Ọgbakọ Zuru ọha
Nkọwa nke ndị Ngalaba Nnyocha nke Nzukọ-nsọ, 2019
Ọgbakọ Zuru-ọha Eprel 2020


Nkọwa nke ndị Ngalaba Nnyocha nke Nzukọ-nsọ, 2019

Maka ndị Otu Ndi-isi-nduzi Mbụ nke Nzukọ nke Jisọs Kraịst nke Ndi-nsọ Ụbọchi-ikpeazu a

Ụmụnne ndị Nwoke: Dịka mkpughe sịrị dị, dịka e dere nime nkeji 120 nke Ozizi na Ọgbụgbandụ niles, Òtù Kansụl maka Imefu Otu-ụzọ n’ụzọ iri nile—nke ndị mejupụtara ya bụ Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ, ndị Kworum nke Ndị Ozi Iri Na Abụọ, na nke Ndị Ọchịchị Ụkọchukwụ—bụ ndị enyere ikike ịmefu ego nile nke Nzukọ-nsọ. Ngalaba Nzụkọ-nsọ nile, n’emefu ego nile dịka atụmatụ akwadoro maka mkpata na mmefu siri dị, dịkakwa otu iwu na usoro nile akwadoro sịrị dị.

Ngalaba Nnyocha Nzukọ-nsọ, nke ndị nọ n’ime ya bụ ndị ọka-mmụta ịhe gbasara ego, ma ha enweghi ngalaba ọzọ nke Nzụkọ-nsọ nke ha nọ na okpuru ya, ha nwere oke-n’ọrụ ị mee nnyocha maka ị doo onye ọbụla anya gbasara ego niile e nwetara, mmefu nile e mere, makwa nchekwa akụ-n’ụba niile nke Nzụkọ-nsọ.

N’ihi nnyocha niile e mere, Ngalaba Nnyocha Nzukọ-nsọ kwekọtara na dịka ịhe niile sịrị dị, ego nile a natara, mmefu niile e mere, ma akụ-n’ụba niile nke Nzụkọ-nsọ nke afọ 2019 ka edeworo ma mezuo dịka atụmatụ nke Nzukọ-nsọ kwadoro maka mkpata na mmefu siri dị, iwu na usoro niile sịrị dị. Nzukọ-nsọ nke-a, n’esorokwa nkuzi nile nke ha n’akụziri ndi otu ya maka ibi ndu dịka otu akpa-ego ha ha, hapụ iji ụgwọ, na n’edebe ego maka oge ọ gadị mkpa.

N’obi nsọpụrụ k’anyị na enyefe ndekọta nke-a.

Ngalaba Nnyocha nke Nzukọ-nsọ

Kevin R. Jergensen

Onye Isi Nhazi