Ọgbakọ Zuru ọha
Ka Ha Wee Hụ Ụzọ
Ọgbakọ Zuru-ọha Eprel 2020


Ka Ha Wee Hụ Ụzọ

Legharịa anya ma kpee ekpere maka ohere ime ka ihe gị chakee ka ndị ọzọ wee nwee ike hụ ụzọ ị bịakwute Jizọs Kraịst.

Ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị, anyị e nwetawo ngọzi na mkpụrụ obi anyị ma bụrụ ndị e mere ọhụụ site na Mmụọ nke metụrụ anyị na-ọgbakọ nke a.

Foto, oyiyi
Otu ogidi ihe

Narị afọ abụọ gara aga, ngidi ihe dakwasịrị otu nwata nwoke n’okpuru igwe osisi. N’ime ihé ahụ, Josef Smit hụrụ Chineke Nna na Okpara Ya, Jizọs Karịst. Ihe Ha chụpụrụ ọchịchịrị nke mmụọ kpuchidere ụwa ma gosị ụzọ nke Josef Smit ga-eso—tinyekwara anyị niile. N’ihi ihe nke ahụ e kpughere ụbọchị ahụ, anyị nwere ike ị nata ngọzi niile n’uju nke e wepụtara site na Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraist.

Site n’ike nke ozi ọma Ya Eweghachitere, anyị nwere ike ijuputa n’ihe nke Onye Nzọpụta anyị. Kaosiladị, ihe ahụ a bụghị ihe e meere naanị mụ na gị. Jizọs Kraist a kpọkuola anyị i me “ka ìhè unu si otu a n’enwu n’iru ndị a, ka ha wee hụ ọrụ ọma unu ma nye Nna unu nke bi n’eluigwe otuto.”1 Enweela m ịhụnaanya na nkebi okwu a “ka ha wee nwee ike hụ.” Ọ bụ ọkpụkpọ oku dị mkpa si n’aka Onyenwe anyị itinye obi n’ihe gbasara inyere ndị ọzọ aka hụ okporo ụzọ ahụ wee si otu a bịakwute Kraịst.

Foto, oyiyi
Okenye L. Tom Perry

Mgbe m gbara afọ iri, ezi na ụlọ anyị nwetara ohere ọma nke ilekọta Okenye L. Tom Perry nke Kworum Ndị Ozi Iri na abụọ mgbe ọ bịara ọrụ na obodo a mụrụ m.

Ka chi jiri, ezi na ụlọ anyị na ndị nke Perry nọdụrụ ala n’ime ụlọ anyị inwe ọńụ site na apple pie na-atọ ụtọ nke nne m mere ebe Okenye Perry kọdaruru ala akụkọ dị iche iche banyere Ndị nsọ na gburugburu ụwa. E nwere m oke obi ụtọ.

Oge agawala mgbe nne m kpọbatara m na usekwu ma jụọ otu ajụjụ dị mfe: “Bonnie, i nyere ụmụ ọkụkọ ahụ nri?”

Obi mafuru m ; e nyebeghị m ha. Na-achọghị ị pụ n’iru Onye ozi nke Onyenwe anyị, a tụrụ m uche na ụmụ ọkụkọ ahụ nwere ike buo ọnụ ruo na-ụtụtụ.

Nne m kụrụ isi n’ala sị “mba.” N’otu ntabi anya ahụ, Okenye Perry batara na usekwu n’olu okwu ya n’ehi ụda, dị na mmasị ime obi ụtọ wee jụọ, “A nụrụ m na mmadụ kwesịrị inye ọkụkọ nri? Mụ na nwa m nwoke anyị nwere ike i soro unu?”

Ee, ọ bụrụwo ihe oke ọńụ ugbu a inye ụmụ ọkụkọ nri! Agbara m ọsọ ị ga weta nnukwu tọọchị anyị. N’oke obi ụtọ, e butere m ụzọ, na-awụfe ụzọ ahụ na-adịchaghị mma gawarra ebe nche ọkụkọ. Site na tọọchị ahụ n’efegharị n’aka m, anyị gafere ebe a wụsara ọka ma si n’ebe a kụrụ wit gafere.

Na-irute ebe a rụrụ obere akwa mmiri nke gafere okporo ụzọ ahụ, a wụfere m na-eleghị anya n’azụ dị ka m naara emebu ọtụtụ anyasị. Uche m agbataghị na mbọ Okenye Perry naara agba iji bịakwute m n’okporo ụzọ ahụ gbara ọchịchịrị na ọ maghị. Ọkụ m na-awụgharị e nyereghị ya aka ị hụ olulu ahụ. Na-enweghị ọkụ na-enwugide ị hụ ụzọ, ọ dabara na mmiri ahụ wee tie mkpu dị egwu. N’ịtụ egwu, a tụgharịrị m ị hụ enyi ọhụrụ m na-efopụta ụkwụ ya dere mmiri site n’olulu ahụ wee na-efepụsị mmirri banyere na-akpụkpọ ụkwụ ya dị ukwuu.

Na-akpụkpọ ụkwụ n’ehi mmiri o yi, Okenye Perry nyeere m aka inye ụmụ ọkụkọ ahụ nri. Mgbe anyị mechara, o jiri ịhụnaanya sị m, “Bonnie, a chọrọ m ị hụ okporo ụzọ ahụ. A chọrọ m ka ọkụ ahụ na-acha ebe m na-aga.”

A naara m a mụke okụ m mana ọ bụghị n’ụzọ ga-enyere Okenye Perry aka. Ugbu a, ị mata na ọ chọrọ ọkụ m iji gafee okporo ụzọ ahụ na nchekwa, e chuwara m tọọchị ahụ ihu n’ofere nzọ m ụkwụ ya anyị e wee nwee ike laghachi n’ebe obibi na obi si ike.

Ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, ke mgbe ọtụtụ afọ a tụgharịwo m uche n’ụkpụrụ ahụ m mụtara site n’aka Okenye Perry. Ọkpụkpọ oku nke Onyenwe anyị ime ka ọkụ anyị chaa nke ọma a bụghị sọọsọ ịdị na-efegharị ihe ọkụ anyị otu o jiri sọọ anyị ma mee ka ụwa niile nwekarịa ihe. Ọ bụ ịwụkwasị ihe ahụ ka ndị ọzọ wee nwee ike hụ ụzọ ị bịakwute Kraịst. Ọ bụ ịkpọkata Izrel na ndị dị ndụ—inyere ndị ọzọ aka hụta ka ha si aganiihu na-ime na idobe ọgbụgba ndụ dị nsọ nke ha na Chineke.2

Onye Nzọpụta gbara ama sị, “Lee abụ m ìhè ahụ; e doziwo m ihe ima-atụ nye unu.”3 Ka anyị leba anya n’otu n’ime ọmụmaatụ Ya.

Nwanyị ahụ nọ n’ebe olulu mmiri bụụrụ onye Samerịa onye nke na-amaghị Jizọs Kraist ma bụrịị onye ọtụtụ mmadụ hụtara dị ka onye a chufuru achufu na-ebe ya onwe ya bi. Jizọs zutere ya ma malite mkparịta ụka. Ọ gwara ya okwu banyere mmiri. O dubara ya n’inwe ihe bara ụba dị ka O kwupụtara Onwe Ya ị bụ “mmiri na-enye ndụ.”4

Kraịst nobi ebere Ya maara ya na mkpa ya niile. O zutere onye inyom ahụ ebe ọ nọ ma bido ikwu okwu banyere ihe a maara amara nke metụtara ha niile. Ọbụrụ na Ọ kwụsịrị ebe ahụ, ọ gaara a bụ nzute dị mma. Mana ọ garaghị eduba na ya ị gawa na obodo i kwupụta, “Bịanụ, lee … : onye a ọ bụghị Kraịst ahụ?”5 Nwayọ nwayọ, site na nkata ahụ, ọ chọpụtara Jizọs Kraist, ma na-agbanyeghị ndụ ya n’oge gara aga, ọ ghọrọ ngwa ọrụ nke ihe, na-amụke n’ụzọ ka ndị ọzọ wee hụ ụzọ.6

Ugbu a ka anyị leba anya na mmadụ abụọ ndị gbasooro ọmụmaatụ nke Onye Nzọpụta banyere ime ka ahụ ihe. Mgbe na-adịghị anya enyi m Kevin nọketere onyeisi azụmahịa nso n’oge nri abalị. O nyere ya nsogbu banyere ihe ha ga-ekwu na awa abụọ. Site na mkpalite nke mmụọ, Kevin sịrị, “Gwa m ihe gbasara ezi na ụlọ gị. Ebee ka ha siri bịa?”

Dimkpa ahụ amachaghị ihe banyere ebe o siri lọ ụwa, ya mere Kevin wepụtara ekwe ntị ya, na-asị, “E nwere m otu app na ejikọ ndị dị iche iche na ezi na ụlọ ha. Ka anyị lee ihe anyị nwere ike ịchọpụta.”

Ka a kpachara nkata ogologo oge, enyi ọhụrụ nke Kevin jụrụ, “Gịnị mere ezi na ụlọ ji dị nzukọ nsọ gị oke mkpa?”

Kevin zara n’ụzọ dị mfe, “Anyị kwere na anyị ga-aganiihu ịdị ndụ mgbe anyị nwụchara. Ọ bụrụ na anyị achọpụta ndị nna nna anyị ochie wee wega aha ha n’ebe dị nsọ a kpọrọ tempụl, anyị nwere ike mee emume nsọ alụmdi niile nke ga-edokọta ndị ezi na ụlọ anyị ọnụ ọbụladị mgbe ọnwụ gasịrị.”7

Kevin na enyi ya ọhụrụ jiri ihe ya na enyi ya nwekọrọ ọnụ bido. Mgbe ahụ ka ọ hụtara ụzọ iji gbaa ama ihe na ịhụnaanya nke Onye Nzọpụta.

Akụkọ nke abụọ bụnnọ nke gbasara Ella, onye ọkụ basketball na kọleji. Ọmụmaatụ ya bidoro mgbe ya bụ nwanyị natara ozi ọkpụkpọ oku ya mgbe ọ nọ n’ụlọ akwụkwọ. Ọ họọrọ i mepe oku ya n’ihu ndị otu egwuregwu ya. O nwetụghị ihe ọbụla ha maara banyere Nzukọ nsọ ahụ nke Jizọs Kraist ma o nweghị ihe ha ghọtara banyere ọchịchọ Ella n’ije ozi. O kpere ekpere ugboro ugboro ị mata ka ọ ga-esi kọwaa ọkpụkpọ oku mishọn ya n’ụzọ ndị otu egwuregwu ya nwere ike nweta mmetụta nke Mmụọ. Ọsịsa ya?

Ella sịrị, “E mere m PowerPoint,” “n’ihi na obi ruru m ala.” Ọ gwara ha ihe dị na-ije ozi n’otu n’ime 400 mishọn na ọma nakwa ohere dị na i nwere ike ịmụta otu asụsụ. Ọ kọwapụtara ihe banyere puku kwuru puku ndị ozi mgbasa ozi ọma nọrịị na-eje ozi. Ella jiri foto nke Onye Nzọpụta na nkenke ama nke a mechie: “Basketball bụ otu n’ime ihe ndị kachasị mkpa na ndụ m. A gafere m kọntịrị ahụ ma hapụ ezi na ụlọ m ị ga kụọrọ onye nkuzi bọl nke a bọl mụ na ndị otu m. Naanị ihe abụọ dịkarịsịrị m mkpa karịa basketball bụ okwukwe m na ezi na ụlọ m.”8

A dịghị ama ama ya a bụrụ na ị na-eche echiche, “Ndị a bụ 1,000-watt ọmụmaatụ, mana a bụ m 20-watt bọb,” chetakwa na Onye Nzọpụta gbara ama sị, “A bụ M ihe ahụ nke ị ga-ejigide.”9 Ọ na-echetara anyị na Ọ ga-ewetara anyị ihe ahụ ma ọ bụrụ na anyị e mee ka ndị ọzọ mata Ya.

Mụ na gị nwere ihe zuru ezu i nyetụ ndị ọzọ ugbu a. Anyị nwere ike malite ugbu a n’inyere mmadụ aka bịakwute Jizọs Kraist nso, zọpụ nzọm ụkwụ ọzọ, na ọzọ.

Jụọ onwe gị, “Onye chọrọ ihe ahụ i kwesịrị ị chọpụta okporo ụzọ ha chọrọ mana e nweghị ike ahụ ya?”

Ezi ndị enyi m, gịnị mere anyị ịmuke ihe anyị ji dị oke mkpa? Onyenwe anyị a gwawo anyị na “e nwekwararịị ọtụtụ ndị ka nọ n’ụwa … bụ ndị nke na-enwetabeghị eziokwu n’ihi na ha a maghị ebe ha ga-achọta ya.”10 Anyị pụrụ inye aka. Anyị nwere ike kpachara anya wakee ihe anyịahụ ka ndị ọzọ wee nwee ike hụ ụzọ. Anyị nwere ike kpọkuo ndị mmadụ.11 Anyị nwere ike soro ndị na-amalite njem ahụ mbụ ị bịakwute Onye Nzọpụta, na-agbanyeghị ka o si na-akwụsị. Anyị nwere ike ikpokọta Izrel.

A na m agba ama na Onyenwe anyị ga-eme ka obere mbọ ọbụla hie ụda. Mmụọ Nsọga-akpalite mmụọ anyị ị mata ihe anyị ga-ekwu na ihe anyị ga-eme. Ụdị mgbalị ahụ nwere ike chọọ anyị isi na-ebe ahụ doro anyị pụta, mana anyị nwere ike nwee mmasi obiike na Onyenwe anyị ga-enyere ihe anyị aka ịmụke.

Lee ka obi m si ju n’ekele maka ihe nke Onye Nzọpụta, nke na-aganiihu edu Nzukọ nsọ nke a site na mkpughe.

Foto, oyiyi
Onye Nzọpụta jidere oriọna

A na m a kpọku anyị niile ka anyị gbasoro ọmụmaatụ nke Jizọs Kraist wee nwee ike na-ọmịịiko mata ndị ahụ nọ na gburugburu anyị. Legharịa anya ma kpee ekpere maka ohere ọma ime ka ihe gị chakee ka ndị ọzọ wee nwee ike hụ ụzọ ị bịakwute Jizọs Kraịst. Nkwa Ya dị egwu: “Onye ọbụla nke gbasoro m a gaghị eje ije na-ọchịchịrị, kama ọ ga-enwe ihe nke ndụ.”12 A na m agba ama na Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst, bụ ụzọ,eziokwu, ndụ, ihe, na ịhụnaanya nke ụwa. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen

Hụba-ama

  1. 3 Nifaị 12:16.

  2. Russell M. Nelson, “Olileanya nke Izrel” (mgbakọta maka ofufe nke ndị ntoroọbịa na gburugburu ụwa, June 3, 2018), OlileanyankeIzrel.NzukọnsọnkeJizọsKraịst.org.

  3. 3 Nịfaị18:16.

  4. Lee Jọn 4:9–30.

  5. Jọn 4:29.

  6. Lee Robert na Marie Lund, “Ugwu nke Onye Nzọpụta nwere maka Ndị inyom,” Laịhona, Mar. 2015, 32–36.

  7. Nzikọrịta-ozi nke onwe.

  8. Nzikọrịta-ozi nke onwe.

  9. 3 Nifaị 18:24.

  10. Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 123:12.

  11. Lee Dieter F. Uchtdorf, “Ọrụ Mgbasa ozi ọma: Ịkọwapụta ihe nọ gị n’obi,” Laịhona, Me 2019, 15–18.

  12. Jọn 8:12.