Ọgbakọ Zuru ọha
Ịbịaru Onye Nzọpụta nso
Ọgbakọ zuruọha Ọktoba 2022


Ịbịaru Onye Nzọpụta nso

Ị na-achọ ịmata ma hụ Onye Nzọpụta naanya, anyị na-ekewapụ onwe anyị iche pụọ n’ụwa site na ọgbụgba ndụ anyị na Chineke, ịdị iche, na-adịkarịghị, ma pụọ iche, na-ekewapụghị onwe anyị site na ndị ọzọ kwere n’ihe dị iche.

Ezi ụmụnne m nwoke na ụmụnne m nwanyị, na mgbede a ana m ekwuru ndị na-eso Jizọs Kraịst raara onwe ha nye. Dị ka m na-ahụ ịdị mma nke ndụ unu na okwukwe unu n’ime Onye Nzọpụta ebea n’obodo a ma na mba niile gburugburu ụwa, a hụrụ m unu niile naanya karịa.

Ruo n’ọgwụgwụ nke ije ozi Ya, ndị na-eso ụzọ Jizọs rịọrọ Ya ịgwa ha “akara nke [ọbịbịa Ya nke ugboro abụọ], na maka ọgwụgwụ nke ụwa.”1

Jizọs gwara ha ọnọdụ ndị ga-ebute nlaghachi Ya ụzọ ma mechie site n’ịma ọkwa, “Mgbe unu ga-ahụ ihe ndịa niile, [unu ga] ama na [oge ahụ] adịwo nso.”2

N’ọgbakọ zuruọha nke ikpeazụ, egeziri m ntị nke ọma n’okwu niile nke Onyeisi Henry B. Eyring: “Onye ọbụla n’ime anyị,” ka o kwuru, “ebe ọbụla anyị nọ, maara na anyị bi n’oge ịtụ egwụ na-abaanye nke ukwuu. … Onye ọbụla nwere anya ịhụ ihe ịrịba ama nke oge na niile ntị iji nụ okwu niile nke ndị amụma maara na ọ bụ eziokwu.”3

Onye Nzọpụta jara ndị na-eso ụzọ Ya dị ike mma: “Ngọzi ga-adịrị anya unu, n’ihi na ha na-ahụ ụzọ: ma ntị unu, n’ihi na ha na-anụ ihe.”4 Ka ngọzi nke a bụrụ nke anyị dị ka anyị n’ege ntị nke ọma n’okwu niile nke Onyenwe anyị site na ndị amụma Ya na ndị ọzọ n’ọgbakọ a.

Ọka whit na Ata

Onyenwe anyị kọwara na n’oge ikpeazụ a tupu nlaghachi Ya, “ọka wit,” onye nke Ọ kọwara dị ka “ụmụ nke alaeze,”5 ga-eto na-akụkụ na-akụkụ ya na “ata,” ma ọ bụ ndị ahụ na-ahụghị Chineke naanya ma anaghị edebe iwu nsọ Ya niile. Ha abụọ “ga-etokọta uto ọnụ,”6 n’akụkụ n’akụkụ.

Nke ga-abụ ụwa anyị tutu ruo mgbe Onye Nzọpụta ga-alaghachi, jiri ọtụtụ ihe dị mma na ọtụtụ ihe dị njọ n’akụkụ niile.7

Oge ụfọdụ i nwere ike ị naghị enwe mmetụta dị ka ị bụ otu eriri ọka whit siri ike kara aka. Nweere onwe gị ndidi! Onyenwe anyị kwuru na ọka whit ga-agụnye agụba dị nro n’etopụta.8 Anyị niile bụ Ndị nsọ Ya Ụbọchi ikpeazụ a, ma na-agbanyeghị na ọbụghịgodi ihe niile anyị chọrọ ịbụ, anyị ji ọchịchọ anyị ịbụ ezi ndị na-eso ụzọ Ya kpọrọ ihe.

Gbaa Okwukwe Anyị Ume nime Jizọs Kraịst

Anyị na-abịa mata na dị ka ihe ọjọọ na-abawanye n’ime ụwa, nlanarị ime mmụọ anyị, na nlanarị ime mmụọ nke ndị anyị hụrụ naanya, ga-achọ ka anyị n’uju lekọta, wusie ike, ma gbaa mgbọrọgwụ niile nke okwukwe anyị n’ime Jizọs Kraịst ume. Onye ozi Pọl nyere anyị ndụmọdụ ka anyị gbaa mgbọrọgwụ,9 guzosie ike, ma nọrọ nke ọma10 n’ịhụnaanya anyị maka Onye Nzọpụta na mkpebi anyị isoro Ya. Taa na ụbọchi ndị dị niihu na-achọ mgbalị lekwasịrị anya ma gbadoo anya, na-echekwa megide ntụgharị uche, akpachapụghị anya.11

Mana ọbụna tinyere mmetụta nke ụwa na-abawanye abawanye gbara anyị gburugburu, anyị ekwesịghị ịtụ egwu. Onyenwe anyị enweghị ike ịgbahapụ ndị ọgbụgba ndụ Ya. Enwere ike nkwụghachi ụgwọ nke onyinye ime mmụọ na odudu si na chi maka ndị ezi omume.12 Ngọzi nke a agbakwunyere nke ike ime mmụọ, kosiladị, anaghị akwụsi n’ebe anyị naanị n’ihi na anyị so na ndudugandu nke a. Ọ na-abịa dị ka anyị na-agba okwukwe anyị n’ime Onyenwe anyị Jizọs Kraịst ume ma debe iwu nsọ Ya niile, dị ka anyị na-abịa mara Ya ma hụ Ya naanya. “Nke a bụ ndụ ebighi ebi,” ka Jizọs kpere, “ka ha wee mara gị onye naanị ya bụ ezi Chineke, na Jizọs Kraịst, onye i ziteworo.”13

Dị ka anyị maara nke ọma, ịnwe okwukwe na Jizọs Kraịst na ịbụ ezi onye na-eso ụzọ bụ nke karịrị mkpebi otu mgbe—karịakwa ihe omume otu oge. Ọ bụ usoro dị nsọ na-aganiihu na-eto ma gbasaa site na oge niile nke ndụ anyị, na-aganiihu tutu ruo mgbe anyị ga-egbu ikpere n’ụkwụ Ya.

Ebe ọka wit na-eto n’etiti ata n’ime ụwa, kedụ otu anyị ga-esi mee ka nkwa anyị nye Onye Nzọpụta mie emie ma nwete mgbam ume n’ụbọchi ndị dị niihu.

Ndị a bụ echiche atọ:

Rukpuo Onwe Anyị nime Ndụ nke Jizọs

Nke mbụ, anyị nwere ike rukpuo onwe anyị kpamkpam karịa n’ime ndụ nke Jizọs, nkuzi Ya niile, ebube Ya, ike Ya, na aja mgbaghara mmehie Ya. Ọnye nzọpụta kwuru, “Lekwasịnụ m anya n’echiche ọbụla.”14 Onye Ozi Jọn na-echetere anyị, “Anyị hụrụ Ya naanya, n’ihi na ọ bu ụzọ hụ anyị naanya.”15 Dị ka anyị na-abịa nwete nhumiihe ịhụnaanya Ya nke ọma, anyị na-ahụ Ya naanya ọbụna karịa ma, n’ọdịdị ya, n’eso karịa ọmụmaatụ Ya nke inwe ịhụnaanya ma lekọta ndị ahụ gbara anyị gburugburu. Na mmegharị ahụ niile dị ezi omume n’ihu Ya, anyị na-ahụ Ya nke ọma karịa.16 Anyị na-ahụ Ya naanya ma anyị na-agbalị n’obere ụzọ anyị iṅomi Ya.17

Mee Ọgbụgba ndụ gị na Onyenwe anyị

Ozo, dị ka anyị na-amatazi ma hụ Onye Nzọpụta naanya, anyị na-achọsike ọbụna karịa ikwe nkwa nkwado na ntụkwasị obi anyị nye Ya. Anyị na Ya na-agba ọgbụgba ndụ. Anyị na-amalite nkwa anyị na baptizim, ma anyị na-akwado nkwa ndị a na ndị ọzọ dị ka anyị n’echegharị kwa ụbọchi, rịọ maka mgbaghara, ma jiri ịnụ ọkụ n’obi na-atụ anya ịnata oriri nsọ izu ụka ọbụla. Anyị n’ekwe nkwa i “cheta ya mgbe niile ma debe iwu nsọ ya niile.”18

Mgbe anyị jikeere, anyị na-anabata emume nsọ niile na ọgbụgba ndụ niile nke tempụl. Inwe mmetụta nke mgbe ebighị ebi n’oge anyị dị nsọ dị nwayọọ n’ụlọ nke Onyenwe anyị, n’obi ụtọ anyị na-agba ọgbụgba ndụ anyị na Chineke ma gbaa mkpebi anyị idebe ha ume.

Ime na idebe ọgbụgba ndụ niile na-ekwe ịhụnaanya nke Onye Nzọpụta imi emi nke ukwuu n’ime obi anyị. N’ime Liahona, nke ọnwa nke a, Onyeisi Russell M. Nelson kwuru: “Ọgbụgba ndụ anyị [niile] ga-eduba anyị nso nso na Ya. … Chineke agaghị ajụ mmekọrịta Ya na ndị ahụ Ya na ha meworo ụdị njikọ a.”19 Dị ka Onyeisi Nelson kwuru n’ụzọ mara oke mma nụtụtụ a, “Site na nraranye nke tempụl ọhụrụ ọbụla, ike si na chi agbakwunyere na-abịa nime ụwa ịgba anyị ume ma megide mbọ niile nke onye iro na-abawanye abawanye.”20

Anyị o nwere ike ịhụ ihe mere Onyenwe anyị ga-esi edu onye amụma Ya iwete tempụl nsọ niile nso n’ebe anyị nọ ma kwe anyị ịnọ n’ime ụlọ Ya ọtụtụ mgbe.

Dị ka anyị na-abanye tempụl, atọghapụwo anyị na nwa oge site na ike mmetụta niile nke ụwa na-agbakọta megide anyị dị ka anyị na-amụ maka nzube anyị na ndụ na onyinye niile nke ebighị ebi enyere anyị site na Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst.

Chegide Onyinye nke Mmụọ Nsọ.

N’ikpeazụ, echiche m nke atọ: n’ọchịchọ nke a dị nsọ, anyị nwere oke mmasị, na-echekwa, na-echegide, ma na-edebe na nchekwa onyinye nke Mmụọ Nsọ. Ma Onyeisi M. Russell Ballard na mbụ na Okenye Kevin W. Pearson naanị nwa oge gara aga kwuur maka ịdọ aka na ntị amụma nke Onyeisi Nelson nke m ga ekwugharị ọzọ: “Ọ gaghị adị ire ịlanarị na ime mmụọ nenweghị odudu, ntụzi aka, nkasị obi, na mmetụta Mmụọ Nsọ na-anọgide.”21 Ọ bụ onyinye gafere ụgwọ. Anyị na-eme ike anyị niile kachasị iji chekwaa nhumiihe anyị niile kwa ụbọchi ya mere nhumiihe nke Mmụọ Nsọ nke a na-anọnyere anyị. Anyị bụ ihe nye ụwa, ma mgbe ọ dị mkpa, anyị ji obi dum ahọrọ ịdị iche site na ndị ọzọ. Onyeisi Dallin H. Oaks na nso nso a jụrụ ndị okenye nta: “[Unu] ‘nwere ike nwaa idi iche?’ … Nke [kacha nke] dị mkpa … bụ nhọrọ niile nke ị na-eme na ndụ nke onwe gị. … Ị na-aganiihu megide mmegide nke ụwa?”22

Họrọ Ịdị Iche site n’Ụwa

N’ime mbipụta sochịal midia na nso nso a, a jụrụ m ndị na-eso ụzọ ibe m ikesa nhọrọ ndị ha meworo nke chọrọ ka ha dị iche site n’ụwa. A natara m narị kwuru narị azịza.23 Ndịa bụ naanị ole ma ole:

Amanda: A bụ m nọọsụ na-arụ ọrụ n’ụlọ mkpọrọ dị n’obodo. Ana m elekọta ndị mkpọrọ dị ka Kraịst ga-esi mee.

Rachel: A bụ m onye na-agụ egwu opera, ma mgbe ụfọdụ ana asị na m ga-eyi ejiji ọbụla nke e nyere m, na-agbanyeghị ejiji n’oke. [N’ihi na m bụ onye nataworo onyinye dị nsọ,] a gwara m [ndị na-emepụta ihe] na uwe ahụ kwesịrị ịdị [n’oke n’ejiji]. Obi jọrọ ha njọ … mana n’enweghị mmasị, ha mere mgbanwe niile ahụ. Agaghị m ere udo nke na-abịa site n’iguzoro dị ka onye aka ebe nke Kraịst n’oge niile.

Chriss: A bụbụrụ m ọńụụ mmanya (na agbake), tozuru oke tempụl, onye otu Nzukọ nsọ. Agbaghị m nkịtị gbasara nhumiihe m niile n’ịńụ mmanya na irite ọgbụgba ama nke Aja mgbaghara mmehie [nke Jizọs Kraịst].

Lauren: A naara m ede skit mụ na ụmụ klas m n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Ha chọrọ ime omume m edobere, dị nwayọọ nwee ntiwa nke okwu rụrụ arụ na mberede. Ha nọgidere na-akwagide m, mana ekweghị m ma nọsie ike n’ala.

Adam: Ọtụtụ ndị mmadụ ekwereghị m mgbe m na-asị na m na-edebe iwu nke mmekọrịta ma họrọ izere nziakwụna. Ha anaghị aghọta uru ọńụ na udo nke obi ọ na-enye m.

Ella: Nna m bụ onye otu obodo LGBTQ. Ana m agbalị ilebara mmetụta nke ndị mmadụ ndị ọzọ anya mgbe m na-eguzoro dị ka onye akaebe nke Kraịst ma nwee okwukwe nihe m kwere na ya.

Andrade: Ekpebiri m ịganiihu na-eje nzukọ nsọ mgbe ezinaụlọ m kpebiri ha agaghị agakwa ọzọ.

Ma n’ikpeazụ, site naka Sherry: Anyị gara otu mmemme na nnukwu ụlọ nke onye gọvanọ. Ha malitere inyefe champagne maka ihe “tost.” Esiri m ọnwụ na mmiri, na-agbanyeghị na onye ọrụ ahụ kwuru na ọ ga-abụ ihe mkparị. Anyị meere gọvanọ tost, ma e weliri m glas mmiri m elu! Gọvanọ ahụ ahụghị ya dị ka mkparị.

Onyeisi Nelson kwuru, “Ee, i bi n’ime ụwa, mana i nwere ezigbo ụkpụrụ dị iche site na nke ụwa iji nyere gị aka zere unyi nke ụwa.”24

Anastasia, otu onye nne nta bi n’ime Ukraine, nọ n’ime ụlọ ọgwụ ka mụrụ nwa nwoke dị ka ogbunigwe niile malitere n’ime Kyiv na February nke a gara aga. Otu nọọsụ mepere ọnụ ụzọ ụlọ ọgwụ ma jiri olu ngwa ngwa kwu okwu, “Kuru nwa gị, were akwa kee ya, ma gaa n’ime họọlụ—ugbu a!”

Emesịa, Anastasia kwuru okwu sị:

“Enweghị mgbe m chere na ụbọchi mbụ m nke ịbụ onye nne ga-esi ezigbo ike, … mana … ana m elekwasị anya na … ngọzi niile na ọrụ ebube niile m huworo. …

“Ugbu a, … o nwere ike dịrị ka ihe na-agaghị ekwe omume ịgbaghara ndị ahụ meworo e ji nwee oke mbibi na mmerụ ahụ … , mana dị ka onye na-eso ụzọ nke Kraịst, enwere m okwukwe na m ga-enwe ike [ịgbaghara]. …

“Amaghị m ihe niile ga-eme n’ọdịniihu … kama ama m na-idebe ọgbụgba ndụ anyị ga-ekwe ka Mmụọ ahụ nọnyere anyị mgbe niile, … na-ekwe ka anyị nwete ọńụ na olileanya, … ọbụna n’oge niile siri ike.”25

Nkwa nke Ndụ Ebighị ebi na Ebube Selestịal

Ụmụnne m nwoke na ụmụnne m nwanyị, enwetewo m ngọzi ịnata nebe ọ dị ukwuu ịhụnaanya nke Onye Nzọpụta anyị hụrụ naanya, Jizọs Kraịst. Ama m na Ọ dị ndụ ma na-edu ọrụ Ya dị nsọ. Enweghị m n’uju okwu ndị m ga-eji akọwapụta ịhụnaanya m maka Ya.

Anyị niile bụ “ụmụ ọgbụgba ndụ” na-agbatị ofe ụwa na mba niile na omenaala niile dị nime kọntinent, ọnụ ọgụgụ dị na nde kwuru nde, dị ka anyị na-echere nlaghachi dị ebube nke Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị. Na-egbuke dị ka ihe nye ndị ahụ gbara anyị gburugburu, anyị na-akpachapụ anya na-akpụzi ọchịchọ anyị niile, echiche niile, nhọrọ niile, na omume niile. Ijiri obi anyị niile na-achọ ịmata ma hụ Onye Nzọpụta naanya, anyị na-ekewapụ onwe anyị iche pụọ n’ụwa site na ọgbụgba ndụ anyị na Chineke, ịdị iche, na-adịkarịghị, ma pụọ iche, dị ka anyị n’enye Ya na nkuzi Ya niile nkwanye ugwu na-ekewapụghị onwe anyị site na ndị ọzọ kwere n’ihe dị iche.

Ọ bụ njem na-atụ naanya ịbụ ọka whit n’etiti ata, mgbe ụfọdụ jupụta n’obi mgbu, mana wetuo obi mgbe niile site na uto na mmesi obi ike na-edozi okwukwe anyị. Dị ka i na-ekwe ka ịhụnaanya gị maka Onye Nzọpụta na ịhụnaanya Ya maka gị mie emi n’ime obi gị, ana m ekwe gị nkwa obisiike, udo na ọńụ agbakwunyere n’izute aka mgba niile nke ndụ gị. Ma Onye Nzọpụta na-ekwe anyị nkwa: “A [ga] m akpọkọta ndị m, dị ka otu nkọniilu nke ọka whit na ata siri dị, na whit ka enwere ike ichekwa n’ime ganas inwete ndụ ebighị ebi, ma ekpukwasị ya otito selestial.”26 Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen

Hụba ama

  1. Matiu 24:3.

  2. Matiu 24:33.

  3. Henry B. Eyring, “Ikwusi ike n’Oké ifufe niile,” Liahona, Me 2022, 27.

  4. Matiu 13:16; ihe niile agbakwunyere.

  5. Matiu 13:38.

  6. Matiu 13:30.

  7. Okenye Neal A. Maxwell kwuru sị: “Ndị otu Nzukọ nsọ ga-ebi n’ọnọdụ ọka wit na ata nke a tutu ruo Milenum. Some real tares even masquerade as wheat” (“Na-adịzi dị ka Nwantakịrị,” Ensign, Me 1996, 68).

  8. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 86:4, 6.

  9. Lee Ndị Kọlọsị 2:7.

  10. Lee Ndị Kọlọsị 1:23; leekwa Ndị Efesọs 3:17; Neal A. Maxwell, “Grounded, Rooted, Established, and Settled” (Brigham Young University devotional, Sept. 15, 1981), speeches.byu.edu.

  11. N’ime Matiu 13:22Jizọs dọrọ ndị na-eso ụzọ Ya aka na ntị ka ha ghara ikwe ọchịchọ niile nke ụwa na ihe ndughe niile nke akụ na ụba “kpagbuo okwu ahụ” ma kwụsị ọganiihu ime mmụọ nke ha. Ọ na-amasị m ikekọta nkebiokwu ahụ “kpagbuo okwu ahụ” na isi nke mbụ nke Jọn, ebe Jọn mara ọkwa na okwu ahụ bụ Jizọs: Na mbido ka enwere Okwu ahụ, ma Okwu ahụ bụ nke nọ ya na Chineke. … E mere ihe niile site n’aka ya; e meghị kwa ihe ọbụla nke e meworo ma ọ nọghị ya” (John 1:1, 3). Okwukwe anyị n’ime Jizọs Kraịst, mkpebisike anyị isoro Ya, ịhụnaanya anyị maka Onye Nzọpụta ka enwere ike ịkpagbu, ma ọ bụ gbochie site n’ito eto dị ka anapụrụ ya ìhè na nlekọta nke ime mmụọ (lee Alma 32:37–41).

  12. Lee Neil L. Andersen, “A Compensatory Spiritual Power for the Righteous” (Brigham Young University devotional, Aug. 18, 2015), speeches.byu.edu.

  13. Jọn 17:3.

  14. Ozizi na Ọgbụgbandụ niile 6:36.

  15. 1 Jọn 4:19.

  16. Okenye Devid B. Haight kwuru:

    “It is true that some have actually seen the Savior, but when one consults the dictionary, he learns that there are many other meanings of the word see, such as coming to know Him, discerning Him, recognizing Him and His work, perceiving His importance, or coming to understand Him.

    “Such heavenly enlightenment and blessings are available to each of us” (“Temples and Work Therein,” Ensign, Nov. 1990, 61).

  17. Lee Mozaya 5:13.

  18. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:77.

  19. Russell M. Nelson, “Ọgbụgba ndụ Dị ebighị ebi,” Liahona, Oct. 2022, 5.

  20. Russell M. Nelson, “Gịnị Bụ Eziokwu?,” Liahona, Nov. 2022, 29.

  21. Russell M. Nelson, “Mkpughe maka Nzukọ-nsọ, Mkpughe maka Ndụ Anyị,” Liahona,, Me 2018, 96.

  22. Dallin H. Oaks, “Going Forward in the Second Century” (Brigham Young University devotional, Sept. 13, 2022), speeches.byu.edu. Onyeisi Oaks credited the phrase “dare to be different” to a recent article in the Deseret Magazine site n’aka Okenye Clark G. Gilbert, the Church Educational System’s Commissioner, on preserving religious identity in higher education (lee “Dare to Be Different,” Deseret Magazine, Sept. 2022, deseret.com).

  23. Ọbụrụ na ọ ga-amasị gị ịmụ site n’aka ndị ọzọ kwuru ihe n’otu ha sịrị dị iche site n’ụwa, i nwere ike ịgụ ihe ndị ha kwuru na Facebook (lee Neil L. Andersen, Facebook, Aug. 18, 2022, facebook.com/neill.andersen) ma ọ bụ Instagram (lee Neil L. Andersen, Instagram, Aug. 18, 2022, instagram.com/neillandersen).

  24. Russell M. Nelson, “Olile anya nke Izrel” (worldwide youth devotional, June 3, 2018), HopeofIsrael.ChurchofJesusChrist.org.

  25. Anastasia Kocheva, “Facing the Conflict in Ukraine, Healing the Conflict in My Heart,” YA Weekly, May 2022.

  26. Ozizi na Ọgbụgbandụ nile 101:65.