Ọgbakọ Zuru ọha
Ozizi nke Isonye
Ọgbakọ zuruọha Ọktoba 2022


Ozizi nke Isonye

Ozizi nke isonye na-abụ nke a nyere onye ọbụla nime anyị: A bụ m otu mụ na Kraịst nime ọgbụgba ndụ nke ozi ọma.

Ọ ga-amasị m ikwu okwu banyere ihe m kpọrọ ozizi nke isonye n’ime Nzukọ nsọ ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nso Ụbọchị ikpeazụ a. Ozizi nke a nwere akụkụ atọ: (1) ọrụ dị nime isonye nime mkpọkọta ndị ọgbụgba ndụ nke Onyenwe anyị, (2) mkpa nke ije ozi na ịchụ aja nime isonye dị, ma (3) otu Jizọs Kraịst siri nọrọ n’etiti nke isonye ahụ.

Na oge ndị mbụ Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazu a malitere ndị mejupụtara ya bụ ndị ọcha nọ na mpaghara Ugwu Amerịka na Ndị nsọ si na mpaghara ugwu Europe, tinyekwara ụfọdụ niime Ụmụ amaala Amerịka, ndị Afrịịka Amerịka na ndị Agwaetiti Pasifik. Ugbua, afọ asatọ tupu eme mmemme ncheta afọ 200 nke nchọpụta ya, Nzukọ nsọ ahụ amụbawo nnukwu nọnụọgụgụ na n’ebe dị iche iche na Mpaghara Ugwu Amerịka , ma ọbụnadị karịa otu ahụ na gburugburu ụwa ndị ọzọ.

Dịka mkpọkọta nke ụbọchị ikpeazụ nke ndị ọgbụgba ndụ nke onyenwe anyị nke eburu n’amụma oge gboo bịaziri na-eme n’ike n’ike, Nzukọ nsọ ahụ n’ezie ga-ejupụta na ndị otu si mba niile, ụmụnna niile, asụsụ niile na ndị mmadụ.1 Nke a abụghị ihe akpachara anya ma ọ bụ mmanye ndị di iche iche kama ọ bụ ihe jiri aka ya na-emere onwe ya nke anyị ga-atụanya, na-amata na ụgbụ nke ozi ọma na-akpọkọta site na mba ọbụla na ndị ọbụla.

Ọ bụ ihe dị ngọzị nyere anyị na anyị na-ahụ ụbọchị ahụ a na-ehiwe Zayọn nke na-eme otu mgbe na kọntinentị ọbụla ma nime agbata obi nke onwe anyị niile. Dịka Onye amụma Josef Smit kwuru, ndị nke Chineke n’ọgbọ ọbụla agawoniihu jiri ọñụ n’atụanya ruo ụbọchị taa, ma “anyị bụ ndị a gọziri agọzi ndị Chineke họrọworopụ iji weta ebube nke Ụbọchị ikpeazụ a na mmezu.”2

Ebe na-enyewo anyị ohere nke a pụrụ iche, anyị ekwesịghị ịkwe ka ịkpa ókè agbụrụ, akpamoke nke ebo, ma ọ bụ nkewa ndị ọzọ nọrọ n’etiti Nzukọ nsọ nke Kraịst n’ụbọchị ikpeazụ nke a. Onyenwe anyị nyere anyị iwu sị: “Dịnụ n’otu; ma ọ bụrụ na unu a dịghị n’otu unu a bụghị ndị m.”3 Anyị kwesịrị ịdị ike n’ifopu akpamoke na ịkpa oke site na Nzukọ nsọ nke a, site n’ebe obibi anyị niile, ma nke kachasị ha niile, site n’obi anyị. Dị ka ọnụọgụgụ Nzukọ nsọ anyị n’etowanyekarị n’ịdị iche ya, nnabata anyị garịrị na-aganiihu emekwara onwe ya ma na-akpalite mmụọ. Anyị niile dịrị onwe anyị mkpa.4

Nime Ozi Mbụ ya nke o zigaara Ndị Kọrịnt, Pọl mara ọkwa na ndị niile emeworo baptizim bata nime Nzukọ nsọ ahụ, bụ otu n’ahụ nke Kraịst:

“N’ihi na dịka ahụ bụ otù, ma nwee kwa ọtutu ndị otu, na ndị otu niile nke otu ahụ ahụ, ebe ọ bụ na ha dị ọtụtụ, ha bụ otu ahụ: otu a ka Kraịst dị kwa.

“N’ihi na site n’otu Mmụọ ka emere anyi niile baptizim bànye n’otu ahụ, ma anyi bụ ndị Juu ma ọ bụ ndị Mba ọzọ, ma anyi bụ ndi ohu ma ọ bụ ndi nweere onwe ha; ma emewo ka anyi niile ṅụọ banye nime otù Mmụọ. …

“Ka nkewa ghara ịdị n’anụ arụ ahụ; kama ka ndị otu ahụ wee nwee otu ụdị nlekọta anya nye onye na ibe ya.

“Ma ọ bụ na otu onye otu na-ata ahụhụ, ndị otu niile na-esokwa ya ata ahụhụ; ma ọ bụ enye otu onye otu ugwu, ndị otu niile na-eso ya aṅụrị ọṅụ.”5

Mmetụta nke isonye dị mkpa maka ahụike nke anụ ahụ anyị, uche anyị, na ọdịmma nke ime mmụọ anyị. Agbanyeghi ọ kwere nnọọ omume na mgbe ụfọdụ onye ọbụla nime anyị nwere ike chee na anyị ekwesịghị ekwesị isonye. N’oge obi ịda mba ndịa, anyị nwere ike chee na anyị agaghị enwe ike etozu ogo ndị dị elu nke Onyenwe anyị ma ọbụ ihe ndị ọzọ na-atụ anya ha.6 Anyị nwere ike site na-amaghị ama manye ndị ọzọ—ma ọ bụladị anyị onwe anyị—atụmanya, ndị nke na-abụghị atụmanya nke Onyenwe anyị. Anyị nwere ike site n’uzọ ndị a na-eleghi anya kwuputa na uru nke mkpụrụ obi bara dabeere n’elu ụfọdụ ihe ndị a rụzuru niile ma ọbụ ọkpụkpọ oku niile, mana ihe ndịa abụghị ịhe eji atụ ebe anyị guzoro n’ihu Onyenwe anyị. “Onyenwe anyị n’ele anya n’obi.”7 Ọ na-echegbu maka ọchịchọ anyị niile na oke ọchịchọ anyị niile na ihe anyị na-aghọ.8

Nwanne nwanyị Jodi King dere maka nhụmịhe nke onwe ya afọ ndịa gara aga:

“Enweghi mgbe m nwetere mmetụta na esonyeghi m na nzukọ nsọ tutu ruo mgbe di m, Cameron na mụ onwe m bidoro nwewe nsogbu amụtaghị nwa. Ụmụaka na ndị ezinụlọ ndị nọburu enye m ọńụ ịhụ ụzọ na nzukọ nsọ bịaziri na-akpatara m iru uju na ihe mgbu.

“A dị m ka nwanyị na-enweghị nwa m nku n’ogweaka m ma ọ bụ akpa dị m n’aka. …

“Ụbọchị Sọnde kachasị raa ahụ bụ nke mbụ anyị nime otu ngalaba ukwu ọhụụ. Nihi n’anyị enweghi ụmụaka, a jụrụ anyị ma anyị ọ lụrụ di na nwunye ọhụụ ma ole mgbe ka anyị nwere atụmatụ ibido ezinụlọ. A mụtawo m ọfụma otu esi aza ajụjụ ndịa n’ekweghi ka ha metụta m—A maara na ọbụghị ebumnobi iji mee mụ ihe mnwute.

“Agbanyeghi, na ụbọchị Sọnde nke a, ịza ajụjụ ndịa rara mụ ezigbo ahụ. Ọ tebeghi aka anyị matara, nagbanyeghi olileanya anyị, na anyị—ọzọkwa—adịghị ime.

“E jiiri m obi ntiwa wee bata m nime ọgbakọ oriri nsọ ahụ, ma ịza ajụjụ ndị ahụ ama ama ‘eji amata gị‘ rara mụ ahụ ịza. …

“Mana ọ bụ Ụlọ akwụkwọ Sọnde bụ nke gbawaziri m obi n’ezie. Ihe ọmụmụ ahụ—nke ebumnobi ya ịbụ banyere ọrụ si na chi nke ndị nne—bịaziri ghọọ ihe ọzọ wee bụrụzie ebe ndị mmadụ ji ekwupụta iwe ha. Obi jụrụ m oyi ma anya mmiri ejiri nwayọ asọda m na nti dị ka m n’anụ ka ụmụ nwanyị na-atanwị banyere ngọzị nke m nwere ike inye ihe ọbụla maka ya.

“E siri m na nzukọ nsọ gbafuo. Na mbụ, achọbughi m ị laghachi azụ. A chọghịm ị nwete ụdị nhụmịhe nke ịnọpụ iche ọzọ. Mana n’abalị ahụ, mgbe mụ na di m kwusiri okwu, anyị matara n’anyị ga na-aga nzukọ nsọ n’abụghị nanị maka na Onyenwe anyị agwawo anyị ime otua mana nihi anyị abụọ makwaara maka ọńụ nke n’abịa site n’inwogharị ọgbụgba ndụ niile na inwe mmetụta nke Mmụọ na nzukọ nsọ karịrị obi mnwute nke m nwetere n’ụbọchị ahụ. …

“Nime Nzukọ nsọ, enwere ndị isi mkpe, ndị gbara alụkwaghịm, ndị otù na-emebeghị ọlụlụ; ndị nwere ndị nke ndị otu ezinụlọ ha siworo n’oziọma dapụ; ndị nwere ajọọ ọrịa ma ọbụ ndị nwere ihe isi ike nke ego; ndị otù ndị na-agabiga mmasị nwoke na nwoke, nwanyị na nwanyị; ndị otù n’agba mbọ imeri agwa ọjọọ rara ahụ nhapụ ma ọbụ obi abụọ; ndị atọghatara ọhụụ; ndị kwabatara ọhụụ; ndị agadị ụmụ ha na-apụsiwo, ma ọtụtụ ihe ndị dị iche iche. …

“Onye Nzọpụta n’akpọku anyị ịbịakwute Ya—nagbanyeghi otu ọnọdụ anyị siri dị. Anyị n’abịa nzukọ nsọ ijiwe nwogharịa ọgbụgba ndụ anyị, mụbaa okwukwe anyị, ịchọta udo, na ime dịka O jiri mee n’ụzọ tozuru oke na ndụ Ya—wee lekọta ndị ọzọ ndị n’eche na ha esonyeghi.”9

Pọl kọwara na Nzukọ nsọ ma ndị ọrụ ya ka enyere site na Chineke “maka ị me ka ndị nsọ tozuo oke, maka ọrụ nke ije ozi, maka mwulite nke ahụ nke Kraịst:

“Tutu ruo mgbe any niile bịara n’idi n’otu nke okwukwe, na ọmụma ihe nke Ọkpara Chineke, ruo na ịbụ mmadụ tozuru oke, ruo na atụ nke ogo ojuju niime Kraịst.”10

Ọ bụ okwu ịkpa amụ dị mwute, mgbe ahụ, mgbe otu onye, bịara n’eche na ya na o torughi ogo dị mma n’ihe niile nke ndụ a, wee bịa na ngwụcha na osonyeghị nime otù ahụ nke Chineke rọpụtara maka ịnyere anyị aka gaaniihu ruo ogo dị mma.

K’anyị hapụ ikpe ikpe n’aka Onyenwe anyị ma n’aka ndị ahụ Ọ nyere ikike ma nwee afọ ojuju n’ịhụkọrịta onwe anyị naanya ma kpasịkọrịta onwe anyị agwa n’ụzọ kachasị mma anyị nwere ike ime. Ụbọchị ọbụla k’anyị rịọ Ya ka o gosi anyị ụzọ ahụ “iji kpọbata … ndị ogbenye, ma ndị nwere nkwarụ, na ndị ngwọrọ, na ndị isi”11—nke bụ, onye ọbụla—ka ha bịa oriri nke Onyenwe anyị dị ukwuu.

Akụkụ nke abụọ nke ozizi nke isonye ahụ bụ maka ntinye aka nke onwe anyi. Agbanyeghi na ọ na-arakarị anyị ahụ iche echiche maka ya, ọtụtụ nsonye anyị n’abịa site n’ije ozi anyị na ichụ aja ndị anyị n’emere ndị ọzọ na maka Onyenwe anyị. Ilekwasị mkpa nke onwe anyị anya ma ọ bụ ọdịmma nke onwe anyị ebe o fere oke nwere ike ikụda mmụọ nke isonye.

Anyị na-agba mbọ iso ozizi nke Onye Nzọpụta:

“Onye ọbụla ga-abụ nnukwu mmadụ n’etiti unu, ga-abụụru unu onye ije ozi. …

N’ihi na ọbụna Nwa nke mmadu abịaghị ka ejere Ya ozi, kama ka O jee ozi, nakwa inye ndụ ya iji kwụọ ụgwọ mmehie maka ọtụtụ mmadụ.”12

Isonye n’abịa ọbụghị dịka anyị nọ na-eche maka ya kama dịka anyị n’esetipụ aka ịnyekọrịtara onwe anyị aka.

Taa, na mnwute, mmadụ ịnyefechasị onwe ya maka ihe mọbụ ichụ aja ihe ọbụla maka onye ọzọ na-aghọzi ihe omenaala megidere. Nime otu edereede maka Deseret Magazineedere naafọ gara aga, onye odee Rod Dreher kọgharịrị otu mkparịkọta ụka ya na otu onye nne dị nta nwere na Budapest:

“Anọ m nime otu ụgbọ oloko n’obodo Budapest mụ na otu … enyi nọ mbido afọ 30 ya—ka anyị kpọọ ya Kristina—mgbe anyị nọ n’ụzọ ije gbaa otu nwanyị n’eso Kraịst metụrụ okenye ajụjụ ọnụ, onye, ya na di ya nwụrụ anwụ, gabigara ma merie mkpagbu nke ọchịchị ndị kọmụnist. Dịka anyị na-ebigharị isi n’ọkpọrọ ama nke obodo ukwu ahụ, Kristina kwuru maka otu o siri sie ike ịkwụwa aka ọtọ n’etiti ndị enyi bụ ọgbọ ya maka aka mgba ndị ọ na-agabiga dịka onye nwunye na onye nne nwere obere ụmụaka

“Ihe isi ike niile nke Kristina bụ nnọọ otu o siri dịịrị onye inyom nta ọbụla na-amụ otu esi abụ onye nne na nwunye—nagbanyeghi nke a echiche dị n’isi ndị otu ndudugandu ya oge ahụ bụ na ihe isi ike niile nke ndụ bụ ịhe na-eyi ọdịmma mmadụ egwu ma ekwesịrị ka ajụ ha. Ya na di ya ha n’esi agụgọ mgbe ụfọdụ? Ọ bụrụ otu ahụ, ọ kwesịrị ị hapụ ya, ka ha kwuru. Ụmụ ya, ha na akpasu ya iwe? Ọ bụrụ otu ahụ, ọ kwesịrị ị zipụ ha ulọakwụkwọ nlekọta ụmụaka.

“Kristina naara enwe nchekasị na ndị enyi ya aghọtaghị na mnwale niile, tinyedị ntaram ahụhụ, bụ ịhe a n’ahụ n’ụwa—ma ọ nwere ike bụrụdị otu akụkụ nke ndụ ọma, mọbụrụ na ntaram ahụhụ ahụ na-akụziri anyị otu esi enwe ndidi, enwe obioma na enwe ịhụnanya.

“… Mahadum nke Notre Dame nwere ọka mmụta na-enyocha okpukperechi Christian Smith chọpụtara nime ọmụmụ ihe ya nke ndị dimkpa [gbara afọ] 18 ruo 23 na ọtụtụ ndị kachasị niime ha kwenyere na obodo enweghị ihe ọ bụ karịa ‘ọgbakọ ụmụ mmadụ ndị nọọrọ onwe ha ndị nwere naanị ọchịchọ inwe ọñụ na ndụ.’”13

Site n’ụdị echiche nke a, ịhe ọbụla nke mmadụ chọpụtara rara ahụ ‘bụ ụdị ịhe dị ka mmegbu.”14

Dịka ihe dị iche, ndị ọsụ ụzọ anyị nwetere mmetụta isonye dị omimi, ịdị n’otu dị omimi, na olilenanya na Kraịst dị omimi site aja ha chụrụ ije ozi mishọn, iwu tempụl dị iche iche, ị hapụ ebe obibi ọma nihi mkpagbu ma bidogharịa ọzọ, ma na-imerime ụzọ ndị ọzọ nyefechasịa onwe ha ma akụ ha niile nihi ọrụ nke Zayọn. Ha dịkwarịị na njikere iji ọbụna ndụ ha chụọ ajaịchụ aja tinyekwara ndụ ha mọbụrụ ịhe achọrọ. Ma anyị niile bụ ndị nrite uru nke nnagide ha. Nke ahụ bụkwa eziokwu nye ọtụtụ ndị taa ndị nwere ike tufuo ndị ezinụlọ na ndị enyi, hapụ ohere ịnwete ọrụ, mọbụ n’ụzọ ọzọ taa ahụhụ nke ịkpa oke mọbụ enweghi ndidi nihi emere ha baptizim. Oke ha ritere, otu osiladị, bụ mmetụta nke isonye dị ukwuu dị n’etiti ndị gbara ndụ Aja ọbụla anyị chụrụ n’ihi ọrụ nke Onyenwe anyị n’enye aka idobere anyị ọnọdụ n’ihu Ya onye nyere Ndụ Ya dịka ihe ịkwụ ụgwọ mmehie maka ọtụtụ mmadụ.

Nke ikpeazụ ma bụrụkwa mmenwere kachasị ịdị mkpa nke ozizi nke isonye bụ isi ọrụ nke Jizọs Kraịst. Anyị abataghị Nzukọ nsọ naanị maka mkparịkọta onye na ibe ya naanị, nagbanyeghi mkpa ọ dị. Anyị n’abata nihi mgbapụta site n’ịhunanya na amara nke Jizọs Kraịst. Anyị n’abata ị nwetere onwe anyị emumme nsọ niile nke nzọpụta na mbuli elu maka onwe anyị nakwa ndị ahụ anyị hụrụ nanya n’ofe abụọ nke akwa mgbochi ahụ. Anyị n’abata iso mee ihe nime nnukwu ọrụ iji hiwe Zayọn n’ime nkwadobe maka nlọghachi nke Onyenwe anyị.

Nzukọ nsọ ahụ bụ onye nchekwa nke ọgbụgba ndụ niile nke nzọpụta na mbuli elu nke Chineke na-enye anyị site na emume nsọ niile nke ọkwa nchụaja dị nsọ.15 Ọ bụ site n’idobe ọgbụgba ndụ niile ndịa k’anyị si enwete mmetụta isonye nke kachasị dị elu ma kachasị dị omimi. Onyeisi Russell M. Nelson dere nso nso a:

“Ozugbo mụ na gị meworo ọgbụgba ndụ anyị na Chineke, mmekọrịta anyị na Ya na-adị mma karịa ka ọ dị na mbụ tupu ọgbụgba ndụ anyị. Ugbua ejikọtawo anyị ọnụ. N’ihi ọgbụgba ndụ anyị na Chineke, Ọ gaghị ma ọlị ada mba na mbọ Ya inyere anyị aka, ma anyị agaghị enwe ike ma ọlị ewete na ngwụcha ndidi obi ebere Ya n’ebe anyị nọ. Onye ọbụla n’ime anyị nwere ebe pụrụ iche n’ime obi Chineke. …

“… Jizọs Kraịst bụ onye nkwado nke ọgbụgba ndụ ndị ahụ (lee Ndị Hibru 7:22;8:6).”16

Ọ bụrụ n’anyị ga-echeta nke a, olile anya dị elu nke Onyenwe anyị nwere maka anyị ga-akpake mmụọ anyị ọ bụghị igbu mmụọ anyị.

Anyị ga-enwete añụrị dịka n’anyị na-achụso site n’isi n’isi mọbụ site n’ịbịakọta ọnụ, “atụ nke ogo ogologo nke ojuju nke Kraịst.”17 Nagbanyeghi ngharịpụ niile na ndọla azụ niile dị n’ụzọ, ọ bụ njem nwere ugwu. Anyị n’ebuli ma na-agbakọrịta onwe anyị ume nịchụso ụzọ ahụ na-agbago agbago, site na-ịmata na na-agbanyeghi mkpagbu ọbụla ma na-agbanyeghi ogbugbu oge niile dị na ngọzi niile ekwere na nkwa, anyị nwere ike “ịñụrị ọñụ; [nihi na Kraịst] emeriwo ụwa,”18ma anyị na Ya nọ. Ịdị n’otu anyị na Nna, Ọkpara, na Mmụọ Nsọ n’ezie bụ isi nsonye ahụ nke kacha ibe ya.19

Ya mere, ozizi nke isonye na-abụ nke a—onye ọbụla nime anyị nwere ike kwete na: Jizọs Kraịst nwụrụ maka mụ; Ọ weere mụ dịka onye tozuru oke ịnata ọbara Ya. Ọ hụrụ m naanya ma nwere ike mee ihe dị iche nime ndụ m. Dị ka m na-echegharị, amara Ya nwere ike ị gbanwe m. A bụ m otu mụ na Ya nime ọgbụgba ndụ nke oziọma; E sonyere m nime Nzukọ nsọ na alaeze Ya; ma esonyere m nime ọrụ Ya nke ị wete mgbapụta nye ụmụ Chineke niile.

Ana m agba ama na isonyere, n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. Lee Mkpughe 5:9; leekwa 1 Nifaị 19:17; Mosiah 15:28; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 10:51; 77:8, 11.

  2. Nkuzi nke Ndị Isi Nzukọ nsọ: Josef Smith (2007), 186.

  3. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 38:27.

  4. Otu onye nnyocha uche ya dị nkọ kwuru:

    “Okpukperechi nke bụ naanị maka ọdịmma otu onye adiwo, tutu ruo oge anyị, bụ nke a na-amaghị nime agụgụala niile nke ụmụ mmadụ—ma nihi ezi ihe mkpata. Ụdị okpukperechi ahụ na-anyụ ka ọkụ ọsịsọ ma bụrụzie ihe egwuruegwu ịme ụlọ, bụrụ ihe añụrị nke otu onye mọbụ abụọ, dịka ịgụ akwụkwọ mọbụ ile televiishọn. Nihi nke a, ọ naghị atụ n’anya na ịchọzi ihe ndị nke ime mmụọ abụrụwo dịka ihe na-ewu ewu. Ọ bụ ihe ndị mmadụ, ndị tọghapụrụ onwe ha site na ọkpukperechi, na-achọsị ike dịka ihe nnochi anya.

    “Ihe nke ime mmụọ nezie bụ otu akụkụ nke okpụkperechi niile—mana ọ bụ otu akụkụ dị nta, ma ọ gaghị enwe ike ịnochi anya ihe dum. Okpukperechi abụghị ihe dịka mmega ahụ nke uche nke mgbe ụfọdụ nwere ike inye onye ahụ nhụmịhe ịhụ ala mmụọ. Ọ ga-ahazi ndụ nke onye ahu—ihe niile dị na ndụ onye ahụ—mọbụkwa ya emie ala, wee hapụ na-azụ ya mkpụrụ obi nke na-echekasị onwe ya, mkpụrụ obi ndị na-enweghị ihe nọ niime ha nke ndị dọkịnta na-agwọ ọrịa ụbụrụ isi nwere ike ịgwọata. Ma ọ bụrụ na okpukperechi ga-ahazi ndụ mmadụ, ọ kwesịrị ị bụ ihe ọha na nke onye ọbụla na-enye aka, ọ kwesịrị ijikọta ruo ndị nwụrụ anwụ ma ndị a na-amụbeghi” (Irving Kristol, “The Welfare State’s Spiritual Crisis,” Wall Street JournalFeb. 3, 1997, A14).

  5. 1 Ndị Korịnt 12:12 -13, 25–26.

  6. See Russell M. Nelson, “Perfection Pending,” Ensign, Nov. 1995, 86–88; Jeffrey R. Holland, “Be Ye Therefore Perfect—Eventually,” Liahona, Nov. 2017, 40–42.

  7. 1 Samuel 16:7.

  8. Dị ka Okenye Jeffery R. Holland kwuru, “”Bịa dị ka ịdị,’ Nna nke dị ịhụnaanya na-agwa onye ọbụla nime anyị, mana Ọ na-agbakwụnye, ‘Mana achọkwala ị nọgide otu ahụ ịdị.’ Anyị na-ara ihu ọchị ma na-echeta na Chineke emewo mkpebi ime anyị karịa otu si chee nanyị nwere ike ịbụ” (“Songs Sung and Unsung,” Liahona, May 2017, 51).

  9. Jodi King, “Isonye nime Nzukọ nsọ ahụ site n’enyo anya nke amụtaghị nwa,” Liahona, Mar. 2020, 46, 48–49.

  10. Ndị Efesọs 4:12–13.

  11. Luk 14:21.

  12. Mak 10:43, 45; nkwusi ike agbakwunyere.

  13. Rod Dreher, “A Christian Survival Guide for a Secular Age,” Deseret MagazineApr. 2021, 68.

  14. Dreher, “A Christian Survival Guide for a Secular Age,” 68.

  15. Lee Ozizi na Ọgbụgbandụ nile 84:19–21.

  16. Russell M. Nelson, “Ọgbụgba ndụ ahụ Dị Ebighị.” Liahona, Oct. 2022, 6, 10.

  17. Ndi Efesọs 4:13.

  18. Jọn16:33.

  19. Lee Jọn 17:20–23 s“Ma ugbua, aga m atụnyere unu uche ka unu chọọ Jizọs nke a nke ndị amụma na ndị ozi deworo maka ya, na amara nke Chineke Nna, na kwa Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, na Mmụọ Nsọ, nke na agba ama maka ha, wee dị ma nọgide nʼime unu ruo mgbe ebighị ebi.” (Ether 12:41).