Ọgbakọ Zuru ọha
Onye Akaebe Dị Ndụ nke Kraịst Dị Ndụ
Ọgbakọ Zuru-ọha Eprel 2020


Onye Akaebe Dị Ndụ nke Kraịst Dị Ndụ

Isiozi nke Akwụkwọ nke Mọmọn bụ maka mweghachi ezi ọmụma-ihe gbasara ọrụ dị mkpa nke Jizọs Kraịst maka nzọpụta na mbuli-elu nke mmadụ.

N’otu ụbọchị n’afọ 2017, mgbe a nọ n’eme mmemme igosi-ọha Tempụl nke Paris France, otu nwoke onye ihu ya jupụtara n’iru uju bịakwutere otu n’ime ndị ndugharị. O kwuru na o bi n’akụkụ tempụl ma kweta na ọ bụbụrụ onye gbara iwu tempụl ahụ ụkwụ. Ọ kọrọ maka otu ụbọchị mgbe ọ sitere n’ebe mgbuwa-ụlọ ya nọ n’ele anya, ma ọ hụrụ igwe-krane ka e si n’igwe n’ebudata akpụrụ-akpụ nke Jizọs ma e jiri wayọọ dobe ya n’ogige nke tempụl ahụ. Nwoke ahụ kwupụtara na ahụmịhe ahụ gbaworo kpam-kpam echiche ọ nwere maka Nzukọ-nsọ anyị. Ọ mataziri na anyị bụ ndị n’eso Jizọs Kraịst ma rịọ anyị mgbaghara maka mmerụ ahụ nke o nwere ike imewo.

Foto, oyiyi
Dịka a n’edobe ihe akpụrụ-akpụ na Tempụl nke Paris France

Akpụrụ-akpụ nke a kpọrọ Christus, nke chọrọ ogige Tempụl nke Paris Temple mma ma ụlọ ndị ọzọ nke Nzukọ-nsọ, na-agba ama maka ịhụnanya anyị anyị nwere maka Onye Nzọpụta. Akpụrụ-akpụ nke mbụ ya ejiri marbụl kpụọ bụ aka-ọrụ nke onye osise-ihe nke Denmark a na-akpọ Bertel Thorvaldsen, onye kpụrụ ya n’afọ 1820—otu afọ ahụ Ọhụ nke Mbụ mere. Akpụrụ-akpụ ahụ guzoro n’ịdị iche ya na ihe osise nile nke oge ahụ, n’ihi ha kachasị gosi nanị ahụhụ nke Kraịst tara n’elu obe. Ọrụ nke Thorvaldsen gosipụtara Kraịst onye dị ndụ, onye meriri ọnwụ ma, gbasapụ aka ya, n’akpọku onye nile ka ha bịakwute Ya. Nanị apa nile nke ntu ahụ dị Ya na aka ma n’ụkwụ, na mmerụ ahụ nke akụkụ ahụ ya gbara ama maka nnukwu ntarama-ahụhụ Ọ gabigara iji zọpụta mmadụ nile.

Foto, oyiyi
Aka Onye Nzọpụta dịka egosipụtara ya na Christus

E nwere ike otu ihe mere anyị dịka ndị otu Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst nke Ndi-nsọ Ụbọchi-ikpeazu a jiri hụ akpụrụ-akpụ a n’anya bụ n’ihi ọ n’echetara anyị maka nkọwa enyere n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn maka ọbịbịa Onye Nzọpụta bịara n’ala-gburugburu nile nke Emerịka:

Foto, oyiyi
Jisus Kraịst wee leta ndị Amerika nile

“Ma lee, ha hụrụ otu Nwoke na-agbadata site n’elu-igwe; ma o yi uwe mwụda ọcha; ma ọ gbadatara ma guzoro n’etiti ha. …

“Ma o wee ruo na o setịpụrụ aka ya ma gwa ndị ahụ okwu, na-asị:

“Lee, abụ m Jizọs Kraịst, …

“… An̄ụwo m site n’iko ilu ahụ nke Nna nyeworo m, ma enyewo m Nna otuto n’iwekwasị onwe m mmehie nile nke ụwa.”1

Emesịa Ọ kpọkuru nwoke ọbụla, nwanyị ọbụla ma nwata ọbụla ka ha bịarute ya ma rụnye aka ha nile n’akụkụ Ya, na kwa ka ha metụ aka n’apa nile nke ntu nile n’aka ya abụọ na n’ụkwụ ya abụọ, ka ha wee nwee ike irite akaebe nke onwe ha na n’ezie Ọ bụ Messiah ahụ a n’eche ka mgbe oge gara aga.2

Ịhe ọma nke-a mere ugbua bụ ihe ukwu kachasị ibe ya mere n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn. “Ozi ọma” ahụ nile nke ozi ọma n’ekwu maka ya gosipụtara onwe ya n’ime ihe osise nke Onye Nzọpụta ahụ, mgbe O jiri obiọma gbasaa “aka ebere” Ya3 wee n’akpọ onye ọbụla okú ka ha bịakwute Ya ma nata ngọzị nile nke aja mgbaghara mmehie.

Isiozi nke Akwụkwọ nke Mọmọn bụ maka mweghachi ezi ọmụma-ihe gbasara ọrụ dị mkpa nke Jizọs Kraịst maka nzọpụta na mbuli-elu nke mmadụ. Isiokwu a ka ekwugharịrị bido na nkọwa mbụ enyere na ihuakwụkwọ nke mbụ ruo na okwu nile nke ikpeazu dị n’ime isi nke ikpeazụ. Ruo na oge nile nke ngọnarị okwukwe ma mgbagwojuanya nke ihe dị nsọ, nkọwa omimi maka ịhe Kraịst mere n’ime Gethsemane ma n’ebe Golgotha bụrụ ihe furu efu m’ọbụ ihe emerụrụ-emerụ. Ọ ga-abụrịrị ihe tọrọ Josef Smit ụtọ n’oge ahụ, mgbe ọ n’atụgharị 1 Nifai wee chọpụta nkwa ebube nke-a: “Akụkọ-ndekọta ikpe-azụ ndị a [Akwụkwọ nke Mọmọn ahụ] … ga-ehiwe ezi-okwu nke mbụ [Baịbụlụ ahụ] … ma ọ ga-eme ka a mata ihe ndị ahụ dị mfe nghọta na oke mkpa bụ nke a napụworo ha; ma ọ ga-eme ka a mata ya n’ebo nile, asụsụ nile, na ndị mmadụ nile, na Nwa-atụrụ Chineke bụ Ọkpara nke Nna nke ebighi-ebi, na Onye-nzọpụta nke ụwa; ma na mmadụ nile garịrị abịakwute ya, ma-ọbụ agaghị azọpụta ha.”4

Ihe ndị ahụ dị mfe nghọta dị oke mkpa gbasara Aja Mgbaghara-mmehie nke Onye Nzọpụta juru n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn. Dịka m na-edepụta eziokwu ndịa, A na m akpọku unu ka unu chee maka otu ha si, m’ọbụ otu ha nwere ike iji gbanwee ndụ unu.

  1. Aja Mgbaghara-mmehie nke Jizọs Kraịst bụ onyinye efu nke enyere mmadụ niile ndị nke biworo na mbụ, ndị dị ndụ ugbua, ma ndị nke ga-ebi ndụ n’elu ụwa nke-a.5

  2. N’ịgbakwụnye ibu mmehie anyị o buru, Kraịst nyekwasịrị onwe Ya iri uju anyị nile, adịghị ike anyị nile, ntaramahụhụ anyị nile, ma nrịanrịa anyị nile, ma ịhe mkpagbu nile nke n’abịa n’ụwa n’ihi ndụ anụ-arụ nke mmadụ. Enweghi obi mgbu ọbụla, ụfụ ọbụla, m’ọbụ obi ọjọọ nile nke Ọ na-ataghị ahụhụ ya maka anyị.6

  3. Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta nyere anyị ohere k’anyị megide ịhe ndapụta ọjọọ nile pụtara n’ihi Ọdịda nke Adam, tinyekwara ọnwụ nke anụ-arụ. N’ihi Kraịst, ụmụ nile nke Chineka nke amụrụ n’ụwa nke-a, n’agbanyeghi eziomume ha, g’enwete nhụmịhe nke nlaghachita mmụọ ha na arụ ha nile site n’ike nke Mbilite N’ọnwụ7 ma laghachikwute Ya ka “e kpe ha ikpe … dịka otu ọrụ [ha] sịrị dị.”8

  4. N’agbanyeghi nke-a, ị nata ngọzị nile nke Aja Mgbaghara-mmehie nke Onye Nzọpụta n’uju dabere anyị irụsi ọrụ ike9 n’idobe “ozizi nke Kraịst.”10 N’ime nrọ ya, Lihaị hụrụ “ụzọ di wara-wara ma dị kwa mkpafa”11 nke n’eduru jee n’ebe osisi nke ndụ nọ. Mkpụrụ osisi ahụ, nke n’egosi ịhụnanya nke Chineke dịka egosiri ya site na ngọzị nile nke Aja Mgbaghara-mmehie nke Kraịst, “dịkarịrị oke mkpa na-adị kwa mmasị karịa … [ma] bụ ihe kachasị onyinye nile nke Chineke.”12 Ọ bụrụ n’achọrọ ị nwete mkpụrụ ahụ, anyị kwesịrị ị nwale okwukwe anyị n’ime Jizọs Kraịst, chegharịa, “n̄a ntị n’okwu Chineke,”13 nata omume nsọ nile dị mkpa, ma dobe ọgbụgba ndụ nile dị nsọ ruo na ọgwụgwụ ndụ anyị.14

  5. Site na Aja Mgbaghara-mmehie Ya, Jizọs Kraịst anaghị asachapụ nanị mmehie anyị, mana Ọ na-arọpụtakwa ike ahụ dị mkpa n’eme ka ndị n’eso ụzọ Ya “[wepụ] ịbụ mmadụ nke anụ arụ,”15 ma gaa nihu “ahịrị n’elu ahịrị,”16 ma baa ụba n’ịdị nsọ17 ka otu ụbọchị, ka ha wee dịrị ka mmadụ tozuru oke ma dịka oyiyi nke Kraịst,19 ma tozuo ibi ndụ ọzọ ha na Chineke19 ma keta oke ngọzị nile nke alaeze nke eluigwe.20

Eziokwu ọzọ n’akasị obi nke nọ n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn bụ na, n’agbanyeghi na ọ nweghi ọgwụgwụ makwa na o zuru ụwa nile, Aja Mgbaghara-mmehie nke Onyenwe anyị bụ onyinye nke dịịrị onwe, nke arọpụtara onye ọbụla n’isi-n’isi.21 Dịka Jizọs kpokuru ndị Nifaị ndị n’eso ụzọ ya n’otu-n’otu ka ha metụ apa aka ya, Ọ nwụrụ ọnwụ maka onye ọbụla n’ime anyị, ọnye ọbụla na nke ya, dịka a ga-asị gi, m’ọbụ mụ, bụ nanị onye nọ n’ụwa. Ọ na-akpoku anyị otu-n’otu k’anyị bịakwute Ya ma dọrọ ngọzị ọma nile nke Aja Mgbaghara-mmehie Ya.22

Nghọta enwere maka Aja Mgbaghara-mmehie nke Kraist na-abawanye dịka anyị n’atule ọmụmatụ dị iche iche nke ndị nwoke na ndị nwanyị nọ n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn. Nime ha bụ Inọs, Alma, Zeezrom, Eze Lamonaị na nwunye ya, ma ndị obodo Eze Benjamin. Akụkọ mgbanwe ha na ama ha na-arọpụtara anyị akaebe maka otu obi anyị nwere ike iji gbanwee, ma otu ndụ anyị nwere iji nwogharịa site n’ịdị mma na ebere n’adịghị agwụ-agwụ nke Onyenwe anyị.23

Onye amụma Alma jụrụ ndị ya ajụjụ nke-a n’ekpo ọkụ. O kwuru “ọbụrụ na unu enwetawo mgbanwe nke obi, ma ọbụrụ na unu enwewo mmetụ ịbụ abụ mgbapụta ịhụ-n’anya, aga m ajụ, unu nwere ike inwe mmetụ dị otu ahụ ugbua?”23 Ajụjụ a dị mkpa taa, n’ihi dịka ndị n’eso ụzọ Onyenwe anyị, anyị chọsịrị ike, ike mgbapụta Ya ka o soro anyị, ịkpali anyị, ma ịgbanwe anyị ụbọchị ọbụla.

Enwere ike jụgharịa ajụjụ Alma ahụ otua, kedụ mgbe ikpeazụ ị nwere mmetụta dị ụtọ nke Aja mgbaghara-mmehie nke Onye Nzọpụta nime ndụ gị? Nke-a n’eme mgbe ị matara na ọn̄ụ “mara oke mma ma dị ụtọ”25 dakwasịrị gị nke n’agbara mkpụrụ obi gị akaebe na agbagharawo mmehie gị nile; m’ọbụ mgbe mnwale nile bịaziri n’otu ntabianya dịịrị gị mfe i bu; m’ọbụ mgbe obi gị bịara dịrị nro ma gị enwezie ike gosipụta mgbaghara nye onye ahụ mere gị ịhe ọjọọ. Ma ọ bụ nwere ike mgbe ọbụla ị matara ike i nwere maka ịhụnanya na ijere ndị ọzọ ozi abawanyewo m’ọbụ na usoro ime mmadu onye nsọ n’emezi ka ị bụrụ mmadụ dị iche, wee dịrị ka ọmụmatụ Onye Nzọpụta sịrị dị.26

A na m agba ama na ahụmịhe nile ndịa dị iré ma ha bụ ịhe ngosipụta na ndụ ọbụla nwere ike ịgbanwe site n’okwukwe n’ime Jizọs Kraịst na n’ime Aja Mgbaghara-mmehie Ya. Akwụkwọ nke Mọmọn na-akowazi ọfụma ma na-abawanye ọmụma-ihe anyị gbasara onyinye ukwu nke-a. Dịka ị na-amụ akwụkwọ a, ị ga-anụ olu nke Kraịst ahụ dị ndụ ka ọ n’akpoku ka ị bịakwute Ya. A na m ekwe gị nkwa n’ọbụrụ na ị nabata ọkpụkpọ oku a, ma hazie ndụ gị dịka ọmụmatụ Ya sịrị dị, mmetụta mgbapụta Ya ga-abata n’ime ndụ gị. Site n’ike nke Mụọ Nsọ, Onye Nzọpụta ga-agbanwo gị ụbọchị n’elu ụbọchị wee “ruo n’ụbọchị ahụ zuru oke”27 mgbe ị ga, dịka O siri kwupụta, “hụ iru m ma mata na a bụ m.”28 Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen