Ọgbakọ Zuru ọha
Imeghe Eluigwe maka Enyemaka
Ọgbakọ Zuru-ọha Eprel 2020


Imeghe Eluigwe maka Enyemaka

Kama k’anyị tinye okwukwe anyị nwere nime Kraịst na ọrụ!

Nke-a bụ nzukọ pụrụ iche ma dịkwa ịtụnanya! Unu emela, ezi Laudy na Enzo. Unu nọchitere anya ndị inyom nta na ndị ikom nta ọma nke Nzukọ-nsọ nkea nke ọma.

Ezi Ụmụnne m ndị nwoke na ndi nwanyị, anyị anụwo ọtụtụ ịhe maka mweghachi nke Nzụkọ-nsọ—Nzụkọ nsọ nke ahụ Onye Nzọpụta anyị Jizọs Kraịst hiwere n’oge mgbasa ozi Ya n’ụwa. Mweghachi ahụ bidoro afọ 200 gara aga n’oge spring nke-a, mgbe Chineke Nna na Ọkpara Ya Jizọs Kraịst, bịakwutere Josef Smit nta ahụ.

Afọ iri ọhụụ nke-a mesiri, Ọnye amụma Josef Smit na mmadụ ise ọzọ ka akpọrọ dịka ndị otú mbụ hiwere Nzụkọ-nsọ Onyenwe anyị eweghachitere.

Site na ntakịrị mmadụ ahụ gbakọrọ n’ọnwa Eprel 6 1830, ka esi nwete otú zuru ụwa nke karịrị deri 16 nke ndị otú. Ihe ọma nke Nzukọ-nsọ n’emezu gburugburu ụwa iji chụpụ ntaram ahụhụ nke mmadụ ma ịrọpụta mbuli nke mmadụ bụ ịhe ọha ma-ama. Mana ebumnuche nke ya kacha dịmkpa bụ ị nyere ndị ikom, ndị inyom na ụmụntakịrị aka isoro Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, dobe iwu Ya nile, ma tozuo oké ị nata ngọzị ahụ kacha ibe ya—nke bụ ndụ ebighi ebi, ha na Chineke ma ndị ha hụrụ n’anya.1

Dịka anyị n’echeta mmemme nke akpọbatara na afọ 1820, ọ dị mkpa k’anyị cheta na n’agbanyeghi anyị na-asọpụrụ Josef Smit dịka onye amụma nke Chineke, nke-a abụghị Nzukọ nsọ nke Josef Smit, m’ọbụkwanụ ọ bụ nzụkọ nsọ nke Mọmọn. Nke a bụ Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst. Ọ nyere iwu ịhe e kwesịrịrị ịkpọ Nzụkọ nsọ Ya: “N’ihi otu a ka a ga-akpọ nzukọ-nsọ m n’ụbọchị ndị ikpeazụ, ọbụna Nzụkọ nke Jisus Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a.”2

E kwuwo m mgbe gara aga maka mkpa ọ dị ị gbanwe ụzọ anyị si akpọ aha nke Nzụkọ nsọ nke-a.3 Kemgbe ahụ, ọtụtụ ịhe ka emeworo iji mezuo mmezi nke-a. A na m ekele nke ọma Onyeisi M. Russell Ballard na ndị Kworum Ndị Ozi nile, ndị meworo ọtụtụ ịhe iji nọrọ n’isi mbọ nile agbara, tinyekwara ndị ọzọ gbasara nrọpụta ndị m ga-ama ọkwa ya na mgbede nke-a.

Ndị ndu Nzụkọ nsọ na ngalaba nile, ọtú nile metụtara ya, ma deri kwuru deri ndị otú—ma ndị ọzọ—ugbua na-akpọ aha nke ziri eze nke Nzụkọ nsọ. Usoro nile nke ejiri mara Nzụkọ nsọ nke-a bụ nke ahazigharịrị Website nke isi nke Nzụkọ nsọ bụzi ChurchofJesusChrist.org. Addresị nile nke email, aha domain nile, na channel nile nke social media bụ nke emeliteworo. Ndị otú ọgụ abụ ọma anyị bụzi Ndị Otú Abụ nke Tabernacle dị na Ogige Tempụl.

Anyị agbawo ọtụtụ mbọ nile ndịa nihi mgbe anyị wepụrụ aha Ọnyenwe any] site na aha nke Nzụkọ nsọ Ya anyị kpachiziri-anya wepụ Ya dịka onye nọ n’etiti ofufe anyị ma n’ime ndụ anyị. Mgbe anyị wekwasịrị aha Ọnye Nzọpụta n’oge baptizim, anyị kpebiri ịgba akaebe, site n’okwu ọnụ, n’echiche na agwa anyị nile, na Jizọs bụ Kraịst ahụ.4

Na mbụ, ekwere m unu nkwa na ọbụrụ na anyị “ga-eme akụkụ nke anyị kacha mma iweghachite aha ziri ezi nke Nzukọ-nsọ nke Onyenwe anyị,” Ọ “ga awụdata ike Ya na ngọzi niile n’elu isi nke Ndi-nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a, ụdị ndi anyị na-ahụbeghị mbụ.”5 A na m ekwegharịkwa nkwa ahụ ọzọ taa.

Inyere anyị aka ị cheta ma kọta Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndi-nsọ Ụbọchi-ikpeazu a dịka Nzukọ nsọ nke Ọnyenwe anyị ọ masịrị anyị iwebata ihe nrụaka ga-egosi isi ebe Jizọs Kraịst nọ n’ime Nzụkọ nsọ Ya.

Akárá nke ahụ gụnyekwara aha nke Nzụkọ nsọ edere nime isinkwume. Jizọs Kraịst bụ nnukwu isinkwume ahụ.6

Foto, oyiyi
Nkume njikọ nwere ihe edere na ya.

N’etiti akárá ahụ bụ ịhe nnọchi anya nke ịhe akpụrụ-akpụ ahụ Thorvaldsen jiri mabụl kpụọ akpọrọ Christus. Ọ n’egosipụta Ọnyenwe anyị nke biliri n’ọnwụ dị ndụ ka ọ setịpụtara aka ya na-abakọọ ọnye ọbụla g’abịakwute Ya.

Dịka ịhe akárá, “Jizọs Kraịst guzoro n’okpuru arch ahụ. Arch ahụ n’echetara anyị maka Onye Nzọpụta biliri n’ọnwụ ka ọ n’esi nime ili n’apụta n’ụbọchị atọ akpọgburu Ya n’obe.

Foto, oyiyi
Akárá Ọhụrụ nke Nzukọ nsọ

Akárá ahụ kwesịrị ka ọtụtụ kọta ya, n’ihi otewo aka anyị tikọtara oziọma nke-a eweghachiri ya na Kraịst ahụ biliri n’ọnwụ dị ndụ

Akárá ahụ ka a ga-ejizi eme ịhe nkọta maka akwụkwọ nile, akụkọ nile ma mmemme nile eji ikike bipụta nke Nzụkọ nsọ.7 Ọ ga-echetara anyị nile na nke-a bụ Nzụkọ nsọ nke Ọnye Nzọpụta ma na ịhe nile anyị n’eme, dịka ndị otú, dabere n’elu Jizọs Kraịst ma n’elu oziọma Ya.

Ugbua, ezi ụmụnne m nwoke na ụmụnne m nwanyị, echi na abịa abịa bụ Sọnde Igwu Nkwụ, dịka Okenye Gong siworo kuzie n’ọnụ wara awa. Emesịa anyị abanye nizu-ụka pụrụ iche nke soro Ista. Dịka ndị n’eso Jizọs Kraịst, ndị bi n’ụbọchị mgbe ọrịa COVID- 19 tinyere ụwa n’ọgbaghara, k’anyị ghara ikwu nani maka Kraịst m’ọbu kwusa okwuchukwu maka Kraịst, m’ọbụ jiri otu akárá nke nnochi-anya Kraịst rụọ ọrụ.

Kama k’anyị tinye okwukwe anyị nwere nime Kraịst na ọrụ!

Dịka unu mara, ndị otú nke Nzụkọ nsọ nke-a n’edobe iwu nke ibu-ọnụ otu ụbọchị n’ọnwa.

Ozizi nke ibu-ọnụ bụ nke mgbe ochie. Ndị akpọrọ dike na baịbụlụ dobere iwu ahụ site ụbọchị isi mbụ ahụ. Mosis, Devid, Ezra, Nehemaịa, Esta, Aịsaịa, Daniel, Joel, na ọtụtụ ndị ọzọ buru ọnụ ma kwuo okwuchukwu maka ibu ọnụ.8 Site na ịhe Aizaịa dere, Ọnyenwe anyị kwuru: “Ọbụna ọ bughị ibu ọnụ nke-a ka m họọrọ? Ị tọghapụ agbụ ndị ọjọọ kere, ị bupụ ibu arụ, ma ị mee ka ndị a n’emegbu nwere onwe ha?”9

Ọnye ozi Pọl nyere Ndị nsọ Kọrịnt ndụmọdụ ka ha “rara onwe ha nyefe n’ibu-ọnụ na ekpere.”10 Ọnye Nzọpụta n’onwe Ya kwupụtara na ụfọdụ ịhe “anaghị apụ apụ m’ọbụghị site n’ekpere na ibu-ọnụ.”11

Oge n’eteghi aka ekwuru m nime video nke social media na “dịka onye dọkịnta na ọka-mmụta nchawa ahụ, enwere m nkwanye ugwu dị elu maka ndị ọka mmụta ahụike, ndị sayensị, ma ndị ọzọ n’arụ ọrụ oge nile maka ịbelata mfesasị COVID- 19.”12

Ugbụa, dịka Onye Isi Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndi-nsọ Ụbọchi-ikpeazu a ma dịka Onye Ozi nke Jizọs Kraịst, A maara m na Chineke “nwere ike nile, amamihe nile, na nghọta nile; ọ na-aghọta ihe nile, ma-ọbụ Onye ebere, ọbụna ruo nzọpụta, nye ndị ga-echegharị ma kwere n’aha ya.”13

Nihi nke-a, n’oge nchekasị ahụ a, dịka ugbua ọrịa n’amụba n’ike n’ike, ịhe anyị kwesịrị ị mee bụ ikpoku Nna anyị nke Eluigwe na Ọkpara Ya—Ọka Ibe nke Ọgwụgwọ-ọrịa —ka ha gosi ike ọma ha i ji gọzie ndị mmadụ nke ụwa.

Nime ozi vidiyo m, akpọkuru m ọnye nile ka ha soro n’ịbu-ọnụ nke Sọnde March 29, 2020. Ọtụtụ n’ime unu hụrụ vidiyo ahụ ma soro n’ibu-ọnụ ahụ. Ụfọdụ nwere ike ha ahụghị. Ugbua anyị ka chọrọ enyemaka si n’igwe.

N’ihi nke-a, n’abalị a, ezi ụmụnnem ndị nwoke na nwanyị, dịka mmụọ nke ụmụ ndị nwoke nke Mọsaịa, ndị nyewọrịị onwe ha na ikpe nnukwu ekpere, na ibu ọnụ,14 ma dịka otu nime ịhe nsonye nke ọgbakọ zuru-ọha nke Eprel, afọ 2020, A na m akpọ okú maka ibu-ọnụ zuru ụwa ọzọ. Maka ndị ahụike ha ga-ekwe, k’anyị buo ọnụ, ma jikọta okwukwe anyị nile ọnụ ọzọ. K’anyị jiri ekpere rịọ maka ezumike site na ọrịa nke-a zuru ụwa.

A na m akpọku onye nile, tinyekwara ndị ahụ n’abụghị ndị okpukperechi anyị, k’anyị buo ọnụ ma kpee ekpere n’ụbọchị Friday Ọma, n’ọnwa Eprel 10, ka enwe ike jikwa ọrịa nkea, ka ndị n’elekọta ndị ọrịa nwee nchekwa, ka agbaa azụmahịa ume, ma, ka ndụ dịrịkwa otu ọ dị mbụ.

Kedụ otu anyị si ebu ọnụ? Nrị ugboro abụọ m’ọbụ ruo awa 24 bụ otu omenala anyị sịrị dị. Mana unu nwere ike kpebie ịhe ọbụla bụụrụ unu ịhe ịtụ-aja, dịka ị n’echetakwa ịtụ-aja kacha ibe ya nke Ọnye Nzọpụta tụrụ n’ihi gị. K’anyị diri n’otu n’ịrịọ maka ọgwụgwọ-ọrịa gburugburu ụwa.

Ụbọchi Friday Ọma g’abụ nke kacha mma maka Nna anyị nke Eluigwe na Ọkpara Ya ị nụrụ olu anyị!

Ezi ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị. A na m ekwupụta ịhụnanya m dị omimi m nwere maka unu, tinyekwara ọgbụgba-ama m maka ịdị-nsọ nke ọrụ a nke anyị nọ nime ya. Nke-a bụ Nzụkọ nsọ nke Jizọs Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a. O guzoro n’isi ya ma n’atuzi aka n’ịhe nile anyị n’eme. A mara m na Ọ ga ege ntị nye akwa nile nke ndị Ya. A na m agba-ama n’aha dị nsọ nke Jizọs Kraịst, amen.