Ọgbakọ Zuru ọha
Ihé nke Olileanya Zuru-oke.
Ọgbakọ Zuru-ọha Eprel 2020


Ihé nke Olileanya Zuru-oke.

Nihi na Mweghachi ahụ kwagidere ntọ-ala eziokwu na Chineke na-arụ ọrụ nime ụwa nke a, anyị nwere-ike nwe olile-anya, anyị kwesịrị inwe olile-anya, ọbụnaghị mgbe ihe siri anyị ike karịcha.

Ọktoba gara-aga, Onye-isi Russell M. Nelson kpọrọ anyị ka anyị lee anya nihu nye ọgbakọ nke Eprel 2020 site na onye ọbụla na ụzọ nke anyị ilee anya nazụ ịhụ ụdị-eze nke aka Chineke na iweghachi oziọma nke Jizọs Kraịst. Nwanne-nwanyị Holland na Mụ were ọkpụkpọ-oku onye-amụma ahụ dịka ihe dị oke mkpa. Anyị hụrụ onwe-anyị ka ndị biri-ndụ na mbido 1800, na-ele anya na nkwenye nile okpukpe-chi nke ụbọchị ahụ. Ka anyị hụrụ onwe anyị, anyị jụrụ onwe-anyị, “Gini bụ ihe adịghị ebe a? Gini bụ ihe anyị chọrọ na anyị nwere? Gini ka anyị tụrụ-anya Chineke ga-enye anyị maka ọchịchọ nke mụọ anyị?”

Ka ọ dị, maka otu ihe, anyị chọpụtara na narị afọ abụọ gara-aga anyị gara enwe olile-anya maka nweghachi nke ezi nghọta nke Chineke karịa ka ọtụtụ nwetara na ụbọchị ahụ, ezoro dịka Ọ dị na ọtụtụ narị afọ nke ịmata mmejọ na nghọtahie. Na ịgbaziri akpa okwu site naka William Ellery Channing, onye okpere amama oge-ahụ,anyị gara ajụ maka “ụdị nne na nna nke Chineke,” nke Channing kpọrọ “oke ozizi nke mbụ nke ndị kwenyere na Jizọs.”1 Ụdị ozizi ahụ gara ahụ Ịbụ Chi dịka ezi Nna nọ nime Elu-igwe, karịa ịbụ onye na-adịghị ekpe ikpe ọma na-ekpe siri-ike ma-ọbụ dịka onye nna nwe ụlọ na-anọghị ya onye nke nọbu na ụwa ahụ ihe nọ nụwa kama ugbua nọzi ebe-ọzọ na-eme ihe nime elu-igwe na ala.

Eh, olile-anya anyị nime 1820 gara abụ ịchọta Chineke na-ekwu okwu ma na-edu ugbua dịka O duru oge gara-aga, ezi Nna, nụzọ ịhụnanya nke mkpụrụ-okwu ahụ. Ọ gaghị abụ okwucha ọgwụ, onye nke dị na mbụ họrọ ole na ole maka nzọpụta ma kpee ndị ezinaụlọ ndị mmadụ ọzọ ikpe ọnwụ. Mbaa, Ọ ga-abụ onye nke ihe ọbụla o mere, site na ịmaa ọkwa nke elu-igwe, ga-abụ “maka ịbara ụwa uru; nihi na ọ hụrụ ụwa na-anya”2 na onye-ọbụla nke bi nime ya. Ịhụnanya ahụ ga-abụ ihe kachasị nuche Ya maka izita Jizọs Kraịst, Ọkpara Ọ Mụrụ Nanị Ya, na ụwa.3

Ikwu maka Jizọs, ọbụrụ na anyị biiri ndụ nime afọ ndị mbụ nke narị afọ 19, anyị gaara eji ụjọ chọpụta na obi-abụọ gbasara ịdị adị nke ndụ na Mbilite nọnwụ nke Onye-nzọpụta e bidowo ijikọta ndị otu Kraịst nke ọma. Ya mere, anyị gara enwe olile-anya maka ihe aka-ebe ga-abịa na ụwa nile nke ga-akwado aka-ebe baịbụl na Jizọs bụ Kraịst ahụ, Ọkpara nke Chineke, Alpha na Omega, na nanị Onye-Nzọpụta ụwa nke a ga-ama. Ọ gara esoro abụ olile-anya anyị kachasị na aka-ebe nke akwụkwọ-nsọ ọzọ pụtara, ihe nwere-ike bụrụ ịgba-ama ọzọ nke Jizọs Kraịst, imeba na ịbulite ọmụma-ihe anyị nke ọmụmụ Ya bụ ọrụ-ebube, nkuzi-oziọma Ya dị-ebube, aja mgbaghara mmehie, na Mbilite-na-ọnwụ Ya dị-ebube. Ezi-okwu akwụkwọ dị otua ga-abụ “ezi-omume [ezidatara] site nime elu-igwe; na ezi-okwu [ezipụtara] site na ime ụwa.”4

Na ilee ụwa ndị kwere na Jizọs na ụbọchị ahụ, anyị gara atụ anya ịhụ onye Chineke nyere ikike nwere ezigbo ikike ọkwanchụ aja onye nwere ike ime anyị baptism, nye anyị onyinye nke Mụọ Nsọ, ma mee emume-nsọ oziọma nile dị mkpa maka mbuli-elu. Na afọ 1820, anyị gara enwe olile-anya ịhụ na mmezu nkwa nile ekwuwapụtara nke Aịzaya, Maịka, na ndị amụma mgbe ochie ọzọ gbasara nlọghachi nke ụlọ ụdị-eze nke Onye-nwe-anyị5 Anyị gara enwe obiọma ịhụ ịdị-ebube nke temple dị-nsọ ehiwere ọzọ, nwere Mụọ, emume-nsọ nile, ike ahụ, na ikike ịkuzi eziokwu nile dị ebigh-ebi, gwọọ mmerụ-ahụ nile nke onwe, ma kechikọta ezinaụlọ nile ọnụ ruo mgbe nile. A gara m ele-anya ebe-ọbụla na ebe nile ịchọta onye enyere ikike ịsị m na Patricia m hụrụnanya na ọlụlụ di na nwunye anyị na-ụdịrị ebe ahụ ka arachiri maka oge-ndụ anyị na mgbe ebigh-ebi niile, na-anụghị ma-ọbụ manye anyị nkọcha ahụ bụ “tutu onwụ ekewa unu.” A ma m na “na-ụlọ Nna [anyị] ọtụtụ ebe-obibi dị,”6 kama, ịkwu-okwu nke m, ọbụrụ na m gaara enwe ihu-ọma iketa otu na ime ha, ọ gaghị apụta ihe ọbụla karịa nkịrịka ụlọ rere-ere ọbụrụ na Pat na ụmụ anyị esonyere m iketa ihe-nketa ahụ. Ma gbasara ndị ichie anyị, ụfọdụ ndị biri-ndụ ma nwụọ mgbe ochie na-anụtụghị aha nke Jizọs Kraịst, anyị gara enwe olile-anya na aga eweghachi nhụnuche nile nke baịbụl kachasị dị nma na obi-ebere — omume nke ndị dị ndụ imere ụmụnne ha nwụrụ-anwụ emume-nsọ nile nke nzọpụta.7 Onweghị emume m chere nwere-ike zipụta nke ọma mmetụta nke Chineke dị ịhụnaanya nwere gbasara ụmụ Ya niile bi nụwa na-agbanyeghị mgbe ha dịịrị ndụ ma-ọbụ mgbe ha nwụrụ.

Ọ dị nma, ọtụtụ ihe ndị anyị tụrụ anya ya na 1820 nwere-ike gaaniihụ, kama ikekwa ozi nke Mweghachị kachsị mkpa bụ na ụdịrị olile-anya ndị a agaraghị a bụ na-efu. Bido nime Osisi Dị-nsọ ma gaanihu ruo ụbọchị taa, ọchịchọ nile ndị a pụtara ihe ma bụrụ, dịka Onye-ozi Pọl na ndị ọzọ kuziri, ezi ndabere nye mkpụrụ-obi, kwusie-ike ma guzogide.8 Ihe bụrụla nanị olile-anya ugbua abụrụla agụgụala.

Ya mere anyị ile-anya na-azụ afọ 200 nke ịdị-mma nke Chineke nye ụwa. Kama kedu maka ile anya nihu? Anyị ka nwere olile-anya ndị na emejubeghi. Ọbụnaghị dịka anyị na-ekwu , anyị nọ na agha “onye niile tinyeaka na” nke COVID-19, ncheta dị-mkpa na nje dị nta ji ugboro 100 karịa otu aja9 nwere-ike kpọnye ọnụ ọgụgụ mmadụ niile na mkpata akụ na ụba nke gburugburu ụwa nile ọnụ na ala. Anyị na echeta na ekpere ndị nwere ndị ha hụrụ nanya ajọọ-ahụhụ ọhụrụ a gburu, ma kwa ndị ọrịa mmetụtara ugbua ma-ọbụ nọ na nsogbu. Anyị na ekpe kwa ekpere maka ndị na-elekọta ndị ọrịa. Mgbe anyị merịrị nke a—ma anyị ga-eme ya— ka anyị nwee mgbalị inwe ụwa na-agaghị enwe nje nke agụụ, na agbata-obi na mba nile na-enweghị nje nke ogbenye. Anyị ka nwere olile-anya maka ụlọ-akwụkwọ nile ebe a na-akuziri ụmụ-akwụkwọ ihe—ọbụghị ịtu-ụjọ mgbagbu—na maka ezigbo-ugwu maka nwa Chineke ọbụla, na-enweghị mmejọ site na otu oke agbụrụ, ebe onye si pụta, ma-ọbụ keesieme akpam-oke. Na isi ihe nile a bụ olile-anya anyị nọgidere maka nnukwu-ịhụnanya karịrị nye iwu-nsọ abụọ ahụ kachasị ukwuu: ịhụ Chineke na-anya site na idobe ndụmọdụ Ya na ịhụ ndị agbataobi anyị na-anya site na igosi ha obiọma na ọmịko, ndidi na mgbaghara.10 Oke iwu abụọ ndị a ka dị—ma mgbe nile ga-adị —nanị olile-anya anyị nwere maka inye ụmụ anyị ụwa ka mma karịa nke ha mara ugbua.11

Na-ịgbakwunyere ọchịchọ nile ndị a nke ụwa, ọtụtụ nọ ebe a taa nwere olile-anya nke onwe dị omimi: olile-anya maka ọlụlụ di na nwunye dịwanye mma, ma-ọbụ mgbe ụfọdụ nanị olile-anya maka ọlụlụ di na nwunye, olile-anya imeri agwa-ọjọọ, olile-anya maka nwa efulefu ịlọghachi, olile-anya maka ihe mgbu nke anụ ahụ na nke ime mmụọ dị ọtụtụ ịkwụsị. Nihi na Mweghachi ahụ kwagidesiri ike ntọ-ala eziokwu na Chineke na-arụ ọrụ nime ụwa nke a, anyị nwere-ike nwee olile-anya, anyị kwesịrị inwe olile-anya, ọbụnaghị mgbe ihe siri anyị ike karịcha. Nke a bụ ihe akwụkwọ-nsọ kwuru mgbe Ebraham nwere ike nwe olile-anya mgbe olile-anya gasịrị12—nke a bụ, o nwere-ike kwere na-agbanyeghị ihe ọbụla ekwesịghị ka e kwere—na ya na Serah nwere-ike ịmụta nwa mgbe ọdị ka ihe e enweghị ike ime. Ya mere, A jụọ m, “Ọ bụrụ na ọtụtụ olile-anya anyị nke 1820 nwere-ike bido mejupụtawa site na amụma nke ihé elu-igwe nye nwata nwoke busiri-ikpere nime ebe osisi toro nebe mgbago New York, gịnị mere anyị agaghị enwe olile-anya na ọchịchọ nile nke ezi-omume na mmasị nile nke Kraịst ka nwere-ike mezuo nụzọ dị ebube na ịtụnaanya site naka Chineke nke olile-anya niile?” Anyị nile kwesịrị ikwenye na ihe ezi-omume anyị chọrọ nwere-ike otu ụbọchị, otu-ụzọ, otu ọbụla ma bụrụ nke anyị.

Ụmụnne m nwoke na nwanyị, anyị mara ụfọdụ ihe okpukpe-chi adabaghị nime mbido afọ nke narị 19 bụụrụ. Ịganihụ, anyị mara ihe banyere okpukpe-chi nke taa na adabaghị nke mere ka agụụ na olile-anya ahụ nke ụfọdụ ka nọrọ na-emejupụtabeghị. Anyị mara ụfọdụ ihe ndị ahụ na adabaghị na-edupụ ụfọdụ site na-ewumewu ọdịnaala usoro ekpukpere ha. Anyị makwara, dịka otu onye ode-akwụkwọ iwe na-ewe dere, na “ọtụtụ ndị ndu okpukpe-chi [nke ụbọchị taa] amaghị ihe” ha ga-eme igbochi ọdịda nke a, na enye azịza abaghị uru, [ma-ọbụ mgbe ụfọdụ nanị] ihe enweghị isi”13—ma ihe nile na mgbe ụwa chọrọ ọtụtụ ihe karịa, mgbe ndị ọgbọ na-etolite kwesịrị inwe karịa, ma mgbe oge nke Jizọs O nyere karịa. Dịka ndị na-eso ụzọ nke Kraịst, anyị nwere-ike na ụbọchị anyị too karịa ndị Izrel mgbe-ochie ndị sụrụ-ude, “Ọkpụkpụ anyị akpọwo nkụ, ma olile-anya anyị alawokwa.”14 Na-ezi ya, ọbụrụ na anyị na ikpeazụ tufuo olile-anya, anyị atufuwo onwunwe ikpeazụ anyị. Ọ bụ na ọnụ ụzọ nke ọkụ mmụọ ka Dante dere okwu ndụmọọdụ nye ndị njem nile gafere site na Divina Commedia: ya “Hapụnụ olile-anya nile,” ka okwuru, “unu ndị na-abata ebe a.”15 Eziokwu mgbe olile-anya gara, ihe anyị nwere fọrọ bụ ire-ọkụ nke na-enwu ọkụ akụkụ nile.

Ya mere, mgbe azụ anyị dabeere na mgbidi ma, dika abụ gụrụ, “ndị inye-aka ndị-ọzọ abịaghị ma nkasị-obi laa,”16 na-etiti ezigbo-omume anyị kachasị mkpa ka onyinye oke-ọnụ nke a nke olile-anya ejikọtara na okwukwe anyị nime Chineke na afọ-ọma anyị nye ndị-ọzọ ga-anọ.

Nime afọ narị abụọ nke a, mgbe anyị lere-anya nazụ ịhụ ihe nile enyere anyị ma nwee ọńụ na nghọta nke mmezu ọtụtụ olile-anya, A na m ekwupụta ọmarịcha ihe nke nwanne-nwanyị si mgbassa-oziọma lọta gwara anyị na Johannesburg ọnwa ole na ole gara-aga, “[Anyị] abịaghị ebe a naanị ịkwụsị ebe a.”17

Ịkọwa otu nime ọtụtu okwu mmechi na-ebulite mụọ edere nime akwụkwọ-nsọ, A na m ekwu ka onye-amụma Nifaị na nwanne-nwanyị ahụ kwuru:

“Ụmụnne m nwoke [na ụmụnne nwanyị] ndị m hụrụ n’anya, mgbe unu [natachara mkpụrụ-osisi nke mbụ ndị a nke Mweghachi], a ga m ajụ ma emesịwo ihe nile? Lee, a sị m unu, Ee. …

“… Unu ga na-aga n’iru kwudesie-ike n’ime Kraịst, na-enwe ìhè nke olile-anya na-enweghị ntụpọ, na ịhụnanya nke Chineke na nke mmadụ nile. … |Ọbụrụ na unu[,] … ka Nna kwuru: Unu ga-enwe ndụ ebighi-ebi.”18

A na m enye ekele, ụmụnne m nwoke na nwanyị maka ihe nile enyeworo anyị nime ọgbọ ikpeazụ a kachasị, ọgbọ nke eweghachitere oziọma nke Jizọs Kraịst. Onyinye na ngọzi nile sitere na oziọma ahụ pụta pụtara ihe nile nye m—ihe-nile—ya mere na ịgba-mbọ ikele Nna m nke Elu-igwe maka ha, E nwere m “nkwa nile m ga-edobe, na ọtụtụ maịl m ga-aga tupu m hie-ụra, na ọtụtụ maịl a ga-aga tupu M hie-ụra.”19 Ka anyị na-aga niru jiri ịhụnanya nime obi anyị, na-aga “na-enwe ihé nke olile-anya”20 nke na-enye ihé na ụzọ nke ịtụanya dị-nsọ nke anyị nwerela ugbua kemgbe afọ 200. A na m agba-ama na ọdịniihu ga-ebu ọrụ-ebube ma jupụta na ngọzi dị ka ọ dị noge gara-aga. Anyị nwere akọ-na-uche ọbụla inwe olile-anya maka ngọzi ọbụla karịrị ndị nke anyị nataworo nihi na nke a bụ ọrụ nke Chineke nke Pụrụ Ime Ihe nile, nke a bụ Nzukọ-nsọ nke mkpughe na-aga niihu, nke a bụ oziọma na eweta ihe ọma na amara anaghị agwụ-agwụ nke Kraịst. A na m agba aka-ebe nye eziokwu nile ndị a na ndị karịrị akari n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.