Ọgbakọ Zuru ọha
A Ga-eme ka Iri uju Anyị bụrụ Ọñụ
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2021


A Ga-eme ka Iri uju Anyị bụrụ Ọñụ

A na m akpoku mmadụ nile n’eri iju, ndị nile ọ na-atụ n’anya ịhe g’eme mgbe anyị nwụrụ, ka ha dobe okwukwe ha na Kraịst.

Ọtụtụ afọ gara aga, mgbe m nọ n’ọgbakọ emere n’Obodo-ukwu nke Salt Lake, Onye amụma ọma anyị Russell M. Nelson bịara kelee mụ. Dịka otu o si akpa agwa ma n’ụzọ nke ya, ọ jụrụ, “Mark, kedụ otu nne gị dị?”

A gwara m ya na mụ na ya noburu na mbido izu-ụka ahụ nime ebe obibi ya na New Zealand ma ọ n’eme kwa okenye ma jupụta na okwukwe na mkpali mmuọ ruo n’ebe ndị nile mara ya nọ.

Ọ wee kwuo, “Biko gosi ya ịhunanya m … ma gwa ya na ọ na-agụ m agụụ ị hụ ya ọzọ.”

Kama ọ tụrụ m n’anya ma ajụrụ m, “Ị na-akwado ị bịa njem ruo obodo New Zealand na mgbe na-adịghị anya?”

Site n’eziokwu si n’ala ala obi ọ zaghachiri, “ O mba, A ga ma ahụ ya na ndụ nke ọzọ.”

Enweghi okwu egwuruegwu dị nime azịza ya. Ọ bụụrụ nkwupụta nke bụ eziokwu. N’oge ahụ a na-akpaghị akpa, a nụrụ ma nwete mmetụta nke ọgbụgba-ama n’enweghi ntukpọ nke si n’ọnụ onye amụma dị ndụ pụta, na ndụ ga-aga n’ihu mgbe ọnwụ gasịrị.

N’ọgbakọ nke ngwụcha izu a, unu ga-anụ site n’ọnụ ndị ozi na ndị amụma dị ndụ dịka ha n’agba-ama nke Mbilite n’ọnwụ Jizọs Kraịst. “Isi ukpuru nile nke okpukperechi anyị bụ ọgbụgba-ama nke Ndị Ozi na Ndị amụma gbasara Jizọs Kraịst, na Ọ nwụrụ ọnwụ, elie ya, ma o biliri ọzọ n’ụbọchị nke atọ[;] … Ịhe ndị ọzọ nile nke metụtara okpukperechi anyị bụ nanị ịhe ndị agbakwụnyere nime [eziokwu nke-a].”1 A na m ekwe unu nkwa na dịka unu n’eji ezi obi unu ege ntị, Mmụọ ahụ ga-ekwu eziokwu nye uche na obi unu maka eziokwu dị nime ịgba-ama ndịa.2

Ndị ozi mgbe ochie nke Jizọs bụụrụ ndị agbanworo ruo ebighi ebi mgbe Ọ bịakwutere ha mgbe ọnwụ Ya gasịrị. Iri mmadụ nime ha jiri anya ha hụ na Ọ bilitewo n’ọnwụ. Thomas, onye na-anọghị mgbe ahụ, kwupụtara, “Ma ọbụghị na ejiri anya m hụ … , A gaghị m ekwere.”3 Emesịa Jizọs dọrọ ya aka na ntị sị, “A dakwala mba n’okwukwe, mana kwere.”4 Emesịa Onyenwe anyị kuziri ọrụ dị mkpa nke okwukwe: “Ngọzi n’adịrị ndị ahụ na ahụbeghị , ma n’agbanyeghị ha ekwerewo”5

Onyenwe anyị onye bilitere n’ọnwụ nyere Ndị Ozi Ya iwu ahụ ịgba ama maka Ya. Dịka ọ dịịrị Ndị Ozi anyị dị ndụ taa, ha hapụrụ ọrụ aka ha nke ụwa ma tinye ndụ ha nile nke fọdụrụ ha n’ikwupụta na Chineke akpolitewo Jizọs elu. Ọgbụgba-ama ha nke-a siri ike mere puku kwuru puku mmadụ ji wee nabata ọkpụkpọ okú ka e mee ha baptizim.6

Ozi ebube nke ụtụtụ Ista bụ isiokwu dị nime okpukperechi nke ndị Krịast. Jizọs Kraịst ebilitewo n’ọnwụ, ma nihi nke-a, anyị kwa ga-adị ndụ ọzọ mgbe anyị nwụworo. Ọmụmihe nke-a n’eme ka ndụ anyị nwee nkọwa ma nwekwa ebumnuche. Ọbụrụ n’anyị jee n’ihu n’okwukwe, anyị ga-abụ ndị agbanworo ruo ebighi ebi, dịka esi mee Ndị Ozi nke mgbe ochie. Anyị, dịka ha, ga-enwe ike inagide ihe isi ike n’ihi okwukwe anyị nwere na Jizọs Kraịst. Okwukwe ahụ ga-enyekwa anyị olileanya maka oge ahụ “a g’eme ka iri uju anyị bụrụ ọñụ.” 7

Okwukwe nke m bidoro mgbe oge ihe iri uju gasịrị.

Nna m na nne m bụ ndị n’azụ atụrụ na New Zealand.8 Ha biri ndụ añụrị. Dịka di na nwunye ka dị nta, ejiri ụmụ nwanyị atọ dị ntakịrị gọzie ha. Nke dịkasị nta nime ha bụ Ann. Otu ụbọchị mgbe ha nọ ezumike n’akụkụ mmiri, Ann dị ọnwa 17 adaba nime mmiri. Mgbe nkeji ole n’ole gafere achọrọ ya, a hụrụ ozu ya nime mmiri.

Ihe egwu nke-a butere iri uju nke onu apụghị ikwu. Mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, nna m dere na ọchị siri nime ndụ ha pụọ ruo ebighi ebi. Nke ahụ mekwara ha jiri wee chọ azịza nye otu ajụjụ kachasị mkpa na ndụ nkea: Kedụ ịhe ga-emezi nwa ọma anyị Ann? Anyị ọ ga ahụkwa ya ọzọ? Kedụ otu ndị ezinụlọ anyị sị enwekwa añụrị ọzọ?

Ka afọ ole n’ole ihe egwu a mere, ndị mgbasa oziọma nta abụọ si nime Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazu bịara n’ubi anyị. Ha bidoro kuziwe eziokwu nile nke aga achọta nime Akwụkwọ nke Mọmọn na Baịbụlụ. Otu eziokwu dị nime nkuzi ahụ bụ nkasị obi na Ann bizi na ala-mụọ ugbua. Nihi Mbilite n’ọnwụ nke Jizọs Kraịst, ọ gakwa ebilite n’ọnwụ. Ha kụziri na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst ka eweghachitere ọzọ n’elu ụwa ma nwee ọnye amụma dị ndụ ma Ndị ozi iri na abụọ. Ma ha kụziri maka ozizi nke-a pụrụ iche, na ezinụlọ nile ka enwere ike ịrachikọta ọnụ ruo ebighi ebi site n’otu ikike ọkwa nchụ aja ahụ Jizọs Kraịst nyere Onye Isi Ozi, bụ Pịta.9

N’otu ntabi anya, nnem kọtara eziokwu ahụ ma nata aka ebe nke Mmụọ ahụ. Kosiladị, nna m, nwere obi abụọ rụọ otu afọ. Ọzọ, ọ chọghịkwanụ ịgbanwe otu osi ebi ndụ ya. Otu ụtụtụ mgbe o biliri n’ụra ọ n’ehighi, ọ nọ na agaghịrị siri ebea ruo ebea, ọ chịgharịrị n’ebe Nne m nọ ma kwuo, “A ga m emerịrị baptizim taa mọbụ a agaghị eme ya mọlị.”

Nne m gwara ndị mgbasa oziọma ahụ ịhe merenụ, ma ozugbo ahụ, ha kọtara na obere ire-ọkụ okwukwe abatawo nime nna m nke ekwesịrị ịkwalite mọbụkwanụ emenyụọ ya.

N’ụtụtụ ụtụtụ ahụ, ndị ezinụlọ anyị jere n’akụkụ mmiri beach dị nso. Dịka ndị na-amaghị ịhe n’eme, anyịnwa bụ ụmụaka nọ n’elu aja eri ọrịrị n’oge ahụ Ndị Okenye Boyd Green and Gary Sheffield kpọọrọ nne na nna m ba nime osimiri wee mee ha baptizim. N’iji gosipụta okwukwe ya, nime obi ya, nna m kwere Onyenwe anyị nkwa na nagbanyeghị ịhe ga-apụta nihu, ọ ga-akwụsike ruo ogologo ndụ ya nile ma dobe nkwa nile nke ọ mere.

Mgbe otu afọ gasịrị e doro otu tempụl dị na Hamilton, New Zealand nsọ. Ka nkea mesịrị, ezinụlọ anyị, tinyekwara onye nochiri anya Ann, sekpuru ala n’ebe nchụ-aja dị nime ụlọ nsọ nke Onyenwe anyị. N’ebe ahụ, site n’ikike nke ọkwa nchụaja, arachiri anyị ọnụ dịka ezinụlọ ebighi ebi nime emume dị nsọ nke dị mfe ma maa mma. Nke-a nwetere anyị udo na ọñụ.

Ọ bụ mgbe ọtụtụ afọ gasịrị ka nna m gwara m na asị n’ọbụghị onwu-ike nke Ann, ọ naghị ị nwe obi umeala ị nabata oziọma eweghachitere mọlị. Ma Mụọ ahụ nke Onyenwe anyị tinyere nime ya olileanya na ihe ndị ahụ ndị mgbasa oziọma n’akụzi bụ eziokwu. Okwukwe nne na nna m gara n’ihu n’eto ruo mgbe igba ama ha abụọ bidoro nwuwe ka ọkụ, nke jiri nwayo duuru ha nime mkpebi obi nile nke ndụ ha.

A na m ekele nne na nna m mgbe nile maka ndụ ọmụmatụ ha dobere ọgbọ ndị nọ n’ihu. Ọ gaghị ekwe omume ị mata ndụ ole ndị agbanworo nihi orụ nile nke okwukwe ha na nzaghachị n’oge iri uju ahụ.

A na m akpoku mmadụ nile n’eri iju, ndị nile n’enwe obi abụọ, ndị nile ọ na-atụ n’anya ịhe g’eme mgbe anyị nwụrụ, ka ha dobe okwukwe ha na Kraịst. A na m ekwe nkwa na ọ bụrụ na unu nwe ọchịchọ ị kwere, ma mee ihe na okwukwe ma soro ntaka nile nke Mmụọ, unu ga-ahụta ọñụ nime ndụ nkea ma n’ụwa nke na-abịa.

Ọ na-anụ m ọkụ n’obi maka ụbọchị m ga-ezuta nwanne m nwanyị Ann. Ọ na anụ m ọkụ n’obi maka mgbe mụ na nna m onye nwụrụ ihe karịrị afọ 30 gara aga, ga-ezutegharị ọzọ n’obi añụrị. A na m agba ama maka ọñụ nke a na-ahụ site n’ibi ndụ okwukwe, ikwere ma ahụghị mọlị, ma mara na site n’ike nke Mmụọ Nsọ na Jizọs Kraịst dị ndụ. Ejiri m obi m nile na mkpụrụ obi m nile, họrọ i soro Jizọs Kraịst na oziọma Ya nke eweghachitere azụ. Nke a na-agọzi ihe nile metutara ndụ m. A mara m na Jizọs bụ Kraịst ahụ, Ọkpara nke Chineke, Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta anyị. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen

Hụba-ama

  1. Teachings of Presidents of the Church: Joseph Smith (2007), 49.

  2. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ nile 8:2

  3. Jọn 20:25 “It is common in our secular world to say that ‘seeing is believing.’ The way of the Lord is best defined by a different maxim: ‘Believing is seeing.’ Faith in the Lord is the premise, not the conclusion” (Lance B. Wickman, “But If Not,” Liahona, Nov. 2002, 31).

  4. Jọn 20:27.

  5. Jọn 20:29; ihe niile agbakwunyere.

  6. Lee Ọlụ 2

  7. Jọn 16:20

  8. Kenneth Molony Palmer na Jill Beeban Garlick Palmer.

  9. Lee Matiu 16:19.