Ọgbakọ Zuru ọha
Unu Ga-enwere Onwe Unu
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2021


Unu Ga-enwere Onwe Unu

Jizọs Kraịst bụ ihe ahụ anyị ga-ejigide ọbụna n’oge ihe isi ike nke ndụ anụ ahụ anyị.

Ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị m hụrụ naanya, obi m juru n’ekele maka ohere ọma m nwere iji gwa unu okwu site na Afrịịka. Ọ bụ ihe ngọzi inwe teknụzụ taa na iji ya rụọ ọrụ n’ụzọ kachasị mma iji rute unu ebe ọbụla unu nọ.

Na Septemba 2019, Mụ na Nwanne nwanyị Mutombo, mgbe anyị na-eje ozi dị ka ndị ndu nke Maryland Baltimore Mishọn, nwere ohere ọma ị ga-leta ụfọdụ ebe ndị a rụrụ ihe agụgụala Nzukọ nsọ na Palmyra, New York, oge anyị na-aga ọgbakọ ọmụmụ ihe nke ndị ndu mishọn. Nleta anyị bịara na ngwụcha n’ime Ọdọ osisi Dị nsọ. Nzube anyị na ịga leta Ọdọ osisi Dị nsọ ahụ abụghị maka inweta ngosi pụrụ iche ma ọbụ ọhụ, kama anyị nwetara mmetụta na Chineke nọ n’ebe ahụ dị nsọ. Mkpụrụ obi anyị jupụtara n’ekele maka Onye amụma Josef Smith.

Mgbe anyị na-ala, Nwanne nwanyị Mutombo hụtara na m na-achị ezigbo ọchị ebe m na-anya ụgbọala, ya mere ọ jụrụ, “Gịnị bụ isi obi ụtọ gị?”

A zara m, “Ọ dị m n’obi Nathalie, eziokwu ga na-emeri okwu asị mgbe niile, ma ọchịchịrị agaghị aganiihu n’ụwa niihi ozi ọma nke Jizọs Kraịst eweghachitere.”

Chineke Nna na Jizọs Kraịst letara Josef Smith dị nta ime ka ihe e zoro ezo pụta ihe ka anyị nwee ike nweta “ọmụmaihe nke ihe niile dị ka ha dị, …dị ka ha dịbuuru, na dị ka ha [ga-adị]” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 93:24).

Mgbe ihe dị ka 200 afọ abụọ gasịrị, ọtụtụ ka na-achọ eziokwu ndị a chọrọ iji nwere onwe site n’ụfọdụ omenaala na asịrị ndị nke onye iro na-agbasa na gburugburu ụwa niile. Ọtụtụ kpuru “isi site na aghụghọ a kpachapụrụ anya nke ụmụ mmadụ” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 123:12). Na-akwụkwọ ozi o degaara ndị Efesọs, Pọl kuziri: “Kulie gị onye nọ na-ụra, ma si na ndị nwụrụ anwụ bilie, Kraịst ga-enye gị ihe” (ndị Efesọs 5:14). Onye Nzọpụta kwere nkwa na Ya ga-abụ ihe nye ndị niile na-anụ okwu Ya (lee 2 Nifaị 10:14).

Iri afọ atọ na ise gara aga, nne na nna m kpukwararịị isi ma na-achọsi ike ịmata eziokwu ma ha nwere ọnụnụ ọkụ n’obi banyere ebe ha ga-elenye anya ịchọta ya. Nne na nna m bụ ndị a mụrụ n’ime obodo, ebe omenaala niile gbara mgbọrọgwụ n’ime ndụ ndị mmadụ na nke ndị ezi na ụlọ. Ha abụọ hapụrụ obodo ha mgbe ha dị nta ma bịa n’obodo mepere emepe, ịchọ ọdịmma nke ndụ.

Ha lụrụ ma malite ezi na ụlọ ha n’ụzọ aka ruru. Anyị ruru ihe dị ka mmadụ asatọ nọ n’obere ụlọ—nne na nna m, mụ na ụmụnne m ndị nwanyị abụọ, na nwa dede m onye anyị na ya bibuuru. A naara m eche ma anyị bụrịị ezigbo ezi na ụlọ, ebe anyị na-anaghị enweta nkwado iri nri anyasị n’otu tebụụlụ ahụ anyị na ndị nne na nna anyị. Mgbe nna anyị lọtara ọrụ, ozugbo ọ batara n’ụlọ, a na-asị anyị pụọ ma gaa n’ezi. Abalị anyị na-adị mkpụmkpụ, ebe anyị na-enweghị ike ịrahụ ụra n’ihi enweghị otu obi na ezi ịhụnaanya dị na alụm di na nwunye nke nne na nna anyị. Ebe obibi anyị abụghị naanị na ọ dị ntakịrị, kama ọ bụ ebe gbara ọchịchịrị. Tupu ezute ndị mgbasa ozi ọma, anyị naara aga nzukọ nsọ dị iche iche Sọnde niile. O doro anya na nne na nna anyị na-achọ ihe ụwa na-enweghị ike iweta.

Nke a garaniihu tutu anyị ezute Okenye na Nwanne nwanyị Hutchings, ndị di na nwunye ndị mgbasa ozi ọma nnukwu nke mbụ a kpọrọ oku ije ozi na Zaire (a maara taa dị ka DR of Congo ma ọbụ Congo-Kinshasa). Mgbe anyị malitere izute ndị mgbasa ozi ọma ndị a dị egwu, ndị dị ka ndị mmụọ ozi sitere n’aka Chineke bịa, a hụtara m na ihe bidoro ịgbanwe n’ime ezi na ụlọ anyị. Mgbe anyị mesịrị baptizim, anyị malitere na-ezia ịganiihu inwe akparamagwa ọhụụ niihi ozi ọma eweghachitere. Okwu nke Kraịst ewee malite ibuwanye mkpụrụ obi anyị. Ha malitere inye amamiihe na nghọta anyị ihe ma tọọ anyị ezigbo ụtọ, ebe ọ bụ na eziokwu ndị anyị natara ka a pụrụ ịhụ anya ma anyị pụrụ ịhụ ihe ahụ, ma ihe nke a garaniihu na-amụke amụke kwa ụbọchị.

Nghọta nke a nke gịnị mere nke ozi ọma naara enyere anyị aka ịdịkarị ka Onye Nzọpụta. Oke ụlọ anyị ha agbanweghị; na abụghị ma ọnọdụ otu anyị ha n’obodo ọ gbanwere. Kama a hụtara m mgbanwe nke obi niime nne na nna m ka anyị na-ekpe ekpere kwa ụbọchị, ụtụtụ na mgbede. Anyị mụrụ Akwụkwọ nke Mọmọn; anyị mere nnọkọ mgbede n’ebe obibi ezi na ụlọ; anyị ghọrọ ezi na ụlọ na-ezia. Sọnde niile anyị na-eteta na 6:00 a.m. iji kwadoo ịga nzukọ nsọ, ma anyị ga-eme njem ọtụtụ awa ịga ọgbakọ Nzukọ nsọ izu ụka niile na-emeghị mkpesa. Ọ bụ nhụmiihe dị egwu ịhụta. Anyị, ndị nabuuru eje ije na ọchịchịrị, chụpụrụ ọchịchịrị site n’etiti anyị (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 50:25) ma hụta “ihe dị ukwuu” (2 Nifaị 19:2).

E chetara m otu ụbọchị mgbe m na-adịghị na njikere iteta ọsịsọ na ụtụtụ maka ekpere ezi na ụlọ anyị, a tamuru m ntamu nye ụmụnne m ndị nwanyị, “Na-ezia onweghị ihe ọzọ anyị pụrụ ime n’ebe obibi nke a, naanị ekpere, ekpere, ekpere.” Nna m nụrụ ihe ndị m kwuru E chetara m otu o siri kpaa agwa ebe o jiri ịhụnaanya mana kwụsie ike kụziere m ihe, “Ebe ọ bụ na ị ga-anọ n’ụlọ nke a, ị ga-ekpe ekpere, kpee ekpere, kpee ekpere.”

Okwu nke nna m dara ụda na ntị m ụbọchị niile. Gịnị ka I chere na mụ na Nwanne nwanyị Mutombo na ụmụntakịrị anyị na-eme taa? Anyị na-ekpe ekpere, ekpe ekpere, ma na-ekpe ekpere. Nke a bụ ihe si n’aka ndị nna nna ochie anyị feere anyị.

Nwoke ahụ kpuru isi site n’afọ nne ya ma nweta ọgwụgwọ site n’aka Jizọs Kraịst, mgbe ndị agbataobi ya na ndị Farisii majachara ya, sịrị:

“Otu nwoke a kpọrọ Jizọs mere ụrọ, ma tee ya na anya m, ma sị m, gaa na ọdọ mmiri nke Saịlom, saa ahụ: e jere m saa ahụ, ma a hụrụ m ụzọ. …

“… Otu ihe [nke] m maara [bụ] na, … ebe m kpuru m isi, ugbu a e [nwere m ike] ịhụ ụzọ” (Jọn 9:11, 25).

Anyị onwe anyị kpukwararịị isi ma anyị nwere ike ịhụ ụzọ ugbu a. Ozi ọma eweghachitere enyerewo ezi na ụlọ anyị aka kemgbe ahụ. Ịghọta gịnị mere ahụ nke ozi ọma a gọziwo ndudugandu nke ezi na ụlọ m atọ ma ga-aganiihu ị gọzi ọtụtụ ndudugandu ga-abịa.

Jizọs Kraịst bụ ihe ahụ na-amụke n’ime ọchịchịrị. Ndị nke na-eso Ya “agaghị eje ije na-ọchịchịrị, kama ga-enwe ihe nke ndụ” (Jọn 8:12).

Kemgbe ihe ruru otu afọ, na-agbata 2016 na 2017, ndị mmadụ nọ na mpaghara Kasai zutere ihe ọdachi dị egwu. Ọ bụụrụ oge oke ihe isi ike nye ndị mmadụ niihi ndọkọrịta dị n’etiti otu ọdịnaala nke ndị dike n’agha na ndị agha nke gọọvment. Ọgbaaghara ahụ gbasara site na nnukwu obodo ndị nọ na-Akụkụ obodo Kasai Central ruo n’ebe kacha na mpaghara Kasai. Ọtụtụ mmadụ si n’ebe obibi ha rie mbọmbọ maka nchekwa wee zotuo niime ọhịa. Ha enweghị nri ma ọbụ mmiri ma ọbụ ihe ọbụla nnọọ, na-ezia, ma n’etiti ndị ahụ e nwere ndị otu Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a nọ na mpaghara Kananga. E gburu ụfọdụ ndị otu Nzukọ nsọ site n’aka ndị agha ọha na eze.

Nwanne nwoke Honoré Mulumba onye Ngalaba ukwu Nganza nọ na Kananga na ezi na ụlọ ya socha n’ụfọdụ mmadụ ole ma ole ndị nọdụrụ ma zotuo niime ụlọ ha, na-amaghị ebe ha ga-aga niihi na atụgharịrị okporo ụzọ nille ha a ghọọ ebe a na-akwa mgbọ. Otu ụbọchị ụfọdụ ndịikom ndị agha ọha na eze na gburugburu ebe ha bi hụtara na Nwanne nwoke Mulumba na ezi na ụlọ ya dị ka n’otu mgbede ha pụrụ gawa ịchọ akwụkwọ nri ha ga-eri n’ubi ezi na ụlọ. Otu otu ndị agha ọha na eze bịara n’ebe obibi ha ma dọpụta ha ma sị ha họrọ ịdị na-ekwenye n’ụzọ ndị agha ọha na eze si na-eme ihe ma ọbụ a ga-egbu ha.

Nwanne nwoke Mulumba kasiri obi gwa ha, “A bụ onye otu Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazu a. Mụ na ezi na ụlọ m anabatawo Jizọs Kraịst ma nwee okwukwe na Ya. Anyị ga-anọgide n’okwukwe nye ọgbụgba ndụ anyị ma ga-anabata ịnwụ.”

Ha gwara ha, “Dị ka unu siri họrọ jizọs Kraịst, nkịta ga-eri ahụ unu,” ma ha kwere nkwa ịbịaghachi. Mana ha enwetụghị mgbe ha bịaghachiri, ma ezi na ụlọ ahụ nọgidere ebe ahụ ruo ọnwa abụọ ma onwetụghị mgbe ha hụrụ ha ọzọ. Nwanne nwoke Mulumba na ezi na ụlọ ya dotere tọọchị nke okwukwe ha ya a na-enwu. Ha chetara ọgbụgba ndụ ha ma e chekwara ha.

Jizọs Kraịst bụ ihe ahụ anyị ga-ejigide ọbụna n’oge ihe isi ike nke ndụ anụ ahụ anyị (lee 3 Nifaị 18:24). Mgbe anyị họọrọ i soro Kraịst, anyị họọrọ ị bụ ndị a gbanwere agbanwe Nwoke ma ọbụ nwanyị a gbanwere maka Kraịst ka Kraịst ga-abụ onyeisi agha ya, ma anyị ga na-ajụ, dị ka Pọl mere, “Onyenwe anyị, gịnị ka ị ga-achọ ka m mee?” (Ọlụ 9:6). Anyị “ga-agbaso nzọ ụkwụ ya” (1 Pita 2:21). Anyị “ga-eje ije, ọbụna dị ka o siri jee ije” (1 Jọn 2:6). (Lee Ezra Taft Benson, “Onye Chineke Mụrụ,” Tambuli, Ọkt. 1989, 2, 6.)

A na m agba ama banyere Ya onye nke nwụrụ anwụ, e lie ya, ma site n’ọnwụ bilie ọzọ n’ụbọchị nke atọ ma lagoro n’eluigwe nke ọ ga-abụ na mụ na gị ga-anata ngọzi nke anwụghị anwụ na mbuli elu. Ọ bụ “ihe ahụ, … ndụ ahụ, na eziokwu ahụ” (Ita 4:12). Ọ bụ ajụ ọgwụ na omeire nye mgbagwoju anya nke ụwa. Ọ bụ ọkọlọtọ dị oke mma maka mbuli elu ọbụna Jizọs Kraịst. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen.