Ọgbakọ Zuru ọha
Soro Jizọs Kraịst na Nzọ ụkwụ niile nke Okwukwe
Ọgbakọ zuruọha Ọktoba 2022


Soro Jizọs Kraịst na Nzọ ụkwụ niile nke Okwukwe

Kraịst nwere ike iburu anyị taa site n’oge ndị siri ike. O meere ya ndị ọsụ ụzọ isi mbụ, ma Ọ na-emekwa ya ugbua maka onye ọbụla n’ime anyị.

Unu emeela, ndị kwaya, maka ịgụ “Okwukwe nke nọ n’ime Njem niile.” Egwu na okwu niile nke ukwe ahụ ka edere n’afọ 1996 site n’aka Newell Dayley1 na nkwadebe maka ememe ncheta mbata nke ndị ọsụ ụzọ isi mbụ na ndagwurugwu Salt Lake n’afọ 1847.

Na-agbanyeghị na ukwe nke a ka edere na nkwadebe maka ememe ahụ, ozi ya metụtakwara ụwa dum.

Ana m enwe mmasị na ukwe ahụ mgbe niile:

Site n’okwukwe na nzọ ụkwụ niile, anyị na-esoro Kraịst, Onyenwe anyị;

Ma jupụta n’olileanya site n’ịhụnaanya ya n’enweghị ntụpọ, anyị na-ekwe n’otu obi.2

Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, ana m agba ama na dị ka anyị na-esoro Jizọs Kraịst na nzọ ụkwụ niile nke okwukwe, enwere olileanya. Enwere olileanya n’ime Onyenwe anyị Jizọs Kraịst. Enwere olileanya maka mmadụ niile n’ime ndụ nkea. Enwere olileanya iji merie mmejọ anyị niile, mwute anyị, ndọlị anyị, na mnwale anyị na nsogbu anyị. Enwere olileanya na nchegharị na inwete mgbaghara na n’ịgbaghara ndị ọzọ. Ana m agba ama na enwere olileanya na udo n’ime Kraịst. O nwere ike iburu anyị taa site n’oge ndị siri ike. O meere ya ndị ọsụ ụzọ isi mbụ, ma Ọ ga-emekwara ya anyị ugbua maka onye ọbụla n’ime anyị.

Afọ a mere ncheta nke ugboro 175 nke mbata nke ndị ọsụ ụzọ isi mbụ na Ndagwurugwu Salt Lake, nke meworo m ji atụle na nna nna m ha, ụfọdụ ndị gara ije site na Nauvoo ruo na Ndagwurugwu Salt Lake. Enwere m ndị nne na nna nnukwu ndị gara ije na ala larịị ahụ mgbe ntoroọbịa ha. Henry Ballard gbara afọ 20;3 Margaret McNeil gbara 13;4 na Joseph F. Smith, onye mesịrị bụrụ Onyeisi Nzukọ nsọ nke isii, gbara naanị 9 mgbe ọ bịaruru na Ndagwurugwu Salt Lake.5

Ha zutere ụdị ụkọ niile nụzọ ahụ, dị ka oyi winta niile, nrịa nrịa, na ụkọ nri na uwe zuru oke. Dị ka ọmụmaatụ, mgbe Henry Ballard banyere Ndagwurugwu Salt Lake, ọ ńụrịrị n’ịhụta “Ala E Kwere na nkwa” mana bie ndụ n’ụjọ na mmadụ nwere ike hụ ya n’ihi na uwe nke o yi dọkara nke ukwuu nke mere na o kpuchighị ahụ ya kpamkpam. O zoro onwe ya na-azụ ọhịa ụbọchị taa niile tutu ruo abalị. Emesịa ọ gara n’otu ụlọ ma rịọ maka uwe ka ya nwee ike gaaniihu na njem ya ma chọta ndị nne na nna ya. Obi jupụtara ya n’ekele nye Chineke na ya ruteworịị ebe obibi ọdịniihu ya na nchekwa.6

Ndị nna nna nnukwu na nne nne nnukwu sooro Jizọs Kraịst na nzọ ụkwụ niile nke okwukwe gburugburu ụzọ ha niile. Obi jupụtara m nekele nye ha n’ihi adaghị mba. Nzọ ụkwụ ha niile nke okwukwe agọziwo m na ndudugandu niile ndị ọzọ, dị ka nnọọ nzọ ụkwụ gị nke okwukwe taa ga-esi gọzie ụmụ ụmụ unu.

Okwu ahụ ọsụ ụzọ bụ ma aha na ngwaa. Dị ka aha o nwere ike pụta mmadụ onye nọ n’etiti ndị mbụ ijegharị ma ọ bụ nọrọ n’ebe ọhụrụ. Dị ka ngwaa, o nwere ike pụta imepe ma ọ bụ ịkwadebe ụzọ ka ndị ọzọ isoro.7

Dị ka m na-eche banyere ndị ọsụ ụzọ kwadebeworo ụzọ maka ndị ọzọ, na mbụ ana m eche maka Onye amụma Josef Smith. Josef bụ ọsụ ụzọ n’ihi na nzọ ụkwụ ya niile nke okwukwe dugara ya na ọdọ osisi, ebe o gburu ikpere n’ekpere ma mepee ụzọ maka anyị iji nwete uju nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst. Okwukwe nke Josef iji “rịọ Chineke”8 n’ụtụtụ udu mmiri n’afọ 1820 mepere ụzọ nke Mweghachite nke uju nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst, nke gụnyere ndị amụma na ndị ozi akpọrọ oku ije ozi n’ụwa ọzọkwa.9 Ama m na Josef Smith bụ onye amụma nke Chineke. Ama m na nzọ ụkwụ ya niile jupụtara n’okwukwe dugara ya igbu ikpere n’ihu Chineke Nna na Ọkpara Ya Ọ Hụrụ naanya, Jizọs Kraịst.

Nzọ ụkwụ okwukwe niile nke Onye amụma Josef nyere ya ike ịbụ ngwa ọrụ n’aka Onyenwe anyị n’iwepụta Akwụkwọ nke Mọmọn, nke bụ ama ọzọ nke Jizọs Kraịst na amara mgbaghara Ya.

Site n’okwukwe na ntachi obi nke Josef Smith n’ihu ihe isi ike na mmegide dị egwu, o nwere ike ịbụ ngwa ọrụ n’aka Onyenwe anyị n’ihiwe Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst ọzọ n’ụwa.

Mgbe ọgbakọ zuru ọha ikpeazụ gara aga, ekwuru m okwu banyere otu ozi mgbasa ozi ọma m n’uju si gọzie m. A gọziri m dị ka m kuziri banyere atụmatụ nzọpụta dị ebube nke Nna nke Eluigwe, Ọhụ nke Mbụ nke Josef Smith, na ntụgharị asụsụ ya nke Akwụkwọ nke Mọmọn. Nkuzi niile na ozizi ndịa eweghachitere duru nzọ ụkwụ m niile nke okwukwe n’ikuziri ndị ahụ dị njikere ihe iji gee ntị n’ozi nke Mweghachite nke ozi ọma.

Ndị mgbasa ozi ọma anyị taa bụ ndị ọsụ ụzọ ụbọchi ugbua n’ihi na ha na-ekesa ozi ebube nkea n’etiti ndị mmadụ gbara ụwa gburugburu, site otu a na-emepe ụzọ maka ụmụ nke Nna nke Eluigwe ịmata Ya na Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst. Ịnabata ozi ọma nke Jizọs Kraịst na-emepe ụzọ ka onye ọbụla ji kwadebe maka ma nabata emume nsọ niile na ngọzi niile nke Nzukọ nsọ na tempụl.

N’ọgbakọ zuruọha gara aga, Onyeisi Russell M. Nelson kwughachiri “na Onyenwe anyị arịọwo onye ikom nta ọbụla tozuru oke, dị ike ikwadobe maka ma jee ozi mgbasa ozi ọma” ma na “ozi mgbasa ozi ọma bụkwa ohere dị ike, mana nke nhọrọ” nye “nwata nwanyị ọbụla nwere ike.”10

Ezi ndịikom nta na ndịiyom nta, nzọ ụkwụ okwukwe unu niile ga-enyere unu aka isoro ọkpụkpọ oku nke Onyenwe anyị iji jee ozi mgbasa ozi ọma—ịbụ ndị ọsụ ụzọ nke ụbọchi ugbua—site n’imepe ụzọ maka ụmụ nke Chineke iji chọta ma nọrọ n’ụzọ ọgbụgba ndụ n’edughachi n’ihu Ya dị ebube.

Onyeisi Nelson abụrụworịị ọsụ ụzọ na Nzukọ nsọ. Dị ka Onye Ozi o mewo njem na ma mepee ọtụtụ ala maka ikwusa ozi nke ozi ọma. Obere oge ọ bụụrụ onye amụma na Onyeisi Nzukọ nsọ, ọ rịọrọ anyị “ịmụba n’ike [anyị] iji nata mkpughe.”11 Ọ gara niihu ikuziri anyị ịgba ọgbụgba ama anyị ume. Nokwu nraranye maka ndị okenye nta, o kwuru:

Ana m arịọ unu ilekọta ọgbụgba ama unu. Rụọ ọrụ maka ya. Nwe ya. Lekọta ya. Nye ya nri ka o wee nwee ike too. …

“[Mgbe ahụ] lezie anya maka ọrụ ebube niile ime n’ime ndụ gị.”12

Ọ na-akuziri anyị otu esi adabere n’onwe n’ime mmụọ karịa. O kwuwo na “n’ụbọchị ndị na-abịa, ọ gaghị adị ire ịlanarị n’ime mmụọ n’enweghị mmetụta odudu, ntụzi aka, nkasị obi na nke na-anọgide nke Mmụọ Nsọ.”13

Ana m agba ama na Onyeisi Russell M. Nelson bụ onye amụma nke Chineke n’ụwa taa.

Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst, bụ ọsụ ụzọ kachasị n’ịkwadebe ụzọ ahụ. N’ezie, Ọ bụ ụzọ ahụ”14 maka iji mezuo atụmatụ nzọpụta ka anyị nwee ike chegharịa ma, site n’okwukwe na Ya, laghachiri Nna nke Eluigwe.

Jizọs sịrị, “A bụ m ụzọ ahụ, eziokwu, na ndụ: ọdighị onye ọbụla na-abịakwute Nna, ma ọbụghị site na mụ.”15 O kwewo nkwa ịghara ịhapụ anyị enweghị nkasị obi; Ọ ga-abịakwute anyị na mnwale anyị.16 Ọ kpọkuwo anyị ịbịakwute [Ya] n’uju nzube nke obi, ma [Ọ] ga-agwọ [anyị].”17

Ana m agba ama na Jizọs Kraịst bụ Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta anyị, Onye Nkwuchite anyị na Nna. Nna anyị nke Eluigwe emepewo ụzọ ka anyị ji laghachiri Ya site n’isoro Ọkpara Ya Ọ Hụrụ naanya, Jizọs Kraịst, jiri okwukwe n’ime nzọ ụkwụ ọbụla.

Nne na nna m nnukwu na ndị ọsụ ụzọ isi mbụ ndị ọzọ zutere ọtụtụ ihe mgbochi dị ka ha bịara site na wagọnụ, ụgbọala aka, na iga ije ruo na Ndagwurugwu Salt Lake. Anyị onwe anyị kwa ga-ezute aka mgba niile na njem onye ọbụla nime anyị site na ndụ anyị. Anyị adịghị akwa ụgbọala aka ma ọ bụ na-agba wagọnụ n’elu ugwu ukwu kpọdara akpọda na site na snowdrifts; anyị na-agbalị dị ka ha mere iji merie n’ime mmụọ ọnwụnwa niile na aka mgba niile nke ụbọchi anyị. Anyị nwere ụzọ iji gaa ije; anyị nwere ugwu nta niile—ma mgbe ụfọdụ ugwu ukwu niile—ịrị. Na-agbanyeghị na mnwale niile nke taa dị iche karịa ndị ahụ nke ndị ọsụ ụzọ isi mbụ, ha adịghị ntakịrị n’ịnwa anyị.

Ọ dị mkpa isoro onye amụma ma dogidesie ụkwụ anyị ike n’ụzọ ọgbụgba ndụ nke ikwesị ntụkwasị obi, dị ka ọ dịịrị ndị ọsụ ụzọ isi mbụ.

Ka anyị soro Jizọs Kraịst jiri okwukwe na nzọ ụkwụ niile. Anyị kwesịrị ijere Onyenwe anyị ozi ma jeere otu onye na ibe ya ozi Anyị kwesịrị inye onwe anyị mgbam ume n’ime mmụọ site n’idebe ma kwanyere ọgbụgba ndụ anyị ugwu. Anyị ekwesịghị itufu uche nke mkpa idebe iwu nsọ niile. Setan na-anwa iduhie mkpebi anyị na ịhụnaanya anyị maka Chineke na Onyenwe anyị Jizọs Kraịst. Biko cheta na ọ bụrụ ma onye ọbụla efuo n’ụzọ ha, anyị enweghị ike efuru Onye Nzọpụta anyị. Jiri ngọzi nke nchegharị, anyị nwere ike tụgharịa na Ya. Ọ ga-enyere anyị aka ịmụ ihe, too uto, ma gbanwee dị ka anyị na-agbalị ịnọ n’ụzọ ọgbụgba ndụ.

Ka anyị nọgide na-esoro na nzọụkwụ niile nke Jizọs Kraịst ma, site n’okwukwe na nzọ ụkwụ anyị niile, na-elekwasị Ya anya, na-eguzosi ike n’ụkwụ anyị n’ụzọ ọgbụgba ndụ, bụ ekpere umeala m naha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba ama

  1. Lee K. Newell Dayley, “Okwukwe na Nzọ ụkwụ niile,” Ensign, Jan. 1997, 15; Liahona, Feb. 1997, 22–23.

  2. Dayley, “Okwukwe na Nzọ ụkwụ niile,” Ensign, Jan. 1997, 15; Liahona, Feb. 1997, 23.

  3. Lee Henry Ballard diary, L. Tom Perry Special Collections, Harold B. Lee Library, Brigham Young University, Provo, Utah, archives.lib.byu.edu/repositories/ltpsc/resources/upb_msssc998.

  4. Lee “A ‘Small Glimpse’ into Pioneer Experiences,” Church News, June 15, 1996, thechurchnews.com.

  5. Lee Nkuzị niile nke Ndịisi Nzukọ Nsọ: Joseph F. Smith (1998), xiv.

  6. Lee Douglas O. Crookston, ed., Henry Ballard: The Story of a Courageous Pioneer, 1832–1908 (1994), 14–15.

  7. Lee Merriam-Webster.com Dictionary, “pioneer.”

  8. Jemis 1:5.

  9. Lee Josef Smit—Agụgụala 1:5–20.

  10. Russell M. Nelson, “Ikwusa Ozi ọma nke Udo,” Liahona, Me 2022, 6; original emphasis removed.

  11. Russell M. Nelson, “Mkpughe maka Nzukọ-nsọ, Mkpughe maka Ndụ Anyị,” Liahona,, Me 2018, 96.

  12. Russell M. Nelson, “Choices for Eternity” (worldwide devotional for young adults, Me 15, 2022), broadcasts.ChurchofJesusChrist.org.

  13. Russell M. Nelson, “Mkpughe maka Nzukọ-nsọ, Mkpughe maka Ndụ Anyị,” 96.

  14. Jọn14:6

  15. Jọn14:6.

  16. Lee Jọn 14:16–18.

  17. 3 Nifaị 18:32.