu ndị anyị na-ahụ n’ime ndụ anụ ahụ. Ọ na-aghọta oke iwe niile, oke mgbu niile, na ụfụ anụ ahụ tinyekwara ihe aka mgba na-ebute anya mmiri na nke ime mmụọ anyị na-ezute. Afọ nke Onye nzọpụta jupụtara na ebere, ma Ọ dị njikere mgbe niile inyere anyị niile aka. Nkea dị ire n’ihi n’onwe ya Ọ gabigara ma wekwasị n’onwe Ya n’anụ ahụ mgbu nke adịghị ike na nrịa nrịa niile nke anyị.24

N’obi dị nwayọọ na obi dị umeala, Ọ gbadatara n’okpuru ihe niile ma nabata nleda anya, ịbụ onye a jụrụ ajụ, na mmechu ihu site n’aka ụmụ mmadụ, ebe emeruwo ya ahụ maka njehie na ajọ omume anyị niile. Ọ tara ahụhụ ihe ndị a niile n’ihi onye niile, wekwasị Onwe Ya njọ niile nke ụwa,25 wee si otu a bụrụzie onye nlekọta ime mmụọ anyị kachasị elu.

Ka anyị na-abịakwute Ya nso, na-enyefe onwe anyị na-ime mmụọ na nlekọta Ya, anyị ga-enwe ike wekwasị onwe anyị yok Ya, nke dị mfe, na ibu arọ Ya, nke na-adịghị arụ, ma si otu a na-achọta nkasi obi na ezumiike ahụ e kwere na nkwa. Ọzọkwa, anyị ga-anata ume ahụ anyị niile chọrọ iji merie ihe isi ike niile, ịda mba niile, na mwute nke ndụ niile, nke siri ezigbo ike nnagide ma enweghị enyem aka na ike ọgwụgwọ Ya.26 Akwụkwọ nsọ na-akuziri anyị i “bukwasị ibu arọ unu n’elu Onyenwe anyị, ma ọ ga-enyere unu aka.”27 “Ma mgbe ahụ ka Chineke nyere [anyị] aka ka ibu arọ [anyị] wee dị mfe, site n’ọn̄ụ nke Ọkpara ya.”28

Foto, oyiyi
Regina na Mario Emerick

Na nso nso njedebe afọ gara aga, a nụtara m maka ọnwụ nke ezigbo di na nwunye, Mario na Regina Emerick, ndị jupụtara n’okwukwe n’ebe Onyenwe anyị nọ ma nwụọ ụbọchị anọ nọ iche iche n’ihi mgbagwoju anya sitere na COVID-19.

Otu n’ime ụmụ ha ndị nwoke, onye nke na-eje ozi ugbua dịka bishọp n’ime Brazil, gwara m ihe ndịa sotere: “Ọ bụ ihe rara ahụ nke ukwuu ịhụta nne na nna m ịpụ n’ụwa nke a site na ọnọdụ ahụ, mana ana m ahụta nke ọma aka nke Onyenwe anyị n’ime ndụ m n’etiti ihe ọdachi ahụ, n’ihi na a natara m mgbam ume na udo nke karịrị nghọta m. Site n’okwukwe m n’ime Jizọs Kraist na Aja mgbaghara mmehie Ya, a natara m enyem aka si n’igwe iji gbaa ume ma kasie ndị otu ezi na ụlọ m obi na ndị niile nyeere anyị aka n’oge nhumiihe nke a. N’agbanyeghị na ọrụ ebube nke onye niile tụrụ anya ya emeghị, n’onwe m a bụ m onye akaebe nke ọtụtụ ọrụ ebube ndị ọzọ nke meworo n’ime ndụ nke mụ onwe m na n’ime ndụ nke ndị otu ezi na ụlọ m. E nwetere m mmetụta udo n’enweghị nkọwa nke bara n’ala ala obi m, na-enye m olileanya na obisike n’ịhụnaanya nke Onye Nzọpụta maka m na n’ime atụmatụ nke an̄ụrị nke Chineke maka ụmụ Ya. A mụtara m na nụbọchị ndị ahụ kachasị jupụta n’iru uju, aka ịhụnaanya nke Onye Nzọpụta setipụrụ mgbe niile mgbe anyị ji obi anyị, ike, uche, na ume niile chọọ Ya.”

Foto, oyiyi
Ezinaụlọ Emerick

Ezi ụmụnne nwoke na ụmụnne m nwanyị, na Sọnde Ista nke a, a na m ekwupụta akaebe m na nsọpụrụ na Jizọs sitere n’ọnwụ bilie ma na Ọ dị ndụ. A na m agbara unu ama na site na Ya na Aja mgbaghara mmehie Ya n’enweghị nsọtụ, Onye Nzọpụta weteere anyị ụzọ iji merie ọnwụ, ma nke anụ ahụ ma nke ime mmụọ. Na mgbakwunye nye nnukwu ngọzi ndịa niile, Ọ na-enyekwa anyị nkasi obi na mmasi obi ike noge ihe isi ike. A na m ekwe unu nkwa na dị ka anyị na-atụkwasị obi anyị n’ime Jizọs Kraist na n’ime aja mgbaghara mmehie Ya kachasị elu, na-anagide nokwukwe anyị ruo ọgwụgwụ, anyị ga-an̄ụrị ọńụ na nkwa niile nke Nna nke Eluigwe anyị hụrụ n’anya, onye na-eme ihe niile dị n’ike Ya iji nyere anyị aka laghachị n’ihu Ya otu ụbọchị. Nke a bụ ọrụ Ya na ebube Ya!29 A na m agba ama nye unu na Jizọs bụ Kraịst ahụ, Onye Mgbapụta nke ụwa, Mezaya ahụ e kwere na nkwa, Mbilite n’ọnwụ na Ndụ ahụ.30 Ma a na m ekwupụtara unu eziokwu ndị a n’aha Ya dị nsọ, onye Nna Mụrụ Naanị Ya, Onyenwe anyị, Jizọs Kraist, amen.