Ọgbakọ Zuru ọha
Bịakwutenu Kraịst—Ibi ndụ dịka Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a
Ọgbakọ Zuru-ọha Eprel 2020


Bịakwutenu Kraịst—Ibi ndụ dịka Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a

Anyị nwere ike mee ihe ndị siri-ike ma nyeere ndị-ọzọ aka mee otu ahụ, nihi na anyị mara onye anyị nwere ike ịtụkwasị-obi.

Ekele m gị, Okenye Soares, maka ịgbaa ama onye-amụma gị dị ike nke Akwụkwọ nke Mọmọn. Mgbe adịghị anya, E nwere m ohere-ọma pụrụ-iche ijide ibe akwụkwọ mbụ ejiri aka dee nke Akwụkwọ nke Mọmọn. Na-elu ibe akwụkwọ nke a, na oge mbụ n’ime ọgbọ nke a, e dere mkpụrụ-okwu ndị a nke Nifaị; “A ga m eje mee ihe ndị ahụ Onyenwe anyị nyere n’iwu-nsọ, n’ihi a ma m na Onyenwe anaghị enye ụmụ nke mmadụ iwu-nsọ, ma ọbụghị na ọ ga-edozi ụzọ ha ga-esị mezuo ihe ndị ahụ o nyere ha n’iwu-nsọ.”1

Foto, oyiyi
Ịhu-akwụkwọ mbụ nkeAkwụkwọ nke Mọmọn

Dịka m ji ibe akwụkwọ a, obi m jupụtara na ekele maka mbọ nile Josef Smit gbara afọ 23 gbara, onye tụgharịrị asụsụ Akwụkwọ nke Mọmọn site na “onyinye na ike nke Chineke.”2 E nwekwara m obi ekele maka mkpụrụ-okwu nile nke Nifaị nta, onye nke enyere ọrụ siri-ike maka ịnata Laban epekele nile nke brass.

Nifaị mara na ọbụrụ na o lekwasị Onye-nwe-anyị anya, ọ ga-enwe mmerị na imezu iwu-nsọ Onye-nwe-anyị nyere ya. Ọ nọgidere na lekwasịrị Onye-nzọpụta anya na ndụ ya n’agbanyeghị na ọ tara-ahụhụ ọnwụnwa nile, mnwale nile, na ọbụnadịghị nhọgbu nke ụfọdụ ndị ezinaụlọ ya.

Nifaị maara onye O nwere ike tụkwasị obi.3 Ka o tichara, “O ogbenye-ọnụ-ntụ ka M bụ! E, obi m na-eru uju n’ihi anụ arụ m,”4 Nifaị kwuru, “Chineke m abụrụwọrị ebe ndabere nke m; o duwo m gafee mkpagbu m nile n’ime ọzara; ma o chekwawo m n’elu mmiri nile nke nnukwu ebe omimi.”5

Dịka ndị na-eso Kraịst, ewepụrụ anyị aka-mgba na mnwale nile n’ime ndụ anyị. A chọrọ ka anyị na-eme ihe ndị siri-ike, ọbụrụ na anyị mee na onwe-anyị, ga-ebu aka ma enwere-ike emeli ya. Dịka anyị nabatara ịkpọ-oku nke Onye-nzọpụta “biakwute m,”6 Ọ ga-enye nkwado, nkasị-obi, na udo dị mkpa, dịka O meere Nifaị na Josef. Ọbụnadị nime mnwale anyị nile, anyị nwere ike nata ịhụnanya Ya dịka anyị tụkwasịrị Ya obi ma nabata ọchichọ Ya. Anyị nwere ike ịnata ọńụ edobere maka ndị na-eso ụzọ Ya, maka “Kraịst bụ ọńụ.”7

Na afọ 2014, mgbe m na-arụ ọrụ mịshịọn, ezinaụlọ anyị hụrụ ihe anyị atụghị anya ya. Mgbe anyị na-aga njem na-agbada oke ugwu, nwa nwoke anyị kachasị nta dara-ada ma merụọ ahụ na ụbụrụ ya. Dịka ọnọdụ ya jọwara njọ, ndị ụlọ-ọgwụ bubara ya ime ya sọjịrị ọsọ-ọsọ.

Ezinaụlọ anyị gburu ikpere na-ala ime-ụlọ ụlọ-ọgwụ onweghị onye nọ ya, ma kwasara Chineke obi anyị. N’ime ọnọdụ nke a, ahụ anyị jupụtara na ịhụnanya na udo nke Nna anyị nke Elu-igwe.

Anyị amaghị ihe ga-eme ma-ọbụ ma anyị ga-ahụ nwa anyị nwoke ọzọ. Odoro anyị anya nke ọma na ndụ ya nọ Chineke na-aka ma ihe ọbụla Chineke kpebiri ga-abụ maka ịdị mma ya na anyị. Site na onyinye nke Mụọ, anyị dị na njikere ịnabata ihe ọbụla pụtara.

Njem ahụ adịghị mfe! Ịnọ ọnwa abụọ na ụlọ-ọgwu mgbe anyị bụ Ndị-isi ihe karịrị ndị mgbasa ozi-ọma 400. Nwa anyị nwoke amataghịkwa onwe ya. Ngwọta ya were ọtụtụ oge ịmụ ikwu-okwu na imegharị ahụ. Aka-mgba nile nọgidere, kama ka oge gachara anyị ahụla otu ọrụ-ebube.

Anyị ghọtara nke-ọma na ọbụghị mnwale ọbụla biakwutere anyị ga-apụta ka anyị si chọọ. Agbanyeghị, dịka anyị lekwasịrị Kraịst anya, anyị ga-enwe udo ma hụ ọrụ-ebube nile nke Chineke, ihe ọbụla ha bụ, nime oge Ya na ụzọ Ya.

A ga-enwe ọtụtụ oge mgbe anyị agaghị enwe ụzọ ọbụla ịmata na ihe ga-adị nma ma nwere ike bee, dịka Nifaị, “obi M na-eru uju nihi anụ arụ m.”8 E nwere ike nwee ọtụtụ oge mgbe nanị olile-anya anyị nwere bụ nime Jizọs Kraịst. Ọ bụ ngọzi inwe olile-anya na ntụkwasị-obi ahụ nime Ya. Kraịst bụ onye nke ga-edobe nkwa Ya nile mgbe ọbụla. Ezumike Ya nọọrọ ndị nile biakwutere Ya.9

Ndị-ndu anyị chọrọ ka anyị nile nweta udo na nkasị-obi ahụ site na ịtụkwasị-obi na ilekwasị-anya na Onye-nzọpụta Jizọs Kraịst.

Onye-amụma anyị dị-ndụ, Onye-isi Russell M. Nelson, na ekwupụta ọhụ nke Onye-nwe-anyị maka ndị ụwa na ndị-otu nke Nzukọ-nsọ nke Kraịst: “Ozi anyị nye ndị ụwa dị mfe ma bụrụ eziokwu: anyị na-akpọ ụmụ nke Chineke ma ndị dị ndụ na ndị nwụrụ-anwụ ka ha biakwute Onye-nzọpụta ha, nabata ngọzi nile nke temple dị-nsọ, nwee ọńụ na-adịgide, ma tozuo maka ndụ ebigh-ebi.”10

Ịkpọ-oku a “ịbịakwute Kraịst” nwere ihe pụrụ-iche maka Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a11 Dịka ndị-otu nke Nzukọ-nsọ nke Onye-nzọpụta,anyị na Ya agbaala ndụ ma bụrụ ụmụ Ya ndị nwoke na nwanyị ime mụọ12 Enyekwala anyị ohere-ọma ịrụrụ Onye-nwe-anyị ọrụ na ịkpọ ndị-ọzọ ịbịakwute Ya.

Dịka anyị na Kraịst na-arụ ọrụ, ilekwasị-anya anyị kachasị kwesịrị ịbụ nime ebe-obibi anyị nile. A ga-enwe ọtụtụ oge mgbe ndị-otu ezinaụlọ na ndị enyi ga-ahụ aka-mgba nile. Olu-okwu nile nke ndị ụwa, ma enwere ike ọchịchọ ha nile, nwere ike ime ha ịhapụ eziokwu. Anyị kwesịrị ime ihe nile anyị nwere ike ime inyere ha aka nweta ịhụnanya nke Onye-nzọpụta na nke anyị. A na m echeta amaokwu akwụkwọ-nsọ nke bụrụla abụ anyị hụrụ nanya “Hụ Onwe unu na-Anya,” nke na-akuziri anyị, “Site na nke a ka … mmadụ ga-ama … na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọbụrụ na unu nwere ịhụnanya nye onwe unu.”13

N’ime ịhụnanya anyị maka ndị amaghị eziokwu, onye-iro nke ọńụ nwere ike mee ka anyị chee na anyị na-edufu ndị ahụ anyị hụrụ n’anya ọbụrụ na anyị na onwe anyị nọgide ibi ndụ nke ozi ọma na-uju ma na-akuzi eziokwu ya nile.

Ikikere anyị ime ka ndị-ọzọ bịakwute Kraịst ma-ọbụ laghachi nye Kraịst ga-adị ire site na mkpebi anyị ịnọgide na ụzọ ọgbụgba-ndụ ahụ.

Ọbụrụ na ezi ọchịchọ anyị bụ ịnapụta ndị anyị hụrụ n’anya, anyị na onwe anyị ga-akwusị ike na Kraịst site na ịnabata Nzukọ-nsọ Ya na ozi ọma Ya na uju.

Na ịlaghachi na akụkọ nke Nifaị, anyị mara na mkpebi nke Nifaị ịtụkwasị Onye-nwe-anyị obi sitere na mmasị nke nne na nna ya ịtụkwasị Onye-nwe-anyị obi na ọmụmatụ idobe ọgbụgba-ndụ ha. Egosipụtara nke a nke ọma nime ọhụ nke Lehi nke osisi nke ndụ. Ka orichara mkpụrụ dị ụtọ ma na-enye ọńụ nke osisi ahụ, Lehi “lere anya [ya] gburu-gburu, na eleghị anya [o] nwere ike chọta ezinaụlọ [ya].”14 Ọ hụrụ Sariah, Sam, na Nifaị guzoro “dịka ha amaghị ebe ha ga-eje.”15 Lehi mgbe ahụ ekwuo, “E feere m ha aka; ma etịkwara m mkpu sị ha bịakwute m, bịa ma rachaa mkpụrụ osisi ahụ.”16 Biko mata na Lehi ahapụghị osisi nke ndụ ahụ. Ọ nọgidere Onyenwe anyị n’ime mụọ ma kpọkuo ezinaụlọ ya ịbia ebe ya na-aracha mkpụrụ osisi ahụ.

Onye-iro ga-eto ụfọdụ akpịrị ịhapụ ọńụ ahụ nke oziọma site na ikewapụ nkuzi nile nke Kraịst na Nzukọ-nsọ Ya. Ọ ga-eme ka anyị kwere na anyị nwere ike kwụrụsie ike na ụzọ ọgbụgba-ndụ na onwe anyị, site na mụọ anyị, ewetaghị Nzukọ-nsọ Ya.

Nime ụbọchị nile ikpeazụ a, eweghachitere Nzukọ-nsọ nke Kraịst iji nyere ụmụ ọgbụgba-ndụ nke Kraịst aka ịnọgide na ụzọ ọgbụgba-ndụ Ya.

Nime Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile anyị gụrụ, “Lee, nke a bụ ozizi m—onye ọbụla chegharịrị ma bịakwute m, onye ahụ bụkwa nzukọ-nsọ m.”17

Site na Nzukọ-nsọ nke Kraịst, a na agba anyị ume site na nhụmihe nile dịka otu ama nke Ndị-nsọ nile. Anyị na anụ olu-okwu Ya site naka ndị amụma, ndị ọhụ-ụzọ na ndị mkpughe Ya nile. Nke kachasị mkpa, site na Nzukọ-nsọ Ya anyị na-enweta ngọzi nile dị mkpa nke aja mgbaghara-mmehie nke Kraịst nke enwere ike inweta site na isoro mee emume-nsọ nile dị-nsọ.

Nzukọ nsọ nke Jisọs Kraịst nke Ndi nsọ Ụbọchi Ikpeazụ a bụ Nzukọ-nsọ nke Kraịst n’elu ụwa, eweghachitaworo na ụbọchị nile ikpeazụ maka nrite-uru nke ụmụ nke Chineke.

A na m agba-ama na dịka anyị na-abiakwute Kraịst ma bie ndụ dịka Ndị-nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a, a ga-eji karịa ịhụnanya Ya, ọńụ Ya, na udo Ya gozie anyị. Dịka Nifaị, anyị nwere ike mee ihe ndị siri-ike ma nyeere ndị-ọzọ aka mee otu ahụ, nihi na anyị mara onye anyị nwere ike ịtụkwasị-obi.18 Kraịst bụ ihé anyị, ndụ anyị, na nzọpụta anyị.19 Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen