Ọgbakọ Zuru ọha
Ọrụ Nlekọta Anyị n’Ụwa
Ọgbakọ zuruọha Ọktoba 2022


Ọrụ Nlekọta Anyị n’Ụwa

A na-ekwe ndị hụrụ ụwa n’anya ma na-ahụ maka ụwa na ndị nwoke na ndị nwanyị ibe ha nkwa nnukwu ngọzi ndị nke ime mmụọ dị ukwuu.

Ka anyị gara na obodo a mụrụ anyị bụ France, nwunye m na mụ onwe m mgbe na-adịghị anya nwere obi ụtọ ịkpọrọ ụmụ ụmụ anyị ole na ole gaa n’otu ama ọha na eze magburu onwe ya nke dị n’obere obodo mepere emepe Giverny. Anyị nwere mmasi ịgagharị n’okporo ụzọ ya iji legharịa anya n’ebe ndị a kụrụ okoko osisi, ọmarịcha lili mmiri niile, na ọkụ na-achagharị n’ọdọ mmiri ndị ahụ na-ańụrị.

Foto, oyiyi
Ubi Giverny

Ebe a dị ịtụnanya sitere na ọchịchọ ekeereuche nke otu nwoke: nnukwu onye na-ete agba Claude Monet, onye, kemgbe afọ 40, jiiri nwayọọ kpụzie ma na-akọ ubi ya iji mee ka ọ bụrụ ebe ọ na-anọ ese ihe. Monet tinyere onwe ya n’ịma mma nke ọdịdị; mgbe ahụ, jiri brọsh ihe osise ya, o gosipụtara mmetụta ndị o nwere site n’ihe otite agba na ihe. Nime afọ ndị gafeworonụ, ọ kepụtara nchịkọta pụrụ iche nke narị kwuru narị nke eserese, nke sitere kpọmkwem na mkpake mmụọ nke ubi ya.

Foto, oyiyi
Monet esere ese nke ubi

Ihe esere ese site na Musée d’Orsay, Paris, France / Bridgeman Images

Ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị, mmekọrịta anyị na mma niile nke okike gbara anyị gburugburu nwere ike iwepụta ụfọdụ nhụmihe ndị na-akachasị enye mkpake ma na-enye ańụrị na ndụ. Mmetụta ndị anyị na-enwe na-akpalite nime anyị obi ekele dị omimi maka Nna anyị nke Eluigwe na Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst, onye kere ụwa a magburu onwe ya—nwere ugwu ukwu niile na iyi ya nile, osisi niile na ụmụ anụmanụ ya—na ndị nne na nna anyị mbụ, Adam na Iv.1

Ọrụ nke okike abụghị njedebe n’onwe ya. Ọ bụ akụkụ dị mkpa nke atụmatụ Chineke nwere maka ụmụ Ya. Ebumnobi ya bụ ịkwado ọnọdụ ebe a ga-anwale ndị nwoke na ndị nwanyị, ijiri ohere nhọrọ ha mee ihe, nweta ọńụ, ma mụọ ihe ma nwee ọganiihu ka ha wee nwee ike ịlaghachi n’ihu Onye Okike ha otu ụbọchị wee keta ndụ ebighị ebi.

Okike ndị a dị ịtụnaanya ka akwadoro kpam kpam maka uru anyị ma ha bụrụkwa ihe ama a na-ahụ anya banyere ịhụnaanya nke Onye Okike nwere n’ebe ụmụ Ya nọ. Onyenwe anyị mara ọkwa, “Ee, ihe nile nke si n’ala apụta … ka e mere maka uru nakwa mmadụ iji ha mee ihe, ha abụọ iji mee ka anya hụ ihe ọma na iji mee ka obi dị ụtọ.”2

Otu o sila dị, onyinye si na chi nke Okike adịghị abịa na-enweghị ọrụ na oke na ọrụ. A kọwara ọrụ ndị a nke ọma site n’echiche nke ọrụ nlekọta. N’okwu ozi ọma, okwu ahụ ọrụ nlekọta na-egosipụta ọrụ dị nsọ nke ime mmụọ ma ọ bụ nke anụ ahụ ilekọta ihe bụ nke Chineke nke anyị ga-aza ajụjụ maka ya.3

Dịka a kuziri n’akwụkwọ nsọ dị nsọ, ọrụ nlekọta anyị n’ụwa gụnyere ụkpụrụ ndị a na-esote:

Ụkpụrụ nke Mbụ: Ụwa dum, gụnyere ihe nile dị ndụ nime ya, bụ nke Chineke.

Onye Okike enyefewo akụrụ ngwa niile dị n’ụwa na ụdị ihe niile bu ndụ n’aka anyị, mana O jigidere ihe niile o nwere n’uju. Ọ sịrị, “Mụ onwe m, Onyenwe anyị, gbatịpụrụ eluigwe nile, ma wuo ụwa, aka ọrụ nke m kpoo; na ihe nile nọ n’ime ya bụ nke m.”4 Ihe nile dị nụwa bụ nke Chineke, gụnyere ezi na ụlọ anyị niile, anụ ahụ anyị nile, na ọbụna ndụ anyị kpoo.5

Ụkpụrụ nke abụọ: Dịka ndị na-elekọta ihe niile Chineke kere, anyị nwere ọrụ ịsọpụrụ na ilekọta ha.

Dịka ụmụ Chineke, anyị anatawo ọrụ ịbụ ndị nlekọta, ndị ndozi, na ndị nhazi nke ihe okike Ya nile si na chi. Onyenwe anyị sịrị na Ya mere “onye ọbụla inye nkọwapụta, dịka onye ọrụ n’elekọta ngọzi nile nke ụwa, nke m meworo ma kwadoo maka ihe nile m kere eke.”6

Nna anyị nke Eluigwe na-ahapụ anyị ka anyị jiri akụrụ ngwa niile dị n’ụwa mee ihe dịka o siri masị anyị. Otu ọ dị ekwesịghị ịkọwa ohere nhọrọ anyị dịka ikike iji mee ihe ma ọ bụ richapụ akụ niile nke ụwa a n’ejighị amamiihe ma ọ bụ njide onwe. Onyenwe anyị nyere ndụmọdụ nke a: “Ma ọ masịrị Chineke na o nyewo mmadụ ihe ndị a nile; n’ihi na otu a ka e jiri mee ha ka e were ha mee ihe, n’ụzọ ziri ezi, ọ bụghị imebiga ya oke, ọbụghị ma ọ bụ site na mpụnarị.”7

Onyeisi Russell M. Nelson otu oge kwuru: “Dịka ndị na-erita uru nke Okike si na chi, gịnị ka anyị ga-eme? Anyị kwesịrị ilekọta ụwa, bụrụ ndị nelekọta ya nwere uche, ma chekwaa ya maka ndudugandu dị n’ihu.8

E wezuga ịbụ nanị mkpa sayensị ma ọ bụ nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ilekọta ụwa na agbata eke anyị bụ ọrụ dị nsọ nke Chineke nyefere anyị, bụ nke kwesịrị ime ka anyị juputa na itinye uche n’ọrụ n’ụzọ dị omimi na ịdị umeala n’obi. Ọ bụkwa akụkụ dị mkpa nke ọrụ anyị dị ka ndị na-eso ụzọ. O lee otu anyị ga-esi sọpụrụ ma hụ Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst n’anya na-enweghị nkwanye ugwu na ịhụnaanya n’ihe okike Ha niile?

Enwere ọtụtụ ihe anyị nwere ike ime— iijikọta ọnụ na n’otu n’otu— ịbụ ezigbo ndị nlekọta. Na ịtụle ọnọdụ anyị n’otu n’otu, onye ọbụla nime anyị nwere ike iji akụ na ụba juputara n’ụwa na-eme ihe n’ụzọ kacha nwee nkwanye ugwu na akọ karịa. Anyị nwere ike kwadoo mbọ ndị obodo na-agba maka ilekọta ụwa. Anyị nwere ike ịnakwere ụdị ndụ na akparamagwa nke na-asọpụrụ ihe niile Chineke kere ma mee ka ebe obibi anyị dị ọcha karịa, maa mma karịa, ma na-akpake mmụọ karịa.9

Ọrụ nlekọta anyị n’ebe ihe okike niile nke Chineke gụnyekwara, n’isi ya, ọrụ dị nsọ nke ịhụ mmadụ n’anya, ịkwanye ugwu, na ilekọta ụmụ mmadụ nile anyị na ha na bi n’ụwa. Ha bụ ụmụ ndị nwoke na ụmụ ada nke Chineke, ụmụnne anyị nwanyị na ụmụnne anyị ndị nwoke, na ańụrị nke ebighị ebi ha bụ isi ebumnuche nke ọrụ nke okike.

Odee bụ Antoine de Saint-Exupéry ńomiri ihe ndị a na-esote: Otu ụbọchị, mgbe ọ na-eme njem n’ụgbọ oloko, ọ hụtara onwe ya ka ọ nọ n’etiti igwé ndị gbara ọsọ ndụ. Na mmetụta dị omimi sitere na-enweghị olileanya ọ hụrụ n’ihu otu nwata ntakiri, o tipuru: “Mgbe site na mgbaso usoro okike a mụrụ rose ọhụrụ n’ubi, ndị ọrụ ubi nile na-ańụrị ọńụ. Ha na-ewepụ rose ahụ debe ya ebe mmadụ na-anọghị, na-elekọta ya, na-azụlite ya. Mana ọ dịghị onye na-elekọta ubi maka ndị mmadụ.”10

Ụmụ nne m ndị nwoke na ndị nwanyị, ọ bụ na anyị ekwesịghị ịbụ ndị na-elekọta ubi maka ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị ibe anyị? Ọ bụ na anyị abụghị ndị nche nwanne anyị nwoke? Jizọs nyere anyị iwu ka anyị anyị hụ onye agbata obi anyị n’anya dịka onwe anyị.11 Site n’ọnụ Ya, mkpụrụ okwu ahụ onye agbata obi apụtaghị naanị ndị bi nso n’ebe anyị bi; ọ na-egosi ịdị nso nke obi. Ọ gụnyekọtara ndị nile bi n’ụwa nke a—ma ha bi anyị nso ma ọ bụ na mba dị anya, n’agbanyeghị ebe ha si lọ ụwa, ụzọ nile e siri zụọ ha, ma ọ bụ ọnọdụ niile.

Dịka ndị na-eso ụzọ Kraịst, anyị nwere ọrụ nwere ugwu ịrụsi ọrụ ike maka udo na ịdị n’otu n’etiti mba nile nke ụwa. Anyị aghaghị ịnwa ike anyị n’ụzọ kachasị mma iji chebe ma wetara ndị na-adịghị ike, ndị nọ na mkpa, na ndị nile na-ata ahụhụ ma ọ bụ ndị a na-emegbu emegbu nkasi obi na enyemaka. Karịsịa ihe niile, onyinye ịhụnaanya kachasị ukwuu anyị nwere ike inye mmadụ ibe anyị bụ ịkọrọ ha ọńụ nke ozi ọma ma kpọkuo ha ịbịakwute Onye Nzọpụta ha site na ọgbụgba ndụ niile dị nsọ na emume nsọ nile.

Ụkpụrụ nke atọ: A na-akpọku anyị isonye na ọrụ nke okike.

Usoro okike si na chi a kaezubeghị. Kwa ụbọchị, ihe niile Chineke kere na-aga n’ihu na-eto eto, na-agbasa, ma na-amụba. Ihe magburu onwe ya bụ na Nna anyị nke Eluigwe na-akpọ anyị isonye na ọrụ okike Ya.

Anyị na ekere oke n’ọrụ okike mgbe ọbụla anyị na-akọ ala ma ọ bụ tinye ihe owuwu nke anyị n’ụwa nke a—ma ọ bụrụhaala na anyị na-asọpụrụ ihe nile Chineke kere. Enwere ike igosi ụtụ anyị site na okike nke ọrụ nka, ihe owuwu ụlọ, egwu, agụmagụ, na omenaala, nke na-achọ ụwa anyị mma, na-eme ka uche anyị dị nkọ, ma na-eme ka ndụ anyị dị mma. Anyị na-enyekwa aka site na nchọpụta nke sayensị na ahụike nke na-echekwa ụwa na ndụ dị nime ya. Onyeisi Thomas S. Monson jiri okwu ndị a mara mma pịakọta echiche nke a: “Chineke hapụrụ ịrụcha ụwa ka mmadụ rụọ ọrụ nka ya n’elu … ka mmadụ wee mara ọńụ na ebube nile nke okike.”12

Na nkọniilu nke Jizọs banyere akaraka, mgbe nna ukwu ahụ si na njem ya lọta, o toro ma kwụghachi ndị odibo abụọ ahụ toro ma bulie akaraka ha niile ụgwọ ọrụ. Na ụzọ dị iche, ọ kpọrọ nwa odibo ahụ nke zoro akaraka ya pụrụ iche nime ala “ihe abaghị uru,” ma ọ napụrụ ọbụna nke ahụ ọ nataworo.13

N’otu aka ahụ, ọrụ anyị dịka ndị na-elekọta ihe niile e kere eke nụwa abụghị naanị ihe gbasara idokwa ma ọ bụ ichekwa ha. Onyenwe anyị na-atụ anya n’aka anyị ịrụsi ọrụ ike, dịka Mmụọ Nsọ Ya na-akpali, ito eto, welite, na imeziwanye akụrụ ngwa ndị O nyefere anyị n’aka—ọ bụghị maka ọdịmma anyị naanị kama iji gọzie ndị ọzọ.

Nime ihe nile mmadụ rụzuru, ọ dịghị nke pụrụ iru nhụmihe nke ịghọ ndị so na nkepụta ihe ha na Chineke n’inye ndụ ma ọ bụ n’inyere nwatakịrị aka ịmụta ihe, ito eto, na ime nke ọma—ma ọ bụ dịka ndị nne na nna, ndị nkuzi, ma ọ bụ ndị ndu, ma ọ bụ n’ọrụ ọ bụla ọzọ. Ọ dịghị ọrụ nlekọta dị nsọ karịa, na-enye afọ ojuju karịa, makwa na-achọsi ohere ike, karịa nke iso Onye Okike anyị na-emekọ ihe inye ụmụ mmụọ Ya ahụ anụ ahụ ma mgbe ahụ nyere ha aka iru ike nke si na chi ha.

Oke na ọrụ nke ịbụ ndị so n’okike bụ ihe na-echetara anyị mgbe nile na ndụ na ahụ nke onye ọbụla dị nsọ, na ọ dịghị onye ọzọ nwe ha ewezuga Chineke, ma na O mewo ka anyị bụrụ ndị nlekọta ịkwanyere ha ugwu, chebe, ma lekọta ha. Iwu nsọ nile nke Chineke, nke na-achị ike niile nke ịmụ nwa na nguzobe nke ezi na ụlọ niles dị ebighị ebi, na-eduzi anyị n’ọrụ nlekọta nke a dị nsọ, nke dị oke mkpa nye atụmatụ Ya.

Ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, anyị kwesịrị ịghọta na ihe nile bụ ihe ime mmụọ nye Onyenwe anyị—tinyere akụkụ ndụ anyị pụrụ inwụ anwụ kachasịnụ. A na m agba ama na a na-ekwe ndị hụrụ ụwa n’anya ma na-ahụ maka ụwa na ndị nwoke na ndị nwanyị ibe ha nnukwu ngọzi ndị nke ime mmụọ dị ukwuu. Ka ị na-anọgide ekwesị ntụkwasị obi n’ọrụ nlekọta nke a dị nsọ ma na-asọpụrụ ọgbụgba ndụ gị dị ebighị ebi, ị ga-eto n’ọmụma ihe nke Chineke na nke Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst, ma ị ga enwe mmetụta ịhụnaanya Ha na mmetụta Ha n’uju karịchaa na ndụ gị. Ihe ndị a nile ga-akwado gị ibinyere Ha ma nweta ike okike ọzọ14 na ndụ nke na-abịa abịa.

Na ngwụcha nke ndụ nke anụ ahụ nke a, Nna ukwu ga-asị anyị nye nkọwapụta maka ọrụ nlekọta dị nsọ anyị, gụnyere otu anyị si lekọta ndị O kere. Ana m ekpe ekpere na mgbe ahụ anyị ga-anụ okwu ịhụnaanya Ya ka a na-atakanye ya n’obi anyị: “I mere nke ọma, ezi odibo kwesịrị ntụkwasị obi: i kwesịworo ntụkwasị obi n’ihe ole na ole, Aga m eme gị onye ọchịchị n’ọtụtụ ihe: banye n’ọńụ nke Onyenwe gị.”15 Na aha nke Jizọs Kraịst, amen.