Ọgbakọ Zuru ọha
E Buliri Elu n’elu Obe
Ọgbakọ zuruọha Ọktoba 2022


E Buliri Elu n’elu Obe

Ịbụ onye na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst onye ahụ aghaghị ibu ibu arọ mgbe ụfọdụ ma gaa ebe ịchụ aja ma ntaram ahụhụ apụghị izere ezere.

Afọ ndị gara aga, isote mkparịta ụka ụlọakwụkwọ mahadum maka agụgụala okpukperechi ndị Emerịka, nwa akwụkwọ ibe m jụrụ m ajụjụ, “Gịnị mere Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a anakwerebeghị obe ahụ nke ndị Kristian ndị ọzọ na-eji dị ka akara nke okwukwe ha?”

Ebe ụdị ajụjụ ndịa banyere obe na-abụkarị ajụjụ banyere nkwa anyị nye Kraịst, na-egbughị oge a gwara m ya na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a weere aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst ịbụ isi okwu, ntọala ahụ dị oké mkpa, isi ozizi, na nkwupụta kachasị nke ịhụnaanya dị nsọ n’ime nnukwu atụmatụ nke Chineke n’ihi nzọpụta nke ụmụ Ya.1 A kọwara m na amara nzọpụta nke dị n’omume ahụ dị mkpa maka ma bụrụ onyinye zuru ụwa enyere ezi na ụlọ mmadụ dum site na Adam na Iv ruo nsọtụ nke ụwa.2 E ńọmiri m Onye amụma Josef Smith, onye kwuru, “Ihe … niile nke gbasara okpukpere chi anyị bụ naanị ihe mgbakwunye” nye Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst.3

Emesịa a gụụrụ m ya ihe Nefi deworo afọ 600 tupu ọmụmụ nke Jizọs: “Ma … mmụọ ozi ahụ gwara m okwu …, na-asị: Lee! Ma e lere m anya ma hụ nwa atụrụ nke Chineke, … [Onye] e buliri n’elu obe ma gbuo n’ihi mmehie niile nke ụwa.”4

Jiri ịnụ ọkụ n’obi nke “ịhụnaanya, nkesa, na mkpọku” m nke na-adịzi n’ụzọ zuru oke, a gara m niihu na-agụ! Nye ndị Nefi n’ime Ụwa Ọhụrụ Kraịst nke bilitere n’ọnwụ kwuru: “Nna m zitere m ka e wee nwee ike bulie m elu n’elu obe; … ka m wee nwee ike dọta ụmụ mmadụ niile nye onwe m, … ma n’ihi nke a ka e buliteworo m elu.”5

Mgbe m na-achọ ińọmi Onye Ozi Pọl ka m bịara mata na anya enyi m bịara malite gosiwa na uche ya apụwo. Ile anya ngwa ngwa n’elekere nkwọjiaka n’ezie cheteere ya na ya nwere ebe o kwesịrị ịnọ—ebe ọbụla ọ bụ—ma ọ gbapụrụ gawa ọrụ efu ya. Site otu ahụ mkparịta ụka anyị akwụsị.

N’ụtụtụ a, ihe ruru afọ 50 gasịrị, ekpebiri m ikwucha nkọwa ahụ—ọbụna ma ọ bụrụ ma onye ọbụla n’ime unu na nzuzo malite ile anya na elekere nkwọjiaka unu. Dị ka m na-anwa ịkọwa ihe kpatara anyị n’ozuzu adịghị eji ihe akara ngosi nke obe, ọ masịrị m ime ka o doo anya nke ọma nkwanye ùgwù anyị miri emi na mmasị anyị dị omimi maka ebumnuuche ndị jupụtara n’okwukwe na ndụ kwesịrị ntụkwasị obi nke ndị ahụ na-eme otua.

Otu ihe kpatara anyị adịghị ekwusi ihe gbasara obe ahụ ike dị ka ihe akara sitere na mgbọrọgwụ anyị nke si na baịbụl. N’ihi na mkpọgbu n’obe bụ otu n’ime ogbugbu kachasị ata ahụhụ n’Ọchịchị nke ndị Rom, ọtụtụ ndị nsiso Jizọs họọrọ ịghara ikwupụta ngwa ọrụ ahụ nke ntaram ahụhụ obi ọjọọ. Ihe ọnwụ nke Kraịst pụtara n’ezie dịịrị n’etiti okwukwe ha, mana nye ruo afọ 300 ha na-achọkarị ibuga njirimara ozi ọma ha site n’ụzọ ndị ọzọ.6

Mgbe narị afọ nke anọ na nke ise, obe ka ewepụtara dị ka ihe akara nke ndị otu Kristi n’ozuzu, mana nke anyị abụghị “otu Kristi n’ozuzu.” Na-abụghị Catholic ma abụghị Protestant, anyị bụ, nzukọ nsọ eweghachitere, nzukọ nsọ Agba Ọhụrụ eweghachitere. Ya mere, mmalite anyị na ikikere anyị laghachiri azụ gafee oge nke kansụl niile, okwukwe, na akara ngosi.7 N’uche nke a, enweghị ihe akara nke na-abịaghị ọsọ ọsọ iji eme ihe na nkịtị bụkwa ihe akaebe ọzọ na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a bụ mweghachite ezi mmalite otu Kristi.

Ihe ọzọ kpatara na anyị anaghị eji ihe akara obe nime okwu anyị n’ọrụ ebube nke ozi nke Kraịst—Mbilite n’ọnwụ Ya dị ebube dịkwa ka ntaram ahụhụ na ọnwụ ịchụ aja Ya. Niwedata ugwu nke adịnamma, a hụbara ama ibe nka abụọ8 nke na-arụ ọrụ dị ka ihe nkwado nye Otu Ndịisi Mbụ na Kworum nke Ndị Ozi Iri na Abụọ na nzukọ ha niile dị nsọ kwa izu ụka ụbọchi Tọsde ọbụla nime Obodo ukwu Salt Lake. Ngosi ndịa na-arụ ọrụ dị ka ihe ncheta na-adịgide nye anyị maka ụgwọ nke akwụrụ na mmeri nke e meriri site n’aka Ya onye ụmụ odibo Ya ka anyị bu.

Foto, oyiyi
Mkpọgbu n’obe, site n’aka Harry Andersen
Foto, oyiyi
Mbilite N’ọnwụ site n’aka Harry Andersen

Nnochi anya ọha nke mmeri ụzọ abụọ nke Kraịst bụ otu anyị si jiri obere eserese Thorvaldsen nke a nke Kraịst biliteworo n’ọnwụ n’ebube site na ili nwee mmerụ ahụ nke Mkpọgbu n’obe Ya ka dịkwa ọhụrụ.9

Foto, oyiyi
Logo Nzukọ nsọ

Nke ikpeazụ, anyị na-echetere onwe anyị na Onyeisi Gordon B. Hinckley kuziburu, “Ndụ nke ndị anyị garịrị [abụ] … ihe akara nke [okwukwe].”10 ntule ndịa niile—kacha nke nke ikpeazụ—na-akpọta m n’ihe nwere ike ịkachasị mkpa nke nrụtụ aka nke akwụkwọ nsọ ruo n’obe ahụ. Ọ dịghị ihe ya na ọla nwere ime, ya na steeples ma ọ bụ akara ama. O nwere ime, kama, ya na eziokwu eji nkume jikọọ na ezi nkwado siri ike na ndị Kristian kwesịrị iwete n’oku Jizọs nyeworo ndị niile bụ ndị na-eso ụzọ Ya. Na mba na ọgbọ ọbụla, Ọ gwawo anyị niile: “Ọ bụrụ ma nwoke ọbụla [ma ọ bụ nwanyị] ga-achọ ịbụ onye na-eso ụzọ m, ya bu ụzọ jụ onwe ya, ma bụrụ obe ya, ma soro m.”11

Nke a na-ekwu maka obe ndị anyị bu kama karịa ndị nke anyị yi. Ịbụ onye na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst, onye ahụ aghaghị ibu ibu arọ mgbe ụfọdụ—nke gị ma ọ bụ nke onye ọzọ—ma gaa ebe ịchụ aja ma ntaram ahụhụ apụghị izere ezere. Ezi Kristian enweghị ike isoro Nna Ukwu naanị n’ihe ndị ahụ nke ọ kwere na ya. Mba. Anyị na-eso ya ebe niile, tinyekọta, ma ọ dị mkpa, n’ebe jupụtara n’anya mmiri na nsogbu, ebe mgbe ụfọdụ anyị nwere ike guzoro nnọọ naanị anyị.

Ama m ndị mmadụ, n’ime ma n’ezi Nzukọ nsọ, ndị na-eso Kraịst naanị na ntụkwasị obi ahụ. Ama m ụmụntakịrị nwere nnukwu nkwarụ ahụ, ma ama m ndị nne na nna n’elekọta ha. Ana m ahụ ha niile na-arụ ọrụ mgbe ụfọdụ ruo n’ike ọgwụgwụ kpamkpam, na-achọ ume, nchekwa, na oge ole ma ole ọṅụ na-adịghị esi ụzọ ọzọ abịa. Ama m ọtụtụ okenye ndị na-alụbeghị ọlụlụ ndị na-achọsi ike maka ma kwesịịrị otu onye nsiso dị mma, alụm di na nwunye magburu onwe ya, na ebe obibi jupụtara na ụmụaka nke onwe ha. Ọdịghị ọchịchọ nwere ike ịdị ezi omume karịa, mana site n’afọ ruo n’afọ ụdị ezi ụba ndị a anaghị abịa otu ahụ. Ama m ndị ahụ na-agabiga ọrịa uche dị iche iche, ndị na-arịọ maka enyem aka dị ka ha na-ekpe ekpere ma chekube ma chọọ maka ala e kwere na nkwa nke nkwụsi ike mmetụta uche. Ama m ndị ahụ bi na ụbịam ọjọọ mana, na-emegide obi nkoropụ, na-arịọ naanị ohere ime ndụ dịtụ mma maka ndị ha hụrụ naanya na ndị ọzọ nọ na mkpa nọ n’etiti ha. Ama m ọtụtụ na-agba mgba n’ihe banyere njirimara, oke ma ọ bụ nne, na mmekọahụ. Ana m e bere ha akwa, e so m ha ebe akwa, mara otu ihe si na mkpebi ha pụta ga-esi dị mkpa.

Ndịa bụ naanị ọnọdụ mnwale ole ma ole anyị na-ezute na ndụ, ihe ncheta dị nsọ na e nwere ọnụ ahịa nke ịbụ onye na-eso ụzọ. Nye Arauna, onye nwara inye ya ehi na osisi n’efu maka aja nsure ọkụ ya, Eze Devid kwuru sị, “Mba; mana n’ezie aga m azụ gị ya n’ọnụ ahịa: … [N’ihi mụ onwe m] a [gaghị] enye … Onyenwe anyị Chineke m … nke ahụ na-enweghị ihe o furu m.”12 Otu ahụ kwa ka anyị niile na-ekwu.

Dị ka anyị na-eburu obe anyị ma soro Ya, ọ ga-abụ ihe jọrọ njọ n’ezie ma ọ bụrụ ma ịdị arọ nke aka mgba anyị emeghị ka anyị na-ekwusi ike karịa mata ma gezie ntị nke ọma n’ibu arọ niile nke ndị ọzọ bu. Ọ bụ otu n’ime ihu abụọ kachasị ike nke Mkpọgbu n’obe ahụ na ogwe aka nke Onye Nzọpụta ka agbatịrị agbatị ma emesịa kụnye ntu ebe ahụ, na-amaghị ama mana n’eziokwu n’egosi na nwoke ọbụla, nwanyị ọbụla, na nwa ọbụla n’ime ezi na ụlọ dum nke mmadụ abụghị naanị na anabatara ya kama akpọrọ oku n’ime nabata Ya dị n’ebuli elu dị mgbapụta.13

Dị ka Mbilite n’ọnwụ ahụ dị ebube sotere ntaram ahụhụ Mkpọgbu n’obe, ya mere ngọzi niile nke ụdị ọbụla ka awụpụtara na ndị ahụ dị njikere, dị ka onye amụma Akwụkwọ nke Mọmọn Jekọb kwuru, i “kwenye na Kraịst, ma hụta ọnwụ ya, ma taa ahụhụ obe ya.” Oge ụfọdụ ngọzi ndị a na-abịa ngwa ngwa ma oge ụfọdụ ha na-abịa ma emesịa, kama mmechi okwu dị ịtụnaanya nye nke onwe site na dolorosa14 bụ nkwa ahụ sitere na Nna Ukwu n’Onwe Ya na ha ga-abịa. Inwete ụdị ngọzi ndị a, ka anyị jisie ike soro Ya—adịghị ada ada ma ghara ịda mbà ma ọ bụ gbafuo, ghara ịtụgharị n’ọrụ ahụ, ọbụghị mgbe obe anyị dị arọ ma ọbụghị mgbe, na nwa oge, ụzọ ahụ nwere ike gbaa ọchịchịrị. Maka ume gị, nguzosike gị, na ịhụnaanya gị, ana m enye ekele nke onwe miri emi. Nụbọchi taa ana m agba akaebe nke onye ozi Ya onye “e buliri elu”15 na maka ngọzi ebighị ebi niile Ọ na-enye ndị ahụ “e buliri elu” Ya na ha, ọbụna Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, amen.

Hụba ama

  1. Lee Jeffrey R. Holland, Encyclopedia of Mormonism (1992), “Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst,” 1:83.

  2. Amulek kwuru okwu maka Aja mgbaghara mmehie nke Kraịst dị ka “aja ikpeazụ dị ukwuu,” nke “n’enweghị ngwụcha ma dị ebighị ebi” nihu ya (Alma 34:10). N’ihi na, “mmadụ niile adawo ma ha efuwo, ma ga-alarịrị n’iyi ma ọbụghị site na aja mgbaghara mmehie” (Alma 34:9; leekwa amaokwu 8–12). Onyeisi John Taylor gbakwunyere: “In a manner to us incomprehensible and inexplicable, [Jesus] bore the weight of the sins of the whole world; not only of Adam, but of his posterity; and in doing that, opened the kingdom of heaven, not only to all believers and all who obeyed the law of God, but to more than one-half of the human family who die before they come to years of maturity, as well as to [those] who, having died without law, will, through His mediation, be resurrected without law, and be judged without law, and thus participate … in the blessings of His atonement” (An Examination into and an Elucidation of the Great Principle of the Mediation and Atonement of Our Lord and Savior Jesus Christ [1892], 148–49; Teachings of Presidents of the Church: John Taylor [2001], 52–53).

  3. Nkuzi niile nke Ndịisi Nzukọ nsọ: Josef Smith (2007), 49.

  4. 1 Nifaị 11:32–33.

  5. 3 Nifaị 27:14–15.

  6. E nwere, n’ezie, ntụaka ndị gbasara obe ahụ nime nkuzi Pọl niile (lee, n’ịmaatụ, 1 Ndị Kọrịnt 1:17–18; Ndị Galeshia 6:14; Ndị Filipi 3:18), mana ndịa kwuru okwu nye ihe kachasị karịa osisi abụọ eji ntu kụkọta ọnụ, ma ọ bụ ụdị ihe akara ntakịrị ọbụla. Ya mere mgbe Pọl na-ekwu banyere obe ahụ, ọ na-eji mkpirisi aka nke ozizi na-ekwu maka ebube nke Aja mgbaghara mmehie, ebe Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a dị njikere isonye ya ma ńomie ya.

  7. Early and traditional Christian figures such as Martin Luther’s associate Andreas Karlstadt (1486–1541) were arguing by the late Middle Ages that “the crucifix [on its own] depicted only Christ’s human suffering and neglected to display his resurrection and redemptive [powers]” (in John Hilton III, Considering the Cross: How Calvary Connects Us with Christ [2021], 17).

  8. Harry Anderson, Mkpọgbu n’obe; Harry Anderson, Meri na Onyenwe anyị Bilitere n’ọnwụ

  9. Lee Russell M. Nelson, “Na-emepe Eluigwe maka Enyem aka,” Liahona, Me 2020, 72–74.

  10. Gordon B. Hinckley, “Akara nke Kraịst,” Ensign, Me 1975, 92.

  11. Matiu 16:24.

  12. 2 Samuel 24:24.

  13. “Ogwe aka Ya ka esetipụrụ nye mmadụ niile ndị ga-echegharị ma kwere n’aha ya” (Alma 19:36; leekwa 2 Nifaị 26:33; Alma 5:33).

  14. Via dolorosa bụ nkebiokwu Latin pụtara “a painfully difficult route, passage, or series of experiences” (Merriam-Webster.com Dictionary, “via dolorosa”). Ọ na-abụkarị ihe gbasara ngagharị nke Jizọs site na ọmụmaikpe Ya n’aka Pilate ruo na mkpọgbu n’obe Ya na Kalvarị.

  15. Lee 3 Nifaị 27:14–15.