Ọgbakọ Zuru ọha
Yok Ya Esighị ike ma Ibu Ya Dị Mfe
Ọgbakọ zuruọha Ọktoba 2022


Yok Ya Esighị ike ma Ibu Ya Dị Mfe

Ka anyị cheta na onye ọbụla nọ n’ụwa nke a bụ nwa Chineke ma Ọ hụrụ onye ọbụla naanya.

E nwere akụkọ a kọrọ maka otu nwoke onye a kpọrọ Jack onye nwere nkịta ọ hụrụ naanya na-achụ nnụnụ a kpọrọ Cassie. Jack ji Cassie akpa oke nganga ma ọtụtụ mgbe na-etu ọnụ gbasara ụdị nne nkịta a zụrụ azụ ọ bụ. Iji gosị na nke a bụ eziokwu, Jack kpọkuru ụfọdụ ndị enyi ya ịbịa lee ihe Cassie ga-eme. Mgbe ha bịachara na klọb ebe ịchụ nta ahụ, Jack kpọpụtara Cassie ịgbagharị ebe ọ banyere niime ideba aha.

Mgbe oge ruru ịmalite, Jack nwere ọnụnụ ọkụ n’obi itu ọnụ maka ọzụzụ dị ịtụnaanya nke Cassie. Ka osila dị, Cassie nọọrọ na-eme ihe n’ụzọ na-edoghị anya. Ọ chọghị irube isi na nduzi ọbụla Jack nyere ya n’iwu dị ka ọ naara eme na-enweghị mmanye. Ihe niile ọ chọburu ime bụ ịnọdụ n’akụkụ ya.

Ike gwụrụ Jack, ma ihere mere ya ma o weere Cassie iwe; ngwa ngwa ọ tụrụ ero ka ha laa. Cassie ọbụna awụlighị elu wụba na-azụ trọk ahụ, otu aka ahụkwa Jack jiiri iwe nwụrụ ya ma nuba ya n’ebe ọ na-arahụ ụra. O were oke iwe ebe ndị ahụ so ya kwara ya emu niihi agwa nkịta ya oge niile ha na-ala n’ebe obibi. Jack aghọtaghị ihe mere Cassie ji na-emegheri. Ọ zụwo ya otu dị mma, ma ọchịchọ ya dum n’oge gara aga bụụrụ ime ihe dị ya mma ma jeere ya ozi.

Ka ọ lọtachara n’ebe obibi, Jack malitere inyocha Cassie maka mmerụ ahụ, ụda fịịfịị, ma ọ bụ akpị, dị ka ọ naara eme na mbụ. Dị ka ọ tụkwasịrị aka ya nobi ya, o metụtara ihe dị mmiri mmiri ma hụ na aka ya jupụtara n’ọbara. Na ihere na oke egwu ji ya, ọ chọpụtara na Cassie nwererịị ogologo, ọnya sara mbara gara nnọọ n’ọkpụkpụ obi ya. Ọ hụkwara ọzọ n’ụkwụ aka nri ya nke ihu, nakwa ruo n’ọkpụkpụ.

Jack kuuru Cassie n’aka ya ma malite ibe akwa. Ihere ya na otu o siworo ghọtahie ma meso ya omume ọjọọ riri ya ọnụ. Cassie nọọrọ na-akpa agwa dị ańaa. na mmalite nke ụbọchị ahụ niihi na o nwere mmerụahụ Agwa ya bụ ihe nke ihe mgbu ya, ahụhụ ya, na mmerụahụ ya butere. O nweghị ihe o nwere ime na na-enweghị ọchịchọ irubere Jack isi ma ọ bụ nke enweghị ịhụnaanya n’ebe ọ nọ.1

A nụrụ m akụkọ nke a ọtụtụ afọ gara aga ma nweghị mgbe ọbụla m chefuru ya. Ole niime ndị mmadụ nwere mmerụ ahụ ka anyị nwere n’etiti anyị taa? Ugboro ole ka anyị na-ekpe ndị ọzọ ikpe na-adabere na ọdịdị mpụta ihe na ihe ndị ha na-eme, ma ọ bụ emeghị ihe, mgbe, ọ bụrụ na anyị ghọtazuru, anyị gaara kama egosị mmetụta jiri ọmịiko na ọchịchọ inye aka karịa ịgbakwunyere ibu ha ikpe ikpe anyị?

E nwewo m ikpe ọmụma banyere nke a ọtụtụ mgbe na ndụ m, mana Onyenwe anyị ejiriwo ndidi kuziere m ihe site na nhụmiihe nke onwe dị iche iche na dị ka m gere ntị na nhụmiihe ndụ nke ọtụtụ ndị ọzọ. A bịawo m matazuo n’uju karịchaa ọmụmaatụ nke ezi Onye Nzọpụta anyị dị ka O jiworo oge Ya karịrị akarị na-elekọta ndị ọzọ n’ịhụnaanya.

Nhụmiihe ndụ nke nwa m nwanyị nke kachasị nta agụnyewo aka mgba ahụike nke mmetụta uche site noge ọ bụụrụ obere nwata nwanyị. Enwewo ọtụtụ mgbe n’oge ndụ ya niile mgbe o cheburu na ya agakwaghị aganiihu n’ọnọdụ ahụ. Anyị ga-anọgide n’obi ekele ruo ebighị ebi nye ndị mmụọ ozi nke ụwa a ndị nọworo ebe ahụ n’oge ndị ahụ niile: na-eso a nọgide ya, na-ege ya ntị, na-eso ya ebe akwa, ma na-ekekọrịta onyinye ndị pụrụ iche ọnụ, enwekọrịta nghọta nke ime mmụọ niile, na mmekọrịta nke ịhụnaanya ruru ala. N’ụdịrị ọnọdụ ndị ahụ dị ịhụnaanya, ibu niile ka ebuliworo ọtụtụ mgbe n’akụkụ abụọ.

Okenye Josef B. Wirthlin, ińomi 1 ndị Kọrịnt, sịrị, “A sị na m na-asụ asụsụ dị iche iche nke ụmụ mmadụ na nke ndị mmụọ ozi, ma nweghị afọ ọma, aghọwo m ihe dị ka ogene na-eme ụzụ ma ọ bụ mbadamba efere na-ada ụda”2

Ọ garaniihu:

“Ozi nke Pọl nyere Ndị nsọ nke a emere ọhụrụ dịịrị mfe ma bụrụ hoo haa: Enweghị ihe i mere pụrụ oke iche ma ọ bụrụ na-inweghị afọ ọma. I nwere ike ịsụ n’ire n’ire, nwee onyinye nke ibu amụma, ghọta ihe niile dị omimi, ma nwee mmata ihe niile; ọbụna na i nwere okwukwe ibupu ugwu ukwu niile, ma inweghị afọ ọma ọgaghị abara gị uru ọbụla.

“‘Afọ ọma bụ ihụnanya nke Jizọs Kraịst na-enweghi ntụpọ’ [Moronaị 7:47]. Onye Nzọpụta gosịpụtara ịhụnaanya ahụ.”3

Niime akwụkwọ Jọn anyị na-agụ, “Site na nke a ka ụmụ mmadụ niile ga-esi amata na unu bụ ndi na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu e nwee ịhụnaanya nye onye ọbụla na ibe ya.”4

E kwuwo ọtụtụ okwu site n’aka ndị ndu Nzukọ nsọ anyị banyere afọ ọma, ịdị n’otu, ịhụnaanya, obi ọma, ọmịiko, mgbaghara, na ebere. E kwere m na Onye Nzọpụta na-akpọku anyị ibi ndụ n’ụzọ kacha dị elu, ụzọ kacha dị nsọ ụzọ nke ịhụnaanya5Ya ebe mmadụ niile nwere ike nwee mmetụta na ha sokwa biri n’ezie ma na-achọkwara ha.

Enyewo anyị iwu ịhụ ndị ọzọ naanya,6 bụghị ikpe ha ikpe.7 Ka anyị nyuwe ibu arọ ahụ n’ala; ọ dịghịrị anyị iburu ya.8 Kama, anyị nwere ike ibuli yok nke ịhụnaanya na ọmịiko nke Onye Nzọpụta.

“Bịakwutenụ m, unu ndi na-adọgbu onwe unu n’ọrụ na ndi e bokwara ibu dị arọ, Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike.

“Wekwasịnụ onwe unu yok m, ma mụọ ihe banyere m; …

“N’ihi na yok m esighị ike, ma ibu m dịkwa mfe.”9

Onye Nzọpụta anaghị anabata mmehie mana na-enye anyị ịhụnaanya Ya ma na-enye mgbaghara mgbe anyị chegharịrị. Nye nwanyị ahụ ejidere na-akwamiko, Ọ sịrị, “Ọ bụghị ma M na-ama gị ikpe: gawa, ma emehiekwala ọzọ.”10 Ndị ahụ O metụrụ aka nwere mmetụta ịhụnaanya Ya, ma ịhụnaanya ahụ gwọrọ ma gbanwee ha. ỊhụnaanyaYa kpakere mmụọ ha ịchọ ịgbanwe ndụ ha. Ibi ndụ n’ụzọ Ya na-eweta ọńụ na udo, ma Ọ kpọkuru ndị ọzọ n’ụzọ ibi ụdị ndụ ahụ jiri ịdị nwayọọ, inwe obi ọma, na ịhụnaanya.

Okenye Gary E. Stevenson sịrị, Mgbe anyị zutere ikuku na ifufe mmiri, ọrịa na mmerụ ahụ niile nke ndụ, Onyenwe anyị—Onye ọzụzụ atụrụ anyị, Onye nlekọta anyị—ga-eji ịhụnaanya na obi ọma zụọ anyị. Ọ ga-agwọ obi anyị ma weghachite mkpụrụ obi anyị.”11 Dị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst, ọ bụ na anyị ekwesịghị ime otu ahụ?

Onye Nzọpụta gwara anyị ka anyị mụọ ihe banyere Ya12 ma mee ihe niile anyị hụrụ O mere.13 O jupụtara na afọ ọma, na ịhụnaanya na-enweghị ntụpọ. Dị ka anyị ji nwayọ na-agbago n’ịmụ ime ihe Ọ gwara anyị mee—ọ bụghị ime ya dị ka ọrụ ma ọ bụ ọbụna maka ngọzi ndị anyị nwere ike ịnata kama naanị site n’ịhụnaanya maka Ya na Nna anyị nke Eluigwe14—Ịhụnaanya Ya ga-asọfe site na anyị ma mee ka ihe niile Ọ gwara anyị hara ị bụ naanị na o kwere omume kama emesịa bụrụ ihe na-esichaghị ike ma dịrị mfe karịa15 ma na-enye ańụrị karịa ka anyị nwere ike iche. Ọ ga-ewe ime ya ugboro ugboro; o nwere ike iwe ọtụtụ afọ, dị ka o were m, mana dị ka anyị si chọọ nnọọ ime ka ịhụnaanya bụrụ ihe na-akpalite ike anyị, O nwere ike iwere ọchịchọ ahụ,16 mkpụrụ osisi ahụ, ma mesia n’ikpeazụ tụgharịa ya ịghọ ọmarịcha osisi, juputara na mkpụrụ dị ụtọ.17

Anyị na-ekwe niime otu abụ anyị hụrụ naanya, “Onye ka m bụ ikpe onye ọzọ ikpe ebe m na-eje ije na-ezughị oke? Niime obi dị jụụ ka e zoro iru uju nke anya na-apụghị ịhụ.”18 Ọ bụ onye niime anyị nwere ike nwee iru uju ndị e zoro ezo? Ihe yiri ka nwata na-enupu isi ma ọ bụ nwata na-eto eto na-enupu isi, ụmụ nke ndị gbara alụkwaghịm, onye nne ma ọ bụ onye nna naanị ya na-azụ nwa ma ọ bụ ụmụ, ndị nke nwere aka mgba nke ahụ ike nke anụ ahụ ma ọ bụ nke ụbụrụ isi, ndị na-ajụ okwukwe ha ajụjụ, ndị na-enweta nhụmiihe ịkpa oke agbụrụ ma ọ bụ akpamoke nke ọdịnaala, ndị na-eche na o nweghị onye so ha, ndị ahụ ọ na-agụ agụọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye, ndị ahụ nwere ihe ndị rara ahụ nhapụ a na-achọzighị, na ọtụtụ ndị ọzọ ha na obosara nhụmiihe nke ndụ na-eche aka mgba n’ụdị dị iche iche na-alụ—ọtụtụ mgbe ọbụna ndị ahụ bụ ndị ndụ ha yiri ka o zuru oke n’elu ahụ.

O nweghị onye ọ bụla niime anyị nwere ndụ zuru oke ma ọ bụ ezi na ụlọ ya zuru oke; n’ezie mụ onwe m ezughị oke. Mgbe anyị na-achọ iche ịma ka ọ dịịrị ndị ọzọ ndị nke nakwa agabiga ihe ịma aka niile na ezughị oke niile, o nwere ike nyere ha aka nwee mmetụta na ọ bụghị naanị ha kwụ niime mgbalị ha niile. Onye niile kwesịrị iche na ha sokwa biri n’ezie ma bụkwa ndị a chọrọ n’otu nke Kraịst.19 Ọchịchọ dị ukwuu nke Setan bụ ikewa ụmụ Chineke, ma ọ na ha emeta ya nke ọma n’ụzọ dị ukwuu, mana e nwere ụdị ike dị n’ịdị n’otu.20 Ma ugbu a anyị kwesịrị ije ije nhata nha onye ọbụla na ibe ya n’elu njem nke anụ ahụ nke a juru na ihe ịma aka!

Onye amụma anyị, Onyeisi Russell M. Nelson, sịrị: “Mmetọ ọbụla ma ọ bụ ịkpa oke ọbụla na-ebe onye ọzọ nọ niihi mba o siri bịa, agbụrụ, ọzụzụ banyere mmasị ahụ nwoke na nke nwanyị, jenda, mmụta banyere digrii ole, omenaala, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ pụtara ihe eji ama mmadụ bụ arụ n’ebe Onye mere anyị nọ! Ụdị mmeso ọjọọ ahụ na-akpata anyị ibi ndụ dị ala karịa ogo anyị dị ka ụmụ ndị nwoke na ụmụ ndị nwanyị nke ọgbụgba ndụ Ya!”21

Ebe Onyeisi Nelson na-akpọkuwo anyị niile ịbata ma nọgide n’okporo ọgbụgba ndụ ahụ nke na-edughachi anyị n’ebe Onye Nzọpụta anyị na Nna nke bi n’Eluigwe nọ, o nyekwara ndụmọdụ nke a na-esote: “Ọ bụrụ na ndị enyi na ezi na ụlọ … adapụ site na Nzukọ nsọ, gaaniihu na-ahụ ha naanya. Ọ bụghị gị ka ọ dịịrị ikpe onye ọzọ ikpe na ihe ọ họọrọ ọzọ karịa ka o kwesịrị gị ị bụ onye a katọrọ maka ịnọgide n’okwukwe.”22

Ndị enyi, ka anyị cheta na onye ọbụla nọ n’ụwa nke a bụ nwa Chineke23 ma Ọ hụrụ onye ọbụla naanya.24 E nwere ndị nọ n’okporo ụzọ gị ndị nke o metụworo gị n’obi ikpe ha ikpe? Ọ bụrụ otu ahụ, cheta na ihe ndị a bụ ohere ndị bara oke uru maka anyị iji na-eme ugboro ugboro ịmụta ị na-enwe ịhụnaanya dị ka Onye Nzọpụta si hụnaanya.25 Dị ka anyị na-eso ọmụmaatụ Ya, e nwere ike yokukọta anyị na Ya ma nye aka wulite mmetụta nke ịhụnaanya na ịnọdụ n’obi nke ụmụ nke Nna anyị niile

Anyị hụrụ ya naanya, niihi na o buru ụzọ hụ anyị naanya.”26 Dị ka anyị juputara nịhụnaanya nke Onye Nzọpụta, yok Ya nezie nwere ike esighị ike, ma ibu Ya nwere ike dị fere fere.27 Nke a ka m na-agba ama ya n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.