Ọgbakọ Zuru ọha
Nna ukwu, Anyị chọrọ Ịhụ Jizọs
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2023


Nna ukwu, Anyị chọrọ Ịhụ Jizọs

Anyị chọrọ ị hụ Jizọs maka onye Ọ bụ ma nwe mmetụta ịhụnaanya Ya.

Ihu Ịkpuịsịị

Otu ụbọchị nime spring nke afọ 1945, otu nwa okorobịa tetara n’ụlọ ọgwụ ndị agha. O nwere ihu ọma ịdị ndụ—a ka gbara ya egbe n’azu ntị, mana ndị dọkịnta awala ya, ma o nwere ike ugbua ga ije ma kwuo okwu nke ọma.

N’ụzọ dị mwute, mgbọ ahụ emebiela akụkụ ụbụrụ ya nke na-amata ihu mmadụ niile. O lere nwunye ya anya na-amataghị onye ọ bụ; ọ nweghị ike ịmata nne nke ya. Ọbụnaghị ihu ọ hụru na ugegbe ka ọmatara—ọ kọtaghị ma ọbụ nwoke ma ọbụ nwanyị.1

Ọ ghọwo onye kpụrụ isii ịmata ihu—ọnọdụ na-emetụ nde kuru nde ndị mmadụ.2

Ndị mmadụ nwere ọrịa ịkpụisii ịmata ihu na-agbalị ịmata ndị ọzọ site na iburu iwu niile nisi—otu iwu maka ịmata otu ada site na otu ihe gbakasịrị onye ahụ n’ihu sịrị dị ma ọbụ otu site na ije ije nke enyị ha.

Ịto Eto

Nke a bụ akụkọ nke abụọ, bịaruo nso ụlọ: Dịka nwa okorobịa, A na m ahụkarị nne m dị ka onye ome iwu. Ọ bụ ya na-ekpebi mgbe m nwere ike gwuo egwu na mgbe m ga-alaba ma ọbụ, ọjọka njọ, dọpụta ahịhịa nime ogige.

O doro-anya na-ọhụrụ m nanya. Kama ọtụtụ mgbe na ihere m, A hụrụ m ya naanị dịka “Nwanyị a Ga-Eruberịrị Isi.”

Naanị mgbe ọtụtụ afọ gachara ka m bịara hụ ya dị ka ezi mmadụ. Ihere na-eme m na A mataghị m aja ya ma ọbụ chee ihe mere na ọtụtụ afọ ọ nara eyi naanị uwe ochie abụọ (ma mụ enweta uwe ụlọ akwụkwọ ọhụrụ) ma ọbụ ihe mere, mgbe ụbọchị gachara, ezigbo ike na-agwụ ya ma ọ nara achọ ka m laba ọsịsọ.

Anyị Nwere ike Nwee Ịkpụisii Ịmata Ihu

Ikekwa ị chọpụtala na akụkọ abụọ ndị a bụ nezie otu akụkọ—ruo ọtụtụ afọ, enwere m, nezie ikpụisii ịmata ihu. A hụghị m nne m dị ka ezi mmadụ. A hụrụ m iwu ya niile mana a hụghị m ịhụnaanya ya nime ha.

A na m akọrọ unu akụkọ abụọ ndị a igosi otu ihe: A na m eche na ịmara otu onye (ikekwa ị bụ otu onye) onye na-arịa ọrịa ịkpụisii ịmata ihu nke ime mmụọ.

Ị nwere ike na-arara gị ahụ ịhụ Chineke dị ka Nna dị ịhụnaanya. Ị nwere ike lee anya n’elu ma hụ ma ahụghị ihu nke ịhụnaanya na ebere kama otu ogbugbo nke iwu nke ị ga-esirịrị na ya gafere. Ikekwa ị kwenyere na Chineke na-achị nime eluigwe Ya, na-ekwu okwu site n’aka ndị amụma Ya, ma hụ nwanne gị nwanyị naanya, mana na-eche na nzuzo ma Ọ hụrụ gị naanya.3 Ikekwa ị nwela mmetụta nke mkpara igwe dị n’aka gị mana ị nwetabeghị ịhụnaanya nke Onye Nzọpụta gị bụ ebe ọ na-eduga.4

A na m eche na ị mara ndị dị otu a nihi ruo na ogologo oge, M bụ onye dị otu a—E nwere m ịkpụisii ịmata ihu nke ime mmụọ.

E chere m na ndụ m bụ ịgbaso iwu niile na ime ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ nkịtị. A matara m na Chineke hụrụ gị naanya zuru oke kama e nweghị m mmetụta ya n’onwe m. Egwu na-atụ m na m chere maka ịbanye n’eluigwe karịa ịnọnyere Nna m nke Eluigwe.

Ọ bụrụ na gị, ka m, nwere ike mgbe ụfọdụ nwee ndakọrịta egbugbere ọnụ mana hara “ịgụ abụ nke mgbapụta ịhụnaanya,”5 ole ihe anyị nwere ike mme?

Aziza ahụ, dị ka Onyeisi Nelson na-echetara anyị, bụ Jizọs mgbe niile.6 Ma nke a bụ ezigbo ozi ọma.

Nna ukwu, Anyị chọrọ Ịhụ Jizọs

E nwere amaokwu dị mkpịrịsi na Jọn nke na-amasị m. Ọ na-ekwu banyere otu ndị si na mba ọzọ bụ ndị ji arịrịọ dị mkpa gakwuru onye na-eso ụzọ ya. “Nna ukwu,” ha kwuru, “anyị ga [achọ] ị hụ Jizọs.”7

Nke a bụ ihe anyị niile chọrọ—anyị chọrọ ị hụ Jizọs maka onye Ọ bụ ma nwe mmetụta ịhụnaanya Ya. Nke a kwesịrị ịbụ ihe kpatara ọtụtụ ihe ndị anyị na-eme niime Nzukọ nsọ—na n’eziokwu nye nzukọ oriri nsọ niile. Ọ bụrụ na ị na-eche maka ụdị ihe ọmụmụ ị ga-akuzi, ụdị nzukọ a ga-eme atụmatụ ya, ma ị ga-ahapụ naanị ndị dikọn ma gwuo dodgeball, ị nwere ike were amaokwu a dị ka ihe ndụ gị: nke a ọ ga-enyere ndị mmadụ aka ịhụ ma hụ Jisọs Kraịst naanya? Ma ọ bụghị ya, ikekwa nwaa ihe ọzọ.

Mgbe m chọpụtara na enwere m ihu Ịkpuịsịị nke ime mmụọ, na m hụrụ iwu niile kama ọbụghị ihu nke ebere nke Nna, a matara m na ọ bụghị Nzukọ nsọ kpatara ya. O sighị n’aka Chineke, ma ọpụtaghị na ihe niile furu efu; ọ bụ ihe anyị niile kwesịrị ị mụta. Ọbụna ndị aka-ebe mbụ nye Mbilite n’ọnwụ ọtụtụ oge hụrụ Onyenwe anyị bịlitere n’ọnwụ ihu na ihu mana ha amataghị Ya; site na Ubi Ili ruo na ikpere mmiri nke Galili, ndị mbụ soro Ya “hụrụ Jizọs kwụ ọtọ, ma amaghị na ọ bụ Jizọs.”8 Ha gbara mbọ ịmụta otu esi amata Ya, ma otu ahụ ka anyị ga-eme.9

Afọ-ọma

Mgbe m chọpụtara na-enwere m ihu ịkpuịsịị nke ime mmụọ, e bidoro m na-eso ndụmọdụ nke Mọmọn ikpe ekpere “jiri ike niile nke obi” ị jupụta na ịhụnaanya ahụ ekwere ndị na-eso ụzọ Ya na nkwa—ịhụnaanya m nwere ebe Ọ nọ na ịhụnaanya O nwere ebe m nọ—na ka “ịhụụ ya di ka ọ dị … ma nwe olile anya nke a.”10 E kpere m ekpere ọtụtụ afọ inwe ike soro iwu mbụ ukwuu ịhụ Chineke naanya ma nwee mmetụta na eziokwu … nke mbụ bụ na Chineke hụrụ anyị n’anya jiri obi, ike, uche, na ume Ya .”11

Ozi ọma niile Ahụ

A gụrụ m ma gụgharịa ma gụgharịa Ozi ọma anọ ahụ—oge a ịgụ n’abụghị iji wepụ iwu niile kama ịhụ onye Ọ bụ na ihe Ọ hụrụ naanya. Ma, nime oge, osimiri ịhụnaanya nke si na Ya asọpụta buru m.

Jizọs bidoro kwuru na mbido na Ọ bịara “ịgwọ ndị obi tiwara etiwa, ị kwusa nwere onwe nye ndị eji-eji na ime ka ndị isii hụ ụzọ.”12

Nke a abụghị naanị ndepụta ime ihe ma ọbụ PR dị mma; ọ bụ ụdịdị nke ịhụnaanya Ya.

Mepee Ozi ọma niile ahụ, na ibe-akwụkwọ ọbụla anyị na-ahụ Ya ebe ọ na-elekọta ndị na-ata ahụhụ— n’etiti ọha na eze na anụ ahụ. Ọ na-emetụ ndị e were dị ka ndị rụrụ arụ na ndị adịghị ọcha aka13 ma nye ndị agụụ nri.14

Gịnị bụ akụkọ kachasị masị gị nke Jizọs? A na m eche na o gosiri Nwa nke Chineke ka ọ na-agbatị aka ịmakụ ma ọbụ nye olile anya nye mmadụ nọ n’akụkụ—onye ekpenta,15 onye Sameria akpọrọ asị,16 onye eboro ebubo na onye mmehie,17 ma ọbụ onye iro mba.18 Ụdị amara ahụ dị ịtụnaanya.

Gbalịa idetu oge ọbụla Ọ na-eto ma ọbụ na-agwọ ma ọbụ na-eri ihe ya na onye ọzọ, ma ihe edemede gị ga-agwụ tupu ị hapụ Luk.

Dịka m hụrụ nke a, obi m wụliri elu n’ihi mmata ihe dị ịhụnaanya, ma m bidoro inwe mmetụta na enwere ike Ọ hụrụ m naanya. Dịka Onyeisi Nelson kuziri, “Ka ị na-amụtakwu gbasara Onye Nzọpụta, ka ọ ga-adịwanye mfe ịtụkwasị obi n’ebere Ya, ịhụnaanya Ya na-enweghị ngwụcha.”19 Ma ị ga aka atụkwasịkwu obi ma hụ Nna gị nke Eluigwe naanya karịa.

Okenye Holland akuziworo anyị na Jizọs bịara igosi “anyị onye na ụdị Chineke Nna anyị nke Ebighị ebi bụ, otu O si jiri obi Ya niile nyefe ụmụ Ya nime afọ na mba niile.”20

Pọl sịrị Chineke bụ “Nna nke obi ebere [niile], na Chineke nke nkasi obi niile.”21

Ọ bụrụ na ị na-ahụ Ya n’ụdị dị iche, ga nihu na-agbalị.

Ọgbụgba ndụ niile na Mmakụ nke Chineke

Ndị amụma na-akpọ anyị ịchọ ihu Ya.22 E were m nke a dị ka ihe ncheta na anyị na-efe Nna anyị, ọ bụghị usoro, na anyị emechabeghị ruo mgbe anyị hụrụ Jizọs dịka ihu nke ịhụnanya nke Nna23 ma soro Ya, ọbụghị naanị iwu Ya niile.24

Mgbe ndị amụma na ndị-ozi na-ekwu banyere ọgbụgba ndụ niile, ha adịghị ka ndị nkuzi na-eti mkpu site na (red velvert) bleachers, na-agwa anyị ka “anyị gbalịkwuo!” Ha chọrọ ka anyị hụ ọgbụgba ndụ anyị niile ka ihe gbasara mmekọrịta26 ma nwere ike bụrụ ọgwụgwọ maka ihu Ịkpuịsịị nke ime mmụọ.26 Ha abụghị iwu niile iji nweta ịhụnaanya Ya; Ọ dị mbụ nwere ịhụnaanya zuru oke ebe ị nọ. Aka-mgba anyị bụ ị ghọta ma dozie ndụ anyị nye ịhụnaanya ahụ.27

Anyị na-agbalị ịhụ site na ọgbụgba ndụ anyị niile, dịka site na windo, ruo ihu ebere nke Nna n’azụ.

Ọgbụgba ndụ niile bụ udịdị nke mmakụ nke Chineke.

Osimiri ahị nke ịhụnaanya nke Chineke

N’ikpeazụ, anyị nwere ike ịmụta ịhụ Ya site n’ijere Ya ozi. “Maka olee otu mmadụ ga-esi mata nna ya ukwu onye ọ na-ejerebeghị ozi?”28

Afọ ole na ole gara-aga, E nwetara m ọkpụkpọ oku obi m anabataghị. E tetara m n’isi ụtụtụ, jiri ụjọ—kama were nkebiokwu n’uche nke m na-anụbeghị mbụ: na ije ozi n’ọgbakọ nsọ a bụ iguzo n’osimiri nke ịhụnaanya Chineke n’ebe ụmụ ya nọ. Nzukọ nsọ a bụ otu ndị ọrụ nke ndị mmadụ na-eji pick na shọvel na-agbalị inye aka kpochapụ ọwa maka osimiri nke ịhụnaanya Chineke nye ụmụ Ya nọ na njedebe nke ahịrị ahụ.

Onye ọbụla ị bụ, ihe ọbụla bụ ihe ịbụrụla, e nwere ohere maka gị nime Nzukọ nsọ a.29

Were otu pick na shọvel ma sonye na otu ahụ. Nye aka buru ịhụnaanya Ya nye ụmụ Ya, ma ụfọdụ ya ga-adakwasị gị.30

Ka anyị chọọ ihu ịhụnaanya Ya, mmakụ ogbụgba-ndụ Ya, ma mgbe ahụ konye aka gị na ụmụ Ya, ma jikọta ọnụ anyị ga-agụụ “Onye Mgbapụta nke Izrel”:

Weghachi, ezi Onye Nzọpụta m,

Ị̀hè nke ihu gị;

Nkasi obi nke mkpụrụ obi gị na-enye;

Ma ka ọchịchọ dị ụtọ pụta

Maka ebe nsọ gị

Weta olile anya n’obi m tọgbọrọ n’efu.31

Ka anyị chọọ ihu ịhụnaanya Ya ma mgbe ahụ bụrụ arịa niile nke ebere Ya nye ụmụ Ya.32 Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen

Hụba-ama

  1. Lee Hadyn D. Ellis and Melanie Florence, “Bodamer’s (1947) Paper on Prosopagnosia,” Cognitive Neuropsychology, vol.7, no. 2 (1990), 84–91; Joshua Davis, “Face Blind,” Wired, Nov. 1, 2006, wired.com.

  2. Lee Dennis Nealon, “How Common Is Face Blindness?,” Harvard Medical School, Feb. 24, 2023, hms.harvard.edu; see also Oliver Sacks, “Face-Blind,” The New Yorker, Aug. 23, 2010 ,newyorker.com.

  3. “Ụfọdụ ndị otu Nzukọ nsọ kwere dịka eziokwu ozizi, ụkpụrụ niile, na ịgba-ama niile ekwupụtara mgbe ọbụla site na ikpo okwu nime Conference Center na nime ọgbakọ ndị dị n’ụwa niile— ma enwere ike ị na-agbalị ikwere na eziokwu ebighị ebi ndị a metụtara kpọmkwem na ndụ ha na ọnọdụ ha niile” (David A. Bednar, “Nọrọ nime M ma Mụ nime Gị; Ya mere Soro M Jegharịa,” Liahona, Mee 2023, 125).

  4. Lee 1 Nifaị 8:19; 15:23. “O siri ike idobe iwu nsọ niile nke Onyenwe anyị mgbe anyị enweghị okwukwe na ntụkwasị obi n’ime Ya” (Henry B. Eyring, “The Faith to Ask and Then to Act,, Liahona, Nov. 2021, 75).

  5. Alma 5:26.

  6. Lee Russell M. Nelson, “Azịza Ahụ Na-abụkarị Jizọs Kraịst,” Liahona, Me 2023, 127–28.

  7. Jọn 12:21.

  8. Jọn 20:14. Ha hụrụ Ya nụzọ gara Emmaus mana ha amaghị Ya (lee LeeLuk 24:16.), nime ọnụ-ulọ akpọchiri akpọchi (lee Luk 24:37), na ikpere nke Galili (lee Jọn 21:4), ma na Ubi Ili (lee Jọn 20;14).

  9. Ọ bụrụ na anyị were obi anyị niile chọọ Ya ma were okwukwe na-aga n’ihu, A ga-achọta Ya.

    “Maka na amawo M echiche nile nke Mụ n’eche n’ebe unu nọ, ka Onyenwe anyị kwuru, echiche nke udo, ma abụghị nke ihe ọjọọ. …

    “Ma unu ga-achọ m, ma chọta m, mgbe unu ga-eji obi unu niile chọọ m” (Jeremaya 29:11,13).

    “Ụbọchị ahụ ga-abịa mgbe unu ga-aghọta ọbụna Chineke, ebe a ga-akpọlite unu n’ime ya ma site na ya.

    “Ma mgbe ahụ ka unu ga-amata na unu ahụla m, na M bụ” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:49–50).

    “Mkpụrụ-obi ọbụla nke hapụrụ mmehie ya nile ma bịakwute m, ma na-akpọku aha m, ma na-erube isi n’olu m, ma na-edebe kwa iwu-nsọ m nile, ga-ahụ iru m ma mata na a bụ m.” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 93:1).

  10. Moronaị 7:48. Pọl jikọtakwara afọ ọma na ikike anyị ịhụ ụzọ nke ọma. Na ngwụcha nke nnukwu okwuchukwu ya gbasara afọ ọma, ọ na-ede na ọ bụ ezie na “ugbu a anyị na-ele anya site na enyo,ọchịchịrị,anyị ga-emecha hụ “ihu na ihu: … mgbe ahụ ka m ga-ama ọbụna dịka amakwara m” (1 Ndị Kọrịnt 13:12).

  11. Jeffrey R. Holland, “Echi na-abịa abịa Onyenwe anyị Ga-eme Ihe Dị Ebube N’etiti Unu,” Liahona, Me 2016, 127. “Nkọwa kachaa nke ’ịhụnaanya dị ọcha nke Kraịst’ … abụghị ihe anyị dịka ndị na-eso ụzọ Kraịst na-eme kama anyị anaghị emeta ndị ọzọ ka Kraịst siri meso anyị. Ezi afọ ọma ka amarala naanị otu ugboro. A na-egosi ya nke ọma na n’ezigbo ịhụnaanya nke Kraịst na-adịghị ada ada, nke ikpeazụ, na nke mgbaghara mmehie n’ebe anyị nọ, na” (Jeffrey R. Holland, Kraịst na Ọgbụgba ndụ Ọhụrụ ahụ: Ozi Mesaịa ahụ nke Akwụkwọ nke Mọmọn [1997], 336).

  12. Luk 14:18, King James vashiọn Ọhụrụ.

  13. Lee Matiu 8:3; 9:25.

  14. Lee Matiu 14:13-21

  15. Lee Matiu 8:1–3

  16. Lee Jọn 4:7–10; O toro onye Sameria ahụ (lee Luk 10:25–37).

  17. Lee Matiu 21:31; Luk 7:27–50; 15:1-10; Jọn 8:2–12.

  18. Lee Matiu 8:5–13.

  19. Russell M. Nelson, “Kraịst Ebilitewo; Okwukwe na Ya Ga-eme Ugwu Anọgharịa,” LiahonaMee 2021, 103.

  20. Jeffrey R. Holland, “The Grandeur of God,” Liahona, Nov. 2003, 70. “Onye huworo m a huwo Nna ahụ” (Jọn 14:9).

  21. 2 Ndị Kọrịnt 1:3.

  22. Lee Abụ ọma 27:8; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:68.

  23. Lee 2 Ndi Kọrịnt 4:6.; Pope Francis, “Misericordiae Vultus: Bull of Indiction of the Extraordinary Jubilee of Mercy,” Apostolic Letters, vatican.va.

  24. Nke a bụ isiokwu dị mkpa. Ọbụghị naanị ọrụ ahụ nke nzọpụta na mbuli elu kama ọrụ Ya (lee Akwụkwọ Ntụziaka Nzugbe: Ije ozi n’ime Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazu a, 1.2, Ọba Akwụkwọ Ozi ọma). A na m aga tempụl na nkiti kama na ụlọ nke Onyenwe anyị; ọ bụghị Nzukọ nsọ Mọmọn kama Nzukọ nsọ ahụ nke Jizọs Kraịst (lee Russell M. Nelson, “Ezigbo aha nke Nzukọ nsọ ahụ,” Liahona, Nov. 2018, 87-89). Ndị ndu anyị na-atụ Ya aka ma na-echetara anyị ma na “onweghị ihe enweghị isi a na-akpọ ‘Aja mgbaghara mmehie ahụ’ nke anyị nwere ike dabere maka enyemaka, ọgwụgwọ, mgbaghara, ma ọbụ ike. Jizọs Kraịst bụ isi iyi” (Russell M. Nelson, “Ịdọbata Ike nke Jizọs Kraịst nime Ndụ anyị,” Liahona, Mee 2017, 40).

  25. “Ụzọ ọgbụgba ndụ ahụ bụ ihe niile gbasara mmekọrịta anyị na Chineke”; ọ bụ “ụzọ nke ịhụnaanya— … iji ọmịko na-elekọta ma na-enyere ibe anyị aka” (Russell M. Nelson, “Ọgbụgba ndụ Ebighị ebi,” Liahona, Oct. 2022, 11).

    Lee David A. Bednar, “The Blessed and Happy State” (address given at the seminar for new mission leaders, June 24, 2022);Scott Taylor, “Elder Bednar Shares 7Lessons on ‘the Blessed and Happy State’ of Obedience,” Church News, June 27, 2022, thechurchnews.com.

    “Ịbanye nime ọgbụgba ndụ na ịnata emume nsọ niile nke ọkwa nchụaja n’itozu oke na-ekekọta anyị na Onyenwe anyị na Nna nke Eluigwe. Nke a pụtara naanị na anyị tụkwasịrị Onye Nzọpụta obi dịka Onye nkwuchite na Onye ogbugbo anyị ma dabere na uru, ebere, na amara Ya n’oge njem nke ndụ. …

    “Ibi ndụ na ịhụ ihe omume niile nke ọgbụgba ndụ naanya na-ewulite njikọta anyị na Onyenwe anyị nke dị nke onwe ma sie ike na ime mmụọ. … Jizọs mgbe ahụ ga-aghọ ihe karịrị onye bụ isi n’akụkọ niile akwụkwọ nsọ; ihe nlereanya na nkuzi Ya niile na-emetụta ọchịchọ, echiche, na omume anyị niile” (David A. Bednar, “Kama Anyị Egeghị Ha Ntị,” Liahona, Mee 2022, 15).

    Lee kwa D. Todd Christofferson, “Mmekọrịta Anyị na Chineke,” Liahona, Mee 2022, 78–80.

  26. “Ma n’enweghi emume-nsọ niile si na ya, na ikike ahụ nke ọkwa nchụ-aja, ike ahụ nke ndụ-iyi-Chineke agaghị apụta ìhè nye mmadụ n’anụ arụ;

    “N’ihi n’enweghi nke a o nweghị onye pụrụ ịhụ iru nke Chineke, ọbụna Nna, ma dị ndụ” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:21–22).

  27. Patricia Holland, “Ọdịnihu Jupụtara na Olile anya” (worldwide devotional for young adults, Jan. 8, 2023), Ọba akwụkwọ nke Ozi-ọma:

    “You don’t have to run around chasing after [the hope that He will help you]; you don’t and you can’t manufacture it. Dị ka nke ukwuu n’ogbe amara, ị gaghị enweta ya site na ịdabere nike nke gị ma ọbụ nke onye ọzọ. E nweghị usoro nzuzo ma ọbụ mantra magic o mmetụtara. …

    “N’ezie, akụkụ anyị na-egwu dị mkpa mana n’ezie dị ntakịrị; Chineke nwere ikike ka ukwuu nke ọrụ ahụ. Oke nke anyị bụ ịbịakwute Ya n’ịdị umeala na ịdị mfe; mgbe ahụ anyị ekwesịghị ichegbu onwe anyị ma ghara ịtụ egwu.”

  28. Mosaia 5:13; lee kwa Jọn 17:3.

  29. Onyeisi Nelson gwara anyị ọtụtụ oge ka “anyị gbassa gburugburu ịhụnaanya anyị iji nabata ezinaụlọ mmadụ dum” (“Ngozi ga-adịrị Ndị na-eme Udo,” Liahona, Nov. 2002, 41). Na Mee 2022 ọ kwara ndi otorobịa na “akara akara nwere ike iduga ikpe ikpe na iro. Mmetọ ọbụla ma ọ bụ ịkpa oke ọbụla na-ebe onye ọzọ nọ niihi mba o siri bịa, agbụrụ, ọzụzụ banyere mmasị ahụ nwoke na nke nwanyị, okike ọmụmụ, digrii ole agụtara n’akwụkwọ, omenaala, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ pụtara ihe eji ama mmadụ bụ arụ n’ebe Onye kere anyị nọ” (“Nhọrọ niile maka Ebighị ebi” [worldwide devotional for young adults, May 15, 2022], Ọba Akwụkwọ nke Ozi ọma). Ma nke dị mkpa, ọ sịrị: “Ọ n’ewute m na ụmụnne anyị ndị nwoke na ndị nwanyị Ojii gburugburu ụwa na-atachị obi nke mgbu sitere n’ịkpa ókè ọjọọ na obi ọjọọ. Taa a na m akpọku ndị otu anyị ebe niile ibute ụzọ n’ịhapụ akparam agwa na omume ndị nke obi ọjọọ. A na m arịọ ka unu bulie elu nsọpụrụ maka ụmụ niile nke Chineke” (“Ka Chineke Merie,” Liahona, Nov.2020, 94).

    “Obi ọjọọ adabaghị na okwu nke Chineke. Ihu ọma ma ọbụ enweghị ihu ọma na Chineke dabeere na nkwesi gị ike na Ya na iwu nsọ Ya niile, n’abụghị na ụcha ahụ gị ma ọbụ agwa ndị ọzọ.

    “… Nke a gunyere obi ọjọọ dabere na agbụrụ, ebe isi, genda, afọ, mmerụ ahụ, ịnwe ụba, nkwenye okpere ma ọbụ ekweghị, na ọzụzụ banyere mmasị ahụ nwoke na nke nwanyị” (Akwụkwọ Ntụziaka Izugbe, 38.6.14, Ọba akwụkwọ Ozi ọma).

  30. Lee 1 Nifaị 11:25.

  31. Onye Mgbapụta nke Israel,” Abụ, no. 6.

  32. Lee Ndị Rom 9:23.