Ọgbakọ Zuru ọha
Obi ụtọ ma Ruo Mgbe ebighị ebi
Ọgbakọ zuruọha Ọktoba 2022


Obi ụtọ ma Ruo Mgbe ebighị ebi

Eziokwu, anyị na ndị anyị hụrụ n’anya inwe ọńụ na-adịgide bụ isiokwu nke atụmatụ obi ụtọ nke Chineke.

Ndị enyi, ezi ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, unu chetara ikwenye, ma ọ bụ ịchọ ịkwenye, na obi ụtọ ebigh ebi?

Mgbe ahụ ndụ bịara. Anyị “etoo” Mmekọrịta a na-eko achicha. Ụwa nke a na-eme mkpọtụ, kpụkọrọ ọnụ, a na-akwa aka, jiri aghụghọ na mmegherị anya. Otu ọ dị, nime “etiti obi anyị,”1 anyị kwenyere, ma ọ bụ chọrọ ikwenye, ebe ọbụla, ụdị ọbụla, obi ụtọ ma ruo mgbe ebighị ebi dị ire ma bụrụ ihe ga-ekwe omume.

“Obi ụtọ ma ruo mgbe ebighị ebi” abụghị echiche nrọ nke akụkọ ufe. Eziokwu, anyị na ndị anyị hụrụ n’anya inwe ọńụ na-adịgide bụ isiokwu nke atụmatụ obi ụtọ nke Chineke. Ụzọ O jiri ịhụnanya kwadoo nwere ike mee njem ebighị ebi anyị inwe obi ụtọ ma ruo mgbe ebighị ebi.

Anyị nwere ọtụtụ ihe ga-eme anyị obi ụtọ nke inye ekele. Otu ọ dị, o nweghị onye ọbụla niime anyị zuru oke, o nweghị kwa ezi na ụlọ ọbụla. Mmekọrịta anyị nile gụnyere ịhụnaanya, isonye mmekọrịta, na ịbụ mmadụ kama ọtụtụ mgbe tinyekwa nghọtahie, mmejọ, mgbe ụfọdụ ụfụ dị omimi.

“N’ihi na dịka na Adam onye niile na-anwụ, ọbụna otu a niime Kraịst ka onye niile ga-esi dị ndụ.”2 Ịdị ndụ nime Jizọs Kraịst gụnyere anwụghị anwụ—onyinye Ya nke mbilite n’ọnwụ ahụ anyị. Dịka anyị na-ebi na okwukwe na nrube isi, ịdị ndụ nime Kraịst nwekwara ike gụnye inwe ndụ ebighị ebi juputara n’ọńụ anyị na Chineke na ndị ahụ anyị hụrụ n’anya.

Na ụzọ pụrụ iche, onye amụma nke Chineke n’akpọkete anyị nso karịa n’ebe Onye Nzọpụta anyị nọ, tinyere site na emume nsọ na ọgbụgba ndụ nile dị nsọ nke tempụl na abiakarị anyị nso n’ọtụtụ ebe. Anyị nwere ohere na onyinye dị omimi iji chọpụta nghọta nke ime mmụọ, ịhụnaanya, nchegharị, na mgbaghara dị ọhụrụ anyị na onye ọbụla na ezi na ụlọ anyị nile, na oge a na mgbe ebighị ebi.

Site na-ịnara ike, ana m akọrọ unu nhụmihe abụọ dị nsọ, pụrụ iche ndị enyi m kọrọ gbasara Jizọs Kraịst ijikọta ezi na ụlọ nile site na ịgwọ ọrịa ọbụnadị ihe na-esi n’otu ndudugandu ruo n’otu ndudugandu.3 “Enweghị oke na ebighị ebi,”4 “dị ike karịa agbụ nile nke ọnwụ,”5 Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst nwere ike nyere anyị aka iweta udo nye ndụ anyị gara aga na olileanya nye ọdịniihu anyị.

Mgbe ha sonyere na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a, enyi m na di ya jiri ọńụ mụta na mmekọrịta nile nke ezi na ụlọ ekwesịghị ịbụ “ruo mgbe ọnwụ kewara unu.” Nime ụlọ nke Onyenwe anyị, ezi na ụlọ nwere ike ijikọta ọnụ ruo mgbe ebighị ebi (arachiri).

Kama enyi m achọghị ka arachikọta ya na nna ya. “Ọ bụghị ezigbo di nye nne m. Ọ bụghị ezigbo nna nye ụmụ ya, “ka o kwuru. “Nna m ga- echere. E nweghị m ọchịchọ ọbụla ị mere ya ọrụ tempụl ya ma rachịkọta mụ na ya ruo mgbe ebighị ebi.”

Na otu afọ, o buru ọnụ, kpee ekpere, gwa Onyenwe anyị ọtụtụ ihe banyere nna ya. Na ikpeazụ, ọ dị na njikere. E mezuru ọrụ tempụl nke nna ya Emesịa, ọ sịrị, “N’ụra m nna m pụtakwutere m na nrọ, yirichaa uwe ọcha. Ọ gbanwewo. Ọ sịrị, ‘Lee m anya. A dị m ọcha. Imeela maka ịrụrụ m ọrụ ahụ nime tempụl.’” Nna ya gbakwụnyere, “Bilie ma laghachi na tempụl; nwanne gị nwoke na-eche ka emee ya baptizim.”

Enyi m kwuru, “Ndị nna nna m ochie na ndị nwụworo anwụ na-echesi ike ka a rụọ ọrụ ha.”

“Ọ bụrụ maka mụ,” ọ sịrị, “tempụl bụ ebe nke ọgwụgwọ ọrịa, mmụta, na ịnakwere Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst.”

Nhụmiihe nke abụọ. Enyi ọzọ gbalịsiri ike mee nchọcha agụgụala ezi na ụlọ ya. Ọ chọrọ ịchọpụta nna nna ukwu ya.

N’otu isi ụtụtụ, enyi m sịrị na o nwere mmetụta ọnụnọ nke ime mmụọ nke otu nwoke nime ụlọ ya. Nwoke ahụ chọrọ ka a chọta ya ma mara ya n’ezi na ụlọ ya. Nwoke ahụ nwere mwute maka mmejọ nke o chegharịworo ugbu a. Nwoke ahụ nyeere enyi m aka ịghọta na enyi m enweghị njikọ DNA na onye enyi m chere na ọ bụ nna nna ukwu ya. “N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ,” enyi m sịrị, “A chọptawo m nna nna ukwu m ma wee mata na ọ bụghị onye ndekọihe ezi na ụlọ anyị kwuru na ọ bụ nna nna ukwu anyị.”

Ka mmekọrịta ezi na ụlọ ya dokwuru anya, enyi m kwuru, “E nweere m onwe m, na udo. Ọ na eme ihe niile dị iche ị ma ndị bụ ezinaụlọ m.” Enyi m na-eche, “Alaka gbagọrọ agbagọ apụtaghị osisi ọjọọ. Otu anyị si bata n’ụwa adịchaghị mkpa karịa ndị anyị bụ mgbe anyị hapụrụ ya.

Akwụkwọ nsọ dị nsọ na nhụmiihe ndị dị nsọ nke ọgwụgwọ na udo nke onwe, tinyere ndị dị ndụ nime ụwa mmụọ, na-emesi ụkpụrụ ozizi ise ike.

Nke mbụ: N’isi atụmatụ nke mgbapụta na ańụrị nke Chineke, Jizọs Kraịst, site na Aja mgbghara mmehie Ya, kwere nkwa ijikọta mmụọ na ahụ anyị ọnụ, “ghara ikewakwa ha ọzọ, ka [anyị] wee nweta njupụta nke ọńụ.”6

Nke abụọ: Aja mgbaghara mmehie—aja-mgbaghara-mmehie nime Kraịst—na-abịa dịka anyị na-egosipụta okwukwe ma na-amịpụta mkpụrụ nile na nchegharị.7 Dịka ọ dị na ndụ a pụrụ ịnwụ anwụ, otu ahụ ka ọ dị nime ndụ anwụghị anwụ. Emume nsọ nile nke tempụl adịghị agbanwe anyị ma ọ bụ ndị nọ nime ụwa mụọ n’onwe ha. Kama emume nsọ ndị a si na chi na-enye aka ido ọgbụgba ndụ nke ha na Onyenwe anyị nsọ, nke nwere ike iwetara ha na Ya nkwekọrịta na onye na ibe ya.

Ọńụ anyị na-ejupụta ka anyị na-enweta amara na mgbaghara nke Jizọs Kraịst nwere maka anyị. Ma dịka anyị na-enyekọrịta onwe anyị ọrụ ebube nke amara na mgbaghara Ya, ebere anyị na-anata na ebere anyị na-enye nwere ike inye aka mee ka ikpe na-ezighị ezi nke ndụ zie ezie.8

Nke atọ: Chineke mazuru ma hụ anyị nanya. “Adịghị akwa Chineke emo,”9 a pụghịkwa ịghọgbu Ya. Site na ebere zuru oke na ikpe ziri ezi, Ọ na-agbakọ ndị dị umeala nobi na ndị chegharịrị n’ogwe aka nke nchekwa Ya.

N’ime Tempụl Kirtland, Onye amụma Josef Smit hụrụ n’ọhụ na nwanne ya nwoke Alvin nwere nzọpụta nime alaeze seleshal. Ọ tụrụ Josef Onye amụma n’anya, ebe Alvin nwụrụlarịị tupu anata emume nsọ nke baptizim na-azọ ndụ.10 N’ịkasi obi, Onyenwe anyị kọwara ihe kpatara ya: Onyenwe anyị “ga-ekpe [anyị] ikpe dika otu ọrụ [anyị] nile siri dị, dịka otu ọchịchọ nke obi [anyị] siri dị”11 Mkpụru obi anyị na-agba ama banyere ọrụ na ọchịchọ anyị nile.

N’obi ekele, anyị matara na ndị dị ndụ na “ndị nwụrụ anwụ chegharịrị ka a ga-agbapụta, site na nrube isi nye emume nsọ nile nke ụlọ Chineke”12 na Aja mgbaghara mmehie nke Kraịst. Nime ụwa mmụọ, ọbụna ndị ahụ nọ na mmehie na mmebi iwu nwere ohere ichegharị.13

N’ụzọ dị iche, ndị ahụ kpachaara anya họrọ ajọọ omume, ndị kpachapụrụ anya na-egbu oge nchegharị, ma ọ bụ ndị n’ụzọ ọbụla e buru ụzọ chee ma ọ bụ mararịị na mbụ mebie iwu nsọ, na-eme atụmatụ maka nchegharị dị mfe, ka Chineke ga-ekpe ikpe ma “ncheta doro anya nke ikpe ọmụma [ha] nile.”14 Anyị enweghị ike kpachara anya mee mmehie na Satọde, wee na-atụ anya mgbaghara na-egbughị oge site n’ikere oke nke oriri nsọ na Sọnde. Nye ndị mgbasa ozi ọma ma ọ bụ ndị ọzọ na-asị na iso Mmụọ ahụ pụtara na ha agaghị erube isi nye ụkpụrụ ozi ọma niile ma ọ bụ iwu nsọ nile, biko chetanụ na irube isi n’ụkpụrụ nile nke mishọn na iwu nsọ nile na-akpọbata Mmụọ ahụ. Ọ dịghị onye nime anyị ga-ewezuga nchegharị. Ngọzi nile nke nchegharị na-amalite ka anyị na amalite ichegharị.

Nke anọ: Onyenwe anyị na-enye anyị ohere si na chi ka anyị na-adịkarị ka Ya dịka anyị na-enye emume nsọ nchekwa nke nnọchi anya nke ndị ọzọ chọrọ ma ha enweghị ike imere onwe ha. Anyị na-aka ezu ezu ma zuo oke15 dịka anyị na-aghọ “ndị nzọpụta … n’ugwu ukwu Zayọn.”16 Dịka anyị na-ejere ndị ọzọ ozi, Mmụọ Nsọ nke Nkwa ahụ nwere ike ịkwado emume nsọ nile ahụ ma dookwa ma onye na-enye enye ma onye na-anata anata nsọ. Ma onye na-enye enye ma onye na-anata anata nwere ike ime ma mee ka ọ dị omimi ọgbụgba ndụ mgbanwe nile, ka oge na-aga na-anata ngọzi nile e kwere Abraham, Aịsak, na Jekọb na nkwa.

N’ikpeazụ, nke ise: Dịka Iwu Ọlaedo17 na-akuzi, ihe ngosi nke na-edobe nsọ nime nchegharị na mgbaghara na-akpọku onye ọbụla niime anyị ka anyị nye ndị ọzọ ihe ahụ nke anyị onwe anyị nwere mkpa ya ma nwee ọchịchọ ya.

Mgbe ụfọdụ ịdị na njikere anyị ịgbaghara onye ọzọ na enyere ma ha ma anyị onwe anyị aka ikwere na anyị nwere ike ichegharị ma nweta mgbaghara. Mgbe ụfọdụ ịdị njikere ichegharị na ike nke ịgbaghara na-abịa n’oge dị iche iche. Onye nzọpụta anyị bụ onye ogbugbo nke anyị na Chineke, mana Ọ na-enyekwa aka eweta anyị n’onwe anyị na onye ọbụla nye ibe ya dị ka anyị na-abịakwute Ya. Karịsịa mgbe mmejọ na ihe mgbu dị omimi, imezi mmekọrịta anyị na ịgwọ obi anyị na-esi ike, ikekwa ọ gaghị ekwe omume maka anyị ime ya n’onwe anyị. Mana eluigwe nwere ike inye anyị ume na amamiihe karịrị nke anyị iji mata mgbe anyị ga-ejigidesi ike na otu anyị ga-esi hapụ ya.

Anyị anọchaghị naanị anyị mgbe anyị ghọtara na anyị anọghị naanị anyị. Onye Nzọpụta anyị na-aghọta mgbe nile.18 Site na-enyemaka nke Onye Nzọpụta anyị, anyị nwere ike nyefee mpako anyị, mmejọ anyị, mmehie anyị n’aka Chineke. Agbanyeghị otu anyị nwere ike na-eche ka anyị na-amalite, anyị na-ezukarị oke mgbe anyị tụkwasịrị Ya obi ime ka mmekọrịta anyị nile zuo oke.

Onyenwe anyị, onye na-ahụ ma na-aghọta nke ọma, na-agbaghara onye Ọ chọrọ; anyị (ịbụ ndị na-ezughị oke) ga-agbaghara mmadụ nile. Dịka anyị na-abịakwute Onye Nzọpụta anyị, anyị na-eebelata ilekwasị onwe anyị anya. Anyị na-ebelata ikpe ikpe ma na-agbaghara karịa. Ịtụkwasị obi na ikwesi ekwesi, ebere, na amara Ya19 nwere ike ịtọhapụ anyị site na esemokwu, iwe, mkparị, nhapụ, mmegide, na ihe ịma aka anụ ahụ na nke uche niile na-abịa mgbe ụfọdụ soro anu ahụ nime ụwa a pụrụ ịnwụ anwụ. Obi ụtọ ma ruo mgbe ebighị ebi apụtaghị na mmekọrịta ọ bụla ga-enwe obi ụtọ ma ruo mgbe ebighị ebi. Mana otu puku afọ mgbe a ga-eke Setan agbụ20 nwere ike inye anyị oge a chọrọ na ụzọ dị ịtụnanya iji hụ n’anya, ghọta, ma mezie ihe dịka anyị na-akwado maka mgbe ebighị ebi.

Anyị na-ahụ mmekọrịta nke eluigwe nime onye na ibe ya.21 Ọrụ na ebube nke Chineke gụnyere iweta na mmezu obi ụtọ ma ruo mgbe ebighị ebi.22 Ndụ ebighị ebi na mbuli elu bụcha ịmara Chineke na Jizọs Kraịst ya mere, site na ike nke Chineke, ebe Ha nọ ka anyị ga-anọ.23

Ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, Chineke Nna anyị nke Eluigwe na Ọkpara Ọ Hụrụ n’anya dị ndụ. Ha na-enye udo, ọńụ, ọgwụgwọ ruo ụmụnna niile na asụsụ ọ bụla, nye onye ọbụla nime anyị. Onye amụma nke Onyenwe anyị na-edu n’ụzọ ahụ. Mkpughe ụbọchị ikpeazụ na-aganiihu. Ka anyị bịaruo Onye Nzọpụta anyị nso nime ụlọ nsọ nke Onyenwe anyị, ma ka Ọ dọtakwa anyị n’ebe Chineke nọ na onye na ibe ya dị ka anyị ji ọmịiko , eziokwu Kraịst na ebere dị ka nke Kraịst ejikọta obi anyị ọnụ na ndudugandu anyị nile—n’oge na mgbe ebighị ebi, obi ụtọ ma ruo mgbe ebighị ebi. Nime Jizọs Kraịst, ọ ga-ekwe omume; nime Jizọs Kraịst, ọ bụ eziokwu. A na m agba-ama ,n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.