Ọgbakọ Zuru ọha
Chetakwa Uzọ Iji Alaghachi Ebe Obibi
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2021


Chetakwa Uzọ Iji Alaghachi Ebe Obibi

Omụmatụ zuru oké nke Jizọs Kraịst k’anyị nwere isoro, ma njem nlaghachi ebe obibi anyị nke igwe ga-ekwe omume nihi nkuzi Ya nile, ndụ Ya, ma aja mgbaghara Ya.

N’afọ 1946, otu onye nyocha n’emebeghi agadi Arthur Hasler nọbụ na-akpagharị n’akụkụ ụzọ otu mmiri nọ n’ugwu nke nọ n’akụkụ ebe obibi ya mgbe ọ bụ nwata mgbe ọ nwetere otu nhụmịhe nke mere ejiri chọta otu azụ sị achọta ụzọ ha laghachị mmiri amụrụ ha.

K’ọna na-akpagharị elu ugwu ahụ, nagbanyeghi na ọ naghị ahụ mmiri si n’elu awụda n’ala nke masịrị ya mgbe ọ bụ nwata, n’otu ntabi-anya otu uche echefuru alaghachi n’isi Hasler. O kwuru, “Dịka ikuku oyi, nke nwere isi-ọma moss na columbine, fegharịrị gburugburu okwute nke ugwu ahụ, ịhe nile eji akọwa mmiri ahụ si n’elu awụda n’ala ma otu o si nọrọ nihu ugwu ahụ agbabata m n’anya n’otu ntabi anya.”1

Isi-ọma ndị ahụ mere ka ịhe ndị mere mgbe ọ bụ nwata abịa n’uche ya ma chetara ya maka ebe obibi ya.

Ọ bụrụ na isi g’akpali n’uche ya ụdị ịhe mere na mbụ, o tulere na enwere ike isi g’abụ ịhe n’akpali azụ salmon onye, mgbe ọtụtụ afọ gasịrị ọ nọ n’oke osimiri, na-alaghachi na iyi ahụ amụrụ ya ma yie akwa.

Nihi nhụmihe nke-a, Hasler, ya na ndị nyochaa ọzọ, gara nihu i gosi na salmon n’echeta isi nile ahụ nke g’enyere ha aka gwuo ọtụtụ mmiri ma chọta ụzọ ha siri n’osimiri laghachi ebe obibi.

Ndekọta nkea mere mụ ka m chee na otu nime ịhe dị mkpa anyị nwere ike ị mee na ndụ a bụ ị kọta ma cheta ụzọ ahụ n’eduru laghachikwuru Nna anyị nke Igwe ma kwusie ike ma jiri ọñụ nwe nnagide jee njem nile ahụ.

Echetara m maka ịhe ncheta anọ, nke ọ bụrụ na etinye ha nime ndụ anyị, ọ g’enwe ike kpalie mmetụta nile banyere ebe obibii anyị nke igwe.

Nke mbụ, Anyị Nwere Ike Ịcheta na Anyị Bụ Ụmụ nke Chineke

Anyị nwere ịhe nketa dị nsọ. Mgbe anyị matara n’anyị bụ ụmụ nke Chineke ma na Ọ chọrọ k’anyị laghachi n’iru Ya bụ otu nzọ-ụkwụ a g’eme na njem nlaghachi ebe obibi anyị nke igwe.

Chetara onwe gị maka ịhe nketa nke a. Wepụta oge mgbe nile maka ị gba ahụ-ike nke mụọ gị ume site n’ịcheta ngọzị nile ị nwetara site n’aka Onyenwe anyị. Tụkwasị obi na odudu nile nke Ọ nyeworo gị, karịa ị dabere nanị n’elu ụwa maka ị mata ụrụ ịbara ma ịchọta ụzọ gị.

Na nso nso a, ejere m leta otu onye mhụrụ n’anya mgbe ọ si n’ụlọ ọgwụ lọta. Ọ jiri obi akwa kọrọ m na mgbe ọ dina n’akwụ ụlọgwụ ahụ, nanị ịhe ọchọrọ bụ ka mmadụ bụọra ya abụ nkea “ A bụ m Nwa nke Chineke.” Echiche a naniị, o kwuru, nyere ya udo nke ọ chọsịrị ike n’awa nke mgbagbu ya ahụ.

Mgbe ị matara onye ị bụ, ọ ga-agbanwo mmetụta gị nile ma ịhe ị neme.

Ị ghọta onye ị bụ n’ezie na-akwado gị ọfụma ị kọta ma cheta ụzọ iji alaghachi ebe obibi anyị nke igwe ma mee ka ọ gụọ gị agụrụ ị nọ ebe ahụ.

Nke abụọ, Anyị Nwere ike Cheta Isi-nkume ahụ Nke N’echekwa Anyị

Agbamume n’abịara anyị mgbe gara nihu n’ịbụ ndị eziomume, ndị eziokwu, na ndị kwụsịrị ike nime Nna nke Igwe na Jizọs Kraịst, tụmadị mgbe ndị ọzọ kwechiri na ịnụpụ isi nye iwu nile na ukpuru nile nke nzọpụta2

Nime Akwụkwọ nke Mọmọn, Hilaman kụziri ụmụ ya ndị nwoke ka ha cheta na ha kwesịrịrị iwu isi-nkume ha n’elu Jizọs Kraịst ka ha wee nwe ike eji emegide ọnwụnwa nile nke onye iro. Ajọ ikuku na ebuli mmiri nke Setan n’akụ anyị ịhe, mana ha agaghị enwe ike iji dọda anyị n’ala mọbụrụ n’anyị tinye ntụkwasị obi anyị nime ebe kacha nwe nchekwa karịa—nime Onye Mgbapụta anyị.3

A matawom site na nhụmịhe nke m na dịka anyị na-ahọrọ ị nụrụ olu Ya ma soro Ya, anyị ga-anata enyemaka Ya. Anya anyị ji ele ọnọdụ anyị ga-adịkwu ime karịa ma nghọta anyị nwere maka ebumnuche ndụ anyị ga abawanye. Anyị ga-anụta mkpali nke mụọ ahụ nke ga-eduru anyị lọta ebe obibi anyị nke igwe.

Nke atọ, Anyị Nwere ike Cheta Ikpe ekpere Mgbe nile

Anyị bi n’oge mgbe otu aka ị kpasara ịhe mọbụ otu okwu iwu ikwuru, anyị ebido chọtawa azịza maka isiokwu ọbụla dị nime ọtụtụ data nke echekwara ma hazie nime ọtụtụ komputa ejikọtara ọnụ.

N’otu aka ọzọ, anyị nwere ụzọ dị mfe nke eji achọta ọtụtụ aziza si n’igwe. “Kpe ekpere oge nile ma A ga m awụkwasị Mụọ n’ime unu.” “Mgbe ahụ ka Onyenwe kwere nkwa, “Ma ngọzi gị nile ga-adị ukwuu—e, ọbụna karịa ma ọbụrụ na inweta akụ nile nke ụwa.”4

Chineke mazuru nke ọma maka onye ọbụla nime anyị ma ọ dị njikere ị gee ntị nye ekpere nile anyị. Mgbe anyị chetara ịkpe ekpere, anyị ga-ahụta ịhụnanya Ya nke na-akwado anyị, ma dịka anyị n’aga n’ihu n’ekpe ekpere ruo ntị Nna nke Igwe site n’aha nke Kraịst, dịka anyị n’aga nihu n’ewebata Onye nzọpụta nime ndụ anyị, mgbe ahụ k’anyị ga akọta ụzọ ahụ Ọ tinyere akárá ya nke anyị ji alọta ebe obibi anyị nke igwe.

Nke anọ, Anyị Nwere Ike Ịcheta Ijere Ndị ọzọ Ozi

Dịka anyị n’agba mbọ ịsoro Jizọs Kraịst site n’ije ozi ma ịgosi ha obi ebere, anyị n’eme ụwa ka ọ bụrụ ebe dị mma karịa.

Ịhe nile anyị neme nwere ike n’ụzọ dị nnukwu gozie ndụ ndị ahụ gbara anyị gburugburu ma ndụ nke anyị kwa. Ije-ozi n’ịhụnanya n’ewetere nkọwa nye ndụ onye n’enye enye na onye na-anata anata.

Eledakwala anya onyinye ahụ ị nwere iji nwe mmetụta dị mma na ndụ ndị ọzọ, site n’ije ozi nke ịhe ndị ị neme ma site n’ije ozi nke ọmụmatụ.

Ijere ndị ọzọ ozi n’ịhụnanya n’eduru anyị jee n’ụzọ ahụ eji alaghachi ebe ebibi anyị nke igwe—ụzọ ahụ maka ịdị ka Onye nzọpụta anyị.

N’afọ 1975, nihi agha nke obodo lụkọrịtara n’onwe ha, Arnaldo na Eugenia Teles Grilo na ụmụ ha hapụrụ ụlọ ha na akụnụba nile ha kpakọrọ kamgbe ọtụtụ afọ site n’ịrụ si ọrụ ike. N’obodo ha Portugal, Nwanne nwoke na nwanne-nwanyị Teles Grilo gabigara nsogbu nke ibidogharị n’isi ọzọ. Mana ka ọtụtụ afọ gasịrị, mgbe ha banyere Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndi-nsọ Ụbọchi-ikpeazu ha kwuru, “ịhe anyị nile nwere funagharịrị anyị, mana ọ bụ ịhe ọma nihi ọ mere anyị echebara echiche maka mkpa dị nime ngọzị nke ebighi ebi.”5

Ebe obibi ha nke ụwa funagharịrị ha, mana ha chọpụtara ụzọ ha ji alaghachi ebe obibi ha nke igwe.

Nagbanyeghị ịhe ọbụla ịtọgbọrọ n’azụ maka isoro ụzọ nlaghachi ebe obibi nke igwe anyị, otu ụbọchị ọ g’adị dịka enweghi ịhe itufuru.

Omụmatụ zuru oké nke Jizọs Kraịst k’anyị nwere isoro, ma njem nlaghachi ebe obibi anyị nke igwe ga-ekwe omume nihi nkuzi Ya nile, ndụ Ya, ma aja mgbaghara Ya—tinyekwara ọnwụ ma Mbilite Nọnwụ Ya dị ebube.

A nam akpọku unu ka unu nwete nhụmihe ọñụ nke ịcheta n’anyị bụ ụmụ nke Chineke, ma na Ọ hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke mere O jiri zite Ọkpara Ya6ka o gosi ụzọ ahụ. A na m akpoku unu ka unu cheta ị kwesike, ịchigharị ndụ unu n’ebe Onye nzọpụta nọ, ma wuo isi nkume unu n’elu Ya. Chetakwa ị nọ n’ekpere oge nile mgbe ị nọ na njem gị, ma jeere ndị ọzọ ozi mgbe ị nọ n’ụzọ ahụ.

Ezi ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, na Sọnde Ista nke a, a na m agba ama na Jizọs Kraịst bụ Onye mgbapụta na Onye nzọpụta ahụ nke ụwa. Ọ bụ Ya na-akpọbata anyị na tebụlụ nke ndụ añụrị ahụ ma duru anyị nime nkem anyị ahụ. Kanyị cheta ma soro Ya ruo ebe obibi. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen

Hụba-ama

  1. Arthur Davis Hasler, in Gene E. Likens, “Arthur Davis Hasler: January 5, 1908–March 23, 2001,” in National Academy of Sciences, Biographical Memoirs, vol. 82 (2003), 174–75.

  2. See Book of Mormon Student Manual (2009), 268–73.

  3. Lee Hilaman 5:6–12.

  4. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 19:38

  5. See Don L. Searle, “Discovering Gospel Riches in Portugal,” Ensign, Oct. 1987, 15.

  6. Lee Jọn 3:16