Ọgbakọ Zuru ọha
Usoro nile nke Ịbụ Ndị n’eso ụzọ
Ọgbakọ zuruọha Ọktoba 2022


Usoro nile nke Ịbụ Ndị n’eso ụzọ

Ị mụta banyere Kraịst ma ụzọ Ya niile n’eduru anyị ịbịa mata Ya, ma ị hụ Ya n’anya.

Usoro nke okwukwe

N’ụtụtụ nke a ụmụ abụọ anyị na ụmụ ụmụ atọ anyị bi na North America ma ihe dịka ọkara ụwa, hụrụ mgbuke nke anyanwụ dịka ọ n’ebili n’ebube ebe ọwụwa anyanwụ. Ụmụ atọ ndị ọzọ ma ụmụ ụmụ asaa nọ n’ime Afrịịka, ma ọkara ụwa nke ọzọ, hụrụ ọchịchịrị ka ojiri wayọọ kpụbatara ha dịka anyanwụ ahụ dara n’ebe ọdịda anyanwụ.

Ihe akwụsịghị akwụsị nke a n’ebido ụbọchị na abalị bụ ịhe ncheta kwa ụbọchị banyere eziokwu niile nke n’achị ndụ anyị nke anyị enweghi ike ị gbanwe. Mgbe anyị kwanyere ugwu nye eziokwu ebighị ebi ndịa ma mee ka ihe niile anyị neme daba adaba na ha, anyị ga-enwete nhụmịhe nke udo ime obi ma nkweko. Ọ bụrụ n’anyị emeghi otua, anyị agaghị ezu ike, ma ihe niile agaghị arụ ọrụ dịka ha kwesịrị.

Ehihie na abalị bụ otu nime ọmụmatụ nke usoro nile nke Chineke nyere ọnye ọbụla biworo n’elu ụwa nke a, maka igosi ihe niile otu ha si wee dịrị n’ezi. Ọ bụ eziokwu zuru oke na dịka anyị si bụrụ mmadụ, anyị enweghi ike ikwubi okwu di na ya dị ka otu ọchịchọ obi anyị siri dị ma ghara inwete nsonazụ dị na ya. A na-echetara m banyere nke a oge ọbụla m na-efe ụgbọelu site n’ala Afrịịka bịaruo ọgbakọ zuru ọha, nke na-akpọghachi elekere anụ arụ m azụ ruo awa 10 n’otu ụbọchị.

Mgbe ọbụla ọ meturu anyị n’obi ịmata, anyị n’ahụ na Nna nke Eluigwe enyewo anyị ndị akaebe zuru ezu nke eziokwu maka ịchị ndụ anyị k’anyị nwe ike mara Ya ma nwete ngọzị niile nke udo na ọńụ.

Site n’aka Onye amụma Josef Smith, mmụọ nke Onyenwe anyị kwupụtara, “Ma ọzọ, a ga m enye unu usoro n’ihe nile, ka e wee ghara iduhie unu; n’ihi na Setan nọ n’elu ala nile, ma na-aga n’iru na-eduhie ọtụtụ mba.”1

Kọrịhọ onye na-emegide Kraịst dara maka ụdị nduhie dị otú ahụ, wee ghara ikwere idị adị nke Chineke ma ọbịbịa nke Kraịst. Maka ya, onye amụma Alma gbara aka ebe, “Ihe nile gosịrị na e nwere Chineke dị; e, ọbụna ụwa, na ihe nile nke dị n’elu nke iru ya, e, na mgbagharị ya, e, na ụwa ndị ọzọ nile nke na-agbagharị n’ụdị usoro nke ha na-agba ama na o nwere Onye Okike Kachasị-elu.”2

Mgbe Kọrịhọ siri ọnwụ ka enye ya ihe iriba ama tupu ọ nwee ike kwere, Alma mere ya ka ọ daa ogbu. Nihi umeala ọ nwetere nihi mkpagbu ya, Kọrịhọ jiri obi ya kwupụta na ọ bụ ekwensu duhiere ya.

Ekwesịghị ka eduhie anyị. Ọrụ ebube nke ndụ nwere ọgụgụ isi n’egosipụta onwe ya n’ihu mgbe niile. Ma otu obere oge anyị lebara anya ma tulee maka ịtụnanya niile nke eluigwe niile nke jupụtara na kpakpando ma ụyọkọ kpakpando n’enweghi ọnụọgụgụ, ọ ga-akpake mkpụrụ obi nke obi kwere ekwe ikwupụta “Chineke mụ, Lee otu ịdị ukwuu gị dị!”3

Eeh, Chineke Nna anyị nke Eluigwe dị ndụ, ma Ọ n’egosipụta onwe Ya nye anyị oge niile site ụzọ dị iche iche.

Ụkpụrụ nke ịdị Umeala

Mana ị kweta, ị kwere, ma ịga niihu na Chineke, obi anyị kwesịrị ị nabata Mmụọ nke eziokwu. Alma kụziri na umeala na-aganihu tupu okwukwe esochie.4 Mọmọn gbakwụnyere na ọ gaghị ekwe omume ka onye ọbụla n’adịghị adị “dị nwayọọ na wedata obi ala” n’inwe okwukwe na olileanya ma ị nata Mmụọ nke Chineke.5 Eze Benjamin kwupụtara na onye ọbụla na-edobe ebube nke ụwa n’isi ihe niile bụ “onye iro nke Chineke.”6

Site n’irara onwe ya mee baptizim iji mezuo ezi omume niile, nagbanyeghi na Ọ dị ezi omume ma dị nsọ, Jizọs Kraịst egosiwo na obi umeala n’ihu Chineke bụ otu ọkpụrụkpụ agwa nke ndị n’eso ụzọ Ya.7

Ndị n’eso ụzọ ọhụrụ ka achọrọ ka ha gosipụta umeala nihu Chineke site n’emume nsọ nke baptizim. Ya mere “Ndị nile dị umeala n’iru Chineke, ma chọọ ime baptism, ma ha jiri obi tiwara etiwa na mụọ nile nke nchegari … ka a ga-anabata site na-ime baptism baa n’ime nzukọ-nsọ ya.”8

Obi ụmeala n’eme ka obi nke onye na-eso ụzọ tụgharịa chewe ihu n’ebe nchegharị na nrube isi nọ. Mmụọ Nsọ nke Chineke mgbe ahụ na-enwe ike weta eziokwu nye obi ahụ, ma ọ ga-enwe ike banye.9

Ọ bụ enweghi obi umeala n’ebutekarị mmezu amụma nke Onye Ozi Pọl buru banyere oge ndị ikpeazụ ndịa:

“Niihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ naanị onwe ha naanya, ndị hụrụ ego naanya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-enupuru ndị mụrụ ha isi, ndị na-anaghị enwe obi ekele, ndị na-anaghị edebe onwe ha nsọ,

“Ndị na-enweghị obi mmadụ, ndị na-anaghị achọ inwe nkwekọrịta ọbụla, ndị nkwutọ, ndị na-anaghị ejide onwe ha, ndị na-eme ihe ike, ndị na-anaghị ahụ ezi ihe naanya.”10

Ọkpụkpọ oku nke Onye Nzọpụta maka anyị ịmuta maka Ya bụ ọkpụkpọ oku nke ịpụ site na ọnwụnwa niile nke ụwa ma dịrị dị ka Ọ dị—nwayọọ ma wedata obi ala, umeala. Mgbe ahụ k’anyị ga-enwe ike ịnyakwasi onwe anyị yok Ya ma chọpụta na ọ dị mfe—na ịbụ ndị n’eso ụzọ abụghị ibu arụ kama ọ bụ ihe ọńụ, dị ka Onyeisi Russell M. Nelson siri kwuo nke ọma ma kuziere anyị ugboro n’ugboro.

Usoro nke Ịhụnaanya

Ị mụta banyere Kraịst ma ụzọ Ya niile n’eduru anyị ịbịa mata Ya, ma ị hụ Ya n’anya.

O gosiri anyị site n’ọmụmatụ na ejiri agwa obi umeala, ọ ga ekwe omume ị mata ma ị hụ Chineke Nna nanya jiri ihe niile nke anyị ma hụ ndị ọzọ naanya dịka anyị si hụ onwe anyị naanya, n’ejideghị ịhe ọbụla azụ. Ozi Ya n’elu ụwa, n’oge ahụ O tinyere uche Ya ma anụ arụ Ya n’elu ebe ịchụaja, bụ usoro maka otu esi etinye ụkpụrụ niile ndịa n’ọrụ, ebe n’elu ha ka atọrọ ntọala oziọma Ya. Ụkpụrụ abụọ ndịa nwere obi sara sara ma ha gbasara otu anyị si akpagharịkọta anyị na ndị ọzọ, n’abụghị maka afọ ojuju na otito nke onwe.

Ọrụ ebube dị nime ya bụ mgbe ọbụla anyị tinyesiworo mbọ anyị nke kacha ibe ya n’ịhụ Chineke ma ndị ọzọ naanya, a na-enye anyị ike ị chọpụta uru dị nsọ nke anyị bara, dị ka ụmụ ndị nwoke na ụmụ ndị nwanyị nke Chineke, ma nwee udo na ọńụ zuru ezu nke nhụmịhe nke a n’enweta.

Anyị abụrụ otu anyị na Chineke ma anyị n’ibe anyị site n’ịhụnanya ma ije ozi. Mgbe ahụ anyị enwe ike ị nata aka ebe nke Mmụọ Nsọ banyere ịhụnaanya ahu n’enweghi ntupọ, mkpụrụ osisi ahụ nke Lehi kwuru maka ya n’ọbụ nke “dị ụtọ nke ukwuu, karịa ndị nile [ọ] rachatụworo mbụ.”11

Okpueze ahụ Kraịst natara site n’ịnye ma ịmee ihe niile ume Ya kwere ya mee iji dobe usoro eji ahụ Nna naanya ma nke eji ahụ anyị naanya bụ iji nata ike niile, tụmadị ihe niile nke Nna nwere, nke bụ mbuli elu.12

Ohere anyị nwere iji zulite nime mkpụrụ obi anyị ịhụnaanya nadịgide anyị nwere maka Chineke ma maka ndị agbataobi anyị n’ebido n’ebe obibi site na agwa nsọ niile n’eijikọta anyị na Nna, nke bụ ekpere kwa ụbọchi nke onwe ma nke ezinụlọ ekpere site n’aha Ọkpara A Mụrụ Naanị Ya, ị mụkọrịta maka Ha ọnụ site n’ọmụmụ akwụkwọ nsọ nke onwe ma nke ezinụlọ, idebekọrịta Ụbọchị ezumiike ọnụ, ma n’isi n’isi ijide tempụl rekọmendị dị ọhụrụ, jiri ya rụkọta ọrụ ọnụ mgbe ọbụla anyị nwere ike ime.

Mgbe anyị n’otu n’otu n’etolite na mmata ihe na ịhụnaanya nke Nna na Ọkpara ahụ, anyị n’etolitekwa n’obi ekele ma ịhụnaanya anyị nwekọrịtara n’onwe anyị. Ike anyị nwere iji hụ naanya ma jere ndị n’abụghị ndị ezi anyị ozi n’abawanyekwa nke ukwuu.

Ihe anyị n’eme n’ebe obibi anyị bụ ezigbo ururu ihe n’ewulite ịbụ ndị na-eso ụzọ nke n’adịgịde ma nke ọṅụ . Ngọzị nke kacha ụtọ nke dị nime ozi ọma eweghachitere, nke nwunyem Gladys na mụ nwere obi ụtọ na ya n’ebe obibi anyị, abịawo site n’ịmụta otu esi a mata ma na-akwanye ugwu nye Chineke n’ebe obibi ma otu esi ekesa ịhụnaanya Ya nye ụmụ ụmụ anyị.

Usoro nke Ije ozi

Ịhụnaanya maka Chineke ma ijekọrịtara onwe anyị ozi nke azụlitere n’ebe obibi ma ije ozi nye ndị ezi n’etolite dịka oge n’aga ịbụ agwa nke afọ ọma.

Nke a na-eyi dịka usoro nke ije ozi nnyefechasị a n’eme n’alaeze nke Chineke nke edebere n’ihu anyị site n’aka ndị amụma na ndị ozi dị ndụ nke Onyenwe anyị. Anyị na ha a bụrụ otu.

Mgbe ahụ k’anyị ga-enwe ike lee anya, gafee ha, ma ruo n’ebe Onyenwe anyị nọ “n’echiche ọbụla,” k’anyị wee ghara ị “nwe obi-abụọ,” ma “tụọ ụjọ.”13

Dị ka ndị amụma na ndị ozi dị ndụ nke Onyenwe anyị, anyi nwere ike gaaniihu jiri “afọ … jupụta na afọ ọma nye mmadụ nile, na nye ezi na ụlọ nke okwukwe, [jiri] ezigbo omume [chọọ echiche anyị] nile mma n’agwụghi agwụ; … mgbe ahụ ka nchekwube [anyị] [ga-esi] ike karịa n’iru Chineke; na ozizi nke ọkwa nchụaja … [ga-atasa] na [mkpụrụ obi anyị] dịka igirigi site n’eluigwe.”

Dị ka ndị amụma ma ndị ozi nke Onyenwe anyị, anyịkwa ga-esonye nime okwukwe okirikiri nke agbara ume site n’ije ozi nke nnyefechasị n’ebe “Mụọ Nsọ ga-abụkwa onye nso [anyị] mgbe nile, na mkpa-na-aka [anyị], mkpa-na-aka na-anaghi agbanwe nke ezi-omume na ezi okwu, na ebe ọchịchị [anyị] ga-abụ ebe-ọchịchị mgbe nile na-adigide, na n’enweghi ụzọ nke nkwagide, ọ ga-asọrutere [anyị] ruo mgbe nile na mgbe nile.”14 N’ihi na nke a bụ nkwa dị nime atụmatụ nke Nna. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen.