Ọgbakọ Zuru ọha
Ịbụ Onye na-eso ụzọ nke Na-anọgide
Ọgbakọ zuruọha Ọktoba 2022


Ịbụ Onye na-eso ụzọ nke Na-anọgide

Anyị nwere ike ịchọta obisike nke ime mmụọ ma udo dị ka anyị n’azulite agwa dị nsọ ma omume ziri ezi nke ga-akwado ma bụrụ nkụ nke ga-eme ka okwukwe anyị nwuru ọkụ.

N’oge summer nke a gafere agafe, ihe karịrị 200,000 nke ndị ntorobịa anyị gburugburu ụwa tolitere n’okwukwe n’ebe otu nime mmemme narị kwuru narị emere ogologo izu maka Maka Ume ndị Ntoroọbịa ma ọ bu ọgbakọ niile nke FSY. Ndị pụtara site nime ịnọ iche nke ọrịa mkpochapụ, maka ọtụtụ ọ bụụrụ omume okwukwe n’Onyenwe anyị mere ha ji ọbụna ị bịa. Ọtụtụ ndị ntoroọbịa sonyere mee dịịrị ka ha n’eso otu ụdị ụzọ ahụ ama ama nke na-eje ruo na mgbanwe dị omimi. Na ngwucha izu ụka ha, ọ masịrị m ị jụ ha, “Ngwanụ, kedụ otu o si gaa?”

Mgbe ụfọdụ ha n’ekwu ihe dị otu a: “N’ezie, n’ụbọchị Mọnde ewesaara nne m iwe n’ihi na ọ mere mụ ka m bịa ma mee nke a. Ma enweghi onye m ma ama. Ma echeghị m na ọ bụ maka mụ. Ma agaghị m enwe enyi ọbụla. … Mana ugbua ọ bụ Fraịde, ma a chọrọ m nnọọ ị nọ ebe a. Naanị ihe m chọrọ m bụ ịnwete mmetụta nke Mmụọ ahụ nime ndụ m. A chọrọ m ibi ndụ otu a.”

Ha n’otu n’otu nwere akụkọ nke ha ga-akọ maka oge niile nke ido anya na maka onyinye niile nke ime mmụọ na-asachapụ site na ha ma buru ha na-aga n’ụzọ nke ntolite ahụ. Mụ onwe m kwa nwetere mgbanwe n’oge summer nke FSY dị ka m hụworo Mmụọ nke Chineke n’ezughi ike ka ọ n’azaghachi ọchịchọ eziomume niile nke obi igwe ndị ntoroọbịa ndịa ndị n’otu n’otu chọtara ume ahụ iji tụkwasị obi na Ya ma baa nime nchekwa Ya otu izu uka.

Dịka ụgbọ mmiri eji igwe rụọ nke nọ n’osimiri, anyị bi nime ebe na ata nchara nke ime mmụọ ebe ekwesịrị ijidesi nkwenye niile ike ma ọbụghị ya ha nwere ike inwe nkarụ ahụ, taa ntachara, ma ọbụ daafusịa.

Kedu Ihe Anyị Nwere ike Ịme iji Chekwaa Ọkụ nke Nkwenye Anyị niile?

Nhụmiihe ndị dịka ọgbakọ FSY, camp niile, nzukọ oriri nsọ, ma ozi mgbasa oziọma na-enye aka ime ka ịgba ama anyị chapụ achapụ, wee kpọrọ anyị gafee ụzọ nke ntolite na nchọpụta nke ime mmụọ ruo ebe niile nke udo dị. Mana kedụ ihe anyị kwesịrị ime iji nọrọ n’ebe ahụ ma gaaniihu “na-aga n’ihu kwudesie ike n’ime Kraịst” (2 Nefii 31:20) ma ghara ịlaghachi azụ? Anyị kwesịrị ịganiihu na-eme ihe ndị ahụ nke kpọtara anyị n’ebe ahụ na mbụ, dịka ekpere mgbe niile, irikpu onwe anyị nime akwụkwọ nsọ, na iji ezi obi jee ozi.

Maka ụfọdụ nime anyị, ọ ga-ewe anyị ịtụkwasị obi nime Onyenwe anyị ọbụnadị ị bịa ọgbakọ oriri nsọ. Mana mgbe ahụ anyị nọ ebe ahụ, mmetụta ọgwụgwọ nke oriri nsọ nke Onyenwe anyị, ịñụ site n’ụkpụrụ niile nke ozi ọma, ma ọzụzụ nke n’abịa site na nnọkọ nke Nzukọ nsọ nwere ike zilata anyị ụlọ ebe anyị buworo ndị ebuliri elu.

Kedụ Ebe Ike ahụ eji Akpọkọta Mmadụ ọnụ sị Abịa?

Na FSY, ndị ntoroọbịa anyị ruru otu narị puku ma ọ bụ karịa bịara mata nke ọma banyere Onye Nzọpụta site n’iji fọmụla dị mfe nke mmadụ abụọ mọbụ karịa ịbịakọtara ọnụ n’aha Ya (lee Matiu 18:20wee n’amụkọrịta ozi ọma na akwụkwọ nsọ niile, na-abụkọrịta abụ, na-ekperịkọta ekpere ma na-achọta udo nime Kraịst. Nke a bụ ọgwụ dị ike maka iteta n’ụra nke ime mmụọ.

Ndị ụmụnne ndị nwoke na nwanyị sị ebe tere anya bịakọta ọnụ alaworịị n’ebe obibi ha ikpebizi ihe ọ pụtara ị gaa nihu “tụkwasị obi nime Onyenwe anyị” (Ilu 3:5; isiokwu ndị ntorobịa nke afọ 2022) mgbe ọgbaghara nke ụwa ike ike nke a n’achọ ịzapụ ha. Ọ bụ otu ihe ị “nụrụ Ya” (Joseph Smith—History 1:17) n’ebe dara jụụ nke ntule uche ma jiri akwụkwọ nsọ asapere asape. Mana ọ bụkwa ihe ọzọ iburu agwa anyị dịka ndị n’eso ụzọ bubata nime ndụ anụ nke a n’adọpụ uche ebe anyị kwesịrịrị ịgba mbọ iji “nụ Ya” ọbụnadị site n’ahụrụ ọkụ nke nchegbu-onwe na obisike nke n’ada ada. Ka aghara ịnwe obi abụọ: n’ezie ọ bụ ihe eji ama ndị dike ka ndị ntorobịa anyị gosiri mgbe ha dobere obi ha na uche ha maka iguzoro ọtọ megide emume ọjọọ ndị ana ahụ n’oge anyị ugbua.

Kedụ Ihe ndị Ezinụlọ G’eme n’ebe Obibi ha iji Wuo ihe n’elu Ume nke Arọpụtara n’ebe ihe Omume niile nke Nzukọ nsọ?

Enwere oge m bụ di onyeisi otù Ndịiyom Nta nke stek. Otu abalị enyere m ọrụ ihazi achịcha niile ka nwunyem nwe ike duzie ihe omume fireside nime ụlọ ekpere maka ndị nne na nna ma ụmụ ha ndị nwanyị ndị na-akwado ije camp Ndịiyom Nta nizu ụka ya n’abịa abịa. Mgbe ọ kọwara ebe a ga-anọ ma ihe a ga-ewete, o kwuru, “Ugbua, n’ụtụtụ Tusde mgbe ị kpọtara ụmụ ndị nwanyị unu ọma ebe bus ga-eburu ha, bakọọnụ ha ike. Ma susuo ha ọnụ nke ka ọdị—nihi na ha agaghị alọghachi azụ.”

A nụrụ m ka otu onye suru ude, ma ghọta na ọ bụ mụ. “A gaghị alọta?”

Mana ọ gara niihu: “Mgbe unu kpọtara ndị nwa nwanyị ụtụtụ Tusde ahụ, ha ga ahapụ n’azụ ha ihe ndọpụ uche niile nke ihe niile n’abaghị uru ma nọkọrịta ọnụ otu izu ụka n’amụta ma n’atụkwasị obi na Onyenwe anyị. Anyị ga-ekpekọrịta ekpere ọnụ ma bụọ abụ ma sie ma keekọrịta nri ọnụ ma kesaara onwe anyị ịgba ama ma mee ịhe niile nke ga-eme ka anyị nwete mmetụta nke Mmụọ nke Nna nke Eluigwe, ruo ogologo izu, tutu ọ deebacha anyị nime ruo n’ọkpụkpụ anyị niile. Ma na Satọde, ndị nwata nwanyị ndịa unu g’ahụ ka ha na-arịdata na bọs agaghị abụ ndị ahụ unu kpọtara ebe a na Tusde. Ha ga-abụ ndị ekere eke ọhụrụ. Ma ọ bụrụ na unu nyere ha aka ga niihu site n’ebe ahụ dị elu, ha ga-atụ unu n’anya. Ha ga agaa nihu na-agbanwe ma n’etolite. Ma ezinụlọ unu ga-agbanwekwa.”

Na Satọde, ọ dịịrị otu ahụ o osiri buo n’amụma. Dịka m n’ebuba ụlọụkwuu niile, a nụrụ m ụda olu nwunye m n’ebe ahụ ndị nwanyị nta ndị ahụ gbakọrọ tupu ha alawa ụlọ ha. A nụrụ m ya ka o kwuru, “Oh, ebe ahụ ka ị nọ. Anyị nọ n’ele anya unu kamgbe otu izu. Ndị nwata nwanyị Satọde anyị.”

Ndị ntoroọbịa dị ike nke Zayọn na eje njem n’oge ndịa dị ịtụnanya. Ị chọta ọńụ nime ụwa nke a eburu amụma mbibi ya ma ghara isonye n’otu akụkụ nke ụwa ahụ, ụwa n’adịghị ahụ ebe ihe dị nsọ nọ, bụ iwu na ọrụ dịịrị ha. Ihe dị ka afọ otu narị gara aga, G. K. Chesterton kwuru nnọọ dịka ọ hụrụ ọchịchọ nke a dịka nke a n’eme ebe obibi ma Nzukọ nsọ na-akwado ya mgbe o kwuru, “Ọ kwesịrị ozugbo ka anyị hụta universe dịka ụlọ ukwu nke ogre, nke ekwesịrị ibuso agha n’ike, ma n’ụzọ ọzọ dịka kwa ụlọ nzumike anyị, nke anyị kwesịrị ịlaghachi na ya n’oge mgbede” (G. K. Chesterton, Orthodoxy1909], 130).

N’obi ekele, ọkwesịghị na ha ga-apụ ezi naanị ha ị lụ agha ahụ. Ha nwere ibe ha. Ma ha nwere unu. Dị ka ha n’eso onye amụma dị ndụ, Onyeisi Russell M. Nelson, onye n’eduzi ma jiri ezi mmata ịhe nke ọhụụ ụzọ, n’ikwupụta na nnukwu mbọ nke oge ndịa—mkpọkọta nke Izrel—ga adị ukwuu ma dịkwa ebube (see “Olileanya nke Izrel” [worldwide youth devotional, June 3, 2018], HopeofIsrael.ChurchofJesusChrist.org).

N’oge summer nke a, nwunyem, Kallen na mụ nọ na-agbanwe ụgbọelu n’obodo Amsterdam ebe, ọtụtụ afọ gara aga, a bụbụụrụm onye mgbasa ozi ọma ọhụrụ. Mgbe m jiri ọtụtụ ọnwa gbaa mbọ ị mụta Dutch, ụgbọelu KLM anyị nọ n’efeda, ma captain jiri igwe okwu maa ọkwa na-adịchaghị mfe nghọta. Mgbe ntakiri oge jụụ gafere, onye nsiso m tamụrụ, “Echere m echiche na nke ahụ bụ Dutch.” Anyị weliri anya elu, na-agụ echiche onye ọ bụla: Ihe niile efuwo.

Mana ọnweghi ihe-ọbụla furu-efu. Ka ọ na-atụ m n’anya maka nnwuli elu nke okwukwe nke anyị gosiri n’oge ahụ anyị na-aga n’ọdụ ụgbọ elu a, nke g’emesịa bụrụ ọrụ ebube nke ga-ezokwasị anyị n’isi dị ka ndị mgbasa oziọma, akpọghachịrị echiche m azụ n’oge nke a site n’aka onye mgbasa oziọma dị ndụ, nke na-eku ume bụ onye nọ na-abanye ụgbọ elu ịlaghachi ụlọ. Ọ kọwara onwe ya ma jụọ, Onyeisi Lund, kedụ ihe m g’eme ugbua?” Kedụ ihe m g’eme iji wee nọrọ n’ịdị ike?”

N’ezie, nke a bụkwa otu ajụjụ ahụ nke nọ nime uche ndị ntorobịa anyị mgbe ha hapụrụ ọgbakọ niile nke FSY, camp niile nke ndị ntorobịa, ma njem niile nke tempụl, ma oge ọbụla ha nwetere mmetụta nke ike niile nke eluigwe: Kedụ otu ịhụ Chineke naanya ga-esi agbanwo bụrụzie ndụ na-eso ụzọ nke Na-anọgide?”

A bịara m nwee ịhụnaanya bara ụba maka onye mgbasa ozi ọma nke a anya ya chapụrụ achapụ, onye n’eje ozi awa ikpeazu nke ije ozi ya, ma nime oge ahụ dị jụụ nke Mmụọ, a nụrụ m ụda olu m ka m kwuru nnọọ, “Ọpụtachaghị na ịga eyiri baajị ahụ tupu ị zaawa aha Ya.”

A chọburu m itinye aka niile m n’elu ubu ya niile ma sị, “Lee ihe ị ga-eme. Laa ụlọ ma bụrụ naanị ihe a Ị bụ nnọ ezigbo mmadụ, ọfọrọ ntakịrị ka igbuke nime ọchịchịrị. Ọzụzụ na ịchu aja nke mgbasa oziọma gị emewo ka ị bụrụ nwa nwoke mara oke mma nke Chineke. Gawa niihu n’eme n’ụlọ ihe ahụ rụụrụ gị ezigbo ọrụ n’ebe a. Ị kwesịrị ị mụta otu esi ekpe ekpere ma ọnye a n’ekpeere ekpere ma asụsụ nke ekpere. Ị mụwo banyere okwu ya niile ma bịa hụ Onye Nzọpụta naanya site n’ịgba mbọ ị dịka Ya. Ị hụwo Nna nke Eluigwe naanya dị ka Ọ hụkwara Nna Ya naanya, jeere ndị ọzọ ozi dị ka Ọ jeere, ma dobe iwu nsọ ya niile dị ka Ọ dobere—ma mgbe ị n’emeghị otu a ahụ, i chegharịrị kwa. Ịbụ onye n’eso ụzọ abụghị naniị ihe edere n’efe—ọ bụrụwo otu akụkụ ndụ gị nke ikpachara anya n’ebi maka ndị ọzọ. Nihi nke a, ị ga ala ụlọ ma ị ga-eme otu ahụ. Bụrụ otu ahụ. Buru ume nke ime mmụọ nke a ruo ogologo ndụ gị niile.

A maara na site n’ịtụkwasị obi na Onyenwe anyị Jizọs Kraịst ma okporo ụzọ nke ọgbụgba ndụ Ya, anyị nwere ike ịchọta obisike nke ime mmụọ ma udo dị ka anyị n’azulite agwa dị nsọ ma omume ziri ezi nke ga-akwado ma bụrụ nkụ nke ga-eme ka okwukwe anyị nwuru ọkụ. Kanyị nile n’otu n’otu bịaruo ọkụ ahụ n’ekpo ekpo nso ma, nagbanyeghi ihe ọbụla ọbụ, nọsiike. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen.