Ọgbakọ Zuru ọha
Zuo oke niime Ya
Ọgbakọ zuruọha Ọktoba 2022


Zuo oke niime Ya

Izu oke anyị ga-ekwe omume naanị site na-amara nke Chineke.

Nna anyị nke Eluigwe na onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst, nwere ike iji zọpụta anyị ma gbanwee anyị. Ha nwere ike inyere anyị aka ghọọ dị ka Ha dị.

Afọ ole ma ole gara aga, otu n’ime ụmụ ụmụ anyị na ndị nwoke, Erọn, malitere inwe nsogbu ahụ ike dị iche iche. Ọ bịara nwee ike ọgwụgwụ, nwee ụmụ obere mmerụ ahụ, ma ọ dịghị ka ahụ ọ dị ya ike. Mgbe enyochasịrị ọnọdụ ahụ ike ya n’ụlọ ọgwụ, a chọpụtara na o nwere oke ụkọ ọbara niime akwara na-emepụta ọbara, ọrịa ebe ụmị ọkpụkpụ ya kwụsịrị ị na-emepụta sel ọbara uhie, sel ọbara ọcha, na ụmụ urughuru sel na-akpụkọta ọbara na-ahụ. Na-enwghị ọgwụ a na-ańụ na ọgwụgwọ na-abịa ma emesịa, ọbara ya enweghị ike ịkpụkọta nke ọma ma ọ bụ buso ọrịa nje ndị na-efe efe agha, ya mere ọbụna ụmụ obere ada, mmerụ ahụ dị iche iche, ma ọ bụ nrịa nrịa dị iche iche nwere ike ghọọ ihe chọrọ iwepụ ndụ mmadụ ọsọ ọsọ.

Na nwa oge nta, Erọn natara ụmụ urughuru sel na-akpụkọta ọbara na mgbanye ọbara na-ahụ iji wepụ ndụ ya na gbata gbata. Ndị dọkịta kọwara na naanị ihe pụrụ ịgwọ ọrịa ahụ ga-abụ iwete ụmị ọkpụkpụ na-ahụ onye ọzọ ma tinye ya na nke ya, ma na ohere kachasị mma iji mezuo nke a ga-abụ inwete otu nwanne ya dị ka onye ga-ewepụta onwe ya ime nke a. Ọ bụrụ na otu onye niime ụmụnne ya ga-abụ onye ọ dabaara ime nke a, mmpụtara nke mwepụta na ntinye nke a nwere ike bụrụ ihe ga-azọ ndụ. Ụmụnne ya ndị nwoke anọ ọ tọrọ ka enyochara, ma otu onye, Maxwell, ka a hụtara hoo haa onye dabara adaba ime nke a.

Ọbụna hoo haa inwe onye dabara adaba ime nke a, iwepụta na itinye ụmị ọkpụkpụ ka bụkwa ihe na-eweta oke mgbagwoju anya dị egwu. Usoro ya chọrọ na sel nke Erọn dị n’ọkpụkpụ nke ya onwe ya nwere ọrịa bụ ihe a ga-ala n’iyi site na ntikọta ọnụ nke kemoterapi na radieshọn tupu ebido ịnata stem sel ndị ahụ site n’ụmị ọkpụkpụ nke nwanne ya nwoke, Maxwell. Ya bụ niihi usoro mgbanarị ọrịa nke Erọn na-esichaghị ike, ọ dị mkpa na ewepụrụ ya iche ebe mmadụ na-anọghị niime ụlọ ọgwụ ahụ ruo ọtụtụ izu ụka ma emesịa na-ebe obibi ihe ruru ọtụtụ ọnwa ma nwee ọtụtụ usoro, ọtụtụ mgbochi, na ọtụtụ ọgwụ pụrụ iche.

Ha tụrụ anya na ihe ga-apụta site na mwepụta na ntinye ahụ bụ na ahụ Erọn agaghị ajụ sel ndị ahụ site n’onye ga-enye ha ma na sel ndị nke Maxwell ga-eji nwayọọ malite iwepụta sel ndị nke ọbara na-acha uhie uhie na nke na-acha ụcha a chọrọ na ụmụ urughuru sel na-akpụkọta ọbara na-ahụ Erọn. Mwepụta na ntinye nke mmadụ nyere gara nke ọma na-ebute ezigbote mgbanwe na-adị na ka esi eme omume. Na-ịtụnaanya, otu dọkịta kọwara na Erọn kpara arụ ma hapụ ọbara n’ebe ahụ a kpara arụ, ndị uwe ojii nwere ike nwụchie nwanne ya nwoke Maxwell. Nke a bụ niihi na ọbara erọn ga-abịa site na sel ndị nke Maxwell ewepụtara tinye ma nwee DNA nke Maxwell, ma nke a ga-abụ ọnọdụ ya n’oge ndụ ya niile.

Ịzọpụta ndụ Erọn site n’ọbara nwanne ya nwoke akpalitewo ọtụtụ echiche banyere ọbara aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst na ndapụta nke Aja mgbaghara mmehie Ya n’ebe anyị nọ. Ọ ga-amasị m itinye uche taa, na mgbanwe na-adị na ndụ na-adghị agbanwe agbanwe nke na-eme mgbe anyị kwere ka Onyenwe anyị rụọ ọrụ ebube dị iche iche niime anyị.1

Erọn enweghị ike ahụ niime ya iji merie ọrịa ahụ. Ahụ ya enweghị ike imepụta sel ọbara ndị a chọrọ iji kwadoo ndụ ya. Na-agbanyeghị ihe o mere n’onwe ya, o nweghị ike ịgwọ ụmị ọkpụkpụ ya. Dị ka Erọn ji nweghị ike gwọọ onwe ya, anyị enweghị ike ịzọpụta onwe anyị. Na-agbanyeghị otu e nwere ike, otu eji gụọ akwụkwọ, otu eji mara ihe, ma ọ bụ otu anyị si gbasie ike, anyị enweghị ike ịsachapụ mmehie anyị n’onwe anyị, gbanwee ahụ anyị ruo n’ọnọdụ ndụ a na-apụghị ịnwụ anwụ, ma ọ bụ bulie onwe anyị elu. Ọ bụ ihe kwere omume naanị site n’Onye Nzọpụta Jizọs Kraịst na Aja mgbaghara mmehie Ya na-enweghị ọgwụgwụ. “Ma ọ dịghị ụzọ ọzọ ma ọ bụ aha ọzọ enyere n’okpuru eluigwe nke mmadụ ga-esi nwee nzọpụta n’alaeze Chineke.”2 Ọ bụ ọbara nke aja mgbaghara mmehie Ya nke na-asachapụ anyị ma doo anyị nsọ.3

Na-agbanyeghị na Erọn enweghị ike ịgwọ onwe ya, iji hụ na mwepụ na ntinye ahụ rụrụ ọrụ o kwesịrị ịdị na njikere ime ihe ndị dọkịnta gwara ya mee—ọbụna ihe ndị siri oke ike, na-eche aka mgba. Na-agbanyeghị na anyị enweghị ike ịzọpụta onwe anyị, mgbe anyị nyefere onwe anyị nuche nke Onyenwe anyị ma debe ọgbụgba ndụ anyị niile, ụzọ na-emepe maka mgbapụta anyị.4 Dị ka usoro pụrụ iche nke DNA nke sel ndị nke ọbara erọn na-agbanwe agbanwe, anyị nwere ike gbanwee obi anyị,5 ma nwee onyinyo Ya na mbara ihu anyị,6 ma ghọọ ndị ekere ọhụụ niime Kraịst.7

Alma cheteere ndị nke Zarahemla banyere ndudugandu gara aga bụwooro ndị atọghatara atọghata. Na-ekwu ihe banyere nna ya, Alma kọwara na “dị ka otu okwukwe ya siri dị na e nwere nnukwu mgbanwe e mere n’obi ya.”8 Mgbe ahụ ọ jụrụ, Unu enwetawo nnukwu mgbanwe nke a n’obi unu?”9 Ọ bụghị ndị ahụ bụ ndị gbanwere obi nke ha onwe ha. Onyenwe anyị mere ya bụ ezi mgbanwe. Alma kwuru ya hoo haa. Ọ sịrị, “Lee, ọ gbanwere obi ha.”10 Ha “wedara onwe ha ala ma tụkwasị obi ha n’ezi Chineke dị ndụ … [ma] wee nwee okwukwe tutu ruo ọgwụgwụ … [ma] wee nweta nzọpụta.”11 Ndị ahụ dị na njikere imeghe obi ha ma nwee okwukwe, ma mgbe ahụ Onyenwe anyị gbanwere obi ha. Olee ụdị nnukwu mgbanwe dị otu ahụ! Chee echiche banyere ndịiche dị na ndụ ndịikom abụọ ndị a akpọrọ Alma tupu na mgbe agbanwechara obi ha.12

Anyị bụ ụmụ Chineke nwere akaraka na-enye ugwu. E nwere ike gbanwee anyị ịghọ ndị dị ka Ya ma nwee “ọńụ n’uju.”13 Setan, n’aka nke ọzọ, ga-achọ ka anyị nwee obi ọjọọ dị ka ya.14 Anyị nwere ike ị họrọ onye anyị ga-eso.15 Mgbe anyị sooro Setan, anyị na-enye ya ike.16 Mgbe anyị sooro Chineke, Ọ na-enye anyị ike.

Onye Nzọpụta kuziri na anyị “kwesịrị izu oke.”17 Nkea nwere ike na-eyi oke egwu. E nwere m ike hụta ezughị oke m niile nke ọma ma a maara m nke ọma banyere oke dị na-etiti mụ na ezughị oke. Anyị nwere ike nwee ụdị agwa nke ị na-eche na anyị ga-eme onwe anyị izu oke n’onwe anyị, mana nke ahụ ekweghị omume. Ị na-agbasoro ntinye uche ọbụla dị niime akwụkwọ enyem aka nke onwe ọbụla dị niime ụwa agaghị eme ka ọ dị otu ahụ. E nwere naanị otu ụzọ na otu aha nke izu oke n’esi na ya abịa. Anyị bụ ndị “e meworo ka ha zuo oke site na Jizọs onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, onye chụrụ aja mgbaghara mmehie nke a zuru oke site n’ịkwafu ọbara nke ya onwe ya.”18 Izu oke anyị bụ naanị ihe kwere omume site na-amara nke Chineke.

I nwere ike chee otu nnyịgbu ya gaara adịrị nwa nwa anyị nke nwoke Erọn iche na ya ga-aghọta ma mezuo usoro ụlọ ọgwụ niile gbasara iwepụta na itinye n’onwe ya? Anyị ekwesịghị iche na anyị kwesịrị ime ihe naanị Onye Nzọpụta nwere ike ime nusoro nke ntozu oke anyị dị ebube.

Mgbe Moronaị bịara na mmechi ndekọihe ya, ọ kụziri: “Ee, bịakwutenụ Kraịst, ma zuonụ oke niime ya, … ma ọ bụrụ na unu ga-ewezuga onwe unu site niihe niile na-egosị na-amaghị Chineke, ma hụ Chineke naanya jiri ike unu, echiche na ume unu niile, mgbe ahụ ka amara ya zuru oke nye unu, nke mere na site na-amara ya unu ga-enwe ike zuo oke niime Kraịst.”19 Lee eziokwu na-enye nkasi obi ma dị ike nke a! Amara Ya zuru m oke. Amara Ya zuru gị oke. Amara Ya zuru ndị niile ndị “na-adọgbu onwe ha n’ọrụ ma buru ibu dị arụ.”20

Site na-ọgwụgwọ nke ụlọ ọgwụ dị ka nke Erọn, mgbe niile a na-enwekarị ụfọdụ ihe obi iko n’elu banyere ihe ga-adapụta. N’ezie, Erọn nwere mkpa iwepụta tinye nke ugboro abụọ mgbe nke mbụ nwere ọtụtụ mgbagwoju anya. N’obi ekele, site na mgbanwe obi nke ime mmụọ, anyị ekwesịghị ịtụ egwu ma ọ bụ na ọ ga-eme. Mgbe anyị biri ndụ dị ka uche Ya si chọọ, “na-adabere kpam kpam n’elu ụgwọ ọrụ niile nke ya onye dị ike n’ịzọpụta,”21 e kwere nkwa100 pecent nke inwe nsachapụ site n’ọbara nke Onye Nzọpụta ma mesịa n’ikpeazụ bụrụ onye zuru oke niime Ya. Ọ bụ “Chineke nke eziokwu, ma [nweghị] ike ị sị asị.”22

O nweghị mgbagha na usoro nke mgbanwe nke a na-ewe oge ma agaghị emezu ya tutu ndụ nke a agasịa, kama nkwa ahụ ahaghị ịdị ire. Mgbe mmezu nke nkwa niile nke chineke yiri ka ihe dị anya, anyị na-aganiihu anakwere nkwa ndị ahụ, ebe ama na ha ga-emezu.23

Mgbanwe dị ịtụnaanya dị na-ahụike nke Erọn ewetawo nnukwu ọńụ n’ezi na ụlọ anyị. Chegodu echiche banyere nnukwu ọńụ dị n’eluigwe mgbe mgbanwe ndị dị ukwuu mere niime mkpụrụ obi anyị.

Nna anyị nke Eluigwe na Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst, hụrụ anyị naanya ma sitewo na amara kwere ịgbanwe anyị ma mee ka anyị zuo oke. Ha chọrọ ime nke a. Ọ bụ isi ihe nyere ọrụ na otuto Ha.24 Ana m agba ama na Ha nwere ike ime nke a dị ka anyị na-abịakwute Ha n’okwukwe. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen