Ọgbakọ Zuru ọha
Ihe Anyị Na-amụ ma Agaghị Echefu Ma ọlị
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2021


Ihe Anyị Na-amụ ma Agaghị Echefu Ma ọlị

Ọ bụrụ na i lee ndụ gị anya n’ekpere, e kwere m na ị ga-ahụta ọtụtụ ụzọ nke Onyenwe anyị siri wee na-edu gị site n’oge nke ihe isi ike nke a.

Ezi ụmụnne m nwoke, atụwo m anya maka nzukọ intanet nkea mụ na unu. Oge ikpeazụ anyị nwere nzukọ ọkwa nchụaja nke ọgbakọ zuru ọha bụụrụ na Eprel 2019. Ọtụtụ emewo n’ime afọ abụọ ndị gara aga! Ụfọdụ n’ime unu enwewo ndị ha hụrụ n’anya nwụrụ anwụ. Ndị ọzọ enweghịkwa ọrụ, ihe eji akpata ego, ma ọbụ ahụ ike. Ndị ọzọkwa enweghị mmụọ nke udo ma ọbụ olileanya maka ọdịniihu. Obi m dịịrị onye ọbụla n’ime unu ndị taworo ahụhụ ndịa ma ọbụ ọghọm ndị ọzọ. A na m ekpe ekpere mgbe niile na Onyenwe anyị ga-akasi unu obi. Dị ka unu na-aganiihu ikwe ka Chineke merie n’ime ndụ gị, a mam na O nwere nchekube banyere ọdịniihu gị dị ka O nweworo na mbụ.

N’etiti ọghọm niile anyị nweteworo, enwekwara ụfọdụ ihe ndị anyị chọtaworo. Ụfọdụ achọtawo okwukwe miri emi n’ime Nna nke Eluigwe na Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst. Ọtụtụ achọtawo echiche ọhụrụ na ndụ—ọbụna echiche nke ebighị ebi. I nwere ike ị chọtawo adịnamma siri ike karịa n’etiti gị na ndị ị hụrụ n’anya na Onyenwe anyị. E nwere m olileanya na unu achọtawo nnukwu ike ị nụrụ Ya ma nata mkpughe nke onwe. Mkpagbu siri ike mgbe na mgbe na-ewete ohere ndị eji etolite nke na-agaraghị abịa site na-ụzọ ọzọ.

Chee echiche azụ n’afọ abụọ ndị gara aga. Olee otu i si wee tolite? Gịnị ka I mụtaworo? O nwere ike dị gị ka gị laghachị azụ na 2019 ma nọrọ ebe ahụ! Mana ọ bụrụ na i lee ndụ gị anya n’ekpere, e kwere m na ị ga-ahụta ọtụtụ ụzọ nke Onyenwe anyị siri wee na-edu gị site n’oge nke ihe isi ike nkea, na-enyere gị aka bụrụ nwoke rara onwe ya nye, chighariworo karịa—ezi nwoke nke Chineke.

A maara m na Onyenwe anyị nwere atụmatụ ukwuu dị ebube maka anyị—n’otu n’otu ma na ngụkọta. N’ọmịiko na ndidi, Ọ na-ekwu:

“Unu bụ ụmụ ntakịrị, ma unu aghọtabeghị nnọọ ụdị ngọzi dị ukwuu Nna … kwadoworo maka unu;

“Ma unu enweghi ike ịnagide ihe niile ugbụ a; otu ọ sịla dị, norọ nụ n’ezigbo ọn̄ụ, n’ihi na a ga m eduru unu na-aga.”1

Ezi ụmụnne m nwoke, a na m agba ama na Ọ nọworịị, ma na, n’ezie na-edu anyị na-aga, dịka anyị na-achọ ị nụrụ Ya. Ọ chọrọ ka anyị too ma mụta, ọbụna site na—elemaanya kacha nke site na—mkpagbu.

Mkpagbu bụ onye nkuzi dị ukwuu. Kedụ ihe unu mụtaworo n’ime afọ abụọ ndịa gara aga nke ị ga-achọ icheta mgbe niile? Aziza unu ga-apụ iche nye unu, mana ka m tụpụta ihe mmụta anọ m nwere olileanya na unu amụtawo ma agaghị echefu ma ọlị.

Ihe mmụta 1: Ebe obibi Bụ Isi nke Okwukwe na Ofufe

Oge ụfọdụ mgbe Onyenwe anyị na-adọ anyị aka na ntị banyere ihe egwu nke ụbọchị ikpeazụ, Ọ dụrụ ndụmọdụ otu a: “Gụzọrọ nụ n’ebe ndị dị nsọ, ma adapụkwala.”2 “Ebe ndị dị nsọ” ndịa n’eziokwu gụnyere tempụl na ụlọ nzukọ nke Onyenwe anyị. Mana dịka ike anyị ịgbakọta n’ebe ndịa ka amachibidoro n’ụzọ dị iche iche, anyị amụtawo na otu nime ebe ndịa kachasị dị nsọ n’elu ụwa bụ ebe obibi---ee, ọbụna ebe obibi unu.

Ụmụnne nwoke, unu ji ọkwa nchụaja nke Chineke. “Oké nke ọkwa nchụ-aja jikọrọ ọnụ n’enweghi ókè ya na ike nke eluigwe.”3 Unu na ezinaụlọ unu anatawo emụme nsọ ọkwa nchụaja. Ọ bụ “na emume nsọ ndị [nke ọkwa nchụaja ka] ike nke ịsọpụrụ Chineke ga-apụta.”4 Ike ahụ dịịrị unu na ezinaụlọ unu n’ime ebe obibi unu dịka unu na-edebe ọgbụgba ndụ unu meworo.5

Nanị afọ 185 gara aga, na ụbọchị nke a nnọọ, Epril 3, 1836, Elaija weghachitere ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja nke kwere ka arachikọta ezinaụlọ ruo ebighị ebi. Nke ahụ bụ ihe mere o si metụta gị nke ọma inye oriri nsọ n’ebe obibi gị. Olee otu i chere o si metụta ndị otú ezinaụlọ gị ịhụta gị—nna ha, nna nna, di, nwa nwoke, ma ọbụ nwanne nwoke—inye emume nsọ nkea? Kedụ ihe ị ga-eme idebe mmetụta ahụ dị nsọ n’ime ezinaụlọ gị?

O nwere ike dị gị ka enwere ihe fọtụrụ i kwesịrị ime iji mee ebe obibi gị n’ezie ebe nsọ nke okwukwe. Ọ bụrụ otu ahụ, biko mee ya! Ọ bụrụ na i lụwo nwunye, nwee ndụmọdụ gị na nwunye gị dịka onye gị nma ya hara ọnụ n’ọrụ nkea dị oke mkpa. E nwere nchuso ole ma ole dị mkpa karịa nkea. N’etiti ugbua na oge Onyenwe anyị ga-abịa ọzọ, anyị niile chọrọ ka ebe obibi anyị bụrụ ebe dị jụụ na ebe nchekwa.6

Mkparam agwa na omume nke na-akpọbata Mmụọ ahụ ga-abawanye ịdị nsọ nke ebe obibi gị. Nke dokwara anya bụ eziokwu na ịdị nsọ ga-apụ ma ọbụrụ na enwere ihe ọbụla dị na agwa gị ma ọbụ na gburugburu gị na-akpasu Mmụọ Nsọ iwe, maka mgbe ahụ “eluigwe niile ewezuga onwe ha.”7

Enwewo mgbe i chere ihe kpatara Onyenwe anyị jiri chọọ ka anyị mee ebe obibi anyị isi nke ọmụmụ oziọma na ibi ndụ oziọma? Ọ bụghị nanị ịkwado anyị maka, na inyere anyị aka site na, ọrịa mkpochapụ. Mgbochi nke ugbua maka ịgbakọta ọnụ n’ikpeazụ ga-abịa na njedebe. Otuosiladị, mkpebi unu ime ebe obibi unu ebe nsọ gị mbụ nke okwukwe ekwesịghị ịkwụsị. Dịka okwukwe na ịdị nsọ na-ebelata n’ụwa nkea dara ada, mkpa unu maka ebe nsọ ga-abawabye. A na m agba unu ume ịganiihu ime ebe obibi unu n’ezie ebe nsọ “ma adapụkwala8 site na mbunobi kacha mkpa.

Ihe mmụta 2: Anyị Chọrọ Ibe anyị

Chineke chọrọ ka anyị rụkọta ọrụ ọnụ ma nyere ibe anyị aka. Nke ahụ bụ ihe kpatara O si zipụ anyị n’ụwa n’ime ezinaụlọ ma hazie anyị n’ime ngalaba ukwu na stek niile. Ya mere O ji na-arịọ anyị ije ozi ma lekọta ibe anyị. Ya mere O ji na-arịọ anyị ibi ndụ nime ụwa mana abụkwala nke ụwa ahụ.9 Anyị nwere ike tikọta aka mepụta ihe n’ebe ọ dị ukwuu karịa anyị nwere ike mee nanị anyị.10 Atụmatụ ańụrị nke Chineke ga-emebi ma ọbụrụ ụmụ ya nọrọ iche iche otu onye na ibe ya.

Ọrịa mkpochapụ nsonso a pụwo iche nke bụ na o metụwo onye niile n’ụwa nnọọ n’otu oge ahụ. Ebe ụfọdụ atawo ahụhụ karịa ndị ọzọ, anyị niile enwetawo aka mgba n’ụzọ dị ańaa. Nihi nkea, mnwale nkea dakwasịrị anyị nile nwere ikike iji nye aka mee ụmụ Chineke adịnotu dịka emebeghị mbụ. Ya mere, a na m ajụ, mnwale nkea zuru ọnụ ọ wetewo unu nso ruo ndị agbata obi unu—ruo ụmụnne gị nwoke na nwanyị gafee ama na gburu gburu ụwa?

Na nkea, iwu nsọ abụọ kacha dị ukwuu nwere ike duo anyị: na mbụ, ịhụ Chineke n’anya na, nke abụọ, ịhụ onye agbata obi anyị n’anya.11 Anyị na-egosi ịhụnaanya anyị site n’ije ozi.

Ọ bụrụ na i maara onye nọ nanị ya, garuo—ọbụna ma ọbụrụ na ọ dị ka ị nọ nanị gị! Ọ dịghị mkpa na ị nwere mbunuche ma ọbụ ozi ma ọbụ azụm ahịa ire. Nanị kwuo ndewo ma gosi ịhụnaanya gị. Teknụzụ nwere ike inyere gị aka. Ma enwere ọrịa mkpochapụ mọbụ enweghi, nwa Chineke oke ọnụ ahịa ọbụla kwesịrị ịma na ya, nwoke ma ọbụ nwanyị anọghị nanị ya.

Ihe mmụta 3: Kworum Ọkwa nchụaja Gị Abụghị nanị maka Ọgbakọ

N’oge ọrịa mkpochapụ, ọgbakọ kworum Sọnde ka akagburu na nwa oge. Ụfọdụ kworum nwere ike ugbua zukọta na intanet. N’agbanyeghị, ọrụ ahụ nke Onyenwe anyị nyeworo kworum ọkwa nchụaja abụghị nanị nke a na-eme na ọgbakọ. Ọgbakọ bụ nanị akụkụ ntakịrị nke ihe kworum pụtara na ihe o nwere ike ime.

Ụmụnne m nwoke Ọkwa nchụaja nke Erọn na kworum ndị okenye, gbatịa olileanya gị nke ihe kpatara anyị jiri nwee kworum. Olee otu Onyenwe anyị si chọọ unu jiri kworum unu emepụta ọrụ Ya—ugbua? Chọọ mkpughe site n’aka Onyenwe anyị. Nwee obi umeala! Rịọ! Gee ntị! Ọ bụrụ na-akpọwo gị i du, dụọ ndụmọdụ dịka otú ndịisi nakwa gị na ndị otú kworum. Ihe ọbụla ọkwa ọrụ ma ọbụ ọkpụkpọ okú ọkwa nchụaja gị bụ, kwee Chineke merie na mkpebi gị dịka onye otú nke kworum gị na nime ije ozi gị. Jiri ọńụ mazuo ezi omume ahụ ndị unu ga ewete na mmezu dịka unu “nọgidere n’ihe dị mma.”12 Kworum niile nọ na ọnọdụ pụrụ iche iji mee ka mkpọkọta nke Izrel na ala ndị dị ndụ ma ndị nwụrụ anwụ n’aga ọsịsọ.

Ihe mmụta 4: Anyị Na-anụ Jizọs Kraịst Nke ọma Mgbe Anyị Dị Jụụ

Anyị bi n’oge eburu amụma ya oge gara aga, mgbe “ihe nile ga-adị n’ọgba-aghara; ma n’ezie, mkpụrụ-obi ndị mmadụ ga-akwụsị ọrụ; n’ihi na ụjọ ga-adakwasị mmadụ niile.”13 Nke ahụ bụ eziokwu tupu ọrịa mkpochapụ, ma ọ ga-abụ eziokwu ma emesịa. Ọgba aghara n’ime ụwa ga-aganiihu ịbawanye. Na ịdị iche, olu nke Onyenwe anyị abụghị “olu nke oke mkpọtụ ọgba aghara, kama … ọ [bụ] olu dị jụụ nke nwayọ zuru oké, [dịka] ntaka, ma ọ na [abanye] ọbụna na mkpụrụ obi ahụ.”14 Iji nwee ike nụrụ olu nkea dị jụụ, gị onwe gị ga-adịrịrị jụụ!15

Nwa oge, ọrịa mkpochapụ akagbuwo ihe omume niile ndị ahụ anyị naara ị neme na ndụ anyị. Mgbe na-adịghị anya anyị nwere ike họrọ iji mkpọtụ na ọgba aghara nke ụwa mejupụta oge ahụ ọzọ. Ma ọbụ anyị nwere ike jiri oge anyị ji nụrụ olu nke Onyenwe anyị na-ataka odudu Ya, nkasị obi, na udo. Oge dị jụụ bụ oge dị nsọ—oge nke ga-akwado mkpughe nke onwe ma kụnye udo.

Zụọ onwe gị inwe oge nanị gị nakwa gị na ndị ị hụrụ naanya. Mepee obi gị n’ekpere nye Chineke. Were oge irukpu onwe gị n’ime akwụkwọ nsọ na ofufe n’ime tempụl.

Ezi ụmụnne m ndị nwoke, e nwere ọtụtụ ihe ndị Onyenwe anyị chọrọ ka anyị mụta site na nhumiihe dị n’oge ọrịa mkpochapụ a. A kpọpụtawo m nanị anọ. A na m akpọku unu ime ndepụta nke gị, tulee ya nke ọma, ma kọọrọ ya ndị ahụ ị hụrụ naanya.

Ọdịniihu dị mma maka ndị Chineke na-edebe ọgbụgba ndụ ha.16 Onyenwe anyị ga na-akpọku ndị odibo Ya mgbe niile ndị ji ọkwa nchụaja na ntozu oké iji gọzie, kasie obi, ma gbaa ụmụ mmadụ ume na iji nyee aka kwadoo ụwa na ndị ya maka Ọbịbịa nke Ugboro abụọ Ya. Ọ bụ ọrụ onye ọbụla n’ime anyị ịgbaru ruo echichi ahụ dị nsọ anyị nataworo. Anyị pụrụ ime ya! A na m agba ama, na ngosi nke ịhụnaanya maka unu, ụmụnne m ndị nwoke m hụrụ naanya, n’aha dị nsọ nke Jizọs Kraịst, amen.