Ọgbakọ Zuru ọha
Ị Ka Dịkwa na Njikere
Ọgbakọ zuruọha Ọktoba 2022


Ị Ka Dịkwa na Njikere

Ịdị na njikere anyị isoro Jizọs Kraịst hakwaka otu ahụ oge anyị n’etinye ị nọ nime ebe niile dị nsọ ha

Otu ụbọchị Sọnde, mgbe m na-ejikere ịga iri oriri nsọ kamgbe ọtụtụ izu ụka m na-agagharị na-arụ ọtụtụ ọrụ nke stek, otu echiche dị mmasị ma dịkwaa ike gbatara m n’uche.

Mgbe onye nchụaja malitere ikpe ekpere ngọzi na-achịcha ahụ, okwu ahụ niile m nụworo ọtụtụ mgbe na mbụ jiri ike gbabata n’uche m na n’obi m. “Na gbaara gị aka ebe, O Chineke, Nna nke Ebighị ebi, na ha dị na njikere iwekwasị onwe ha aha nke Ọkpara gị, ma na-echeta ya oge niile ma na-edebe iwu nsọ ya nile nke o nyeworo ha; ka ha wee na-enwe Mmụọ ya oge nile ịnọnyere ha.1 Ugboro ole ka anyị gbaara Chineke aka ebe na anyị dị na njikere?

Dị ka m na-atulegharị mkpa okwu nsọ niile ndịa dị, mkpụrụ okwu ahụ ị dị na njikere mere ka m na-echeta dị ka m na-emetụbeghị na mbụ. Ọtụtụ nhụmiihe dị nsọ ma dịkwa ụtọ sọọrọ ka mmiri wee jupụta n’uche na n’obi m, ya na ihụnaanya na obi ekele maka aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta, ma ọrụ Ya dị mkpa nime atụmatụ mgbapụta nke Nna maka mụ na ezinụlọ m. Emesịa, a nụrụ m ma nwee mmetụta nke okwu niile na-arukpu niime nke e kpere n’elu mmiri ahụ: “Ka ha wee gbaara gị aka ebe … na ha na-echeta ya oge nile.” 2 A ghọtara m ọfụma n’oge ahụ na idobe ọgbụgba ndụ m niile ahaghị ịkarị inwe ezi uche.

Iri oriri nsọ abụghị mmemme okpukperechi dị nkịtị nke na-anghị eme ihe ọbụla maka ya nke ihe ọ chọrọ bụ naanị nkwenye anyị. Ọ bụ ihe ncheta siri ike banyere ịdị irè nke Aja mgbaghara mmehie agwụghị agwụ nke Onye Nzọpụta ma mkpa ọ dị ịcheta Ya ma idobe iwu nsọ Ya niile mgbe niile. Ịdị na njikere ilekwasị anya n’elu Onye Nzọpụta dị oke mkpa nke mere o jiri bụrụ ozi dị mkpa nke ihe abụọ akachasị eńomi nime akwụkwọ nsọ nime Nzukọ nsọ: ekpere niile nke oriri nsọ. Ịghọta eziokwu banyere ihe Nna nke Eluigwe na-ezi njikere nyere onye ọbụla nime anyị site n’Ọkpara Ọ Mụrụ Naanị Ya kwesịrị ịkpake mbọ anyị nke kachasị iji dị na njikere mgbe niile na nkwụghachi ụgwọ.

Ewusikwara ntọala nke ime mmụọ anyị ike n’elu Jizọs Kraịst?

Ọ bụrụ na ntọala nke ime mmụọ anyị emighi emi ma ọbụ na o sighi ike, ọ ga-eme ka anyị debe njikere anyị n’elu naanị ihe ga-bara anyị uru ma ọbụ mgbe ọ ga-adịrị anyị mfe. Ma ọ bụrụ n’anyị nabata okwua ndị mmadụ ’nekwu na Nzukọ nsọ ahụ nwere nanị iwu ndị oge ochie ndi n’ezighi ezi n’oge ugbua, nwee mgbochi nke onwe nke n’enweghi ezi uche, ma nke na-anara oge, mgbe ahụ mkwubi okwu anyị banyere idi na njikere ga-enwe oke ntupọ. Anyị ekwesighi ịtụanya ụkpụrụ nke idi njikere ka ọ bụrụ ihe ga-ewu ewu nke ọma n’ụwa ndị soshal midia na nke ndị Tik Tok na-amasị. Iwu niile nke ụmụ mmadụ na-arakarị ahụ ịkwụ n’ebe eziokwu si na chi nọ.

Nzukọ nsọ bụ ebe mgbakọ maka ndị mmadụ n’ezughi oke nọ, ndị hụrụ Chineke nanya ma dị njikere isoro Onyenwe anyị Jizọs Kraịst. Idi na njikere ahụ gbara mgbọrọ ọgwụ nime eziokwu nke a na Jizọs bụ Kraịst ahụ, Ọkpara nke Chineke dị ndụ. Eziokwu nke a si na chi ka a ga-amata naanị site nʼike nke Mmụọ Nsọ. Ya mere, ịdị na njikere anyị hakwaka otu ahụ oge anyị n’etinye ị nọ nime ebe niile dị nsọ, ebe mmetụta nke Mmụọ Nsọ nọ.

Anyị ga-eme ọfụma m’anyị tinye nnukwu oge nime mkparịta ụka bara uru ikwurikọta mkpagbu obi anyị anyị na Nna nke Eluigwe onye hụrụ anyị nanya, ma hapụ itinyezi oge anyị nime onu okwu ndị ọzọ. Anyị nwekwara ike họrọ ịgbanwe ozi sochal midia nke ụbọchi anyị niile ka ọ n’egosipụta okwu niile nke Kraịst ndị dị nime akwụkwọ nsọ ma okwu amụma niile nke ndị amụma dị ndụ nke Ya.

Otu anyị si were mkpa ọ dị idebe Ụbọchị izu ike nsọ, ikwu otu ụzọ n’ụzọ iri zuru ezu, ijide tempụl rekọmendị dị ọhụrụ, ịdị na-aga tempụl, ma ịkwanyere ọgbụgba ndụ tempụl anyị dị nsọ, bụcha ihe ngosipụta niile siri ike banyere idi na njikere anyị ma bụrụ ihe aka ebe nke nraranye anyị. Anyị ọ dị na njikere itinye ezigbote mbọ maka ime ka okwukwe anyị nwere na Kraịst sie ike karịa itinye mbọ niihe na-emighị emi?

Nna nke Eluigwe hụrụ anyị nanya n’ụzọ zuru oke, mana ịhụnaanya ahụ n’achọ nnukwu atụmanya n’aka anyị. Ọ na-atụanya site naka anyị nanyị ịdị na njikere idebe Onye Nzọpụta n’isi ihe omume nke ndụ anyị. Onye Nzọpụta bụ ezigbote onye ọmumatụ nye anyị maka otu esi adị na njikere inyefe onwe anyị n’aka Nna nime ihe niile. Ọ bụ “ụzọ, eziokwu, na ndụ.” 3 Ọ jiri obi ya gbaa aja nye njọ anyị nile. Ọ jiri obi ya na-eme ka ibu anyị dị mfe, kụda ujọ anyị, nye anyị ume, ma wete udo na nghọta n’obi anyị n’oge niile nke nchekasị ahụ na arịrị.

Otu ọ dị, okwukwe nime Jizọs Kraịst bụ otu nhọrọ. “Ọ bụrụ na [anyị] enweghị ike ọzọ ime ihe na-akarịghị ịchọ ikwere”4 n’okwu Ya niile, anyị enwewo ebe mbido ịmalite ma ọ bụ hazigharịa njem nke okwukwe anyị. Okwu ya niile, ọ bụrụ na-akụọ ya nime obi anyị dị ka mkpụrụ ma zụọ ha jiri ezi nlekọta, ọ ga-agba mgbọrọgwụ, ma okwukwe anyị ga-eto bụrụ ịhe ịmasi obi ike ma ghọkwaa otu ukpuru nke ihe omume na ike. Akwụkwọ nke Mọmọn bụụrụ anyị ihe akụrụngwa kachasị ike maka ịweghachi okwukwe anyị ma ka ọ n’eto eto. Idi na njikere bụ ihe na-akpata okwukwe ịgbanwe.

Na ndụ anụ ahụ nke a, site na atụmatụ si na chi, adịghị mfe ma mgbe ụfọdụ ọ n’abụ ihe mgbagwoju anya. Otu osila dị, “[anyị] dị, ka [anyị] wee nwee ọn̄ụ”!5Ilekwasi anya na Onye Nzọpụta ma n’ebe ọgbụgba ndụ anyị nọ n’enwete ọn̄ụ n’adịgịde! Ebumnuche nke ndụ anụ ahụ bu k’anyị gosipụta idi njikere anyị. “Nnukwu ọrụ nke ndụ [ma ọnụ ahịa nke ị bụ onye n’eso ụzọ] bụ ịmụta uche nke Onyenwe anyị nakwa i me ya.”6 Ibụ ezi onye n’eso ụzọ na-eduba n’ọn̄ụ zuru oke. Anyị ọ dị na njikere ị kwụ ụgwọ nke ị bụ onye n’eso ụzọ?

Okporo ụzọ nke ọgbụgba ndụ ahụ abụghị ọrụ dị mfe; ọ bụ usoro otuto nke ime mmụọ na nnyefe dị omimi nye Onyenwe anyị Jizọs Kraịst. Isi ebumnobi nke iwu nsọ, ụkpụrụ, ọgbụgba ndụ, ma emume nsọ niile bụ iwulite okwukwe na ntụkwasị obi n’ebe Kraịst nọ. Mkpebi obi anyị mere ịtụkwasị ndụ anyị n’elu Kraịst, ya mere, ahaghị ị kwụrụ chim—n’abụghị nke mgbe ohere dị, nke mgbe ọnọdụ dị mma, ma ọ bụ nke na-emighị emi. Anyị enweghị ike iwere ezumiike ọtụtụ ụbọchị ma ọbụ oge nke onwe pụọ site na ịdị na njikere anyị “iguzo dịka ndị aka ebe nke Chineke n’oge nile na n’ihe nile, na n’ebe nile.”7 Ị bụ onye n’eso ụzọ abụghị ihe dị ọnụ ala, nihi na nnonyere nke Mmụọ Nsọ enweghi ọnụ ahịa.

N’ezie, Onyenwe anyị nọọrọ n’eche echiche maka ụbọchị anyị dị ka Ọ kụziri ụkabụilu nke ụmụ agbọghọ iri ahụ na-amaghị nwoke. N’ime ise ahụ nwere akọ n’uche, Ọ kwuru ha e “werewokwa Mmụọ ahụ dịka onye nduzi ha, ma eduhiekwaghi ha,”8 mana oriọma nke ndị nzuzu ahu “anyụworịị” nihi enweghi mmanụ.9 Ikekwe okwu niile nke Nefi kachasị kọwaa ndịa bụbụrụ ndị ọtu Nzukọ nsọ kwụsiri ike n’okwukwe: “Ma ndị ọzọ ka ọ ga-eme ka ha dajụọ, ma rafuo ha mee ịbanye niime nchedo nke anụ ahụ, ka ha wee sị: Ihe nile adịwo mma n’ime Zaịọn.”10

Nchedo nke anụ arụ bụ ịchọsike maka ma ịtụkwasị obi n’ihe nke ụwa ma kama niime ihe nke Kraịst—n’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ile anya site na enyo anya nke ụwa karịa enyo anya nke ime mmụọ. Mmụọ Nsọ n’enye anyị ikikere ịhụ “ihe nile dịka ha dị n’ezie, na … dịka ha ga-adị n’ezie.”11 Naanị “site nʼike nke Mmụọ Nsọ [ka anyị nwere ike] mata eziokwu nke ihe nile.”12 ma hapụ ịbụ ndị aghọgburu. Anyị na-edebe Kraịst n’isi ndụ anyị ma kwe nkwa itinye ịdị na njikere anyi irube isi n’iwu nsọ Ya nille, na-abughi nihi na anyị kpuru isi mana nihi na anyị nwere ike ịhụ ụzọ13

Kedụ maka ndị ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke ndị nzuzu ahụ? Gịnị kpatara ha adịghị njikere ibu arịa nke mmanụ ime mmụọ? Ha nọrọ na-egbu oge? Ikekwe, ha akpọghị ya ihe, nihi ọ dabaghị n’oge ha ma ọbụ ọ dị ka ọdịghị mkpa. Ihe ọ bụla ọbụ, aghọgburu ha banyere ọrụ dị oke mkpa nke Kraịst. Nke a bụ otu ọkpụrụkpụ aghụghọ nke Setan ma bụrụ ihe kpatara oriọma nke ịgba ama ha ji mesịa nyụọ nihi enweghi mmanụ nke ime mmụọ. Ụkabụilu nke a bụ mbụrụ nke agba ọhụrụ maka oge anyị. Ọtụtụ na-ahapụ Onye Nzọpụta ma ọgbụgba ndụ ha ruo ogologo oge tupu ha ahapụ Nzukọ nsọ Ya.

Anyị bi n’oge ndị a n’ahụbeghi mbụ nke ndị amụma mgbe ochie buru amụma ya oge gboo, ụbọchị mgbe Setan ga-akpalite ọnụma “n’ime obi nke ụmụ mmadụ, ma kpalite ha iwe iwe ọkụ megide ihe ahụ nke dị mma.”14 Ọtụtụ nime anyị kwa, bi ndụ ha nime ụwa internet nke ihe juru nime ya bụ ntụrụndụ ma ozi ndị bụ ndị iro nye ejirimara si na chii na nkwenye na Kraịst.

Mmetụta nke ime mmụọ nke kachasị ibe ya sie ike nime ndụ nke otu nwata bụ ọmụmatụ ezi omume nke ndị nne na nna ma ndị nne nne na nna nna dị ịhụnaanya, ndị jiri okwukwe n’edobe ọgbụgba ndụ ha dị nsọ. Ndị nne na nna mara ihe na-akụziri ụmụ ha okwukwe nime Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, nke ga-abụ na ha onwe ha kwa “wee mata ebe ha ga-esi wee lee anya maka mgbaghara nke mmehie ha”15. Akpọghi ọgbụgba ndụ ihe, na akwụghị chim n’idebe ya n’eduba na ị nọ nkịtị nke ime mmụọ. Mmebi nke ime mmụọ ọtụtụ mgbe na-akachasị adị ukwuu na ndụ nke ụmụ na ụmụ ụmụ anyị. Ndị nne na nna, ma ndị nne nne na nna nna, anyị ọ ka dịkwa na njikere?

Onyeisi Russell M. Nelson adọwọ anyị aka na ntị na “n’ụbọchị ndị n’abịa abịa, ọ gaghị ekwe omume ịnya ndụ ime mmụọ na-enweghi nduzi, ntụziaka, nkasị obi na mmetụta nke Mmụọ Nsọ na-adịgide.”16 Nke a bụ ịdọ aka na ntị doro anya na-enweghị mgbaghapụ k’anyị mezie oriọma anyị, ma mụbaa e mmanụ nke ime mmụọ anyị nke anyị dokwara. Anyị ọ ka dịkwa na njikere isoro ndị amụma dị ndụ? Kedụ ebe mmanụ nke ime mmụọ nke nọ nime oriọma gị ha? Kedụ ụfọdụ mgbanwe a geme na ndụ gị nke g’eme ka ịnwekwoo mmetụta nke Mmụọ Nsọ nke ga-anọgide?

Taa, dị ka ọ dị n’oge nke Jizọs, a ga-enwe ndị ga-echigharị azụ, na-adịghị na njikere ịnabata ọnụ ahịa nke ndụ onye n’eso ụzọ. Dị ka a na-ekwupụta nkatọ siri ike ma nke ịkpọ asị nọ na-amụba n’ebe Nzukọ nsọ nke Onye Nzọpụta nọ, na ndị ahụ n’esoro Ya, ndụ anyị dị ka ndi n’eso ụzọ ga-achọ njikere bara ụba nke eji agbatị ma gbaa ọkpụkpụ azụ nke ime mmụọ anyị ume ma ghara ị gee ha ntị.17

Ọ bụrụ na ewusiri ntọala nke ime mmụọ anyị ike n’elu Jizọs Kraịst, anyị agaghị ada ma anyị ekwesịghị ịtụ ụjọ.

“Lee, Onyenwe anyị chọrọ obi na echiche dị na njikere, ma ndị dị na njikere na ndị na-erube isi ga-eri ihe dị mma nke ala Zayọn n’ụbọchị ikpeazụ ndị a.”18

Ka anyị dị na njikere mgbe niile. Site na aha di nsọ nke Onyenwe anyị, Jizọs Kraịst, amen.