Ọgbakọ Zuru ọha
Ma Ha Wee Chọọ Ịhụ Jizọs Onye Ọ Bụ
Ọgbakọ zuruọha Ọktoba 2022


Ma Ha Wee Chọọ Ịhụ Jizọs Onye Ọ Bụ

Ana m agba aka ebe na Jizọs dị ndụ, na Ọ maara anyị, ma na O nwere ike iji gwọọ, iji gbanwee, na iji gbaghara.

Ụmụnne nwoke, ụmụnne nwanyị, na ndị enyi, n’afọ 2013 nwunye m, Laurel, na mụ onwe m ka akpọrọ ije ozi dị ka ndị ndu mishọ nọ na Mishọn Czech/Slovak. Ụmụ anyị anọ sooro anyị jee ozi.1 A gọziri anyị dị ka ezi na ụlọ site na ndị mgbasa ozi ọma maara ihe ma site na Ndị nsọ Czech na Slovak pụrụ iche. Anyị hụrụ ha n’anya.

Dị ka ezi na ụlọ anyị banyere ogige mishọn, otu ihe Okenye Josef B. Wirthlin kuziri sooro anyị gaa. N’okwu enyere aha “Iwu nsọ Dị Ukwuu,” Okenye Wirthlin jụrụ, “Unu hụrụ Onyenwe anyị naanya?” Ndụmọdụ Ya nye anyị onwe anyị ndị ga-aza ee dịịrị mfe ma dị omimi: “Wepụta oge nonyere Ya. Tụgharịa uche n’okwu Ya niile. Wekwasị onwe gị yok Ya. Chọọ ịghọta na irube isi.”2 Okenye Wirthlin mgbe ahụ kwere nkwa ngọzi ndị nke na-enye mgbanwe n’ebe ndị ahụ dị na njikere inye Jizọs Kraịst oge na ọnọdụ.3

Anyị tinyere ndụmọdụ na nkwa nke Okenye Wirthlin n’obi. Anyị na ndị mgbasa ozi ọma anyị, anyị na Jizọs nọkọrọ ọtụtụ oge, na-amụ akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn sitere na Agba Ọhụrụ na 3 Nifaị sitere na Akwụkwọ nke Mọmọn. Na ngwụcha nzukọ mgbasa ozi niile, anyị hụtara onwe anyị ọzọ n’ihe anyị weere dị ka “Ozi ọma Ise” ahụ4 na-agụ ihe, na-akparịta ụka, na-atule, ma na-amụ ihe banyere Jizọs.

Nye mụ onwe m, nye Laurel, ma nye ndị mgbasa ozi ọma anyị, ịnọnyere Jizọs n’ime akwụkwọ nsọ gbanwere ihe niile. Anyị ritere ekele miri emi maka onye Ọ bụ na ihe dị Ya mkpa. N’otu anyị tulere otu O si kuzie ihe, ihe Ọ kụziri, ụzọ ndị O si gosi ịhụnaanya, ihe O mere iji gọzie ma jee ozi, ọrụ ebube Ya niile, otu O si zaghachi nrara nye, ihe O ji mmetụta obi nke mmadụ siri ike mee, aha ndị a na-akpọ Ya na aha niile, otu O si gee ntị, otu O si mezie esemokwu, ụwa nke O biri na ya, nkọnilu Ya niile, otu O si kwadoo ịdị notu na obi ọma, ike Ya ịgbaghara na ịgwọ ọrịa, okwuchukwu Ya niile, ekpere Ya niile, aja mgbaghara mmehie Ya, Mbilite n’ọnwụ Ya, ozi ọma Ya.

Mgbe ụfọdụ ọ dịịrị anyị ka “[mkpụmkpụ] ogo” Zakịọs na-agbaga ite elu osisi sikamọ mgbe Jizọs siri na Jeriko gafee niihi na, dị ka Luk kọwara ya, anyị “wee chọọ ịhụ Jizọs onye ọ bụ.”5 Ọ bụghị Jizọs dị ka anyị si chọọ ma ọ bụ chekube Ya ị bụ, ma kama Jizọs dị ka Ọ dịịrị n’ezie na dị ka Ọ dị.6 Dị nnọọ ka Okenye Wirthlin kweworo nkwa, anyị mụtara n’ụzọ a hụrụ anya na “ozi ọma nke Jizọs Kraịst bụ ozi ọma nke mgbanwe. Ọ na-ewere anyị dị ka ndị ikom na ndị inyom nke ụwa ma nụchaa anyị ị bụ ndị ikom na ndị inyom maka ebighị ebi niile.”7

Ndị ahụ bụụrụ ụbọchị ndị pụrụ iche. Anyị bịara kwere na site “na Chineke enweghị ihe a na-apụghị ime.”8 Ehihie ndị dị nsọ na Prague, Bratislava, or Brno na-enwete nhumiihe ike na nsiridị nke Jizọs, gaaniihu pụta ihe n’ime ndụ anyị niile.

Mgbe ụfọdụ anyị na-amụ Mak 2:1-12. Akụkọ nọ ebe ahụ na-akpali mmasị. A chọrọ m ịgụ akụkụ ya sitere kpọmkwem na Mak ma emesịa kesaa ya dị ka m bịaworo ghọta ya mgbe ọmụmụ ihe miri emi na mkparịta ụka mụ na ndị mgbasa ozi ọma na ndị ọzọ gasịrị.9

Ọzọkwa [Jizọs] banyere na Capernaum mgbe ụfọdụ ụbọchị gasịrị; ma ọ kpọtụrụ na ọ nọ n’ime ụlọ.

“Ozugbo ọtụtụ mmadụ zukọtara ọnụ, nke mere na ohere afọdụghị ịnabata ha, mba, ọ bụladị n’ọnụ ụzọ: ma ọ kwusaara ha okwu ahụ.

“Ma ha bịakwutere ya, na-ebute otu onye ọrịa nwere ahụ mkpọnwụ, nke mmadụ anọ bu.

“Ma mgbe ha na-enweghị ike ibutere ya Jizọs n’ihi igwe mmadụ, ha gwupuru oghere n’elu ụlọ ebe ahụ ọ nọ: ma mgbe ha gwupusiri ya, ha budatara akwa onye ahụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ jiri dina.

“Mgbe Jizọs hụrụ okwukwe ha, ọ sịrị onye ọrịa ahụmkpọnwụ ahụ, Nwa nwoke, njọ gị niile ka agbaghaworo gị.”

Mgbe ya na ụfọdụ niime igwe mmadụ ndị ahụ kpasịrị nkata,10 Jizọs elee nwoke ahụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ ma gwọọ ya na-anụ ahụ, na-asị:

“Ana m a sị gị, Bilie, ma bulie akwa gị, ma laa n’ụlọ gị.

“Ma n’egbughị oge o biliri, bulie akwa ya, ma pụọ n’ihu ha niile: nke mere na ọ tụrụ ha niile naanya, ma too Chineke, na-asị, Anyị ahụtụbeghị ihe dị otu a mbụ.”11

Ugbua akụkọ ahụ dị ka m bịaworo ghọta ya: Na mmalite ije ozi Ya, Jizọs laghachiri Capernaum, ntakịrị obodo na-akụ azụ̀ nọ na mpaghara ugwu nke ikpere mmiri Oke osimiri nke Galilee.12 O meworịị nsoro nsoro nke ọrụ ebube oge na-adịghị anya site n’ịgwọ ndị ọrịa ma chụpụ ajọọ mmụọ niile.13 N’ịchọsi ike ịnụ ma zute nwoke ahụ a na-akpọ Jizọs, ndị ime obodo ahụ gakọtara n’ebe obibi ebe a nụrụ kepu kepu na Ọ nọ anọ.14 Dị ka ha mere, Jizọs malitere ikuzi ihe.15

Ebe obibi n’oge ahụ ndị dị na Capernaum nwere elu ụlọ dị larịị, otu ụlọ elu ebe a na-ebi ebi, achịkọtara ọnụ.16 Elu ụlọ ahụ na mgbidi niile bụụrụ ngwakọta nke okwute, osisi, ụrọ, na akịrịka, a na-enwete site na otu mkpokọta nke nzọụkwụ ndị dị mfe dị na akụkụ ebe obibi ahụ.17 Igwe mmadụ ahụ mụbara ọsọ ọsọ n’ụlọ ahụ, jupụta ọnụ ụlọ ahụ ebe Jizọs na-akuzi ihe, ma gbasaa pụọ ruo n’okporo ama ahụ.18

Akụkọ ahụ na-elekwasị anya n’otu nwoke “na-arịa ọrịa ahụ mkpọnwụ” na ndị enyi ya anọ.19 Ọrịa mkpọnwụ bụ ụdị ngwọrọ, nke ike ọgwụgwụ na ahụ ịma jijiji na-eso ọtụtụ mgbe.20 Ana m eche otu niime ihe anọ a na-agwa ndị ọzọ, “Jizọs nọ n’ime obodo anyị. Anyị niile maara banyere ọrụ ebube niile Ọ rụworo na ndị ahụ Ọ gwọworo. Ọ bụrụ na anyị ga-enwe ike kpọtara Jizọs enyi anyị, elemaanya ya nwa kwa ka enwere ike ime ka o zuo oke.”

Ya mere onye ọbụla n’ime ha na-ewere otu akụkụ ute ma ọ bụ akwa nke enyi ha ma bido ịbụrụ ya site na ama niile nke Capernaum gbagọrọ agbagọ, dị gịrịgịrị, ana awaghị awa.21 Ogwe aka na ụkwụ na-egbu mgbu ike gwụrụ, ha anọ tụgharịrị n’akụkụ nke ikpeazụ naanị ịchọpụta na igwe mmadụ ahụ ma ọ bụ, dị ka akwụkwọ nsọ kpọrọ ya, “igwe” mmadụ gbakọtara ige ntị dị oke ukwuu na ịkpọfe enyi ha site na ọnụ ụzọ ahụ ruo Jizọs agaghị ekwe omume.21 Jiri ịhụnaanya na okwukwe, anọ a anaghị ada mba. Kama, ha gbagoro nzọụkwụ ahụ ruo n’elu ụlọ ahụ dị larịị, kpachara anya bulie enyi ha na akwa ya elu, gwupee elu ụlọ ahụ kpuchiri ime ụlọ ahụ ebe Jizọs na-akuzi ihe, ma budata enyi ha.23

Tulee na n’etiti ihe gaara abụrịị oge nkuzi dị mkpa, Jizọs a na-anụ mkpọtụ na-eme kọrọ kọrọ, lelie anya elu, ma hụta oghere na-abawanye n’uko ahụ dị ka uzuzu na akịrịka na-adabata n’ime ọnụ ụlọ ahụ. Otu nwoke ahụ kpọnwụrụ nọ n’elu akwa ka e budatara n’ala. N’ụzọ pụrụ iche, Jizọs hụtara nke ọma na nke a abụghị nnapụ okwu n’ọnụ kama na ọ bụ ihe dị mkpa. Ya elee nwoke ahụ nọ n’elu akwa anya, gbaghara ya njọ ya niile n’ihu ọha, ma gwọọ anụ ahụ ya site n’ọrịa ya.24

N’iburu akụkọ nke Mak 2 a kọrọ nuuche, ọtụtụ eziokwu dị mkpa banyere Jizọs dị ka Kraịst bịara doo anya. Na mbụ, mgbe anyị na-anwa inyere onye anyị hụrụ naanya aka bịakwute Kraịst, anyị nwere ike mee otu ahụ jiri ntụkwasị obi na O nwere ike iji bupu ibu arọ nke mmehie na ịgbaghara. Nke abụọ, mgbe anyị na-ebute ọrịa niile nke anụ ahụ, nke mmetụta uche, ma ọ bụ ndị ọzọ nye Kraịst, anyị nwere ike mee otu ahụ mara na O nwere ike iji gwọọ ma kasie obi. Nke atọ, mgbe anyị gbara mbọ dị ka mmadụ anọ ndị ahụ ikpọta ndị ọzọ nye Kraịst, anyị nwere ike mee otu ahụ nwee obisike na Ọ na-ahụ ezi nzube anyị ma ga-asọpụrụ ha otu kwesịrị ekwesị.

Cheta, nkuzi nke Jizọs ka akwụsịtụrụ site na mpụta ihe nke otu oghere n’elu ụlọ. Kama ịdọ aka na ntị ma ọ bụ ịchụpụ mmadụ anọ ahụ gwupuru oghere ahụ maka ime nkwụsịtụ, akwụkwọ nsọ na-agwa anyị na “Jizọs hụrụ okwukwe ha.”25 Ndị ahụ gbara akaebe ọrụ ebube mesịrị “nwee ịtụnaanya, ma too Chineke, nke nyeworo ụdị ike dị otu a [n’aka] ụmụ mmadụ.”26

Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, ka m jiri nchọpụta abụọ ọzọ a gbakwunyere mechie. Ma ọ bụ dị ka ndị mgbasa ozi ọma, ndị n’eje ozi, ndịisi Otu Enyem aka, ndị bishọp, ndị nkuzi, ndị nne na nna, ụmụnne, ma ọ bụ ndị enyi, anyị niile nwere ọrụ dị ka Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a na-eso ụzọ Kraịst n’ọrụ nke ịkpọta ndị ọzọ nye Kraịst. Site otu a, àgwà ndị enyi anọ ahụ gosiri bụ nke kwesịrị nleba anya na nṅomi.27 Ha wara anya, na-anagide, agbanweghị agbanwe, nwee ekeereuche, nwee mmasị ime ọtụtụ ihe dị iche ichepụrụ, jupụta n’olileanya, nwee mkpebisi ike, kwesị ntụkwasị obi, nwee nchekwube, dị umeala, ma dị nnagide.

Na mgbakwunye, ndị enyi anọ ahụ gosipụtaziri mkpa ime mmụọ nke adị na mma na mkpakọrịta.28 I ji nwee ike kpọtara Kraịst enyi ha, onye ọbụla n’ime mmadụ anọ ahụ ga-eburiri akụkụ ha. Ọ bụrụ ma otu wepụ aka, ọtụtụ ihe nwere ike raa ahụ karịa. Ọ bụrụ na mmadụ abụọ a daa mba, ọrụ ahụ n’egbughị oge ga-abụrụ ihe na-agaghị ekwe omume. Onye ọbụla n’ime anyị nwere ọrụ ịrụ n’alaeze Chineke.29 Dị ka anyị na-emejupụta ọrụ ahụ ma mee nke anyị, anyị na-eburu akụkụ nke anyị. Ma ọ bụ n’ime Argentina ma ọ bụ na Vietnam, Accra ma ọ bụ Brisbane, otu ngalaba nta ma ọ bụ otu ngalaba ukwu, otu ezi na ụlọ ma ọ bụ otu nsiso onye mgbasa ozi ọma, onye ọbụla nime anyị nwere otu akụkụ i buru. Dị ka anyị na-eme, ma ọ bụrụ na anyị ga-eme, Onyenwe anyị na-agọzi anyị niile. Dị ka Ọ hụrụ okwukwe ha, otu ahụ ka Ọ ga-esi hụ nke anyị ma gọzie anyị dị ka ndị mmadụ.

N’oge ndị dị iche iche e buruwo m akụkụ nke akwa, ma n’oge ndị ọzọ a bụrụwo m onye nke ebu ebu. Otu akụkụ ike nke akụkọ nke Jizọs nke a pụrụ iche bụ na ọ na-echetere anyị nnọọ otu anyị si nwee mkpa ibe anyị, dị ka ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, iji nwee ike bịakwute Kraịst ma nwee mgbanwe.

Ndị a bụ ihe ole ma ole m mụtaworo site na-ịnọkọ mụ na Jizọs n’ime Mak 2.

“Ka Chineke nye aka ka anyị wee nwee ike [buru akụkụ nke anyị], ka anyị ghara ịgbapụ, ka anyị ghara ịtụ egwu, kama ka anyị wee nwee ike sie ike n’okwukwe anyị, ma kpebie n’ọrụ anyị, imejupụta nzube niile nke Onyenwe anyị.”30

Ana m agba aka ebe na Jizọs dị ndụ, na Ọ maara anyị, ma na O nwere ike iji gwọọ, iji gbanwee, na iji gbaghara. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen

Hụba ama

  1. Evie, Wilson, Hyrum, na George.

  2. Joseph B. Wirthlin, “Iwu nsọ nke Kachasị,” Liahona, Nov. 2007, 30.

  3. Ngọzi niile a matara site naka Okenye Wirthlin gụnyere ụbara ike maka ịhụnaanya, ịdị njikere inwe nrube isi ma nabata iwu nsọ niile nke Chineke, ọchịchọ ijere ndị ọzọ ozi, na àgwà ime ezi ihe mgbe niile.

  4. “The Gospels … are a fourfold presentation under the names of four different evangelists or Gospel writers of the life and teaching of Jesus, and of his suffering, death and resurrection” (Anders Bergquist, “Bible,” in John Bowden, ed., Encyclopedia of Christianity [2005], 141). Ọkọwa okwu Baịbụl gbakwunyere na “okwu ahụ ozi ọma pụtara ’ozi dị mma.’ Ozi dị mma ahụ bụ na Jizọs Kraịst achụwo aja mgbaghara mmehie zuru oke maka ụmụ mmadụ nke ga-agbapụta ụmụ mmadụ niile. … Ndekọihe niile nke ndụ anụ ahụ Ya na mmemme niile gbasara ije ozi Ya ka akpọrọ Ozi ọma niile” (Ọkọwaokwu Baịbụl, “Ozi ọma niile”). 3 Nefi, edekọrọ site n’aka Nefi, nwa nwa Helaman nke nwoke, nwere ndekọihe nke mpụta ihe na nkuzi nke Jizọs Kraịst bilitere n’ọnwụ n’ime Amerịkas naanị mgbe Mkpọgbu n’obe Ya gasịrị ma, ya mere, ka e nwekwara ike ịkpọ dị ka “Ozi ọma.” Ozi ọma niile na-akpali mmasị karịsịa n’ihi na ha dekọtara mmemme niile na ọnọdụ niile nke Jizọs n’onwe Ya na-arụsi ọrụ ike ikuzi ihe ma soro na-eme ihe. Ha bụ ebe mmalite dị egwu maka ịghọta Jizọs dị ka Kraịst, mmekọrịta anyị na Ya, na ozi ọma Ya.

  5. Lee Luk 19:1–4; lekwa Jekọb 4:13 na-akọwa na Mmụọ ahụ “na-ekwu maka ihe niile dị ka ha dị nezie, na maka ihe niile dị ka otu ha ga-adịrịrị”) na Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 93:24 na-akọwa eziokwu dị ka “mmata ihe nke ihe niile dị ka otu ha dị, na dị ka otu ha dịbuuru, na dị ka otu ha ga-adị”).

  6. Onyeisi J. Reuben Clark notu aka ahụkwa gbara ume ọmụmụ ihe nke ndụ nke Onye Nzọpụta dị ka ezi àgwà. Ọ kpọkuru ndị ọzọ ịnọ n’ime nkọwapụta nke ime akwụkwọ nsọ banyere ndụ nke Jizọs Kraịst, ịgbalị ma soro Onye Nzọpụta na-aga, binyere ya, kwe ka ọ bụrụ nwoke dị adị n’ezie, ọkara si na chi, n’ezie, mana na-agbanyeghị na-aga dị ka mmadụ gara n’ụbọchi ndị ahụ. Ọzọkwa O kwere nkwa na ụdị mgbalị ahụ “ga-enye gị ụdị nhụta maka ya, ụdị mmekọrịta chiri anya gị na ya dị ka m chere na ị gaghị esi n’ụzọ ọzọ enweta. … Mụọ ihe o mere, ihe ọ chere, ihe ọ kụziri. Mee dị ka o mere. Bie ndụ dị ka o biri, ruo ebe anyị nwere ike. Ọ bụ nwoke zuru oke” (Behold the Lamb of God [1962], 8, 11). For insight regarding the value and reasons for studying Jesus in the context of history, see N. T. Wright and Michael F. Bird, The New Testament in Its World (2019), 172–87.

  7. Joseph B. Wirthlin, “Iwu nsọ ahụ Dị Ukwuu,” 30.

  8. Luk 1:37.

  9. Na mgbakwunye mkparịta ụka agbatịrị agbatị mgbe ọbụla Mark 2:1–12 anyị na ndị mgbasa ozi ọma nke Czech/Slovak Mishọn, obi jupụtakwara m n’ekele maka ihe ọmụmụ niile m mụtara na-atule ederede nke a anyị na ndịikom nta na ndịinyom nta nke klas nkwado mgbasa ozi ọma Salt Lake Highland Stek na ndị ndu na ndị otu nke Stek Salt Lake Pioneer YSA.

  10. Lee Mak 2:6–10.

  11. Mak 2:11–12.

  12. Lee Bruce M. Metzger and Michael D. Coogan, eds., The Oxford Companion to the Bible (1993), 104; James Martin, Jesus: A Pilgrimage (2014), 183–84.

  13. Lee Mak 1:21–45.

  14. Lee Mak 2:1–2.

  15. Lee Mak 2:2.

  16. Lee Metzger and Coogan, The Oxford Companion to the Bible, 104; William Barclay, The Gospel of Mark (2001), 53.

  17. Lee Barclay, The Gospel of Mark, 53; leekwa Martin, Jesus: A Pilgrimage, 184.

  18. Lee Mak 2:2, 4; leekwa Barclay, The Gospel of Mark, 52–53. Barclay na-akọwa na “ndụ n’ime Palestin bụ nnọọ ihe ọha. N’ụtụtụ emeghere ọnụ ụzọ nke ụlọ ahụ ma onye ọbụla nke chọrọ ga-enwe ike pụọ ma ọ bụ banye. Enweghị mgbe e mechiri ọnụ ụzọ nke ụlọ ahụ ọ gwụla ma enwere onye kpachara anya na-achọ ịnọọrọ onwe ya; ọnụ ụzọ meghere emeghe pụtara òkù ghe ọnụ maka onye niile ịbata. N’ebe obibi kacha dị umeala dị ka [nke ahụ a rụtụrụ aka n’ime Mak 2ọ ga-abụrịrị, enweghị họọlụ mbanye; ọnụ ụzọ ahụ meghere nnọọ chewe ihu … n’ama. Ya mere, n’oge na-adịghị anya, igwe mmadụ ejupụtawo n’ụlọ ahụ n’uju ma nọchie ebe a na-aga ije n’akuku ọnụ uzo; ma ha niile naara ege ntị nke ọma n’ihe Jizọs nwere ikwu.”

  19. Mak 2:3

  20. Lee Medical Dictionary of Health Terms, “palsy,” health.harvard.edu.

  21. Lee Martin, Jesus: A Pilgrimage, 184.

  22. Mak 2:4

  23. Lee Mark 2:4; leekwa Julie M. Smith, Ozi ọma Ahụ dị ka Mak siri dee (2018), 155–71.

  24. Lee Mak 2:5–12

  25. Mak 2:5; nkwụsị ike nke agbakwunyere.

  26. Matiu 9:8; leekwa Mak 2:12; Luk 5:26

  27. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 62:3 na-akọwa na ndị odibo nke Onyenwe anyị ka a “gọziri agọzi, n’ihi na ọgbụgba ama nke ha gbaworo ka e dekọrọ n’eluigwe … ma njọ unu niile ka a gbaghaworo unu.”

  28. Lee M. Russell Ballard, “Olile anya n’ime Kraịst,” Liahona, Me 2021, 55–56. Onyeisi Ballard kwuru na “echiche nke isoro” dị mkpa nye ma ahụike nke anụ ahụ na nke ime mmụọ, ma ọ matakwara na “onye otu ọbụla n’ime kworum anyị niile, otu niile, ngalaba ukwu niile, na stek niile nwere onyinye na akaraka ndị Chineke nyere nke nwere ike inye aka wulite alaeze Ya ugbua.” Leekwa David F. Holland, Moronaị: A Brief Theological Introduction (2020), 61–65. Holland kọwara Moronaị 6 na ụzọ niile nke nsoro na ofufe n’obodo nwere okwukwe na-enye aka ikwado ụdị nhumiihe nke onwe n’ime mmụọ nke na-ejikọta anyị nso ruo eluigwe.

  29. Lee Dieter F. Uchtdorf, “Bulie Ebe I Guzoro,” Liahona, Nov. 2008, 56. Okenye Uchtdorf kọwara na “enweghị onye n’ime anyị nwere ike ma ọ bụ kwesịrị i buru ọrụ nke Onyenwe anyị naanị ya. Mana ọ bụrụ na anyị nọkọta ọnụ nso n’ebe ahụ Onyenwe anyị kwadobere ma bulie ebe anyị guzooro, enweghị ihe nwere ike igbochi ọrụ nke a si na chi ịgbago elu ma gaaniihu.” Lee also Chi Hong (Sam) Wong, “Napụta n’ịdị N’otu,” Liahona, Nov. 2014, 15. Okenye Wong rụtụrụ aka na Mak 2:1-5 ma kuzie na “iji nwee ike nyere Onye Nzọpụta aka, anyị kwesịrị ịrụkọta ọrụ ọnụ n’ịdị n’otu ma nụzọ dabara adaba. Onye ọbụla, ọkwa ọbụla, na ọkpụkpọ oku ọbụla dị mkpa.

  30. Oscar W. McConkie, n’ime Ndekọihe nke Ọgbakọ, Oct. 1952, 57.