Ọgbakọ Zuru ọha
Mkpu Hosana
Ọgbakọ Zuru-ọha Eprel 2020


Mkpu Hosana

Ugbua, ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, dị ka anyị na-eme nkwanye ugwu maka Ọhụ Nke Mbụ nke Josef Smit nke Nna na Ọkpara Ya, anyị chere na ọ ga-adị mma ịńụrịkọta ọńụ site n’isoro na Mkpu Hosanna.

Mkpu nke a dị nsọ ka enyere na mbụ n’ọgbọ nke a n’oge ido-nsọ nke Tempụl Kirtland na Machị 27, 1836. Ugbua a n’eti ya na ido-nsọ tempụl ọbụla. Ọ bụ onyinye nsọpụrụ dị nsọ nye Nna na Ọkpara ahụ, nke n’egosi omume nke igwe mmadụ mgbe Onye Nzọpụta mere mbata mmeri Ya banye Jerusalem. Ọ nakwa ekwusikwa ike nhụmihe nke Josef nta nwetere n’ụbọchị ahụ na Ọdọ-osisi Dị Nsọ—ndị gụnyere, na Nna na Ọkpara Ya bụ Ndị abụọ dị ndụ nwere ebube, ndị anyị n’efe ma na-enye otito.

Ugbua a ga m egosi otu Mkpu Hosanna ga-esi abụ. Dịka m na-eme, a na m akpọku ndị otu anyị n’ikuku iji nkwanye ugwu na nsọpụrụ egosi mmemme a dị nsọ n’ezie.

Onye ọbụla so n’ihe a na-eme n’ewere handikachifu ọcha dị ọcha, jide ya n’akụkụ, ma fegharịa ya mgbe anyị n’ekwukọrịta n’otu ụda olu, “Hosanna, Hosanna, Hosanna nye Chineke na Nwa Atụrụ ahụ,” ekwugharịrị ugboro atọ, nke “Amen, Amen, na Amen” sotere. Ọ bụrụ na i nweghị handikachifu ọcha, i nwere ike fegharịa aka.

Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, ugbua a na m akpọku unu iguzoro ma soro n’iti Mkpu Hosanna, emesịa ya Hosanna Anthem na “The Spirit of God”1 ka a ga-ekwe.

Mgbe onye ntụzi aka nyere ngosi, biko soro n’ịgụ “The Spirit of God.”

Hosanna, Hosanna, Hosanna dịrị Chineke na Nwa Atụrụ Ya.

Hosanna, Hosanna, Hosanna dịrị Chineke na Nwa Atụrụ Ya.

Hosanna, Hosanna, Hosanna dịrị Chineke na Nwa Atụrụ Ya.

Amen, Amen, na Amen.

Lee anya

  1. Hymns, no. 2.