Ọgbakọ Zuru ọha
Nọgide n’Ụbọchi ahụ niime Kraịst
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2023


Nọgide n’Ụbọchi ahụ niime Kraịst

Jizọs Kraịst na-eme ka o kwe anyị omume ị “nọgide n’ụbọchi ahụ.”

Ọ bụ ụbọchi juputara na nkọnilu ndị a pịara ọnụ dị kpọm kwem, ajụjụ ndị dị mgbagwoju anya, na ozizi miri emi. Mgbe ọ bakasịchara ndị ahụ yiri ili e tere nzu mba ike, nke na-egosi ihe mara mma n’elu ahụ n’ezie, mana ime ya jupụtara n’ọkpụkpụ ndị nwụrụ anwụ, na ihe niile na-adịghị ọcha,”1 Jizọs kuziri nkọnilu atọ ọzọ banyere ịdị njikere niime mmụọ na ịbụ onye na-eso. Otu niime ndị a bụ nkọnilu nke ụmụ agbọghọ iri na-amaghị nwoke.

“A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere akụkọ ụmụ agbọghọ iri na-amaghị nwoke ndị weere oriọna ha pụta, ma gaa izute nwoke na-alụ nwunye ọhụrụ.

“Ma ise niime ha maara ihe, ma ise ndị ọzọ bụ ndị nzuzu.

“Ha bụ ndị nzuzu weere oriọna ha, ma ha ewereghị mmanụ ọkụ:

“Mana ndị maara ihe weere mmanụ ọkụ na karama ha tinyekwa oriọna ha.

“Mgbe nwoke na-alụ nwunye ọhụrụ nọrọ ọdụ n’ọbịbịa ya, ha niile dinara ma rahụ ụra.

“Ma n’etiti abalị e tiri mkpu n’oke olu sị, Lee, nwoke ahụ na-alụ nwunye ọhụrụ na-abịa; pụtanụ gaa zute ya.

“Mgbe ahụ ụmụ agbọghọ niile ahụ na-amaghị nwoke biliri, ma mụnye oriọna ha.

“Ma ndị nzuzu rịọrọ ndị maara ihe, Nyetunụ anyị mmanụ unu; niihi na oriọna anyị anyụwo.

“Mana ndị ahụ maara ihe zara, na-asị, Mbanụ; n’ụjọ ma ọ bụ na ọ gaghị ezuru anyị na unu: ma kama jekwurunụ ndị na-ere ya, ma zụrụnụ nke onwe unu.

“Ma mgbe ha pụrụ ije zụta, nwoke ahụ na-alụ nwunye ọhụrụ bịara; ma ha ndị dị njikere sooro ya banye n’ebe ọlụlụ di na nwunye ahụ: ma e mechikwara ọnụ ụzọ ahụ.

“Mgbe emesịrị ụmụ agbọghọ ndị na-amaghị nwoke ndị ọzọ bịara, na-asị, Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, meghere anyị ụzọ.2

“Mana ọ zaghachiri ma sị, N’ezie a sị m unu, Unu amaghị m.3

“Ya mere lezienụ anya, niihi na unu amaghị ụbọchi ahụ ma ọ bụ awa mgbe Ọkpara nke mmadụ na-abịa.”4

Onyeisi Dallin H. Oaks jụrụ ajụjụ na-akpake echiche ndị a sotere n’ihe gbasara ọbịbịa nke Nwoke na-alụ nwunye ọhụrụ:5 “Ọ bụrụkwanụ na ụbọchi ọbịbịa Ya ga-abụ echi? Ọ bụrụ na anyị maara na anyị ga-ezute Onyenwe anyị echi—site n’ọnwụ anyị n’erughị eru ma ọ bụ site n’ọbịbịa Ya a na-atụghị anya—gịnị ka anyị ga-eme taa?”6

A mụtawo m site na nhumiihe nke onwe na nkwado nke ime mmụọ banyere ọbịbịa nke Onyenwe anyị abụghị naanị ihe dị oke mkpa mana naanị ụzọ iji chọta ezi udo na obi ụtọ.

Ọ bụụrụ ụbọchi jụrụ oke oyi mgbe m nụrụ okwu ndị a nke mbụ “I nwere ọrịa kansa.” Ọ tụrụ mụ na di m n’anya! Ka anyị nyaara ụgbọala laa n’ekwughị okwu ọbụla, na-atụ uche n’ozi ahụ, obi m lara n’ebe ụmụ anyị ndị nwoke atọ nọ.

Niime uche m a jụrụ m Nna nke Eluigwe, “M ga-anwụ?

Mmụọ Nsọ takaara m, “Ihe niile ga-adị MMA.”

Mgbe ahụ mụ a jụọ, “M ga-adị ndụ?”

Ọzọkwa, azịza ahụ bịara: “Ihe niile ga-adị MMA.”

Ọ gbagwojuru m anya. Gịnị mere m jiri nata otu azịza ahụkwa ma m ga-adị ndị ma ọ bụ m ga-anwụ?

Emesịa na mberede akwara m niile jupụtara n’udo zuru oke dị ka echeteere m: Ọ dịghị mkpa na anyị ga-agbaga ebe obibi ọsọ ọsọ ma kuziere ụmụ anyị otu esi ekpe ekpere. Ha maara otu esi anata azịza niile na nkasi obi site na ekpere. Ọ dịghị mkpa na anyị ga-agbaga ebe obibi ọsọ ọsọ ma kuziere ha banyere akwụkwọ nsọ ma ọ bụ okwu niile nke ndị amụma dị ndụ. Okwu ndị ahụ abụworịị ụzọ ama ama nke mgbam ume na nghọta. Ọ dịghị mkpa na anyị ga-agbaga ebe obibi ọsọ ọsọ ma kuziere ha banyere nchegharị, Mbilite n’ọnwụ, Mweghachite ahụ, atụmatụ nke nzọpụta, ezi na ụlọ na-adịgide ruo ebighị ebi, ma ọ bụ ozizi nke Jizọs Kraịst ahụ kpọm kwem.

N’oge ahụ ihe ọmụmụ nnọkọ mgbede ezi na ụlọ ọbụla, nzukọ ọmụmụ akwụkwọ nsọ, ekpere e kpere n’okwukwe, ngọzi e nyere, ama agbara, ọgbụgba ndụ e mere ma debe, ụlọ nke Onyenwe anyị a gara, na ụbọchị Izuiike e debere dịịrị mkpa—o, lee ka o si dị mkpa! Oge a gaala nke ukwuu itinye mmanụ ọkụ niime oriọna anyị. Anyị chọrọ otu takpọm ọbụla, ma ọ dị anyị mkpa ugbua!

Niihi Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya eweghachitere, ọ bụrụ ma m nwụọ, ezi na ụlọ m ga-enwete nkasi obi, mgbam ume, ma otu ụbọchi eweghachite. Ọ bụrụ ma m dị ndụ, aga m enwe ohere inete ike kachasị ihe niile n’elu ụwa nke a iji nye aka, kwadoo, ma gwọọ m. N’ikpeazụ, niihi Jizọs Kraịst, ihe niile pụrụ ịdị MMA.

Anyị na-amụ ihe site n’ọmụmụ ihe akpachapụrụ anya mụọ site n’Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile ihe “ịdị MMA” yiri ka ya:

“Ma n’ụbọchị ahụ, mgbe m ga-abịa n’ebube m, ka a ga-emezu nkọnilu ahụ nke m kwuru banyere ụmụ agbọghọ iri ahụ na-amaghị nwoke.

“Niihi na ndị ahụ maara ihe ma nabatawokwa eziokwu ahụ, ma werewokwa Mmụọ Nsọ dị ka onye ndu ha, ma eduhieghịkwa ha—n’ezie a sị m unu, agaghị egbutu ha ma tụba ha niime ọkụ, mana ha ga-anọgide n’ụbọchi ahụ.”7

Jizọs Kraịst na-eme ka o kwe anyị omume ị “nọgide n’ụbọchi ahụ.” Ị na-anọgide n’ụbọchi ahụ apụtaghị ịgbakwunye ndepụta ndị a ga-eme eme na-abawanye ụbara. Chee maka enyo mmụba ihe. Naanị ọrụ o nwere abụghị nnọọ ime ka ihe dị ka o buru ibu. O nwekwara ike kpokọta ma chakwasị ìhè iji mee ya adị ike karịa. Anyị kwesịrị ime ka ọ dị mfe, tụkwasị mbọ anyị, ma bụrụ ndị mkpọkọta nke Ìhè nke Jizọs Kraịst. Anyị chọrọ nhụmiihe na nke mkpughe dị nsọ karịa.

Nke dị na mpaghara ọdịda anyanwụ ugwu Izrel bụ ọmarịcha elu ugwu ukwu a na-akpọkarị ọtụtụ mgbe “ugwu ukwu evergreen.” Ugwu ukwu Kamel8 na-anọgide inwe akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ gburugburu afọ karịchaa ebe ụfọdụ ruo n’obere igirigi. Ọzụzụ na-eme kwa ụbọchi. Dị ka “igirigi nke Kamel,”9 ka anyị na-achọ izulite mkpụrụ obi anyị “jiri ihe niile banyere ezi omume,”10 “ihe ndị dị nta ma dị mfe,”11 ama anyị na ama nke ụmụ anyị ga-adị ndụ!

Ugbua, unu nwere ike na-eche, “Mana Nwanne nwanyị Wright, ị maghị ezi na ụlọ m. Anyị na-adọga n’ezie ma anyị eyighị ihe ọbụla dị ka nke a.” I kwuru eziokwu. Amaghị m ezi na ụlọ gị. Mana otu Chineke ji ịhụnaanya, ebere, ike, mmata ihe, na ebube na-enweghị ọgwụgwụ maara.

Ajụjụ ndị i nwere ike ị na-ajụ bụ ajụjụ ndị nke obi na-egbu mgbu niime ala ala mkpụrụ obi. Ajụjụ ndị yiri nke a ka a na-ahụ niime akwụkwọ nsọ:

“Nna ukwu, o metụghị gị n’obi na [ezi na ụlọ m] na-ala n’iyi?”12

“Olee ebe olileanya m nọ ugbua?”13

“Gịnị ka [m] ga-eme, ka igwe ojii nke a ka a ga-enwe ike ewepụ ịghara ikpugide [m]?”14

“Olee ebe a ga-achọta amamiihe? ma olee ebe nghọta dị?”15

“Kedụ otu o si kwe omume na [m] pụrụ ijigide ihe niile ọbụla dị mma?”16

“Onyenwe anyị, gịnị ka ị ga-achọ ka m mee?”17

Ma emesịa nụzọ tọgburu onwe ya ka azịza ndị ahụ sị abịa:

“I kwere n’ike nke Kraịst ruo na nzọpụta?”18

“Ọ bụ na Onyenwe anyị e nyewo onye ọbụla iwu ka ha ghara iketa oke n’ịdị mma ya?”19

“I kwere na [O] nwere ike ime nke a?”20

“I kwere na ndị amụma?”21

“Unu na-enwe okwukwe na mgbapụta nke ya onye kere unu?”22

“Ọ bụ na Ọkaikpe nke ụwa niile agaghị eme ihe ziri ezi?”23

Ezi ndị enyi m, anyị apụghị ike mmanụ anyị, mana anyị pụrụ ikesa ihè Ya. Mmanụ dị niime oriọna anyị agaghị naanị enyere anyị aka “nọgide n’ụbọchi ahụ” mana nwekwara ike bụrụ ụzọ nke inye ọkụ n’ụzọ ahụ na-eduga ndị ahụ anyị hụrụ naanya ruo Onye Nzọpụta, onye guzooro na njikere “jiri ogweaka mepere emepe ịnabata” ha.24

“Otu a ka Onyenwe anyị kwuru; Jide olu gị aka ka ọ ghara ịkwa ákwá, ma anya gị ka ha ghara ịgba anya mmiri: niihi na a ga-akwụ gị ụgwọ ọrụ niihi ọrụ gị, … ma ha ga-abịakwa ọzọ site na ala nke onye iro.

“Ma e nwere olileanya na nsọtụ gị, ka Onyenwe anyị kwuru, na ụmụ unu ga-abịakwa ọzọ n’oke nke onwe ha.”25

Jizọs Kraịst bụ “olileanya na nsọtụ gị.” Ọ dịghị ihe anyị meworo ma ọ bụ na-emebeghị gafere aja Ya na-enweghị ọgwụgwụ ma dị ebighị ebi. Ọ bụ ihe kpatara na ọ dịghị mgbe ọ bụ nsọtụ nke akụkọ anyị.26 Ya mere anyị “garịrị na-aganiihu kwudesie ike niime Kraịst, na-enwe ìhè nke olileanya zuru oke, na ịhụnaanya nke Chineke na nke ụmụ mmadụ niile. Ya mere, ọ bụrụ na [anyị] ga na-aganiihu, n’eri oriri n’elu okwu nke Kraịst, ma nagide ruo ọgwụgwụ, lee, otu a ka Nna kwuru: [Anyị] ga-enwe ndụ ebighị ebi.”27

Ndụ ebighị ebi bụ ọṅụ ebighị ebi. Ọṅụ niime ndụ nke a, ugbu a—ọ bụghị na-agbanyeghị aka mgba niile nke ụbọchi anyị mana niihi enyemaka nke Onyenwe anyị iji mụọ ihe site na ma n’ikpeazụ merie ha—na ọṅụ na-enweghị atụ na ndụ nke na-abịa abịa. Anya mmiri ga-atachapụ, obi tiwara etiwa ka a ga-emezi, ihe ahụ nke furu efu ka a ga-achọta, nchegbu niile ka a ga-emezi, a ga-eweghachite ezi na ụlọ niile, ma ihe niile nke Nna nwere ga-abụ nke anyị.28

Lekwasị anya na Jizọs Kraịst ma dịrị ndụ29 bụ ama m n’ịdị nsọ na aha nsọ nke “Onye ọzụzụ atụrụ na Bishọp nke mkpụrụ obi [anyị] a hụrụ naanya,”30 Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. Matiu 23:27.

  2. Matiu 25:1–11

  3. Ntụgharị asụsụ Josef Smith, Matiu 25:11 (niime Matiu 25:12, nkọwada a).

  4. Matiu 25:13

  5. Okenye James E. Talmage kuziri: “Nwoke na-alụ nwunye ọhụrụ bụ Onyenwe anyị Jizọs; oriri alụm di na nwunye ahụ gosipụtara ọbịbịa Ya n’ebube, ịnabatara Onwe Ya Nzukọ nsọ ahụ ncelu ụwa dị ka nwunye ọhụrụ Ya. Ụmụ agbọghọ ndị ahụ na-amaghị nwoke gosipụtara ndị n’ekwupụta nkwenye niime Kraịst, na ndị, ya mere, n’obisiike na-atụanya ka agụnye ha n’etiti ndị nsonye n’oriri ahụ agọziri agọzi. Oriọna ahụ amụnyere ọkụ, nke onye ọbụla niime ụmụ agbọghọ ahụ bu, bụ ngosipụta pụtara ihe nke nkwenye na omume onye ụka Kraịst; ma niime mmanụ ọkụ edokwara nke ndị maara ihe anyị nwere ike hụta ike ime mmụọ na uju nke mgbalịsiike na nrara nye n’ije ozi nke Chineke naanị nwere ike ikpuchite” (Jizọs Kraịst ahụ [1916], 578-79).

  6. Dallin H. Oaks, “Njikere maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ,” Liahona, Me 2004, 9.

  7. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 45:56-57; nkwusi ike agbakwunyere.

  8. “Dewfall provides a limited amount of moisture even during the dry summer, and is important to summer crops such as watermelon. The nearer the area to the sea, the better are its prospects for dewfall on windless nights when the soil grows colder than the air which touches its surface. In general, the Coastal Plain has more dew than inland regions; richest is Mount Carmel, which has an average 250 nights of dew per year” (Efraim Orni and Elisha Efrat, Geography of Israel, 3rd rev. ed. [1971], 147).

  9. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 128:19.

  10. Mosiah 23:18.

  11. Alma 37:6.

  12. Mak 4:38.

  13. Job 17:15.

  14. Helaman 5:40.

  15. Job 28:12.

  16. Moronaị 7:20.

  17. Ọlụ 9:6.

  18. Alma 15:6.

  19. 2 Nefi 26:28.

  20. Matiu 9:28.

  21. Ọlụ 26:27.

  22. Alma 5:15.

  23. Jenesis 18:25.

  24. Mọmọn 6:17.

  25. Jeremaya 31:16–17; nkwusi ike agbakwunyere.

  26. Lee Camille N. Johnson, “Kpọkuo Kraịst ka O Dee Akụkọ Gị,” Liahona, Nov. 2021, 82: “Ka nsogbu na mkpagbu nke bụ akụkụ nke akụkọ ọbụla dị mma bụrụ ụzọ nke ị ga-esi abịaru nso na, ma kara dịrịzie dị ka, Jizọs Kraịst.”

  27. 2 Nefi 31:20.

  28. lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 84:38.

  29. Lee Alma 37:47.

  30. 1 Pita 2:25.