Ọgbakọ Zuru ọha
Ike Nrachi Ahụ
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2023


Ike Nrachi Ahụ

Ike nrachi na-eme nzọpụta nke mmadụ n’otu n’otu na mbuli elu nke ezi na ụlọ adịrị adị ụwa niile nye ụmụ nke Chineke.

E buwo ya n’amụma opekempe kemgbe ụbọchi niile nke Aịzaya1 na n’ụbọchi ikpeazụ a, na ndị ọgbụgba ndụ mgbe ochie nke Onyenwe anyị, ụlọ nke Izrel, kwesịrị “ikpokọta site na mgbasasị ha dị ogologo, site na agwaetiti nke oké osimiri, na site akụkụ anọ nke ụwa”2 ma weghachite na “ala nke ihe nketa ha.”3 Onyeisi Russell M. Nelson e kwuwo ugboro ugboro na na nnukwu ike banyere mkpokọta nke a, na-akpọ ya “ihe kachasi mkpa na-eme n’elu ụwa taa.”4

Gịnị bụ ebumnoobi nke mkpokọta nke a?

Site na mkpughe nye Onye amụma Josef Smith, Onyenwe anyị chọpụtara otu ebumnoobi dị ka nchekwa nke ndị ọgbụgba ndụ. Ọ sịrị, “Mkpọkọta ahụ n’ọtụ ebe n’ala nke Zayọn, nakwa na stek ya niile, [ga] abụ maka nchekwa, na maka ebe mgbaba pụọ na ebili mmiri, na kwa site n’oke iwe mgbe a ga-awụpụ ya n’enweghi ngwagbu n’elu ụwa niile.”5 “Iwe” n’ọnọdụ nke a ka enwere ike ịghọta dị ka nsonazụ eke niile nke nnupuisi zuru ebe niile nye iwu niile na iwu nsọ niile nke Chineke.

Nke kachasị mkpa, mkpokọta ahụ bụ maka ebumnoobi nke iwete ngọzi niile nke nzọpụta Ọ bụ otu a esi enwete nkwa ọgbụgba ndụ niile enyere Abraham. Onyenwe anyị gwara Abraham na site na mkpụrụ ya na ọkwa nchụaja ya “ezi na ụlọ niile nke ụwa [kwesịrị] ka agọzie, ọbụna jiri ngọzi niile nke Ozi ọma, nke bụ ngọzi niile nke nzọpụta, ọbụna nke ndụ ebighị ebi.”6 Onyeisi Nelson kwupụtara ya n’ụzọ a: “Mgbe anyị nabatara ozi ọma ma mee baptizim, anyị na-ewekwasị onwe anyị aha dị nsọ nke Jizọs Kraịst. Baptizim bụ ọnụ ụzọ ama nke na-eduba ịbụ ndị so keta oke nye nkwa niile enyere mgbe gboo site n’aka Onyenwe anyị ruo Abraham, Aịzik, Jekọb, na ụmụ ụmụ ha.”7

N’afọ 1836, Moses pụtara nye Onye amụma Josef Smith niime Tempụl Kirtland ma “nyefee … ọtụghe niile nke mkpokọta nke Izrel site n’akụkụ anọ nke ụwa.”8 N’otu oge ahụ kwa, Elaias pụtara, ma “nyefee ọgbọ ahụ nke ozi ọma nke Abraham, na-asị na niime anyị na mkpụrụ anyị, ndudugandu niile ga-esochi anyị ga-adị ngọzi.”9 Jiri ikike nke a, ugbu a anyị bu ozi ọma nke Jizọs Kraịst—ozi ọma nke mgbapụta site na Ya—nye akụkụ ụwa na ndị mmadụ niile ma kpokọta ndị niile ga-abata niime ọgbụgba ndụ nke ozi ọma. Ha na-abụ “mkpụrụ nke Abraham, na nzukọ nsọ na alaeze, na ndị a họpụtara nke Chineke.”10

N’otu ụdị oge ahụ niime Tempụl Kirtland, enwere onye ozi nke atọ si eluigwe onye pụtara nye Josef Smith na Oliver Cowdery. Ana m ekwu banyere Elijah, ma ọ bụ ikike na ọtụghe niile o weghachitere ka m chọrọ ikwu banyere ya taa.11 Ike iji kwadoo emume nsọ niile nke ọkwa nchụaja ma mee ha ejikọọ ma n’elu ụwa ma niime eluigwe—ike nke nrachi—dị oké mkpa maka mkpokọta na ikwado ndị ọgbụgba ndụ na aka abụọ nke akwa mgbochi.

Ọtụtụ afọ gara aga, Moronaị emewo ya e doo Josef Smith anya na Elijah ga-ewete ikike ọkwa nchụaja dị mkpa: “Aga m ekpughere gị Ọkwa nchụaja, site naka Elijah onye amụma.”12 Josef Smith mesịrị kọwaa: “Gịnị kpatara eji ezite Elijah? Niihi na o ji ọtụghe niile nke ikike iji nye emume nsọ niile nke Ọkwa nchụaja; ma [ọ gwụla] ma enyere ikike ahụ, agaghị enwe ike enye emume nsọ niile n’ezi omume”13—nke bụ, emume nsọ niile agaghị a dị irè ma ugbu a ma mgbe ebighị ebi.14

Niime nkuzi edoro nsọ dị ka akwụkwọ nsọ niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, Onye amụma kwuru: “Ọ ga-adịịrị ndị ụfọdụ ka ọ bụ ozizi siri ike ka anyị na-ekwu maka ya—ike nke na-edekọihe ma ọ bụ kechie n’ụwa ma kechie n’eluigwe. Otu o sila dị, n’oge niile nke ụwa, mgbe ọbụla Onyenwe anyị nyeworo otu ọgbọ nke ọkwa nchụaja n’aka nwoke ọbụla site na mkpughe n’ezie, ma ọ bụ otu ndịikom ọbụla, ike nke a ka a na enyekarị kwa. Ya mere, ihe ọbụla ọ bụ ndịikom ahụ mere n’ikike, n’aha nke Onyenwe anyị, na mee ya n’eziokwu na na nkwesị ntụkwasị obi, na dobe ndekọihe ziri ezi ma kwesị ntụkwasị obi nke ahụkwa, ọ na-abụrịị iwu n’ụwa na n’eluigwe, ma enweghị ike ihichapụ, dị ka otu iwu niile nke Jehova dị ukwuu siri dị.”15

Anyị na-achọkarị iche maka ikike nrachi dị ka imetụta naanị ụfọdụ emume nsọ tempụl, mana ikike ahụ dị mkpa iji mee emume nsọ ọbụla dị ire ma na-ejikọ gafee ọnwụ.16 Ike nrachi na-enyefe ihe nrachi nke izi ezi nisi baptizim gị, nịma atụ, ka enwee ike mata ya ebe a na n’eluigwe. N’ikpeazu, emume nsọ niile nke ọkwa nchụaja ka a na-eme n’okpuru ọtụghe niile nke Onyeisi Nzukọ nsọ, ma dị ka Onyeisi Josef Fielding Smith kọwara, “Ya [Onyeisi Nzukọ nsọ] enyewo anyị ikike, o tinyewo ike nrachi niime ọkwa nchụaja anyị, niihi na o ji ọtụghe ndị ahụ.”17

Enwere ebumnoobi ọzọ dị mkpa na mkpokọta nke Izrel nke nwere mpụtara pụrụ iche mgbe anyị na-ekwu banyere nrachi n’ụwa ma n’eluigwe—nke bụ iwulite na ịrụ ọrụ nke tempụl niile. Dị ka Onye amụma Josef Smith kọwara: “Kedụ ihe bụ ebumnuuche nke ikpokọta … ndị nke Chineke n’ọgbọ ọbụla nke ụwa? … Isi ebumnuuche ahụ bụ iwulitere Onyenwe anyị ụlọ ebe O ga-enwe ike kpugheere ndị Ya emume nsọ niile nke ụlọ Ya na ebube niile nke alaeze Ya ma kuziere ndị ahụ ụzọ nke nzọpụta; niihi na enwere ụfọdụ emume nsọ na ụkpụrụ ndị, mgbe akuziri ha ma tinye ha n’ọrụ, aga emerịrị ha n’ebe ma ọ bụ ụlọ ewuru maka ebumnoobi ahụ.”18

Ịdị irè nke ike nrachi na-enye emume nsọ niile nke ọkwa nchụaja gụnyere, n’ezie, emume nsọ maka ndị nwụrụ anwụ a na-eme n’ebe ahọpụtara site n’aka Onyenwe anyị—Tempụl Ya. Ebe a anyị na-ahụ ebube na ịdị nsọ nke ike nrachi—ọ na-eme nzọpụta nke ndị mmadụ n’otu n’otu na mbuli elu nke ezi na ụlọ ịdị n’eluigwe na ala nye ụmụ Chineke ebe ọbụla na mgbe ọbụla ha biworo n’elu ụwa. Ọ dịghị nkà mmụta okpukperechi ma ọ bụ fịlọsọfị ma ọ bụ ikike nwere ike ịtụnyere ụdị ohere nke a agụnyere ihe niile. Ike nrachi nke a bụ ngosipụta zuru oke nke ikpe ziri ezi, ebere, na ịhụnaanya nke Chineke.

Site na-ịnwete ohere ike nrachi, obi anyị na-atụgharịkarị nye ndị ahụ laworo tupu ugbu a. Mkpokọta ụbọchi ikpeazụ a fere ofe akwa mgbochi. N’usoro zuru oke nke Chineke, ndị dị ndụ enweghị ike inwe nhumiihe ndụ ebighị ebi n’uju ya na-enweghị njikọ na-anọgide emepụtara nye “ndị nna,” ndị nna nna anyị N’otu aka ahụ, ọganiihu nke ndị ahụ ndị nọworịị n’aka nke ọzọ, ma ọ bụ onye ka nwere ike ife site n’akwa mgbochi nke ọnwụ na-enweghị nrite nke nrachi niile, ezughị ezu tutu ruo emume nsọ ndị nwụrụ anwụ ejikọọ ha nye anyị, ụmụ ụmụ ha, na anyị nye ha n’usoro sinachi.19 Mkpebi inyere onye nibe ya nofe akwa mgbochi aka nwere ike bụrụ nke a ga-ekewapụta dị ka nkwa ọgbụgba ndụ, akụkụ nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ na nke ebighị ebi. N’okwu niile nke Josef Smith, anyị chọrọ “ịrachikọta ndị anyị nwụrụ anwụ [isoro anyị] pụta na mbilite n’ọnwụ nke mbụ.”20

Ngosipụta kacha ịdị elu ma kacha ịdị nsọ nke ike nrachi bụ njikọ dị ebighị ebi nke otu nwoke na otu nwanyị niime ọlụlụ na ijikọ ụmụ mmadụ site na ndudugandu ha niile. Niihi na ikike iji rụọ ọrụ niime emume nsọ ndị a dị ezigbo nsọ, Onyeisi Nzukọ nsọ n’onwe ya na-elekọta nyefe ọrụ n’aka ndị ọzọ. Onyeisi Gordon B. Hinckley kwuru otu mgbe, “Ekwuwo m ọtụtụ mgbe na ọ bụrụ ma enweghị ihe ọzọ pụtara na site na mwute na nhụsianya na mgbu nke mweghachite karịa ike nrachi nke ọkwa nchụaja dị nsọ iji jikọta ezi na ụlọ ọnụ ruo ebighị ebi, ọ gaara aba uru n’ikpeazụ n’ihe niile o were.”21

Ma enweghị nrachi niile nke na-emepụta ezi na ụlọ mgbe ebighị ebi ma jikọọ ọtụtụ ndudugandu ebe a ma emechaa, agaara ahapụ anyị na mgbe ebighị ebi na-enweghị mgbọrọgwụ niile ma ọ bụ alaka niile—nke bụ, n’enweghị nna nna ma ọ bụ ụmụ ụmụ. Ọ bụ ọnọdụ nke ndị mmadụ n’otu n’otu nke na-ese n’efu kwụsịrị akwụsị n’otu aka, ma ọ bụ njikọ ndị nke mebiri ọlụlụ na mmekọrịta ezi na ụlọ ndị Chineke nyeworo22 n’aka nke ọzọ, nke ahụ ga-egbochi ebumnoobi kpọmkwem nke okike nke ụwa. Asị na nke ahụ ga-abụ nsiniiwu, ọ ga-apụta na ụwa ka a ga-eti ihe jiri abụmọnụ ma ọ bụ “bibie kpamkpam” n’ọbịbịa nke Onyenwe anyị.23

Anyị nwere ike hụ ihe kpatara “alụmdi na nwunye n’etiti otu nwoke na otu nwanyị ka akwadoro n’aka Chineke ma na ezi na ụlọ bụ isi nke atụmatụ nke Onye Okike maka akara aka ebighị ebi nke ụmụ Ya.”24 N’otu oge ahụkwa, anyị na-amata na n’oge ugbu a n’ezughị oke, nke a abụghị nsiridi ahụ ma ọ bụ ọbụna nsiridi kwere omume nye ụfọdụ. Mana anyị nwere olileanya niime Kraịst. Ebe anyị na-echere Onyenwe anyị, Onyeisi M. Russell Ballard na-echetere anyị na “akwụkwọ nsọ na ndị amụma ụbọchi ikpeazụ na-egosi na onye ọbụla kwesịrị ntụkwasị obi n’idebe ọgbụgba ndụ nke ozi ọma ga-enwe ohere maka mbuli elu.”25

Ụfọdụ enwewo nhumiihe ọnọdụ ezi na ụlọ ndị na-enweghị obi ụtọ na ndị na-adịghị mma ma nwe obere mmetụta maka otu ezi na ụlọ ebighị ebi. Okenye Devid A. Bednar kwuru ihe ndị a: “Maka unu ndị nweteworo nhumiihe obi mgbu nke alụkwaghịm niime ezi na ụlọ unu ma ọ bụ nwete nhụmiihe ihe mgbu nke ntụkwasị obi emebiri, biko cheta [na usoro nke Chineke maka ezi na ụlọ niile] na-ebido ọzọ na gị! Otu njikọ dị niime cheenị nke ndudugandu unu nwere ike bụrụ nke adọbiri, mana njikọ ezi omume ndị ọzọ na ihe fọdụrụ nke cheenị ahụ dị mkpa ebighị ebi na-agbanyeghị. I nwere ike gbakwunye ike nye cheenị gị ma eleghị anya ọbụna nyee aka iweghachi njikọ niile dọbiri adọbi. Ọrụ ahụ ka a ga-emezu otu otu.”26

N’ụka olili ozu nke Nwanne nwanyị Holland, nwunye Okenye Jeffrey R. Holland, na Julaị gara aga, Onyeisi Russell M. Nelson kuziri: “N’oge, Patricia na Jeffrey ka a ga-ejikọta ọzọ. Ha ga-esonye ụmụ ha ma emesịa na ụmụ ụmụ ha ndị na-edebe ọgbụgba ndụ ha inwe nhụmiihe nke uju nke ọńụ nke Chineke debere maka ụmụ Ya kwesịrị ntụkwasị obi. N’ịmara nke ahụ, anyị ghọtara na agụgụ ụbọchi kacha dị mkpa na ndụ nke Patricia abụghị agụgụ ụbọchi ọmụmụ ya ma ọ bụ agụgụ ụbọchi ọnwụ ya. Agụgụ ụbọchi ya kacha mkpa bụ Jun 7, 1963, mgbe ya na Jeff rachiri niime Tempụl St. George. … Gịnị mere nke a jiri dị oke mkpa? Niihi ebumnoobi kpọmkwem e jiri kee ụwa bụ ka enwee ike hazie ezi na ụlọ niile ma rachie nye ibe ya. Nzọpụta bụ mkpa mmadụ n’otu n’otu, mana mbuli elu bụ mkpa nke ezi na ụlọ. Enweghi onye a ga-ebuli elu naanị ya.”

N’etebeghị anya, mụ na nwunye m sonyere otu ezigbo enyi niime ọnụ ụlọ nrachi nke Bountiful Utah Tempụl. Ezutere enyi nke a na mbụ mgbe ọ bụ nwata niime Córdoba, Argentina. Mụ na onye nsiso mgbasa ozi ọma m naara akpọtụrụ ndị mmadụ n’otu agbata naanị ụlọ ole ma ole site n’ụlọ ọrụ mishọn, ma o mepere ọnụ ụzọ ahụ mgbe anyị bịara n’ebe obibi ya. N’oge na-adịghị anya, ya na nne ya na ụmụnne ya sonyere Nzukọ nsọ, ma ha anọgidewo ịbụ ndị otu kwesịrị ntụkwasị obi. Ugbu a ọ bụ ọmarịcha nwanyị, ma n’ụbọchi nke a anyị nọ niime tempụl ịrachi ndị nne na nna ya nwụrụ anwụ nye otu n’ibe ya ma emesịa rachie ya nye ha.

Di na nwunye ndị kemgbe ọtụtụ afọ bụworo ezigbo ndị enyi nọchitere nne na nna ya n’ebe nchụaja. Ọ bụ oge nwere mmetụta uche nke ahụ bịara ghọọ ọbụna dị ụtọ karịa mgbe arachiri enyi anyị onye Argentina nye nne na nna ya. Enwere naanị anyị mmadụ isii nọ oge ahụ n’ehihi dara jụụ pụrụ site n’ụwa, ma otu ọ dị otu niime ihe ndị kachasị mkpa nke na-emekarị mgbe niile n’ụwa naara eme. Obi dịịrị m ụtọ na ọrụ m na mkpakọrịta m ezuwo site n’ịkụ aka n’ọnụ ụzọ ya dị ka onye mgbasa ozi ọma nta ruo ugbu a, ọtụtụ afọ ndị a e mesịrị, na-eme emume nsọ nrachi niile nke jikọrọ ya nye nne na nna ya na ndudugandu ndị gara aga.

Nke a bụ ọnọdụ na-eme mgbe niile gburugburu ụwa niile niime ọtụtụ tempụl. Nke a bụ nzọụkwụ kachasị n’ịkpokọta ndị ọgbụgba ndụ. Ọ bụ ohere ọma kachasị elu nke ịbụ onye otu gị niime Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst. Ana m ekwe nkwa na dị ka ị na-achọ ohere ọma ahụ n’ịkwesị ntụkwasị obi, n’oge a ma ọ bụ mgbe ebighị ebi ga-abụrịrị nke gị.

Ana m agba ama na ike na ikike nrachi eweghachitere n’ụwa site n’aka Josef Smith dị adị, na ihe ọ bụ ekechiri n’ụwa n’ezie ka ekechiri n’eluigwe. Ana ma agba ama na Onyeisi Russell M. Nelson, dị ka Onyeisi Nzukọ nsọ, bụ otu nwoke ahụ n’ụwa taa site nọtụghe ya niile na-eduzi ojiji nke ike nke a kachasi elu. Ana m agba ama na Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst emewo anwụghị anwụ eziokwu ma ikwe omume nke mmekọrịta ezi na ụlọ ebuliri elu ịbụ nsiridị. N’aha nke Jizọs Kraịst, amen.