Ọgbakọ Zuru ọha
Ike nke Akwụkwọ nke Mọmọn maka Mgbanwe
Ọgbakọ Zuru-ọha Eprel 2020


Ike nke Akwụkwọ nke Mọmọn maka Mgbanwe

Akwụkwọ nke Mọmọn n’ewete ihe oriri nke ime mmụọ, n’enye atụmatụ nke ime ihe, ma n’ejikọ anyị na Mmụọ Nsọ.

Dịka m gụgharịchara nnyocha sitere na ule ahụ emere na nso nso a, a matara m na kwesịrị ime mgbanwe na ụdị ndụ m n’ebi. Inyere m aka, dọkịnta m dere atụmatụ nri na mgbatị ahụ, nke, ọ bụrụ na m họrọ isoro ya, ga-agbanwe m ịbụ onye nwere ezi ahụike.

Ọ bụrụ na onye ọbụla n’ime anyị lee onwe anyị ule nke ime mmụọ, kedụ ihe anyị nwere ike ịmụta banyere onwe anyị? Olee mgbanwe ndị dibịa ime mmụọ anyị ga-ede? Anyị ị bụrụzi onye anyị kwesịrị ịbụ, ọ dị oke mkpa na anyị maara ihe anyị ga-eme ma mee ihe anyị maara.

Jizọs Kraịst bụ Nnukwu Onye Ọgwọọ Ọrịa.1 Site na Aja mgbaghara Mmehie Ya, Ọ na-arachị ọnya anyị, wekwasị n’Onwe Ya adịghị ike anyị niile, ma gwọọ obi anyị gbawara agbawa.2 Site na amara Ya adịghị ike anyị nwere ike sie ike.3 Ọ na-akpọku anyị isoro Ya4 site n’ịmụta banyere Ya, gee ntị n’okwu Ya, na ịga ije n’umeala nke Mmụọ ya.5 O kwewo nkwa ị nyere anyị aka6 n’usoro mgbanwe nkea dị ogologo na ndụ, nke n’agbanwe anyị ma wetere anyị ọńụ mgbe niile na adịgide.7

Onye Nzọpụta enyewo anyị Akwụkwọ nke Mọmọn dịka ngwa ọrụ dị ike inye aka na mgbanwe. Akwụkwọ nke Mọmọn n’ewete ihe oriri nke ime mmụọ, n’enye atụmatụ nke ime ihe, ma n’ejikọ anyị na Mmụọ Nsọ. E dere n’ihi anyị,8 o nwere okwu Chineke n’ime ya9 n’ụzọ dị mfe nghọta10ma na-agwa anyị maka njirimara anyị, ebumnuche, na akaraka anyị.10 Tinyekọta Baịbụlụ, Akwụkwọ nke Mọmọn na-agba ama nke Jizọs Kraịst11 ma na-akuzi otu anyị nwere ike isi mara eziokwu ma dịrịzie dịka Ya.

Foto, oyiyi
Nwanne nwoke Saw Polo

Nwanne nwoke Saw Polo gbara afọ 58 mgbe e mere ya amata oziọma nke Jizọs Kraịst eweghachitere. Mgbe m zutere ya, ọ naara eje ozi dịka onyeisi ngalaba nta ọtụtụ afọ, mana a matara m na ọ gụbeghị Akwụkwọ nke Mọmọn ma ọlị n’ihi ọ nọghị n’asụsụ Burmese nke obodo ya. Mgbe m jụrụ ya otu o si mara na akwụkwọ ahụ bụ eziokwu ebe ọ gụbeghị ya, ọ zaghachịrị na ya a mụọla akwụkwọ foto Akụkọ Akwụkwọ nke Mọmọn ụbọchị niile site na ile ngosipụta niile ahụ, n’eji akwụkwọ nkọwa n’atụgharị okwu Bekee niile, na ịkpachapụ anya n’edepụta ihe niile ọ mụtaworo. Ọ kọwara, “Oge niile m mụrụ ihe, a ga m ekpe ekpere banyere ihe m mụtaworo, ma a ga m enwete udo na ọńụ, uche m ga-adị ọcha, ma obi m ga-adị nro E nwetere m mmetụta nke Mmụọ Nsọ na-agbara m ama na ọ bụ eziokwu. A ma m na Akwụkwọ nke Mọmọn bụ okwu nke Chineke.”

Dịka Nwanne nwoke Saw Polo, onye ọbụla n’ime anyị nwere ike mụọ Akwụkwọ nke Mọmọn dịka otu ọnọdụ anyị si dị. Dịka anyị na-achọ ikwere ma tulee nkuzi ya niile n’ime obi anyị, anyị nwere ike jiri okwukwe jụọ Chineke ma nkuzi niile ahụ ọ bụ eziokwu.12 Ọ bụrụ na ọchịchọ anyị ziri ezi ịmata ma nwee ezi uche ime ihe, Ọ ga-aza anyị n’ime obi anyị site na Mmụọ Nsọ. Ọ bụ site nʼike nke Mụọ Nsọ unu ga-enwe ike mata ezi-okwu nke ihe niile.13 Mgbe anyị nwetere akaebe si n’igwe nke Akwụkwọ nke Mọmọn, anyị ga-amatakwa site n’otu ike ahụ na Jizọs Kraịst bụ Onye Nzọpụta nke ụwa, na Josef Smit bụ onye amụma Ya, ma na Nzukọ Nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndi-nsọ Ụbọchi-ikpeazu a bụ Nzukọ nsọ Ya eweghachitere.14

Dịka nwokoroọbịa nta bidoro ije ozi mgbasa oziọma, a banyere m ụgbọelu gawara Australia. Mgbe ọ metutaram na m nọ nanị m, nwee obi erughị ala, na etozughị etozu, mana ebe mụ ekpebiwo ije ozi, a chọsiri m ike mmesigharị obi ike na ihe m kwere na ya bụ eziokwu. E kpere m ekpere ma gụọ akwụkwọ nsọ m nke ọma, ma dịka ụgbọ elu ahụ gara n’ihu, obi abụọ nke onwe gbalitere ma ọnọdụ ahụ m bịara dị njọ. Mgbe m gbachara mbọ ruo ọtụtụ awa, otu onye ọrụ nlekọta dị n’ụgbọ elu gbadatara n’ụzọ ahụ ma kwụsị n’akụkụ oche m. O napụrụ m Akwụkwọ nke Mọmọn m nọọrọ na-agụ n’aka m. O lere ihu akwụkwọ a ma kwuo, “Nkea bụ ezigbo akwụkwọ!” mgbe ahụ o nyeghachịrị m akwụkwọ ahụ azụ ma gara pụọ. A hụghị m ya ọzọ.

Dịka okwu ya na-adagharị n’ime ntị m, n’ụzọ dị iche a nụrụ ma nwee mmetụta n’ime obi m, “A nọ m ebe a, ma a maara m ebe ị nọ. Nanị mee ihe i nwere ike ime, n’ihi a ga M emezi ndị ọzọ fọrọ.” N’ime ụgbọelu ahụ dị n’elu Oke osimiri Pasifik, a natara m akaebe nke onwe site na mmụta nke Akwụkwọ nke Mọmọn na mkpalite nke Mmụọ Nsọ na Onye Nzọpụta m maara onye m bụ ma na oziọma ahụ bụ eziokwu.

Okenye David A. Bednar kuziri: “Ịmara na oziọma ahụ bụ eziokwu bụ ihe kachasị mkpa nke ịgba-ama. Ịnọgide ibi ezi ndụ nke oziọma bụ ihe kachasị mkpa nke mgbanwe.”15 Mgbanwe na-achọ ka anyị bụrụ “ndị na-eme ihe ekwuru, na-abụghị nanị ndị na-anụ anụ.”16 Atụmatụ ime ihe nke Onyenwe anyị maka anyị—ozizi nke Kraịst—ka akuziri nke ọma n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn.17 Ọ gụnyere:

  • Na mbụ, inye okwukwe n’ime Jizọs Kraịst site n’ịtụkwasị obi na Ya, idebe iwu nsọ Ya niile, na ịmara na Ọ ga-enyere anyị aka.18

  • Nke abụọ, ichegharị kwa ụbọchị maka njehie anyị niile na ịnwete udo na ọńụ mgbe Ọ gbagharaworo anyị.19 Nchegharị na-achọ ka anyị gbaghara ndị ọzọ20 ma ọ na enyere anyị aka ịga n’ihu. Onye Nzọpụta ekwewo nkwa ịgbaghara anyị mgbe na mgbe dịka anyị chegharịrị.21

  • Nke atọ, ịme na ịdebe ọgbụgba ndụ niile anyị na Chineke mere site na emume nsọ dịka baptizm. Nkea ga edebe anyị n’ụzọ nke ọgbụgba ndụ nke n’eduba anyị na Ya.22

  • Nke anọ, ịnata onyinye nke Mmụọ Nsọ. Onyinye nkea n’enye anyị ohere ịnwegide nsiso nke onye nke na-asacha, na-akasị obi, ma na-edu anyị.23

  • Nke ise, ịnọgide ruo ọgwụgwụ site n’ịga n’ihu n’okwukwe dịka anyị na-anọgide kwa ụbọchị n’okwu nke Kraịst.24 Site n’ịgụ Akwụkwọ nke Mọmọn na ịnọgidesike na nkuzi ya niile, anyị nwere ike merie ọnwụnwa niile ma nata odudu na nchekwa n’ime ndụ anyị niile.25

Ị na-etinye mgbe niile ozizi nke Kraịst nime ndụ anyị, anyị ga-emeri agbanweghị agbanwe nke na-emegide mgbanwe na ụjọ nke na-emegide ime ihe. Anyị ga-anata mkpughe nke onwe, n’ihi na Mmụọ Nsọ “ga egosi gị ihe niile ị kwesịrị ime,”26 na “okwu niile nke Kraịst ga agwa gị ihe niile nke ị kwesịrị ime.”27

Kamgbe afọ 20, Nwanne nwoke Huang Juncong nwere nsogbu ịhapụ mmanya ọkụ, siga, na ịgba chaa chaa. Mgbe agwara ya maka Jizọs Kraịst na oziọma Ya eweghachitere, Nwanne nwoke Huang enwee mmasị ịgbanwe n’ihi ezi na ụlọ ya n’eto eto. Ihe kachasị raa ya ahụ bụụrụ ise siga. Onye oke ọsee siga, ọ gbalịworịị ịkwụsị ọtụtụ mgbe ma o nweghị ike. Otu ụbọchị, okwu ndịa sitere na Akwụkwọ nke Mọmọn banyere n’ime uche ya: “jiri obi dị eziokwu, nwere ezi ebumnuche.”28 N’agbanyeghị na mgbalị ndị gara aga dara ada, ọ chere elemanya na ya nwere ike gbanwe site na enyem aka si na Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst.

Ndị mgbasa ozi ọma n’uju ya tinyekọtara okwukwe ha na nke ya ma wete atụmatụ ịme ihe nke ihe ndị dị irè, ya na nnukwu ekpere na ọmụmụ nke okwu Chineke. Nihi o jiri eziokwu na ezigbo ebumnuche, Nwanne nwoke Huang jiri mkpebi jupụtara n’okwukwe mee ihe ma chọpụta na dịka o lekwasịrị anya karịa n’elu agwa ọhụrụ ndị masịrị ya inwete, dịka ịmụta Akwụkwọ nke Mọmọn, o belatara uche ya na agwa ndị ọ chọrọ ịhapụ.

N’icheta nhụmihe ya sitere n’afọ 15 gara aga, o kwuru, “A naghị m echete mgbe m kwụsịrị kpam kpam ise siga, mana dịka m gbalịsịrị ike ụbọchị niile ime ihe ndị m maara na m kwesịrị ime ịkpọbata Mmụọ nke Onyenwe anyị n’ime ndụ m ma gaa n’ihu na-eme ha, e nweteghị kwa m mmasị ise siga ma emebeghị m kemgbe ahụ.” Site n’itinye nkuzi niile nke Akwụkwọ nke Mọmọn, ndụ, Nwanne nwoke Huang agbanwewo, ma ọ bụrụziwo ezi di na nna karịa.

Foto, oyiyi
Huang Juncong na ezi na ụlọ

Onyeisi Russell M. Nelson ekwewo nkwa: “Dịka ị n’eji ekpere amụ Akwụkwọ nke Mọmọn ụbọchị niile, ị ga-eme mkpebi ndị ka mma karịa—ụbọchị niile. A na m ekwe nkwa na dịka ị na atule ihe ị mụrụ, windo nke eluigwe ga-emepe, ma ị ga-anata azịza nye ajụjụ nke onwe gị niile na ntuzi aka maka ndụ nke gị. A na m ekwe nkwa na dịka ị n’emikpu onwe gị n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn, i nwere ike nwete mgbochị megide ihe ọjọọ niile nke ụbọchị a, ọbụna ọrịa mkpochapụ nke ile ndị gba ọtọ na ihe mmara ahụ ndị ọzọ.”29

Ezi ndị enyi, Akwụkwọ nke Mọmọn ahụ bụ okwu nke Chineke, ma anyị ga-abịakwute Ya nso m’ọbụrụ na anyị mụọ ya.30 Dịka anyị n’etinye okwu ya niile n’ọrụ, anyị ga-enwete akaebe nke eziokwu ya.31 Dịka anyị n’ebigide ndụ n’ụzọ nke nkuzi ya niile, anyị agaghị enwekwa mmasị ime ihe ọjọọ.32 Obi anyị, mbara ihu, na ọdịdị ga-agbanwe33ịbụrụzi karịa dịka Onye Nzọpụta ahụ. A na m ekwupụta akaebe m na Jizọs bụ Kraịst ahụ, Onye Nzọpụta anyị, Onye Mgbapụta anyị, na Enyi anyị. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen