Ọgbakọ Zuru ọha
Hosanna na Hallelujah—Jizọs Kraịst Ahụ Dị Ndụ: Onye Nọ N’etiti nke Mweghachite na Ista.
Ọgbakọ Zuru-ọha Eprel 2020


Hosanna na Hallelujah—Jizọs Kraịst Ahụ Dị Ndụ: Onye Nọ N’etiti nke Mweghachite na Ista.

N’oge nke hossanna na hallelujah nke-a, bụọ hallelujah—nihi Ọ g’achị ruo ebighi ebi ma ebighi ebi!

Ezi Ụmụnne ndi Nwoke na ndi Nwanyị: anyị ji hosanna na hallelujah n’eme mmemme Jizọs Kraịst ahụ dị ndụ n’oge nke-a Mweghachite na Ista n’aga n’ihu. Ọnye Nwe-anyị jiri ịhụnanya tozuru oké kasie anyị obi: “ Site na m unu nwere ike inweta udo. Na ụwa unu ga enwe mkpagbu: ma na nwee nụ ańụrị; E-merie-la m ụwa”1

Ụfọdụ afọ gara, Nwanne-nwanyị Gong na Mụ zutere otu ezinụlọ ọma, nwa ha nwanyị Ivy jiri ihere wepụta igbe ụbọ-violin ya. Ọ weliri mkpịsị ọkpọ violin ya, machie ya ma tinye rosin n’elu ya. Emesịa o tighachi mkpịsị ahụ nime igbe ya, kelee ekele ikpere ma nọdụ ọdụ. Dịka ọnye n’ebido ịhe ọhụrụ, ọ gosiwo ịhe nile ọ mụtaworo gbasara ụbọ-violin. Ugbua, mgbe ọtụtụ afọ gara, Ivy nazị akpọ ụbọ-violin nke ọma.

Foto, oyiyi
Ivy na ụbọ-violin ya.

N’oge ndụ anụ-arụ nke-a, anyị nile dị ntakịrị ka Ivy na ụbọ-violin ya. Anyị n’ebido na mbido. Ọ bụrụ n’anyị jiri mbọ n’akwụsịghị akwụsị, anyị g’eto ma dị mma. Dịka oge n’aga, ọhere nhọrọ na ahụmịhe nke ndụ anụ arụ a g’enyere anyị aka dịrị ka Onye Nzọpụta anyị karịa dịka anyị n’arụ ọrụ nime ubi-vine Ya2 ma soro ụzọ ọgbụgba ndụ Ya.

Mmemme ncheta nile, tinyere nke afọ narị abụọ nkea, n’egosipụta usoro nile nke mweghachite.3 Dịka anyị n’eme mmemme Mweghachite nke oziọma nke Jizọs Kraịst, anyị n’akwadokwa maka Ista. Nime ịhe abụọ a, anyị na-añụrị nime nlaghachi nke Jizọs Kraịst. Ọ dị ndụ—ọbụghị nanị mgbe ahụ, ma ugbua, ọbụghị nanị maka ụfọdụ, kama maka onye nile. Ọ bịara ma n’abịa ị gwọ ndi obi tiwara, ị gbapụta ndị eji-eji, ị mee ka ndị kpụrụ isi hụ ụzọ, ma tohapụ ndị ahụ bụ ndụ emerụrụ ahụ.4 Nkea bụ metụtara anyị nile. Nkwa mgbapụta Ya nile bụ nke enwere ike itinye na ndụ, nagbanyeghi ndụ anyị biri na mbụ, nke ugbua, mọbụ ịhe gbasara ọdịnịhu anyị.

Foto, oyiyi
Mbata mmeri nke Jizọs nime Jerusalem

Echi bụ Sọnde Igu Nkwụ Dịka ọmenala sịrị dị, igu nkwụ bụ akárá dị nsọ eji egosi ọñụ nime Ọnye Nwe-anyị, dịka nime mbata mmeri nke Jizọs nime Jerusalem, ebe “ọtụtụ ndị mmadụ … weere akala osisi nkwụ, ma jee izuta ya.”5 ( Ị nwere ike ịnwe mmasị ka ị mata maka maka ịhe osise nke mbụ ya nke Harry Anderson sere nke akụpagidere nime n’ụlọ-ọrụ Onyeisi Russell M. Nelson, nazụ tebụlụ ya.) Nime akwụkwọ mkpuhe, ndị ahụ n’eto Chineke na Nwa atụrụ otito n’eme nke ahụ “yiri uwe mwụda ọcha, ma jide igu nkwụ na aka ha.”6 Dịkakwa “uwe mwuda nke eziomume” ma “okpueze nke ebube,” igu nkwụ sonyekwara nime ekpere ido-nsọ nke Tempụl nke Kirtland.7

N’ezie, mkpa Sọnde Igu Nkwụ dị karịrị igwé mmadụ ijiri igu nkwụ kelee Jizọs. Na Sọnde Igu nkwụ, Jizọs batara Jerusalem n’ụzọ ndị kwere-ekwe matara dịka mmezu amụma. Dịka Zakarịya8 na Onye abụọma buru n’amụma, Ọnyenwe anyị batara Jerusalem wee na-anya nwa ịnyịnya dịka igwé mmadụ matara ma bee “Hosanna n’ebe kachasị elu.”9 Hosanna pụtara “zọpụta ugbua”10 Mgbe ahụ ma ugbua, anyị n’añụrị, “Ngọzị dịịrị onye ahụ n’abịa n’aha Ọnyenwe anyị.”11

Izu-ụka n’esochi Sọnde Igu nkwụ bụ Sọnde nke Ista. Onyeisi Russell M. Nelson n’akụzi na Jizọs Kraịst “bịara ị kwụ ụgwọ nke Ọ bụghị Ya metere, nihi anyị ji ụgwọ nke anyị agaghị akwụli.”12 N’ezie, site na Aja Mgbaghara mmehie nke Kraịst ụmụ nile nke Chineke, “ga-enweta nzọpụta, site na nrube isi nye iwu nile na emume-nsọ nile nke Ozi-ọma.”13 N’oge Ista, anyị n’abụ hallelujah. Hallelujah pụtara “toonụ Ọnye nwe Jehovah.”14 Kọrọsụ hallelujah ahụ dị nime abụ Messiah nke Handel dere bụ nkwupụta nke Ista na Ọ bụ “Eze ndị Eze, ma Onyenwe anyị ndị Onyenwe anyị nile.”15

Mmemme nsọ ahụ mere n’etiti Sọnde Igu nkwụ na Sọnde Ista bụ akụkọ maka hosanna na hallelujah. Hosanna bụ arịrịọ anyị ka Chineke zọpụta anyị. Hallelujah n’egosipụta otito anyị nye Ọnyenwe anyị maka olileanya nke nzọpụta na mbuli-elu. N’ime hosanna na hallelujah anyị na akọta Jizọs Kraịst ahụ dị ndụ dịka onye nọ n’etiti nke Ista na mweghachite nke ụbọchi ikpeazụ a.

Mweghachite nke ụbọchị-ikpeazụ a bidoro na ngosipụta Chineke Nna na Ọkpara Ya Jizọs Kraịst nye onye amụma nta ahu bụ Josef Smit. Ọnye amụma Joseph kwuru, “I nwee ike ị lee eluigwe anya ruo nkeji ise, ị ga-amata ịhe karịa otu ị mara karịa ị gụụ ịhe nile edeworo maka isiokwu ahụ.”16 Nihi eluigwe nile emehewo, anyị mara ma “kwere na Chineke, Nna mgbe Ebighi-ebi, na n’Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst, na Mụọ Nsọ”17Chukwu dị nsọ.

Na Sọnde Ista nke Eprel 3, 1836, n’ụbọchị mbido nke Mweghachite, Jizọs Kraịst ahụ dị ndụ bịara mgbe emesịrị mmemme ido Tempụl Kirtland nsọ. Ndị ahụ hụrụ Ya ebe ahụ gbara ama maka Ya site n’ijiri mkpụrụ okwu kọwara ịhe ndị dị iche iche, metụtara ọkụ na mmiri: “Anya ya abụọ dịka ire nke ọkụ; agịrị nke isi ya dị ọcha dịka ezi snow; mbara ihu ya na-enwu karịa mmụke nke anyanwụ; na olu ya dịka ụda nnukwu mmiri nile na-asọ-asọ, ọbụna olu ahụ nke Jehova.”18

N’oge mmemme ahụ, Onye Nzọpụta anyị kwupụtara, “A bụ m onye mbụ ahụ na onye ikpe azụ ahụ; a bụ m onye ahụ na-adị ndụ, a bụ m ya onye ahụ egburu egbu; a bụ m onye nkwuchita ọnụ unu n’ebe Nna nọ.”19 Ọzọkwa, okwu ndị n’akọwa ịhe ndị dị iche iche—ọnye mbụ na ikpeazụ, ọnye dị ndụ na onye egburu egbu. Ọ bụ Alpha na Omega, mbido na ngwụcha,20 onye bụụrụ onye-mbụ-wetara na onye mmecha nke okwukwe anyị.21

Na nsochi mpụta nke Jizọs Kraịst, Mosis, Elais, na Elaịja bịakwara. Site na ntuzi aka dị nsọ, ndị amụma ahụ dị ike nke mgbe ochie weghachitere ọtụghe-ụzọ nile na ikike nke ọkwa nchụaja. N’ihi nke-a, “ọtụghe-ụzọ nile nke ọgbọ nke a ka e nyefere”22 n’ime Nzukọ-nsọ Ya nke ewechitere maka ị gọzi ụmụ nile nke Chineke.

Ọbịbịa Elaịja nime Tempụl nke Kirtland mezukwara amụma ochie nke Malakaị buru na Elaịja ga-abịaghachi “tutu ọbịbịa nke nnukwu ụbọchị ahụ dị egwu nke Onyenwe anyị.”23 Site na ị mee nke-a, ọbịbịa Elaịja mere, n’ezie ọ mere mgbe a chọrọ ka ọ mee, n’oge ahụ ndị Juu n’eme mmemme Passover nke omenala ya bụ iji chere nlaghachi Elaịja.

Ọtụtụ ezinụlọ ndị Juu kwesịrị ike n’okwukwe n’edobere Elaịja oche n’ebe nri Passover ha. Ọtụtụ na-agbajuu iko ha n’ọnụ maka ikpoku ya ma ị nabata ya. Ma ụfọdụ, n’oge mmemme Passover Seder, n’ezipụ otu nwata n’ụzọ, nke ahapụtụrụ mgbe ufọdụ ka oghere ọnụ, maka ị lee ma Elaịja ọ nọ n’ezi n’eche ka akpọbata ya nime.24

N’imezu amụma, ma dịka otu akụkụ nime mweghachite ịhe nile ekwere na nkwa,25 Elaịja bịara dịka ekwere na nkwa, n’oge Ista ma na mbido Passover. Ọ wetere ikike nrachi maka ikekọta ezinụlọ n’ụwa ma na eluigwe. Dịka Moronaị kụziri Onye amụma Josef, Elaịja “ga-akụnye kwa n’ime obi nile nke ndị bụ ụmụ nkwa nile ahụ e kwere ndị bụ nna ha, na obi nile nke ndị bụ ụmụ ga-atụgharị kwute ndị bụ nna ha. Asị ma-ọbụghị ọtụ ahụ,” Moronaị kwuru, “ụwa nile ka a ga-ala n’iyi kpam kpam n’ọbịbịa [Onyenwe anyị].”26 Mụọ nke Elaịja, ịhe ngosipụta nke Mụọ Nsọ, na-adọta anyị nso ruo ndị ọgbọ anyị nile—ndị gara aga, ndị ugbua, ma ndị n’abịa abịa—nime ndekọta agbụrụ anyị, akụkọ nile ma ijeozi nke tempụl.

K’anyi nwere ntakịrị oge cheta ịhe Passover n’egosi. Passover n’echeta nnapụta ụmụ nke Izrel site na agbụ ọtụtụ afọ ruru 400 Akwụkwọ nke Ọpụpụ kọwara otu nnapụta nkea si bịa mgbe ajọọ-ahụhụ nke ọtụtụ awọ, akpị, ijiji, ọnwụ nke ọtụtụ ehi, otito, ọnya, ọkụ, ụkpara, ma oke ọchịchịrị. Ajọ-ahụhụ nke ikpeazụ bụ maka ọnwụ nwa mbụ nke ala ahụ, mana ọbụghị n’ụlọ Izrel m’ọbụrụ—m’ọbụrụ na ebe obibi ndịa ga-ete ọbara nwa atụrụ nke mbụ n’enweghi ntụkpọ n’elu ụzọ ha nile.27

Mụọ ozi nke ọnwụ ahụ gafere ụlọ nile akara ọbara nwa atụrụ ahụ.28 Ngafe ahụ nọchitere Jizọs Kraịst dịka otu o siri merie ọnwụ. N’ezie, ọbara mgbapụta nke Nwa Atụrụ nke Chineke nyere Onye Ọzụzụ atụrụ Ọma anyị ike iji kpọkọlata ndị Ya n’ebe nile ha nọ ma n’ọnodụ nile, wee bata nime nchekwa nke ya ma n’ebe ndị dị ndụ ma n’ebe ndị nwụrụ anwụ.

N’ụzọ dị mkpa, Akwụkwọ nke Mọmọn ahụ n’akọwa maka “ike na mbilite n’ọnwụ nke Kraịst”29—ịhe dị mkpa nime Ista—dịka mweghachite dị abụọ.

Nke mbụ, mbilite n’ọnwụ gụnyere mweghachite anụ arụ nke anyị “n’ezigbo ọnọdụ na okporo-arụ zuru oke29Ụkwụ na aka nile na njikọ ha” “ọbụna otu mkpụrụ agịrị-isi nke isi ahụ agaghị efu”30 Nkwa nkea n’enye olileanya maka ndị ahụ n’enweghi ụkwụ na aka, ndị ahụ n’enweghi ike ịhu ụzọ, nụ ntị, jee ije, m’ọbụ ndị echere na ọrịa ha eweghi ọgwụgwọ, ọrịa isi mgbaka, mọbụ ndị ọrịa wezugara ịdị-ike ha ndị ọzọ. O chọtara anyị. Ọ n’eme k’anyị zuo oké.

Nkwa nke abụọ Ista ahụ nakwa Aja Mgbaghara-mmehie nke Onye nwe bụ, na nime mmụọ, a“ga-eweghachi ihe nile n’ezigbo ọnọdụ ha.”31 Mweghachite nke ime mụọ ahụ, n’egosipịta ọrụ na ọchịchọ anyị nile Dịka achịcha n’elu mmiri,32 ọ n’eweghachi “nke ahụ dị nma” “ezi-omume” “ikpe ziri ezi” na “obi ebere”33 Ọ bụ ịhe kpatara Alma jiri kwuo maka mkpụrụ-okwu mweghachi ugboro 2234 dịka ọ na-agwa anyị k’anyị “meso n’ikpe ziri ezi, kpee ikpe n’ezi-omume, ma mee ihe ọma esepụghị aka.”35

Nihi “Chineke n’onwe ya na-achụ aja maka aja mgbaghara mmehie nile nke ụwa,”36 Aja Mgbaghara mmehie nke Onyenwe anyị ga-eme ịhe ezuo oké, ọbụghị nanị ịhe dịịrị na mbụ, mana ịhe ga-adị n’ihu. Nihi Ọ mara mgbu anyị nile, na mkpagbu nile, na nrịanrịa nile, na “ọnwụnwa nile n’ụdị ọbụla,”37 Ọ g’eji ebere nyere anyị aka dịka adịghị ike anyị nile siri dị.38 N’ihi Chineke bụ “onye zuru-oke, Chineke ikpe ziri-ezi, na kwa Chineke nke ebere,” atụmatụ ebere ga “emeju ọchịchọ nile nke ikpe ziri-ezi.”39 Anyị g’echegharị ma mee ịhe nile anyị nwere ike ịme. O gba anyị gburu-gburu ruo mgbe ebighi-ebi “nime aka nke ịhụnanya ya.”40

Taa anyị n’eme mmemme mweghachite na mbilite n’ọnwu. E soro m unu na añụrị nime Mweghachite ahụ n’aga n’ihu nke oziọma nke Jizọs Kraịst n’uju ya. Dịka ebidoro afọ 200 gara-aga n’oge spring a, ihé na mkpughe kana abịa site n’aka onye amụma dị ndụ nke Onyenwe anyị, ma site na Nzụkọ-nsọ Ya akpọrọ n’aha Ya—Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndi-nsọ Ụbọchi-ikpeazu a—ma site na mkpughe nke onwe na mkpali nke mụọ nke sitere na onyinye eluigwe nke Mụọ Nsọ.

Esoro m unu n’oge Ista nke-a n’agba ama maka Chineke Nna Ebighị-ebi anyị na Ọkpara Ya Ọ Hụrụ n’anya, Jizọs Kraịst ahụ dị ndụ. Mmadụ anụ arụ ejiri obi ọjọọ kpọgbuo n’obe ma emesịa o ebilie n’ọnwụ. Mana ọ bụ nanị Jizọs Kraịst ahụ dị ndụ nime ọnọdụ Ya zuru oké nke mbilite n’ọnwụ bụ ọnye ka nwere apa nke mkpọgbu n’obe n’aka Ya abụọ, n’ụkwụ ma n’akụkụ ya. Nanị Ya nwere ike ikwu, “A kanyewo m gị n’elu ọba nke aka m abụọ.41 Nanị ya nwere ike ikwu: “A bụ m onye ahụ eweliri-elu. A bụ m Jizọs nke akpọgburu n’obe. A bụ m Ọkpara nke Chineke.”42

Dịka obere nwa Ivy na ụbọ-violin ya, anyịnwa n’ụfọdụ ụzọ dịkakwa k’anyị o n’ebido ebido. N’ezie, “anya ahụbeghị, ma ọbụ ntị ịnụ, ọbụghị ma ọbawo n’ime obi nke mmadụ, ihe nile nke Chineke kwadoworo ndi nke hụrụ Ya n’anya.”43 N’oge ndịa, anyị nwere ike ị mụta maka ịdị-nma nke Chineke ma maka akaraka dị nsọ anyị, ka ịhụnanya nke Chineke too eto nime anyị dịka anyị n’achọ Ya ma n’esetịpụ aka nye mmadụ ibe anyị. Na ụzọ ọhụrụ ma n’ebe ndị dị iche iche, anyị nwere ike ị mee makwa dịrị, ahịrị n’elu ahịrị, ebere n’elu ebere, otu n’otu makwa anyị bịakọta ọnụ.

Ezi Ụmụnne ndi Nwoke na ndi Nwanyị nile, dịka anyị n’ezuta unu ma n’amụtakọrịta ịhe ọnụ okwukwe na ịdịnma unu n’ejupụta mụ na mmetụta njem oziọma ma obi ekele. Ọgbụgba-ama unu na njem oziọma unu na abawanye ọgbụgba-ama nakwa njem oziọma m. Nchegbu na ọñụ unu, ịhụnanya unu nwere maka ndị ezinụlọ nke Chineke ma maka ọgbakọ ndị nsọ, ma nghọta unu ibi ndụ dịka eziokwu na ịhé nke eweghachitere sịrị dị, n’abawanye uju nkem nime oziọma eweghachitere, nke nwere Jizọs Kraịst ahụ dị ndụ n’etiti ya. Site n’ijikọta aka ọnụ, anyị g’atụkwasị obi na “site n’igwe ojii na anyanwụ, Onye-nwe m, nọnyere m.”44 Site n’ịdị n’otu, n’etiti ibu anru na mkpagbu anyị nile, anyị g’agụkọ ngọzị nile anyị.45 Nime ịhe ndị anyị n’eme kwa ụbọchị, ma ndị dị ntakịrị ma dịrị mfe, anyị g’ahụ nnukwu ịhe ka ọ n’emezu ndụ anyị nile.46

“Ma ọ ga-erụ na ndị ezi-omume ka a ga-akpọkọta site n’etiti mba nile, ma ha ga-abịa na Zaịọn, na-ekwe ukwe nile nke ọn̄ụ mgbe nile na-adigide.”47 N’oge nke hossanna na hallelujah nke-a, bụọ hallelujah—nihi Ọ g’achị ruo ebighi ebi ma ebighi ebi! Tie hosanna, nye Chineke na Nwa Atụrụ ahụ! Site na aha edoro nsọ na nke di nsọ nke Jịzọs Kraịst, amen.