Ọgbakọ Zuru ọha
Gọzie na Aha Ya
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2021


Gọzie na Aha Ya

Ebumnoobi maka anyị ịnata ọkwa nchụaja bụ inye anyị ohere ịgọzi ndị mmadụ maka Onyenwe anyị, na-eme otu ahụ na-aha Ya.

Ezi ụmụnne m nwoke, ndị odibo ibe m niime ọkwa nchụaja nke Chineke, ọ bụ nkwanye ugwu nyere m ịgwa unu okwu na-anyasị a. Unu nwere ugwu na ekele m kachasị dị omimi. Mgbe mụ na unu kpara nkata ma anụ maka okwukwe unu dị ukwuu, ana m ekwere na ike ọkwa nchụaja na-abawanye niime ụwa, tinyere kworum ndị na-adịwanye ike na ndị ji ọkwa nchụaja nokwukwe na-esiwanye ike.

Na-oge ole na ole mụ na unu ga-anọ na mgbede a, a ga m e kwuru ndị niime unu chọrọ ịdị ire okwu ọbụna karịa nozi ọkwa nchụaja nke onwe ha. Unu maara maka okwu a gwara unu na unu ga-arụsi ọrụ ike noku a kpọrọ unu ije ozi.1 Mana unu nwere ike ị na-eche ihe ịrụsi ọrụ ike na-ọkpụkpọ oku unu pụtaara unu.

Aga m eji ndị dikọn e chiri ọhụrụ ebido niihi na ha ọ dị ka ha kachasị ịdị na-ọnọdụ amaghị ka eriri niihe gbasara ihe ịrụsi ọrụ ike na ọkwa nchụaja ha pụtara. Ndị e chiri echichi okenye ọhụrụ nwekwara ike chọọ ịńa ntị. Onye bishọp niizu ụka ndị mbụ nozi ya nwekwara ike nwee mmasị.

Ọ dị mkpa mụ ịtụgharị uche azụ cheta oge nke m dị ka onye dikọn. Ọ dịịrị m kaasị na o nwere onye gwatụrụ m mgbe ahụ ihe m na-aga ịtụpụta uche ya ugbu a. Ọ gaara enye aka nọrụ ọkwa nchụaja niile m nwetagoro kemgbe ahụ—ọbụna ndị nke m na-anata nụbọchị taa.

E chiri m dikọn na ngalaba dị ezigbo ntakịrị nke na a bụụrụ m naanị onye dikọn ma nwanne m nwoke Ted naanị ya bụ onye nkuzi. Naanị ezi na ụlọ anyị bụ ndị nọ na ngalaba nta ahụ. Ndị ngalaba nta ahụ niile na-ezukọ nebe obibi anyị. Onyendu ọkwa nchụaja maka mụ na nwanne m nwoke bụrịị onye mere nchigharị ọhụrụ onye nke ka natara ọkwa nchụaja ahụ nonwe ya. E chebuuru m mgbe ahụ na naanị ọrụ ọkwa nchụaja m nwere bụrịị ibugharị oriri nsọ niime ụlọ iri nri nke mụ onwe m.

Mgbe ndị ezi na ụlọ m kwagara na Uta, a hụtara m onwe m na nnukwu ngalaba ukwu nwere ọtụtụ ndị dikọn. Na nzukọ oriri nsọ m nke mbụ ebe ahụ, a hụtara m ndị dikọn—ndị agha, ka o yiri m— na-aga ụkwụ na ụkwụ ka ha na-ebugharị oriri nsọ dị ka otu ndị a zụrụ azụ.

Egwu tụrụ m nke ukwuu nke mere na Sọnde na-abịa abịa a gara ngwa ngwa na ụlọ ngalaba ukwu ahụ ị nọọrọ onwe m mgbe na o nweghị onye ga-ahụ m. Echetara m na ọ bụ Ngalaba ukwu Yalecrest nọ na Salt Lake City, ma o nwere ihe a kpụrụ akpụ nọcha na-ala. A gara m na-azụ ihe a kpụrụ akpụ ma kpesie ekpere ike maka enyemaka ịmata ka esi ghara ịda ada mgbe m weere ọnọdụ m na-ibugharị oriri nsọ. A zara ekpere ahụ.

Mana a maara m ugbu a na enwere ụzọ kacha dị mma ikpe ekpere na iche echiche ka anyị na-agbalị ito eto nozi ọkwa nchụaja anyị. Ọ bịawo site na nghọta m ihe mere eji enye ndị mmadụ ọkwa nchụaja. Ebumnoobi maka anyị ịnata ọkwa nchụaja bụ inye anyị ohere ịgọzi ndị mmadụ maka Onyenwe anyị, na-eme otu ahụ na-aha Ya.2

Ọ bụrịị ka ọtụtụ afọ gasịrị oge m bụụrụ dikọn ka mụtara otu esi arụ ọrụ dikọn. Na-ịmaatụ, dị ka onyeisi ọkwa nchụaja, e nyere m ọrụ ịga leta nzukọ oriri nsọ nebe ana elekọta ndị mmadụ. A gwara m ka m bugharịa oriri nsọ. Kama iche echiche gbasara usoro ma ọbụ kpọmkwem ụzọ m si bugharịa oriri nsọ ahụ, kama e lere m anya niihu ndị ọbụla metụrụ okenye. A hụtara m ọtụtụ niime ha na-ebe akwa. Otu nwanyị dọọrọ m na-aka uwe m, lelie anya elu, ma kwusie ike, “Oo, I meela, I meela.”

Onyenwe anyị agọziwo ozi m enyere naha Ya. Ụbọchị ahụ ekpewo m ekpere maka ọrụ ebube dị otu ahụ ịbịa kama ikpe ekpere maka otu m ga-esi emeta ihe ekenyere m nke ọma. Ekpere m ekpere ka ndị mmadụ nwee mmetụta nke ịhụnaanya Onyenwe anyị site n’ozi ịhụnaanya m. A mụtawo m nke a bụ ọtụghe ije ozi na ịgọzi ndị ọzọ naha Ya.

A nụtara m nhụmiihe mere nsonso a nke chetaara m maka ụdịrị ịhụnaanya dị otu ahụ. Mgbe a kwụsigoduru nzukọ niile nke Nzukọ nsọ niihi ọrịa mkpochapụ ụwa COVID-19, nwanne nwoke na-eme nleta nabatara ije ozi site naka onyeisi kworum ndị okenye ya ịgọzi na inye otu nwanne nwanyị ọ na-elekọta oriri nsọ. Mgbe ọ kpọrọ ya na ya na-abịa iweta oriri nsọ, ọ nabatara nobi abụọ, na mwute na ọ na-aga ịkpọpụta ya na-ebe obibi ya nụdịrị oge jọgburu onwe ya dị otu ahụ nakwa ekweta na ihe niile ga-abịaghachi nọnọdụ ha ọsịsọ ọsịsọ.

Mgbe ọ bịaruru na-ebe obibi ya na ụtụtụ Sọnde ahụ, ọ rịọrọ ya otu arịrịọ. Ma ha nwere ike ịga nụlọ nke nọ nakụkụ nke ya ma rikọọkwa oriri nsọ ọnụ ya na onye agbataobi ya gbara afọ 87? Site na nkwado nke bishọp ahụ, o kwetere.

Ihe were ọtụtụ izu ụka, na site na-ezi mkpachara anya nke ịnọkeje anọkeje na usoro nchekwa ndị ọzọ, obere ndị otu ndị nsọ ahụ na-agbakọ kwa Sọnde maka ofufe oriri nsọ nụzọ dị mfe. Naanị mpempe achịcha ayawara ayawa na iko mmiri ole na ole—mana ọtụtụ anya mmiri ebere maka ịdịmma nke Chineke nwere ịhụnaanya.

Oge na-adịghị anya, nwanne nwoke ahụ na-eme nlekọta, ezi na ụlọ ya na nwanne nwanyị ahụ ọ na-elekọta nwere ike lọghachi nụlọ ụka. Mana nwanyị isimkpe ahụ gbara afọ 87, onye agbata obi ya, site na-ezi mkpachapụ anya, nọdụrụ na-ebe obibi. Nwanne nwoke ahụ na-eme nleta—cheta na ọrụ enyere ya abụghị nke onye agbataobi nwanyị ahụ ma ọbụladị nke nwanne ya nwanyị megoro okenye nonwe ya—na-agbanyeghị ruo taa na-eji nwayọ abịa nụlọ nwanyị ahụ Sọnde ọbụla, jide akwụkwọ nsọ na ntakịrị ibe achịcha na-aka, inye oriri nsọ nke Nri anyasị nke Onyenwe anyị.

Ozi ọkwa nchụaja Ya, dị ka nke m ụbọchị ahụ nebe nlekọta ahụ, ka enyere nịhụnaanya. Na eziokwu, nwanne nwoke ahụ na-eje ozi nlekọta jụrụ bishọp ya na nsonso a ma enwere ndị ọzọ nọ na ngalaba ukwu ahụ ya nwere ike ilekọta. Ọchịchọ ya nịrụsi ọrụ ọkwa nchụaja ya ike etowo ka ọ na-eje ozi naha nke Onyenwe anyị na nụzọ nke naanị Ya maara. Amaghị m ma nwanne nwoke ahụ na-eje ozi nlekọta o kpewo ekpere, dị ka m mere, maka ndị ahụ ọ na-ejere ozi ịma maka ịhụnaanya nke Onyenwe anyị, kama nihi na ozi ya abụrụwo naha nke Onyenwe anyị, rịzọọtụ ya abụrụwo otu ihe ahụ.

Otu ụdịrị rịzọọtụ ahụ dị ebube na-abịa mgbe m kpere ekpere maka ya tupu mụ enye onye na-arịa ọrịa ma ọbụ onye nwere mkpa ngọzi nke ọkwa nchụaja. O mekwara otu mgbe notu ụlọ ọgwụ mgbe ndị dọkịta ọdị ọkụ ọkụ na-ahụ manyere m—ọ karịrị ịmanye m —nyere iwu—ime ọsịsị ma si ebe ahụ pụọ ka ha nwee ike rụọ ọrụ ha, karịa inye m ohere inye ngọzi nke ọkwa nchụaja. A nọgidere m, ma enyere m ngọzi ahụ. Ma nwantakịrị nwanyị ahụ m gọziri ụbọchị ahụ, onye nke ndị dọkịnta chebuuru ga-anwụ, nyara ndụ. Obi m jur4u na-ekele noge nke a na nụbọchị ahụ, e kweghị m ka mmetụta nke m nochie ụzọ kama nwee mmetụta na Onyenwe anyị chọrọrịị ka nwantakịrị nwanyị ahụ nweta ngọzi. Ma a maara m ihe ngọzi ahụ bụ: Enyere m ya ngọzi ka ọ nata ọgwụgwọ. Ma ọ natara ọgwụgwọ

O mewo ọtụtụ oge dị ka m na-enyego otu onye o doro anya nọ nọnụ ọnwụ ngọzi, na-ebe ndị otu ezi na ụlọ gbara akwa ya gburugburu, na-atụanya ngọzi nke ọgwụgwọ. Ọbụrụgodu na m nwere naanị nwa ntịtị oge, ana m e kpe ekpere mgbe niile ịmata ngọzi nke Onyenwe anyị kwadoro nke m nwere ike inye naha Ya. Ma a jụrụ m otu O ji chọọ igọzi onye ahụ na-abụghị ihe mụ onwe m ma ọbụ ndị mmadụ guzo nso chọrọ. Nhụmiihe m bụ na ọbụna mgbe ngọzi ahụ na-abụghị ihe ndị ọzọ chọrọ maka onwe ha ma ọbụ ndị ha hụrụ naanya, Mmụọ na-emetụ ha aka nobi inwe nnabata na nkasi obi karịa ịda mba.

Otu ụdị mkpatemmụọ ahụ na-abịa mgbe onye petrak buru ọnụ ma kpee ekpere maka nduzi inye ngọzi ahụ Onyenwe anyị kwadooro mmadụ. Ọzọkwa, anụwọ m maka ngọzi ndị enyere nke tụrụ m naanya ma tụkwaa onye na-anata ngọzi ahụ naanya. O doro anya, na ngọzi ahụ si naka Onyenwe anyị—ma ịdọ aka na ntị ndị nọ na ya nakwa nkwa niile e kwere naha Ya. Ekpere na obubu ọnụ nke onye petrak bụ nke Onyenwe anyị zara.

Dị ka onye bishọp, a mụtara m ihe mgbe m na-ajụ ajụjụ ọnụ ntozuoke ikpe ekpere ka Onyenwe anyị ikwe ka m matatụ ihe Ọ chọrọ maka onye ahụ, idebe mkpatemmụọ ọbụla Ọ ga-eweta hara inwe mkpuchi site na ikpe nke onwe m. Nke ahụ rara ahụ ma ọ bụrụ na Onyenwe anyị, na ịhụnaanya, ga-achọ ịgọzi mmadụ site na ntụziaka. Ọ na-ewe ịgba mbọ ịchọpụta ihe onyenwe anyị chọrọ site na ihe ị chọrọ na ihe onye nke ọzọ nwere ike ị chọ.

E kwere m na anyị nwere ike ịrụsi ọrụ ọkwa nchụaja anyị ike oge niile nke ndụ anyị ma ikekwe fere n’ọnwụ. Ọ ga-adabere na nrụsi ọrụ ike anyị na-ịgba mbọ ịmata uche nke Onyenwe anyị na mbọ anyị ịnụ olu Ya nke ọ ga-abụ na anyị ga-anụ olu Ya ka anyị nwee ike ịmata nke ọma ihe Ọ chọrọ maka onye anyị na-ejere ozi maka Ya. Ịdị mma ahụ ga-abịa na ntakịrị ntakịrị nzọm ụkwụ. O nwere ike jiri nwayọ na-abịa, mana ọ ga-abịa. Onyenwe anyị kwere anyị nkwa nke a:

N’ihi na ndị ọbụla nwere okwukwe ruo n’inweta ọkwa nchụ-aja abụọ ndị a nke m kwuworo maka ha, na ịrụsi ọrụ ike n’ọkpụkpọ oku ha, ka e doro nsọ site na Mụọ ahụ ruo na mgbanwe nke ahụ ha nile.

Ha na-abuzị ụmụ ndịkom nke Moses na nke Erọn na mkpụrụ-afọ nke Ebreham, na nzukọ-nsọ na ala-eze ahụ, na ndị a họpụtara iche nke Chineke.

Na kwa ndị nile ndị nabatara ọkwa nchụ-aja nke a nabatara m, ka Onyenwe anyị kwuru.”3

Ọ bụ aka ebe m na ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja bụ ndị eweghachitere nye Onye amụma Josef Smith. Ndị odibo nke Onyenwe anyị sitere neluigwe bịa iweghachite ọkwa nchụaja ahụ maka nnukwu ihe omume nke ekpuheworo na ndị tọgbọrọ niihu anyị. A ga-ekpokọta Izrel. Ndị nke onyenwe anyị ga-enwe nkwado maka Ọbịbịa Ya Nke ugboro Abụọ ga-adị ebube. Mweghachite ahụ ga-aganiihu. Onyenwe anyị ga-ekpughekwu ọtụtụ ihe bụ uche Ya nye ndị amụma Ya na ndị odibo Ya.

I nwere ike chee na ị dị nta ma atụnyere gị na nnukwu ndapụta nke ihe Onyenwe anyị ga-eme. Ọ bụrụ na I mee nke a, ana m akpọku gị ka i jiri ekpere jụọ otu Onyenwe anyị siri hụ gị. Ọ maara gị onwe gị, O nyefere gị ọkwa nchụaja, ma mgbago elu gị na nrụsi ọrụ ọkwa nchụaja gị ike dịrị Ya mma niihi na Ọ hụrụ gị naanya ma Ọ tụkwasịrị gị obi ịgọzi ndị mmadụ Ọ hụrụ naanya naha Ya.

A na m agọzi unu ugbu a inwe mmetụta ịhụnaanya Ya na ntụkwasị obi Ya naha nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, amen.