Ọgbakọ Zuru ọha
Ọkwa Nchụaja Melkizedek na Ọtụghe-ụzọ ahụ niile
Ọgbakọ Zuru-ọha Eprel 2020


Ọkwa Nchụaja Melkizedek na Ọtụghe-ụzọ ahụ niile

N’ime Nzukọ nsọ ikike nke ọkwa nchụaja ka a na-etinye n’ọrụ n’okpuru ntuzi aka nke onye ndu ọkwa nchụaja onye ji ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja.

A họrọwo m ikwu ọzọ banyere ọkwa nchụaja nke Chineke, isiokwu nke mmadụ atọ na mbụ kwuru banyere ya ndị kuziiri anyị banyere otu ọkwa nchụaja si agọzi ndụ nke ndịinyom, ndịiyom nta na ndịikom nta.

Ọkwa nchụaja bụ ike na ikike dị nsọ ejidere na ntụkwasị obi nke eji arụ ọrụ nke Chineke maka ọdịmma nke ụmụ Ya niile. Ọkwa nchụaja abụghị ndị ahụ echiworo n’ọrụ ọkwa nchụaja m’ọbụ ndị n’eji ikike ya arụ ọrụ. Ndịikom ji ọkwa nchụaja abụghị ha bụ ọkwa nchụaja. Dịka anyị ekwesịghị ikpọ ndịikom echiri echichi dịka ọkwa nchụaja ahụ, ọ bụ ihe ziri ezi ikpọ ha ndị ji ọkwa nchụaja ahụ.

Ike nke ọkwa nchụaja dị ire ma n’ime Nzukọ nsọ ma n’ime ezi na ụlọ. Mana ike ọkwa nchụaja na ikike ọkwa nchụaja na-arụ ọrụ iche iche n’ime Nzukọ nsọ karịa ka ha si eme n’ime ezi na ụlọ. Nkea niile bụ dịka ụkpụrụ niile nke Onyenwe anyị wepụtaworo. Ebumnuche nke atụmatụ nke Chineke bụ idu ụmụ Ya banye n’ime ndụ ebighị ebi. Ezi na ụlọ nke ndụ anụ ahụ dị mkpa nye atụmatụ ahụ. Nzukọ nsọ nọ iwete ozizi ahụ, ikike ahụ, na emume nsọ niile ahụ dị mkpa iduga mmekọrịta ezi na ụlọ banye nime ndụ ebighị ebi. Ya mere, otú ezi na ụlọ na Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst nwere mmekọrịta siri ike n’etiti ha. Ngọzi niile nke ọkwa nchụaja—dị ka oziọma n’uju ya na emume nsọ niile dị ka baptizm, ime onye otu na ịnata onyinye nke Mmụọ Nsọ, onyinye dị nsọ nke tempụl, na alụmdi dị ebighị ebi—dị ire maka ndịikom na ndị inyom.1

Ọkwa nchụaja anyị n’ekwu ebe a bụ Ọkwa nchụaja Melkizedek, eweghachiri na mbido nke Mweghachite nke oziọma. Joseph Smith na Oliver Cowdery ka Pita, Jemis, na Jọn, chiri echichi ndị mara okwa n’onwe ha dịka ndị ji ọtụghe-ụzọ niile nke ala-eze ahụ, na nke ọgbọ nke ozuzu oge niile akara aka” (Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 124:40). Ndị ozi ukwu ndịa natara ikike ahụ site n’aka Onye Nzọpụta n’onwe Ya. Ikike ndị ọzọ niile ma ọbụ ọkwa niile nime ọkwa nchụaja bụ mgbakwunye nye Ọkwa nchụaja Melkizedek (lee Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 107:5), n’ihi na ọ “ji ikike nke otú ndịisi, ma nwere ike na ikike nke ọkwa niile nke nzukọ nsọ n’ọgbọ niile nke ụwa” (Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 107:8).

N’ime Nzukọ nsọ, ikike nke ọkwa nchụaja di ukwuu, Ọkwa nchụaja Melkizedek ahụ, na nke nta ma ọbụ Ọkwa nchụaja nke Erọn na-arụ ọrụ n’okpuru ntụzi aka nke onye ndu ọkwa nchụaja, dịka bishọp ma ọbụ onyeisi, onye ji ọtụghe-ụzọ niile nke ọkwa nchụaja ahụ. Ọ bụrụ na achọrọ ịghọta otu esi ejiri ikike ọkwa nchụaja arụ ọrụ n’ime Nzukọ nsọ, anyị ga-aghọtarịrị ụkpụrụ nke ọtụghe-ụzọ niile nke ọkwa nchụaja.

Ọtụghe-ụzọ niile nke Ọkwa nchụaja Melkizedek nke ala-eze ka enyefere site n’aka Pita, Jemis, na Jọn, mana nke ahụ emezughị mweghachite nke ọtụghe-ụzọ ọkwa nchụaja. Ụfọdụ ọtụghe-ụzọ nke ọkwa nchụaja mesịrị bịa. N’isote ido-nsọ nke tempụl nke mbụ nke ọgbọ nkea na Kirtland, Ohio, ndị amụma atọ—Moses, Elias, na Elijah—weghachitere “ọtụghe-ụzọ niile nke ọgbọ nkea,” tinyekọta ọtụghe-ụzọ niile gbasara mkpokọta nke Izrel na ọrụ tempụl niile nke Onyenwe anyị (lee Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 110), dịka Onyeisi Eyring kọwaziri nke ọma ugbua.

Ọmụmatụ kacha amaara ama maka ọrụ nke ọtụghe-ụzọ niile bụ na ime emume nsọ niile nke ọkwa nchụaja. Emume nsọ bụ emume dị nwanyọ n’egosipụta ịgba ọgbụgba ndụ na ikwe nkwa nke ngọzi. N’ime Nzukọ nsọ, emume nsọ niile ka a na-eme n’okpuru ikike nke onye ndu ọkwa nchụaja, onye ji ọtụghe-ụzọ niile nke emume nsọ ahụ.

Emume nsọ ọbụla ka a n’emekarị site n’aka ndị echiworo echichi otu ọkwa dị n’ime ọkwa nchụaja, wee neme nke-a n’okpuru ntuzi aka nke onye ji ọtụghe-ụzọ niile nke ọkwa nchụaja. N’ịmaatụ, ndị ji ọkwa dị iche iche nke Ọkwa nchụaja nke Erọn na-edu na emume nsọ nke oriri nsọ n’okpuru ọtụghe-ụzọ niile na ntuzi aka nke bishọp, onye ji ọtụghe-ụzọ niile nke Ọkwa nchụaja nke Erọn. Ụdị ụkpụrụ ahụ metụkwara emume nsọ ọkwa nchụaja na nke ndịinyom na-edu nime tempụl. N’agbanyeghị ndịinyom enweghị ọkwa n’ime ọkwa nchụaja, ha na-arụ ọrụ emume nsọ dị nsọ nke tempụl n’okpuru inye ikike nke onyeisi nke tempụl, onye ji ọtụghe-ụzọ niile maka emume nsọ niile nke tempụl.

Ọmụmatụ ọzọ nke ikike ọkwa nchụaja n’okpuru ntuzi aka nke onye ji ọtụghe-ụzọ niile bụ nkuzi niile nke ndịikom na ndị inyom akpọrọ ikuzi oziọma ahụ, ma ọbụ n’ime klas n’ebe ngalaba ukwu ha ma ọbụ n’ime ebe mishọn. Ọmụmatụ ndị ọzọ bụ ndị ahụ ji ọkwa ọchịchị n’ime ngalaba ukwu ma n’eji ikike ọkwa nchụaja arụ ọrụ n’ihi ọkwa ọchịchị ha n’ihi ọkpụkpọ okú ha, ma nihi ha n’okpuru ịdopụ-iche na ntuzi aka nke onyendu ọkwa nchụaja onye ji ọtụghe-ụzọ n’ime ngalaba ukwu ma ọbụ stek ahụ. Otu a ka esi eji ikike na ike nke ọkwa nchụaja arụ ọrụ ma n’erite ihe n’ime Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndi-nsọ Ụbọchi-ikpeazu a.2

Ikike ọkwa nchụaja ka ejikwa arụ ọrụ, ma ngọzi ya niile ka a na ahụta na ezi na ụlọ niile nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a. Ezi na ụlọ nkem na-ekwu maka ya bụ otu nwoke ji ọkwa nchụaja na otu nwanyị ndị lụrụ-alụ, ya na ụmụ ha. E tinyekọtakwara m ịdị iche iche dị na mmekọrịta ziri ezi dị ka nke ọnwụ ma ọbụ ịgba alụkwaghị m kpatara.

Ụkpụrụ ahụ nke kwuru na ikike ọkwa nchụaja ka enwere ike iji rụọ ọrụ nanị n’okpuru ntuzi aka nke onye ji ọtụghe-ụzọ niile maka ọrụ ahụ dị mkpa n’ime Nzukọ nsọ, mana nkea adịchaghị mkpa n’ime ezi na ụlọ. N’ịmaatụ, onye nna na-edu ma na-arụ ọrụ ọkwa nchụaja n’ime ezi na ụlọ ya site n’ikike nke ọkwa nchụaja o ji. Ọ dịghị mkpa ichọ ntuzi aka ma ọbụ inye nnabata nke onye ji ọtụghe-ụzọ ọkwa nchụaja iji nwee ike mee ọrụ ezi na ụlọ ya dị iche iche. Ndịa gunyere ịdụ ndị otu ezi na ụlọ ya ndụmọdụ, ime nzụkọ ezi na ụlọ, inye nwunye ya na ụmụ ya ngọzi niile nke ọkwa nchụaja, ma ọbụ inye ndị otú ezi na ụlọ ma ọbụ ndị ọzọ ngọzi ọgwụgwọ.3 Ndị ji ikike Nzukọ nsọ na-akụziri ndị otú ezi na ụlọ mana ha anaghị atụzi aka n’iji ikike ọkwa nchụaja arụ ọrụ n’ime ezi na ụlọ.

Otu ụkpụrụ ahụ dabakwara mgbe onye nna anọghị ma onye nne abụrụ onye ndu ezi na ụlọ. Ọnye nne na-edu n’ime ebe obibi ya ma bụrụ ngwa ọrụ n’iwete ike na ngọzi niile nke ọkwa nchụaja n’ime ezi na ụlọ ya site na onyinye dị nsọ na nrachi nke ya n’ime tempụl. Ebe enyeghị ya ikike inye ngọzi nke ọkwa nchụaja nke nanị onye ji ọkwa n’ime ọkwa nchụaja nwere ike inye, o nwere ike ime ọrụ ndị ọzọ niile nke onye ndu ezi na ụlọ. Na-ime otu ahụ, ọ n’eji ike nke ọkwa nchụaja arụ ọrụ maka ọdịmma nke ụmụ ahụ ndị ọ na-edu n’ọnọdụ ya nke onye ndu n’ime ezi na ụlọ.4

Ọbụrụ na ndị nna ga-akwado ọkwa nchụaja ha nime ezi na ụlọ nke ha, ọ ga-eme ozi nke Nzukọ nsọ a gaa n’ihu dịkwa ka ihe ọbụla ọzọ ha nwere ike ime. Ndị nna ndị ji Ọkwa nchụaja Melkizedek ga-eji ikike ha arụ ọrụ “site na ime ka ekwere, site n’ogologo ntachiobi, site na ịdị-umeala na ịdị nwayọ, na site n’ịhụ n’anya nke iru abụọ n’adịghị ya” (Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 121:41). Ọnọdụ ahụ dị elu maka ịrụ ọrụ nke ikike ọkwa nchụaja niile kacha dị mkpa n’ime ezi na ụlọ. Ndị ji ọkwa nchụaja kwesịkwara idebe iwu nsọ niile ka ha wee nwee ike ọkwa nchụaja iji nye ndị otú ezi na ụlọ ha ngọzi niile. Ha kwesịrị imepụta mmekọrịta ịhụnanya ezi na ụlọ ka ndị otú ezi na ụlọ nwee mmasị ịna ha ngọzi. Ma ndị nne na nna kwesịrị ime ka ngọzi ọkwa nchụaja dịrị karịa n’ime ezi na ụlọ.5

Na nzụkọ niile nke ọgbakọ ndịa, dịka anyị na-achọ ebe mgbaba nwa oge site na mkpa ndụ anụ ahụ ya na ọrịa ọjọọ, akuziworo anyị ụkpụrụ ukwuu nke ebighị ebi. A na m agba onye ọbụla n’ime anyị ume itinye anya anyị “nanị” n’ịnata eziokwu nke ebighị ebi ndịa niile ka ahụ anyị “ga ejupụta na ihe” (3 Nifaị 13:22).

Na nkuzi ya nye igwe mmadụ edere n’ime Baịbụlụ na n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn, Onye Nzọpụta kuziri na anụ ahụ nwere ike jupụta n’ihé ma ọbụ jupụta na ọchịchịrị. Anyị, n’ezie, chọrọ ijupụta n’ihé, ma Onye Nzọpụta anyị kuziiri anyị otu anyị nwere ike isi mee nke adị iré. Anyị ga-ege ntị nye ozi niile banyere eziokwu niile nke ebighị ebi. O jiri anya anyị nye ịhe ọmụmatụ, nihi ọ bụ ebe anyị n’esi ewebata ihé n’ime ahụ anyị. Ọbụrụ “anya anyị nọrọ nanị”—ekwugharịa ya n’ụzọ ọzọ, ọbụrụ na anyị tinye uche na ịnata ihé na nghọta nke ebighi ebi—Ọ kọwara, “ahụ gị niile ga ejupụta n’ihé” (Matiu 6:22; 3 Nifaị 13:22). Ma ọbụrụ na “anya anyị bụrụ njọ”—ya bụ, ọbụrụ na anyị chọọ njọ ma tinye nke ahụ n’ime ahụ anyị—Ọ dọrọ aka na ntị, “ahụ gị niile ga-ejupụta n’ọchịchịrị” (amaokwu 23). Na nkwugharị, ihé ahụ ma ọbụ ọchịchịrị dị n’ime ahụ anyị dabere n’otu anyị si ahụta—ma ọ bụ anata—eziokwu ebighị ebi niile nke akuziworo anyị.

Anyị kwesịrị isoro ọkpụkpọ oku nke Onye Nzọpụta ịchọ na ịrịọ ịghọta eziokwu niile nke ebighị ebi. O na-ekwe nkwa na Nna anyị nke Eluigwe dị na njikere ikuziri onye niile eziokwu ndị ha na-achọ (lee 3 Nifaị 14:8). Ọ bụrụ na anyị chọọ nkea ma debe anya anyị nanị n’ịnata ha, Onye Nzọpụta na-ekwe nkwa na eziokwu niile nke ebighị ebi “ka aga emepe” nye anyị (lee 3 Nifaị 14:7-8

N’ụzọ ọzọ, Setan chọsịrị ike ịgbagwoju echiche anyị anya ma ọbụ idufu anyị na ihe ndị dị mkpa dịka arụmọrụ nke ọkwa nchụaja nke Chineke. Onye Nzọpụta dọrọ aka na ntị maka ụdị “ndị-amụma-ụgha, ndị na-abịakwute unu n’ihe oyiyi atụrụ, mana n’ime ime ha bụ nkịta-ọhịa na-apụnara atụrụ” (3 Nifaị 14:15). O nyere anyị mnwale nkea inyere anyị aka họrọ eziokwu ahụ site n’etiti nkuzi dị iche iche nke nwere ike ịgbagwoju anyị anya: “Unu ga-amata ha site na mkpụrụ ha niile,” ka Ọ kuziri (3 Nifaị 14:16). “Osisi ọma enweghị ike imipụta mkpụrụ ọjọọ, ọbụghị [ma] osisi mebiri emebi ga-amịpụta mpụrụ ọma” (amaokwu 18 Ya mere, anyị kwesịrị ịchọ aziza—“mkpụrụ ahụ”—nke ụkpụrụ ndị akuziri na ndị mmadụ ndị na-akuzi ha. Nke ahụ bụ aziza kacha mma nye ọtụtụ ekweghi-ekwe niile anyị na-anụ megide Nzukọ nsọ na ozizi ya niile na iwu niile na odudu. Soro mnwale ahụ Onye Nzọpụta ahụ kuziworo. Chọọ mkpụrụ ahụ—aziza ahụ.

Mgbe anyị n’eche maka mkpụrụ nke oziọma na Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst eweghachitere, anyị na-ańụrị ọńụ n’otu Nzukọ nsọ ahụ, n’oge ndụ nke ndị otú ya dị ndụ, abawanyewo site n’ọgbakọ ime obodo n’ime Intermountain West ruo ihe karịrị nde 16 ndị otú ya bi nime mba ọzọ n’abụghị United States. N’ihi ito-eto ahụ, anyị ahụtawo mmụba n’ike nke Nzukọ nsọ n’inyere ndị otú aka. Anyị n’enye aka n’idebe iwu nsọ niile, n’imejupụta ọrụ nke ikwusa ozi ọma eweghachitere, n’ikpokọta Izrel, na n’iwu ụlọ tempụl gburugburu ụwa.

Onye Amụma na-edu anyị, Onyeisi Russell M. Nelson, onye odudu ya ka Onyenwe anyị jiriwo weta ọganihu nke anyị nweteworo n’oge afọ abụọ nke odudu ya. Ugbua anyị ga-enwete ngọzi site n’ịnụta n’aka Onyeisi Nelson, onye ga-akuziri anyị otu esi emelite ọganihu anyị n’ime Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst eweghachitere n’oge aka mgba ndịa.

A na m agba-ama eziokwu nke ihe ndịa niile ma sonyere unu n’ikpe ekpere maka onye amụma anyị, onye anyị ga-anụ site na ya ugbua, n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.