Ọgbakọ Zuru ọha
I wulite Ndụ N’eguzogide Onye iro ahụ
Ọgbakọ zuruọha Ọktoba 2022


I wulite Ndụ N’eguzogide Onye iro ahụ

A na m ekpe ekpere n’anyị ga a ga n’ihu n’iwulite ndụ anyị niile site n’isoro atụmatụ niile dị nsọ eji ewu ihe nke Nna nke Eluigwe rọpụtara.

Kamgbe ọtụtụ afọ site n’ọmalịcha pulpit nke Ụlọ Ọgbakọ nke a, anyị anatawo ndụmọdụ di ebube, nke n’akpake mmụọ, nke n’akụzi ma nke mkpughe. N’otu oge, ndị okwu ewerewo ihe ndị metụtara mmata ihe ha niile tinyere nhụmịhe ha iji kuzie ka o doo anya otu ukpuru nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst.

Site n’ụzọ nke a, n’ọmụmatụ, anyị amụtawo banyere ụgbọelu ma ofufe ya nke gosiri na otu ntakịrị njehie ejehere, nwere ike iduru anyị ruo ebe n’abụghị ebe anyị chọbụrụ ị ga na mbụ.1 Sitekwa n’ụzọ nke a, anyị amụtawo ihe na site atụ emere banyere otu obi anyị si arụ ọrụ ya na mgbanwe obi siri ike nke achọrọ maka iji zaa oku Onyenwe anyị kpọrọ i soro Ya.2

Ugbua, Ọ g’amasị m iji obi umeala gbakwụnye otu atụ nke mkpake ya sitere n’ebe m n’arụ ọrụ. Ịhe m n’ekwu maka ya ga-esi n’ọrụ ndị engineer n’ahụ maka irụ ụlọ na ọkpọrọ ụzọ. Site na mmalite agụmakwụkwọ mahadum m, a rọrọ m nrọ maka ụbọchị ahụ mgbe m ga-emezu ihe niile achọrọ n’aka m ka m wee tozuo ị bata nime klas nke ga-akụziri m otu esi ese ụlọ ma ihe ndị ọzọ a ga arụ arụ nke ga-enwe ike guzogide “ala ọmajijiji.”

N’ikpeazụ, ubọchị klas mbụ ahụ ruru maka mmụta nke a. Mkpụrụ okwu mbụ si n’ọnụ ọka mmụta ahụ bụ ndịa: “N’ezie obi dị unu ọkụ ọkụ ibido mmụta nke a ma ka unu wee mụta otu esi ese ihe ndị a na arụ arụ nke ga-enwe ike guzogide ala ọma jijiji,” anyị niile jiri obi ịnụ ọkụ kwe n’isi. Mgbe ahụ ọka mmụta ahụ kwuru, “Ndo, unu ewela iwe na m ga-agwa unu na nke ahụ agaghị ekwe omume, nihi a gaghịm akụziri unu otu esi ese ụlọ nke ‘megidere-’ ma ọbụ ga-egbochi ala ọma jijiji. Nke a enweghi isi,” ka o kwuru, “nihi na ala ọma jijiji g’emerịrị m’anyị ọ chọrọ ya m’anyị achọghị ya.”

Mgbe ahụ ọ gbakwụnyere, “Ihe m g’akụziri unu bụ otu esi ese ụlọ nke ga-eguzogide ala ọma jijiji, ịhe ndị a n’arụ arụ nwere ike iguzogide ike niile nke sitere na ala ọma jijiji, nke g’eme ka ụlọ ahụ guzorokwa n’enweteghi nnukwu mmebi ma nwe ike na-arụkwa ọrụ ahụ ebunobi wee rụọ ya.

Onye engineer ahụ g’eme mgbakọ niile nke ga-egosi udị niile, ejirimara niile nke ntọala ahụ, isi nkume niile, ogidi niile, ihe niile a gawụ awụ tinyekwa akpụrụ akpụ nile nke a ga-ese ese. Ihe niile ndịa g’apụta ihè dịka atụmatụ niile eji arụ ụlọ ahụ, nke onye ọrụ ụlọ ga-esorịrị kpam kpam ka ọrụ ahụ wee nwe ike pụta ihè ma nwe ike mezuo ebumnobi ejiri see ya ma rụọ ya.

Agbanyeghi na afọ 40 agafewo kamgbe klas mbụ ahụ akụziri maka iguzogide ala ọmajijiji, a na m echeta ọfụma oge ahụ mgbe m bidoro nwetewe nghọta dị omimi na nke zuru ezu, maka nnukwu uru ukpuru nke a ga-abaram nime ịhe ọrụrụ niile ndị m ga-ese n’ọrụ m nke ọdịnihu. Ọbụghị naanị nke ahụ, nke ka dịchaa mkpa—na ọ ga-anọgide mgbe niile nime mwulite nke ndụ mụ onwe m ma nime ndị ahụ m g’enwe ezi mmetụta na ndụ ha.

Ọ bụ ngọzị n’anyị maara banyere atụmatụ nke nzọpụta nke Nna anyị nke Eluigwe rọpụtara, ịnwete ozi ọma nke Jizọs Kraịst eweghachitere, ma ịdabere n’elu odudu dị nsọ nke ndị amụma dị ndụ! Ihe ndịa m gụpụtara na mbụ sonyere nime “atụmatụ” dị nsọ esere ese ma sonyekwa nime “ntụziaka” ndị n’akụziri anyị otu esi ewu ndụ añụrị—ndụ ndị ga-eguzogide mmehie, guzogide ọnwụnwa, guzogide mbuso agha niile nke Ekwensu, onye n’achọsike ibibi akaraka ebighị ebi nke anyị ị nọnyekọta anyị na Nna anyi nke Eluigwe ma ndị ezinụlọ ndị anyị hụrụ naanya.

Ọnye nzọpụta N’ọnwe Ya, na mmalite ije ozi Ya, “ka ahapụrụ ka ekwensu nwaa ọnwụnwa.” 3 Mana Jizọs pụtara nwee mmeri site na oke mnwale ahụ. Kedụ otu ịnwe agwa n’eguzogide Ekwensu ma ọbụ nke n’eguzogide ọnwụnwa jiri baara Ya uru? Ihe kpatara Jizọs jiri pụta nwee mmeri site na oge ahụ ndị siri ajọọ ike bụ nkwado ime mmụọ Ya, nke mere Ya ka ọnọrọ ọnọdụ iji guzogide ọnwụnwa niile nke onye iro.

Kedụ ụfọdụ ihe ndị nyeere Onye Nzọpụta aka iji kwado maka oge nke a dị mkpa?

Nke mbụ, Ọ buru ọnụ ụbọchị 40 na abalị 40, obubu ọnụ nke ekpere mgbe niile ga-esorịrị. Nihi nke a, agbanyeghi ọ nwere ike ọgwụgwụ nke anụ arụ, mmụọ Ya siri ezigbote ike. Agbanyeghi, n’ụzọ dị mma, anaghị agwa anyị buo ọnụ ruo ụdị ogologo oge dị otua—kama nanị ruo awa 24 ma otu ugboro n’ọnwa—obubu ọnụ n’enwetere anyị ume ime mmụọ ma n’akwado anyị ịguzogide mnwale niile nke ndụ nke a.

Na ọnọdụ nke abụọ, nime akụkọ ọnwụnwa niile ahụ Onye Nzọpụta rara onwe ya nye, anyị n’ahụ na Ọ zara ajụjụ Ekwensu buru akwụkwọ nsọ n’uche ya, n’ekwupụta ha, ma n’etinye ha n’ọrụ n’oge ziri ezi.

Mgbe Ekwensu nwara Ya ka ọ gbwanwe okwute ndị ahụ ka ha ghọọ achịcha ka ọ nwe ike kwụsị agụụ nke sitere na ogologo ebumọnụ Ya, Onyenwe anyị gwara ya, “edere, Mmadụ agaghị adị ndụ naanị site na achịcha, mana site n’okwu niile nke si n’ọnụ Chineke pụta.” 4 Mgbe ahụ, mgbe Onyenwe anyị nọ elu tempụl ahụ, ekwensu ahụ gbara mbọ ịnwaa Ya ka ọ gosipụta ike Ya, nke kpatara Onyenwe anyị jiri ike zaghachi, “e dere ọzọ, Ị gaghị anwa Onyenwe Chineke gị ọnwụnwa.” 5 Ma nye mbọ atọ nke Ekwensu, Onyenwe anyị zaghachiri, “E dere, Ị ga-efe Onyenwe Chineke gị ofufe, ma naanị ya ka ị ga-ejere ozi.”6

Mgbe ala ọmajijiji gafere, ọ n’egosi aka ya n’ulọ ndị esere nnọ ma wuo nnọ nke ọma—ụdị nsonaazụ niile ndịa n’abụkarị mgbawa ahụ ụlọ, oche na uko ụlọ ndị dara ada, ma windo ndị gbawara agbawa. Mana ụlọ nke a esere ọfụma ma wuo ọfụma g’emezu ebumnobi ya nke bụ ịchekwa ndị nọ ya nime, ma arụzigharị ụfọdụ ihe, ọ ga-abịaghachi otu ọ dị na mbụ.

N’otu aka ahụ, ntaramahụhụ nke onye iro nwere ike meekwa ka “mgbawa,” ma ọbụ ufọdụ mmebi mee nime ndụ anyị, nagbanyeghi mbọ niile anyị iwulite ndụ anyị dịka otu ihe esere ahụ zuru oke dịkwa nsọ siri dị. “Mgbawa” ndị ahụ nwere ike gosipụta onwe ha site ne mmetụta niile nke mnwute ma ọbụ mmetụta nchegharị maka mperi ụfọdụ emere makwa nihi na emeghi ihe n’ụzọ zuru oke ekwesịrị isi eme ya, ma ọbụ mmetụta n’anyị adịghị mma otu ọ gaara amasị anyị ịdị.

Mana ihe kacha mkpa n’ezie bụ ebe anyị esorowo atụmatụ ahụ dị nsọ eji ewu ihe, nke bụ, ozi ọma nke Jizọs Kraịst, anyị ka guzokwara. Nhazi nke ndụ anyị niile abụghị nke akwatuworo nihi mbọ niile nke onye iro ma ọbụ nihi ọnọdụ siri ike nke cheere anyị n’ihu; kama, anyị dị na njikere ị ga n’ihu.

Ọńụ nke ekwere nkwa nime akwụkwọ nsọ dịka ebumnuche nke ịdị adị anyị7abụghị nke a ga-aghọta na ọ pụtara na anyị agaghị enwezi ihe isi ike ma ọbụ iri uju, n’anyị agaghị enwe “mgbawa” dịka ihe nsonazụ nke ọnwụnwa niile, nke mkpagbu, ma ọbụ site na mnwale nille nke ndụ anyị n’ụwa.

Ọńụ ahụ nwere nrụtụaka n’ebe echiche Nifaị nwere maka ndụ mgbe o kwuru, “Ebe ọ bụ na ahụwo m ọtụtụ mkpagbu n’ụbọchị ndụ m niile, otu o sila dị, ebe ọ bụ na onye agọziri agọzi n’anya Onyenwe anyị n’ụbọchị ndụ m niile.”8 Ụbọchị ndụ ya niile! Ọbụna n’ụbọchị niile nke Nifaị tara ahụhụ n’oge aghọtaghị na nnupụisi nke ụmụnne ya nwoke, ọbụna mgbe ha kere ya agbụ n’ụgbọmmiri, ọbụna n’ụbọchị ahụ nna ya, Lehi, nwụrụ, ọbụna mgbe Laman na Lemuel bụziri ajọọ onye iro nke ndị ya. Ọbụna n’ụbọchị niile nke ihe isi ike ndị ahụ, Nifaị nwetere mmetụta na Onyenwe anyị goziri ya.

Anyị nwere ike bịa mata na Onyenwe anyị agaghị mọlị ahapụ anyị ka anwa anyị karịa otu ike anyị siri dị. Alma akpokuwo anyị k’anyị “kpee ekpere esepụghị aka, ka a ghara ịnwa [anyị] ọnwụnwa karịa ka [anyị] ga-ebụli, ma si otu a Mmụọ Nsọ a na-edu unu, na-aghọọ ndị n’eweda onwe ha ala, dị nwayọ, na-erube isi, nwe ndidi, jupụta n’ịhụnanya na ogologo ntachi-obi.”9

Enwekwara ike itinye udị ihe dị otu nime mnwale niile nke ndụ. Ammon na-echetara anyị maka okwu niile nke Onyenwe anyị: “Gaa … ma jiri ndidi die mkpagbu unu nile, ma a ga m enye unu mmeri.”10

Onyenwe anyị mgbe niile na-arọpụtara anyị enyemaka mgbe ihe chere anyị nihu bụ mkpagbu, ọnwụnwa, aghọtaghị ihe, adịghị ike, ma ọbụgodi ọnwụ. O kwuru, “Ma ugbụ a, n’ezie a sị m unu, ma ihe m kwuru nye otu onye ekwuru m nye mmadụ nile, nọọ n’ezigbo ọn̄ụ, ụmụ-ntakịrị; n’ihi na a nọ m n’etiti unu, ma a hapụghị m kwa unu”11 Ọ gaghi ahapụ anyị!

A na m ekpe ekpere n’anyị ga a ga n’ihu n’iwulite ndụ anyị niile site n’isoro atụmatụ niile dị nsọ eji ewu ihe nke Nna anyị rọpụtara ma mezuo site n’Onye nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst. Ya mere, nihi amara ahụ nke n’erutere anyị site na Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta anyị, anyị ga-enwe mmeri n’ịrupụta ndụ nke ga-eguzogide ọnwụnwa, ma nke agbara ume iji nagide obi mnwute, oge niile ndị siri ike na ndụ anyị. Ma ọzọkwa, anyị ga-anọ nime ọnọdụ ndị g’eme k’anyị nwe ike rite ngọzị niile ekwere na nkwa site n’ịhụnanya nke Nna and na Onye Nzọpụta anyị. Na aha nke Jizọs Kraịst, amen.