Ọgbakọ Zuru ọha
Akara ndị pụrụ iche nke Obi ụtọ
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2023


Akara ndị pụrụ iche nke Obi ụtọ

Iwukwasị n’elu ntọala nke Jizọs Kraịst dị oke mkpa nye ańụrị anyị.

Mgbe m nọ niime otu ụgbọelu n’efega Peru ọtụtụ afọ gara aga, A hụtara m onwe m ebe m nọ ọdọ n’akụkụ otu nwoke si Netherlands. Ọ naara agụsi m ike ịga leta ya ebe m jeworo ozi na Belgium na Netherlands dị ka onye mgbasa ozi ọma nta.

Dị ka anyị matara onwe anyị, o nyere m kaadị azụmahịa ya nwere aha ọrụ pụrụ iche nke bụ “prọfesọ nke ańụrị.”  Ekwuru m okwu niihe gbasara aka ọrụ ya dị ịtụnaanya ma jụọ ya ihe prọfesọ nke ańụrị mere. Ọ sịrị na ya kuziiri ndị mmadụ otu esi enwe ndụ obi ụtọ site na-inwe mmekọrịta na ebumnuuche bara uru. A zaghachiri m, “Nke ahụ dị ịtụnaanya, mana ọ bụrụkwanụ na inwere ikekwa kuzie otu mmekọrịta ndị ahụ nwere ike iji gaaniihu gafee ala ili ma zaa ajụjụ ndị ọzọ nke mkpụrụ obi, ụdị dị ka gịnị bụ ebumnuuche nke ndụ, olee otu anyị nwere ike iji merie adịghị ike anyị niile, na ebee ka anyị ga-aga ma anyị nwụsịa?” E kwetara m na ọ ga-adị ịtụnaanya ma ọ bụrụ na anyị nweburu azịza nye ajụjụ ndị ahụ, ma obi tọrọ m ụtọ ịkọrọ ya na anyị nwere.

Taa, ọ ga-amasị m inyochagharị ụkpụrụ ndị dị oke mkpa ole ma ole maka ezigbo ańụrị nke yiri ka ọ kwaala ọtụtụ ndị n’ụwa nke a dị mgbagwoju anya, ebe ọtụtụ ihe na-enye mmasị mana ihe ole ma ole dị mkpa n’ezie.

Alma kuziiri ndị nke ụbọchị ya, “N’ihi na lee, a sị m unu e nwere ọtụtụ ihe ndị ga-abịa; ma lee, o nwere otu ihe nke dị mkpa karịa ha niile—n’ihi na lee, oge ahụ adịghị anya na Onye mgbapụta na-adị ndụ ma ga-abịa n’etiti ndị ya.”1

Ọkwa nke a dịkwa mkpa nye anyị n’ụbọchị taa dị ka anyị na-atụanya ma na-akwado maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Kraịst!

Ya mere, ihe mbụ m hụtara bụ na iwukwasị na ntọala nke Jizọs Kraịst dị oke mkpa nye ańụrị anyị. Nke a bụ ntọala dị ire, “ntọala nke bụ na ọ bụrụ na ụmụ mmadụ wuo n’elu ya ha enweghị ike ịda.”2 Ime otu ahụ na-akwado anyị maka ịma aka mgba niile nke ndụ, ihe ọ sọkwara ya bụrụ.

Ọtụtụ afọ gara aga, a gara m kampụ Scout ọkọchị mụ na nwa anyị nwoke Justin. Mgbe ihe omume gamiri, n’obi ụtọ o kwupụtara na ya na ndị enyi ya chọburu irite baajị mmeri ịgba ụta. Ime otu ahụ chọrọ na ụmụntakịrị ahụ ga-agafe obere mnwale edemede ma tụta akụ ha niihe ahụ elere anya.

Obi dabara m n’afọ. N’oge ahụ, Justin adịchaghị ike niihi cystic fibrosis, ọrịa ọ na-arịa kemgbe a mụrụ ya. A naara m eche ma ọ ga-enwe ike dọlaa ụta ahụ azụ otu dị anya nke ọma iji zipụ akụ ahụ ruo n’ebe atụrụanya.

Mgbe ya na ndị enyi ya hapụrụ maka klaas ịgba ụta ahụ, e jiri m nwayọ kpee ekpere ka ọ hara inweta ihe ihere site na nhụmiihe ahụ. Mgbe awa ọnụnụ ọkụ n’obi ole ma ole gasịrị, a hụrụ m ka o si n’ụzọ na-abịa ebe m nọ na nnukwu ọnụ ọchị. “Papa!” ka o tipụrụ. “E nwetere m baajị nrite ahụ! E nwetere m anya nke oke ebule ahụ; ọ nọọrọ na ebe a tụrụ anya n’akụkụ nke m, mana a tụtara m anya nke oke ebule!” Ọ dọlawo ụta ahụ azụ jiri ike ya niile ma hapụ akụ ya ka ofee, na-enweghị ike ijikwa ebe mbikwasị aka. Lee ka obi m si ju na-ekele maka nghọta nke onye nkuzi ịgba ụta ahụ onye nke na-enweghị mgbe ọ sịrị, “Ndo, ọ bụghị ebe a tụrụ anya!” Kama, mgbe ọ hụrụ adịghị ike niile nke Justin pụtara ihe na ezi mbọ ya, o jiri obi ọma zaghachi, “Ọrụ ọma!”

Nke ahụ bụ otu ọ ga-adịrị anyị ma ọ bụrụ ma anyị mee nke kachasị mma anyị nwere ike iji soro Kraịst na ndị amụma Ya na-agbanyeghị adịghị ike anyị niile. Ọ bụrụ na anyị bịakwute Ya site na-idobe ọgbụgba ndụ anyị niile na ichegharị site na mmehie anyị niile, anyị ga-eji ọńụ nụ ịjamma nke Onye Nzọpụta anyị: “I meela, gị ezigbo nwa odibo kwesịrị ntụkwasị obi nke ọma.”3

Ana m agbara unu aka ebe banyere ịdị ka Chukwu nke Onye Nzọpụta nke ụwa na ịhụnaanya nke mgbapụta Ya na ike nke ịgwọ ọrịa, ịgba ume, na ibuli anyị elu mgbe anyị ji obi anyị niile na-agba mbọ ịbịakwute Ya. N’aka nke ọzọ, e nweghị ụzọ ọbụla anyị nwere ike isi eso igwe mmadụ aga ma sorokwa Jizọs. Onye Nzọpụta emeriwo ọnwụ, ọrịa, na mmehie ma wetewo ụzọ maka izu oke ikpeazụ anyị ma ọ bụrụ na anyị ga-esoro Ya jiri obi anyị niile.4

Ihe nke abụọ m hụtara bụ na ọ tara akpụ nye ańụrị anyị na anyị ga-echeta na anyị bụ ụmụ ndị nwoke na ụmụada sitere na Nna nke Eluigwe dị ịhụnaanya. Ịmata na ịtụkwasị eziokwu nke a obi na-agbanwe ihe niile.

Ọtụtụ afọ gara aga, n’ụgbọ elu m gbara na-ala ebe obibi site n’ọrụ Nzukọ nsọ, mụ na Nwanne nwanyị Sabin hụtara onwe anyị ịnọ ọdụ nnọọ na-azụ otu nnukwu nwoke nwere ihu buru ibu, na-atụ ụjọ esere na-azụ isi nkwọcha ya tinyekwara nọmba 439.

Mgbe anyị kwọdara, a sịrị m, “Biko nna m ukwu, chere. Ọ ga-ewute gị ma m jụọ ihe nọmba ahụ esere n’azụ isi gị pụtara?” Anwaghị m anwa jụọ ihe gbasara ihu na-ewe iwe ahụ.

Ọ sịrị, “Onye ahụ bụ m. Ọ bụ onye m bụ. Ọ bụ m nwe ala ebe ahụ: 219!

Narị anọ na iri atọ na iteghete bụụrụ nnọọ ezi nọmba nke nọ n’isi ya, ya mere ọ tụrụ m naanya na o nwetaghị ya ebe ọ bụ na ọ dị ya oke mkpa.

Echere m echiche gbasara otu o si dị njọ na ejiri mara nwoke nke a na oke nsọpụrụ nke onwe ya dabeere na nọmba ejiri mara ala ndị na-eme mpụ. Echere m niime onwe m: Nwoke nke a siri ike ile anya nweburu mgbe ọ bụ nwata nwoke nke otu onye onye nke ga-achọkwara inwe mmetụta na a kpọrọ ya mmadụ ma na o so biri. A sị naanị na ọ maara onye ọ bụ n’ezie na onye nke nwe ya n’ezie, niihi na “azụwo anyị niile n’ọnụ ego.”5

E nwere otu ahịrị amamiihe nọ niime otu egwu sitere na fim Eze nke Ijipt nke kwuru, “Lee anya na ndụ gị site na anya nke eluigwe.”6 Dị ka mmata ihe nke agbụrụ anyị si na chi na ike dị niime anyị dị ebighị ebi mikpuru niime mkpụrụ obi anyị, anyị ga-enwe ike ịhụta ndụ dị ka atụmatụ dị mma, na-ekpughe njem egwu iji mụta ihe ma too site na ya, ọbụna dị ka “anyị na-ahụ site na glas, nke gbara ọchịchịrị”7 na nwa oge nta.

Akara nke ańụrị nke atọ bụ ị na-echeta mgbe niile uru nke otu mkpụrụ obi bara. Anyị kachasị eme nke a site na i soro ịdọ aka na ntị nke Onye Nzọpụta: “Hụrịtanụ onye na ibe ya naanya; dị ka m siworo hụ unu naanya.”8

Ọ kụzikwara, “Ọbụrụraa na unu emewo ya nye otu niime ụmụnne m ndị a dịkasịrị nta, unu emewo ya nye m.”9

Akwụkwọ Ilu jiri amamiihe nye ndụmọdụ, “Ejichila ihe ọma site n’ebe ha nọ bụ ndị o ruuru, mgbe ọ dị n’ike nke aka gị ime ya.”10

Anyị enweghị ike ịkwa mmakwaara ị bụ ndị nwere oke obi ọma. Na anya Chineke, obi ọma yiri ịdị ukwuu. Akụkụ nke inwe obi ọma bụ inwe mgbaghara na-ekpela ndị ọzọ ikpe.

Ọtụtụ afọ gara aga ezi na ụlọ anyị dị nta naara aga ile muvi maka nnọkọ mgbede n’ebe obibi ezi na ụlọ. Anyị niile nọọrọ niime van ahụ ewezuga otu niime ụmụ anyị ndị nwoke na nwunye m, Valerie. Itiri agbaworịị n’ezi, ma dị ka nwa anyị nwoke meghere ụzọ ma gbara bịawa ebe ụgbọala ahụ nọ, na mberede ọ kụtara ihe o chere bụ nwolomgbo anyị ụkwụ n’ebe ọnụ ụzọ ụlọ ahụ. Ebe ọ dị mwute ikwu maka nwa anyị nwoke na nwunye m, onye nke na-esochi ya azụ, ọ bụghị nwologbo anyị ma kama otu nnukwu skọnkụ obi na-adịghị mma, nke mere ka a mata ya! Anyị niile lọghachiri n’ụlọ, ebe ha abụọ sara ahụ ma saa agịrịgị isi ha jiri mmiri tomato, nke echere bụ ezi ihe ọgwụgwọ ga-akwụsị ishi skọnkụ ahụ. N’oge ha sachara ahụ ma gbanwee uwe ha, anyị anaghịkwa anụ ishi ọbụla ọzọ, ya mere anyị kpebiri na anyị Adịwo Mma ịga muvi ahụ n’ikpeazụ. 

Ozugbo anyị nọdụrụ ọdọ na-azụ azụ obom ahụ, otu otu ndị mmadụ nọ anyị gburugburu n’otu ntabi anya kpebiri ịpụ ịga zụọ ọka eghere eghe. Mgbe ha lọghachiri, otu osila dị, enweghị onye ọbụla niime ha lọghachiri n’oche ha nọbuuru.

Anyị achiwo ọchị dị ka anyị na-echeta nhụmiihe ahụ, mana kedụ kwanụ ma ọ bụrụ na mmehie anyị niile nwere ishi? Kedụ kwanụ ma ọ bụrụ na anyị nwere ike nụ ishi akwụwaghị aka ọtọ, agụụ ịkwa iko, ntaji anya, ma ọ bụ mpako? Site na-adịghị ike anyị ekpughere, a tụrụ anya na-anyị ga-akarị na-echeta ma na-akpachara anya maka ndị ọzọ, otu ahụkwa, hanwa n’ebe anyị nọ dị ka anyị na-eme mgbanwe ndị a chọrọ na ndụ anyị. Ishi anwụrụ na nzukọ na-amasị m nezie, niihi na ọ na-egosị na mmadụ na-agba mbọ ịgbanwe. Ha chọrọ ogweaka nnabata anyị na gburugburu ha.

Onyeisi Russell M. Nelson ekwuwo na amamiihe, “Otu niime ụzọ ndị kachasị mfe iji chọpụta ezigbo onye na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst bụ otu onye ahụ si na-eji ọmịiko emeso ndị ọzọ omume.”11

Pọl degaara ndị Efesọs akwụkwọ, “Ma mesonụ onye na ibe ya omume ọma, dị nro n’obi, na-agbaghara onye na ibe ya, ọbụna dị ka Chineke niihi Kraịst gbaghaworo unu.”12

Dị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst, a sịwo anyị ka anyị tụkwasị Nna nke Eluigwe na Onye Nzọpụta anyị obi ma anwakwala anwa idochi Ha. Jizọs Kraịst maara ezughị oke onye ọbụla nke ọma ma ga-ekpe ha ikpe n’ụzọ zuru oke.

Akara ndị pụrụ iche nke ańụrị m nke anọ bụ ijigide nhụnuuche nke ebighị ebi. Atụmatụ nke Nna anyị gbatịrị ruo ebighị ebi niile; ọ dị mfe ilekwasị anya ebe a na ugbua ma chefuo ma emesịa ebe a.

Akuziiri m ihe ọmụmụ nke a nke ọma afọ ole ma ole gara aga site n’aka nwa anyị nwanyị, Jennifer gbara afọ 16 mgbe ahụ. Ọ nọọrọ na njikere ime mgbanwe ngụ abụọ, ebe ọnụ ọnụ ngụ ya ise nwere ọrịa ka aga ewepụcha kpam kpam ma dochie site na abụọ ndị dị nta dị mma, nke ndị enyi abụọ dị ịtụnaanya dị ka Kraịst nyere. Ọ bụụrụ ihe omume ịdị egwu ya dị ukwuu, otu ọ dị abalị ahụ tupu ọwụwa ahụ ya, Jennifer fọdụrụ ntakịrị ka ọ kwusaara m ozi ọma jiri paụnd 90 ya niile (41 kg), na-asị, “Enyela onwe gị nsogbu, Papa! Echi aga m eteta jiri ngụ ndị dị ọhụụ, ma ọ bụ aga m eteta n’ebe kacha mma. Ụzọ ọbụla ọ bụ ga-adị egwu.” Nke ahụ bụ okwukwe; nke ahụ bụ nhụnuuche ebighị ebi! Ịhụ ndụ site na-ebe esi ahụ ya dị ebighị ebi na-ewete ịhụta ihe nke ọma, nkasi obi, mgbam ume, na olileanya.

Mgbe awachara ahụ, mgbe ụbọchị ahụ a na-atụ anya ya kemgbe bịara maka iwepụ tuubu esi eku ume ma gbanyụọ igwe eji eku ume nke nọrịị na-enyere Jennifer aka iku ume, anyị nọọrọ n’obi nkoropu na-echere ịhụ ma ọnụ ọnụ ngụ ya abụọ ọ ga-arụ ọrụ. Mgbe o kuru ume nke mbụ ya, ọ malitere ozugbo bewa akwa. Ịhụ mwute anyị, o jiri ọsịsọ tie, “Ọ dị nnọọ oke mma iku ume.” 

Kemgbe ụbọchị ahụ, enyewo m Nna nke Eluigwe ekele ụtụtụ na abalị niihi ịdị ike m n’iku ume. Ngọzi ndị a na-apụghị ịgụta ọnụ gbara anyị gburugburu nke mere na anyị nwere ike ejighị ha kpọrọ ihe ma ọ bụrụ na anyị akpachaghị anya. N’aka nke ọzọ, mgbe na-enweghị ihe a tụrụ anya ya ma ihe niile ka anabatara, ndụ na-aghọ ihe anwansị.

Onyeisi Nelson ekwuwo: “Ụtụtụ ọhụrụ ọbụla bụ onyinye si n’aka Chineke. Ọbụna ikuku anyị na-eku bụ mbite dị ịhụnaanya sitere na Ya. Ọ na-edokwa anyị site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị ma kwadoo anyị site na nwa oge ruo na ọzọ. Ya mere, ihe mbụ anyị nwere ugwu ga-abụ ekpere dị umeala nke obi ekele.”13

Nke ahụ na-eweta m na nhụta m nke ise na nke ikpeazụ, nke bụ na unu enweghị ike enwe ọńụ karịa nke unu nwere ekele.

Onyenwe anyị mara ọkwa, “Ma ya onye nke na-anata ihe niile n’obi ekele ka a ga-enye otuto.”14 Ikekwe nke a bụ niihi na afọ ojuju na-amụta imerime omume ọma ndị ọzọ.

Lee otu mmata ihe anyị ga-esi agbanwe ma ọ bụrụ ụtụtụ niile anyị na-eteta jiri naanị ngọzi ndị anyị nwere afọ ojuju maka ha na-abalị gara aga. Ịhapụ inye ekele maka ngọzi anyị niile nwere ike ịdapụta n’uche nke enweghị afọ ojuju, nke nwere ike izonarị anyị ọńụ na ańụrị nke inwe afọ ojuju na-eweta. Ndị ahụ nọ n’ụlọ dị nnukwu ma dị obosara na-eto anyị akpịrị ile anya gafee akara ahụ, ma site otu ahụ leghara akara ahụ anya kpam kpam.

N’eziokwu, ọńụ na ngọzi nke ndụ anụ ahụ kachasị ukwuu ka a ga-ahụ niime onye anyị na-aghọwo site na amara Chineke dị ka anyị na-eme ma na-edobe ọgbụgba ndụ niile dị nsọ anyị na Ya. Onye Nzọpụta anyị ga-ehicha ma ńụchaa anyị site na nrite oke nke aja mgbaghara mmehie Ya ma sịwo banyere ndị ahụ ga-eji obi ha niile na-eso Ya, “Ha ga-abụ ndị m n’ụbọchị ahụ mgbe m ga-abịa iji ọla chọọ ndị m mma.”15

Ana m ekwe unu nkwa na ọ bụrụ na anyị wukwasị ndụ anyị n’elu ntọala nke Jizọs Kraịst; were ezi njiri mara anyị dị ka ụmụ ndị nwoke na ụmụada nke Chineke kpọrọ ihe; cheta uru nke otu mkpụrụ obi bara; jigide nhụnuuche ebighị ebi anyị; ma nobi ekele nabata ọtụtụ ngọzi anyị, nke ka nke ọkpụkpọ oku nke Kraịst ịbịakwute Ya, anyị nwere ike chọta ezi ańụrị anyị na-achọ n’oge njem egwu nke ndụ anụ ahụ nke a. Ndụ ga na-enwe ihe aka mgba ya niile, mana anyị ga-enwe ike izute nke ọbụla n’ụzọ kacha mma jiri uche nke ebumnobi na udo niihi eziokwu ndị dị ebighị ebi anyị na-aghọta ma na-eji ebi ndụ.

Ana m agbara unu aka ebe m banyere ịdị adị nke Chineke, Nna anyị dị ịhụnaanya na maka Ọkpara Ya Ọ Hụrụ naanya, Jizọs Kraịst. Anakwa m agba ama banyere ndị amụma, ndị ọhụụ na ndị mkpughe dị ndụ. Ọ bụ ngọzi ịnata ndụmọdụ nke eluigwe site n’aka ha. Dị ka Onye Nzọpụta siworo kwuo ya n’ụzọ doro anya, “Ma ọ bụ site n’olu nke mụ onwe m ma ọ bụ site n’olu nke ụmụ odibo m, ọ bụkwa otu ihe ahụ.”16 N’aha dị nsọ nke Jịzọs Kraịst, amen.