Ọgbakọ Zuru ọha
Ọ Na-Aga N’ihu Anyị
Ọgbakọ Zuru-ọha Eprel 2020


Ọ Na-Aga N’ihu Anyị

Ọnye-nwe n’edu Mweghachi nke oziọma Ya ma Nzukọ-nsọ Ya. Ọ mara maka ọdịnihu n’ụzọ zuru oke. Ọ nakpọ anyị okú kanyị soro nọrụ.

Ụmụnne m ọma ndị nwoke na nwanyị, E nwere m obi-ekele ị nọnyere unu n’ọgbakọ nke Nzukọ-nsọ nke Jizọs Kraịst nke Ndi-nso Ụbọchị Ikpeazụ a. N’ọkpụkpọ-oku ọ kpọrọ ka anyị tụgharịa uche maka otu anyị na ndị anyị hụrụ n’anya si nwete ngọzị n’ụzọ Onyenwe anyị si mee Mweghachi Nzụkọ-nsọ Ya n’agba oge ikpeazụ nkea, Onyeisi Russell M. Nelson ekwewo nkwa na nhụmihe anyị ahụ ga-abụ ihe anyị n’agaghị echefu echefu.

Nhụmihe nkem abụghị ihe m ga-echefụ, a ma kwam na otu a ka ọdịkwaara unu. Ọ nọ anyị n’aka otu n’otu ma ọ ga-abụrụ anyị ihe nchefu. Nke a dịrị m mkpa n’ihi ahụmịhe m nwetere n’oge m n’akwado maka ọgbakọ nke-a agbanwewo mụ n’ụzọ nke m chọrọ ka ọ nogide. Ka m kọwa.

Nkwado m mere m ịmata akụkọ otu ihe mere n’oge Mweghachi. A gụwo m maka emume ahụ ọtụtụ oge na mbụ, mana a mara m ya dịka akụkọ maka nzụkọ dị oke mkpa nke gbasara Josef Smit, onye amụma nke Mweghachi. Mana ugbua, A hụwọ m nime akụkọ a, otu Onye Nweanyị si edu anyị, ndị bụ ndị n’eso ụzọ ya, nime Nzukọ-nsọ Ya. A hụtara m ihe ọ pụtara na anyị bụ mmadụ ka Onye Nzọpụta nke ụwa ga-abụrụ onye ndu—onye mara ihe nile, ihe mere na mbụ, ugbua, ma ọdịnịhu. Ọ na-akụziri anyị ahiri-na-ahiri ma n’edu anyị, a n’aghị eme ya ike-ike.

Nzụkọ nke ahụ m na-akọwa maka ya bụ otu ihe gbara kpụrụkpụrụ mere n’oge Mweghachi. Ọ mere n’Ụbọchi Ezumike n’ime ọgbakọ emere na Eprel 3, 1836, n’ime Kirtland Temple, ụbọchị asaa gara aga emere ofufe nro ido-nsọ ya. Josef Smit kọwara mmemme ukwu nke-a mere n’ụwa n’uzọ dị mfe. Ọtụtụ akụkọ ọ kọrọ maka ya ka edere nime Ozizi na Ọgbụgba ndụ nile nkeji 110:

“Na ehihie, e nyeere m Ndịisi ndị ọzọ a aka n’ikesasị Oriri nke Onyenwe anyị nye Nzukọ-nsọ, na-anata ya site n’aka Iri na Abụọ ahụ, ndị ọbụ ohere ha iduzi n’oche-nsọ n’ụbọchị nke a. Mgbe m rụsịrị ọrụ nke a nye ụmụnna m, a laghachiri m na pulpit, ebe emechikwara, akwa-mgbochi ma hudata isi m, mụ na Oliver Cowdery, na ekpere dị mkpa na nke dị nwayọ. Mgbe anyị bilitere n’ekpere, ọhụ nke a na-eso ka emeghere nye anyị abụọ”1

“Akwa mgbochi ahụ ka ewepụrụ site n’uche anyị, na anya nile nke nghọta anyị ka emeghere.

“Anyị hụrụ Onyenwe anyị ebe o guzo n’elu ihe mkpuchi nke pulpit, n’iru anyị; na n’okpuru-ukwu ya abụọ ka enwere ihe aruru n’ọrụ-aka nke ezigbo ọla-edo, na-acha edo-edo.

“Anya ya abụọ dịka ire nke ọkụ; agịrị nke isi ya dị ọcha dịka ezi snow; mbara iru ya na-enwu karịa mmụke nke anyanwụ; na olu ya dịka ụda ọtụtụ nnukwu mmiri nile na-asọ-asọ, ọbụna olu ahụ nke Jehova, na-asị:

“A bụ m onye mbụ ahụ na onye ikpe azụ ahụ; a bụ m onye ahụ na-adị ndụ, a bụ m ya onye ahụ egburu egbu; a bụ m onye nkwuchita ọnụ unu n’ebe Nna nọ.

“Lee, agbagharawo unu mmehie nile unu; unu dị ọcha n’iru m; ya mere, welite nụ isi unu na n̄ụrịa ọn̄ụ.

“Ka obi nile nke ụmụnna unu n̄ụrịa ọn̄ụ, na kwe ka obi ndị nke m nile n̄ụrịa ọn̄ụ, ndị, jiri ume ha, wuo ụlọ nke a n’aha nke m.

“N’ihi lee, a nabatawo m ụlọ nke a, na aha nke m ga-anọ ebe a; na a ga m egosi onwe m nye ndị nke m n’ebere n’ụlọ nke a.

“E, a ga m egosi onwem nye ndị odibo m, na kwuoro ha okwu n’olu nke m, ọ bụrụ na ndị nke m ga-edebe iwu-nsọ m nile, na ghara ịmerụ ụlọ nkea dị nsọ.

“E obi nile nke puku nile na iri puku nile ga-an̄ụrị oke ọn̄ụ n’ihi ngọzi nile nke a ga-awụpụta, na onyinye dị-nsọ nke e jirila doo ụmụ odibọ m nsọ n’ụlọ nke a.

“Ma ezi aha nke ụlọ nke a ga-agbasa ruo ala ndị-ọzọ nile; na nke a bụ mmalite nke ngọzi nke a ga-awụpụ n’elu n’isi ndị nke m. “Ọbuna otu a. Amen.

“Mgbe ọhụ nke a mechiri, elu-igwe nile ka emeghere ọzọ nye anyị, na Moses pụtara n’iru anyị, na nyefee anyị ọtụghe-uzo nile nke mkpọkọta nke ndị Israel site na akụkụ anọ nile nke ụwa, na nke odudu nke ebo iri site n’ala nke elu elu.

“ Mgbe nke a gasịrị, Elaias pụtara, na nyefee ọkwa-ọrụ ahụ nke ozi-ọma nke Abraham, na-asị na n’ime anyị na na mkpụrụ anyị, ọgbọ nile ga-esochi anyị ga-adị ngọzi.

“Mgbe emechiri ọhụ nke a, nnukwu ọhụ ọzọ dị ebube kpughepuru n’iru anyị; n’ihi na Elaịja onye-amụma ahụ, nke ewelara n’elu-igwe n’edetugh ọnwụ ire, guzoro n’iru anyị, na-asi:

“Lee, oge ahụ abịawo n’uju ya, nke e kwuru maka ya site n’ọnụ nke Malakaị—n’agba-ama na ya [Elaịja] ka a ga-ezipụta, tutu ụbọchị ahụ dị ukwuu na dị egwu nke Onye-nwe abịa—

“Ịtụgharị obi nile nke ndị bụ nna nye ụmụ ha, na ndị ụmụ nye nna ha, ka ụwa nile ghara ibu ihe e jiri ọbụbụ-ọnụ gburie—

“Ya mere, ọtụghe-ụzọ nile nke ọgbọ nke a ka e nyefere n’aka unu abụọ; na site na nkea unu ga-ama na ụbọchị ukwu ahụ dị-egwu nke Onye-nwe dịkwa nso, ọbuna n’ọnụ ụzọ nile.”2

Matakwa na a gụwom akụkọ nkea ọtụtụ oge. Mụọ Nsọ ahụ emewo ka m mata na akụkọ ahụ bụ eziokwu. Mana dịka m n’amụ ya ma n’ekpe ekpere nkwado maka ọgbakọ nke-a, A bịara m hụta nke ọma ike nke Onye Nweanyị nwere iji duo ndị n’eso Ya n’ime orụ Ya

Afọ asaa gara-aga kamgbe Mosis nyere Josef ọtụghe nile nke ịkpọkọlata Izrel n’ime tempụl nke Kirtland, “Josef matara site na ị muta ihe site na ákára ihu-akwụkwọ nke Akwụkwọ nke Mọmọn na ebumnuche ya bụ ‘igosi ndị fọdụrụ nke ụlọ nke Izrel … Ka ha nwee ike ịmata ọgbụgbandụ nile nke Onye Nwe, na achụpụghị ha ruo mgbe nile.’ N’afọ 1831, Onye-nwe gwara Josef Smit na mkpọkọlata nke Izrel g’ebido na Kirtland, ‘Ma site n’ebe ahụ, [Kirtland], onye ọbụla m chọrọ ga-aga n’iru n’etiti mba nile, … n’ihi Israel ga-enwe nzọpụta, ma a ga m edu ha .’”3

N’agbanyeghi na ọrụ nke mgbasa oziọma bụ ihe a chọrọ maka ịkpọkọlata Izrel, Onye-nwe kpaliri obi ndị ndu Ya ka ha kuziere ndị Iri na Abụọ ịhe, ndị bụụrụ ụfọdụ ndị mgbasa oziọma anyị na mbụ, “Cheta kwa na unu agaghị agakwuru mba ndị ọzọ, tutu ruo mgbe unu natara onyinye dị nsọ unu.”4

Ọ dịka Tempụl nke Kirtland dịịrị atụmatụ usoro-na-usoro nke Onye-nwe mkpa n’ihi ihe abụọ nke-a: Nke mbụ, Mosis cheere ruo mgbe arụsịworo tempụl ahụ tupu o weghachi ọtụghe-ụzọ nile nke mkpọkọta Izrel. Nke abụọ, Onyeisi Joseph Fielding Smith kuziri na “Onye-nwe nyere ndị nsọ iwu ka ha wuo otu tempụl [ya bụ Tempụl nke Kirtland] ka ọ wee kpuhee ọtụghe nile nke ikike ma ebe ndọ ozi nwere ike ọnata onyinye-nsọ ma kwado ịrụ ọrụ n’ubi-vine nke ikpeazụ.”5 N’agbanyegi na onyinye-nsọ nke tempụl dịka anyị si mara ya taa, dị iche na nke enyere nime tempụl nke Kirtland, n’imezu amụma, emume-nsọ nkwado nke tempụl ka ebidoro wepụtawa ebe ahụ, tinyekwara mwụkwasa nke ọtụtụ ihe dị nsọ nke kwadoro ndị ahụ akpọrọ ọrụ mgbasa oziọma site n’ịnye ha nkwa onyinye dị nsọ nke “ike si n’elu” nke mere eji nwee nnukwu mkpọkọta sitere na ijeozi nke mgbasa oziọma.6

Oge enyesịrị Josef ọtụghe nile nke mkpọkọta Isrel, Onye-nwe kpalitere mụọ Onye amụma ka o zipụ ndị otu Iri na Abụọ njem ikwusa oziọma. Dịka m n’agụ, ọ doro m anya na Onye-nwe akwadoworị n’ụzọ zuru-ezu, ụzọ maka ndị Iri na Abụọ ị jee ịkwusa oziọma n’ebe ofesii ebe akwadowokwara ndị g’ekwere na ha ma nyere ha aka. Nwa mgbe nta, puku-kuru-puku, site n’aka ha, ga-abata nime Nzụkọ-nsọ nke Onye-nwe eweghachiri.

Dịka otu ndekọta anyị si kwuo, echere na ihe dị n’etiti 7500 na 8000 ka emere baptizim n’oge ikwusa oziọma ugboro abụọ ndị Iri na Abụọ mere na Btitish Isles. Nke-a hiwere isi nkume nke ọrụ mgbasa-ozi-ọma na Europe. Mgbe 19 senchuri gwụrụ, ihe dịka 90,000 abịawo na Amerika, ọtụtụ nime ndịa n’abịanụ si British Isle na Scandinavia bịa.7 Onye-nwe akpalitewo mụọ Josef ma ndị mgbasa ọziọma ahụ dị ike, ndị jere ọrụ owuwu ịhe ubi ahụ dịịrị ka ọ karịrị ike ha n’oge ahụ. Mana Onye-nwe mere ka nke-a kwee omume nihi Ọ nwere ike zuru oké ịhụ ụzọ, ma tinyere nkwado ọ mere.

Ị g’echeta okwua yiri mbem nke ekwuru nime isi 110 nke Ozizi na Ọgbụgbandụ nile:

“Lee, oge ahụ abịawo n’uju ya, nke e kwuru maka ya site n’ọnụ nke Malakaị—n’agba-ama na ya [Elaịja] ka a ga-ezipụta, tutu ụbọchị ahụ dị ukwuu na dị egwu nke Onye-nwe abịa—

“Ịtụgharị obi nile nke ndị bụ nna nye ụmụ ha, na ndị ụmụ nye nna ha, ka ụwa nile ghara ibu ihe e jiri ọbụbụ-ọnụ gburie—

“Ya mere, ọtụghe-ụzọ nile nke ọgbọ nke a ka e nyefere n’aka unu abụọ; na site na nkea unu ga-ama na ụbọchị ukwu ahụ dị-egwu nke Onye-nwe dịkwa nso, ọbuna n’ọnụ ụzọ nile.”8

A na m agba ama na Onye-nwe hụrụ ọhụ nke ọdịnịhu ma otu Ọ g’esi eduru anyị maka ị nyere anyị aka mezuo ebumnuche Ya nile n’ụbọchị nile nke ikpeazu a.

Oge m n’arụ ọrụ dịka Onye Bishọpụ Ndụzi ọtụtụ afọ gara aga, e nyere m ikike ọrụ ka m hụ maka ndị otú nrọpụta ma mwulite ahụ kepụtara ihe anyị kpọrọ FamilySearch. A kpacharam anya i kwu na m “hụrụ” maka nkepụta ya, kama i kwu na ọ bụm “tụziri aka” na ya. Ọtụtụ ndị ọkammụta hapụrụ ọrụ ha ma bịa ị wulite ihe Ọnye-nwe chọrọ.

Ndị Isi Nduzi nke Mbụ nwere ebunmobi ịbelata ọnụ-ọgụgụ mmegharị emume-nsọ nile ndị emere na mbụ. ihe kacha nye ha nsogbu bụ na anyị enweghi ike ị mata ma emeworịị emume-nsọ nile nke onye ọbụla na mbụ. Ruo ọtụtụ afọ—m’ọbụkwanụ ihe dịka ọtụtụ afọ—Ndi isi Nduzi nke Mbụ jụrụ mụ, “Kedụ mgbe ị g’eme ya?”

Nihi ekpere, ịdị ike n’ọrụ, ma ịtụaja nke onwe nke ndị mmadụ nwere nnukwu ịdị-ike, emezuru ọrụ ahụ. Ọ bịara nwayọ nwayọ. Ọrụ nke mbụ bụ ị mee ka FamilySearch dịrị mfe iji rụọ ọrụ maka ndị ahụ n’amaghị kọmpụta ọfụma. Ọtụtụ mgbanwe bịara, ma a maram na ha ga n’abịa n’ọdịnihu, nihi mgbe ọbụla anyị gara n’ihu gboo otu nsogbu, anyị n’emeghe ụzọ maka mkpuhe ọzọ maka ihe ntolite ndị ọzọ dịkwa mkpa, kama ahụbeghi ha ugbua. Ruokwa ma taa, FamilySearch n’aga nihu ịbụ ihe ahụ Ọnye-nwe chọrọ maka Mweghachi-azụ Ya—n’abụchaghị nanị maka ịgbanagharị mmegharị emume-nsọ.

Onyenwe anyị n’ahapụ ka anyị melite ihe maka ịnyere ndị mmadụ aka mata ndị nna-nna ha ọfụma ma hụ ha n’anya ma mezuoro ha emume-nsọ nile nke tempụl. Ugbua, dịka otu Ọnye-nwe si mara n’ezie n’ọga eme, ndị ntorobịa n’abụrụ ndị nkụzi nye ndị nne-na-nna ha ndị ngalaba-ụka ha. Ha nile enwetawo nnukwu ọñụ n’ime ijeozi nke-a.

Mụọ nke Elaịja n’agbanwo obi nile ndị ntorobịa ma ndị okenye, ndị ụmụ ma nne-na-nna, ndị ụmụụmụ na ndị nne-na-nna-ukwu. Mgbe n’adịghị anya, tempụl nile ga-ejikwa obi ọma ọzọ n’arọpụta ọtụtụ ohere maka baptizim ma emume-nsọ nile. Ọchịchọ nile maka ijere ndị nnanna anyị ozi ma tinyekwara njikọ dị n’etiti ndị nne na nna na ndị ụmụ na eto-eto.

Ọnye-nwe hụrụ ihe ndị a nile ka ha n’abia. Ọ bụ Ya haziri ya nwayọ nwayọ dịka otu O si mee mgbanwe ndị ọzọ nime Nzụkọ-nsọ Ya. Ọ kpọlitewo ma kwado ndị kwusịrị ike n’okwukwe, ndị họọrọ ị mee ihe siri ike nke ọma. Kamgbe rịị ka Ọ ji ịhụnanya na ndidi n’enyere anyị aka ị mụta “ahịrị n’elu ahịrị, ozizi n’elu ozizi, ntakịrị n’ebe a ntakịrị n’ebe ahụ.”9 Ọ sepụghị aka imezu ọchịchọ Ya n’oge ma n’usoro Ọ chọrọ ha, tụmadị Ọ n’eme ka ịtụaja nwete ngọzị akwụsịghị-akwụsị nke anyị ahụghị mọlị.

A na m emechi site ị gosipụta obi ekelem nye Ọnye-nwe—Ọ kpalitere Onyeisi Nelson ka ọ kpọm ka m tụọ aja maka nkwado maka ọgbakọ nke-a. Awa ọbụla ma ekpere ọbụla n’oge mkwado m ewetawo otu ngọzi.

A nam akpọku onye ga’nụ ozi a, mọbụ onye g’agụ mkpụrụ okwu ndịa ka ọ nwee okwukwe na Ọnye-nwe n’edu Mweghachi nke oziọma Ya ma Nzukọ-nsọ Ya. Ọ N’eje Anyị Ije N’ihu Ọ mara maka ọdịnihu n’ụzọ zuru oke. Ọ nakpọ anyị okú kanyị soro nọrụ. O sokwara anyị nime ya. Ọ dobere atụmatụ maka ijeozi gị. Ma dịka ị n’atụ aja, ị g’enweta ọñụ dịka ị n’enyere ndị ọzọ aka ka ha bilie ma dịrị na njikere maka ọbịbịa Ya.

A na m agbara unu ama na Chineke Nna dị ndụ. Jizọs bụ Kraịst ahụ. Nke a bụ Nzukọ-nsọ Ya. Ọ maara gị ma hụkwa gị n’anya. Ọ n’edu gị. Ọ kwadoworo gị ụzọ ahụ. Site na aha di nsọ nke Jịzọs Kraịst, amen