Ọgbakọ Zuru ọha
Ichekwa Olu nke Ọgbụgba ndụ ndị Mmadụ nime Ọgbọ na Ebili
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2023


Ichekwa Olu nke Ọgbụgba ndụ ndị Mmadụ nime Ọgbọ na Ebili

Otu nime ọrụ anyị kacha dị nsọ bụ inyere ụmụ anyị aka ịmata nke ọma na Jizọs bụ Kraịst ahụ.

Otu ihe kachasị n’ihe niile mere e depụtara nime Akwụkwọ nke Mọmọn bụ ije ozi nke Onye nzọpụta bilitere n’ọnwụ jere nye ndị mmadụ na tempụl nime ala Bountiful. Mgbe otu ụbọchị nke ikuzi ihe, ịgwọọ ọrịa, na iwulite okwukwe gafere, Jizọs dọọrọ uche ndị mmadụ gaa n’ọgbọ na-ebilite: “O nyere iwu ka a kpọta ụmụ-ntakịrị ha.”1 O kpeere ha ekpere ma gọzie ha n’otu n’otu. Nhụmihe ahụ dị nnọọ okee mkpa nke mere na Onye Nzọpụta n’onwe Ya kwara akwa ọtụtụ ugboro.

Mgbe ahụ, ka ọ na-agwa igwe mmadụ ahụ okwu, Jizọs sịrị:

“Lee ụmụ ntakiri unu.

“Ma dịka ha lere anya … ha hụrụ elu-igwe nile ka o meghere, ma ha hụrụ ndị mmụọ ozi na-arịdata site n’eluigwe,” na-ejere ụmụ ha ozi.2

M na-echekarị banyere ahụmihe a. Ọ ga-abụrịrị na ọ gbazere obi onye ọbụla! Ha hụrụ Onye-nzọpụta ahụ. Ha metụrụ Ya aka. Ha maara Ya. Ọ kụziri ha ihe. Ọ gọziri ha. Ma Ọ hụrụ ha n’anya. Ọ bụghị ihe ijuanya na mgbe ihe omume a dị nsọ gasịrị, ụmụaka ndị a tolitere iji nye aka guzobe ọha mmadụ nke udo, ọganihu, na ịhụnanya yiri nke Kraịst nke dịgidere ruo ọgbọ niile. 3

Ọ gaghị abụ ihe magburu onwe ya ma ọbụrụ na ụmụ anyị nwere ike ịnweta nhụmihe niile dị otu a ha na Jizọs Kraịst—ihe ga-ekekọta obi ha niile n’ebe Ọ nọ! Ọ na-akpọ anyị oku, dịka ọ kpọrọ ndị nne na nna ahụ nime Akwụkwọ nke Mọmọn, ka anyị kpọtara Ya ụmụntakịrị anyị. Anyị nwere ike nyere ha aka ịmata Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta ha otu ụmụntakịrị a siri mee. Anyị nwere ike igosi ha otu ha ga-esi chọta Onye Nzọpụta ahụ nime akwụkwọ nsọ niile ma wuo ntọala ha na Ya.4

Na nso nso a, otu ezigbo enyi m kuziri m ihe m na-ahụtụbeghị mbụ banyere ilu nwoke amamihe ahụ onye wuru ụlọ ya n’elu nkume. Dịka akụkọ dị na Luk si kwuo, ka onye amamihe ahụ tọrọ ntọala ụlọ ya, ọ “gwumiri egwumi.”5 Ọ bụghị mgbalị dị nkịtị ma ọ bụ nke dị mfe—o were mgbalị!

Iji wuo ndụ anyị niile n’elu Nkume nke Onye Mgbapụta anyị, Jizọs Kraịst, anyị kwesịrị igwumi egwumi. Anyị na-ewepụ ihe ọbụla bụ ajaaja ma ọbụ nke karịrị akarị n’enweghi isi na ndụ anyị. Anyị na-egwugide ime ime ruo mgbe anyị chọtara Ya. Ma anyị na-akụziri ụmụ anyị ka ha kekọta onwe ha n’ebe Ọ nọ site na emume nsọ na ọgbụgba ndụ niile dị nsọ, ka mgbe oke mmiri ozuzo na ide mmiri na-emegide, dịka ha ga-eme, ha ga-enwe mmetụta dị nta n’ahụ ha “nihi nkume ahụ n’elu nke e wuru [ha].”6

Ụdị ike a anaghị eme naanị ya. Anaghị enyefe ya n’ọgbọ na-abịa dị ka ihe nketa nke mmụọ. Onya ọbụla ga-egwu ala miri emi iji chọta oke nkume ahụ.

Anyị na-amụta ihe mmụta a site na nkọwapụta ọzọ n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn. Mgbe Eze Benjamin gwara ndị ya okwu ya, ha zukọtara dị ka ezinaụlọ niile ka ha nụ okwu ya niile.7 Eze Benjamin gbara ama dị ike banyere Jizọs Kraịst, ma ịgba-ama ya metụtara ndị mmadụ nke ukwuu. Ha mara ọkwa:

“Mmụọ ahụ … ewetara nnukwu mgbanwe nime anyị, ma ọbụ nime obi anyị niile. …

“Ma anyị dị na njikere ịba nime ọgbụgba ndụ anyị na Chineke anyị ime uche ya … ụbọchị niile nke fọdụrụ anyị.”8

Mmadụ nwere ike ịtụ anya na ụmụntakịrị nwere nne na nna nwere mgbanwe dị otu ahụ ga-emecha gbanwee ma mee ọgbụgba ndụ n’onwe ha. Ma n’agbanyeghị, n’ihi ihe ụfọdụ a na-ekwughị nime ndekọihe ahụ, ọgbụgba ndụ ndị nne na nna mere enwechaghị mmasị nime ụfọdụ ụmụ ha. Ka ọtụtụ afọ gachara, “e nwere ọtụtụ nke ọgbọ ndị na-etolite etolite ndị na-enweghị-ike ịghọta okwu nile nke eze Benjamịn, ebe ha bụ ụmụ-ntakịrị n’oge ọ gwara ndị ya okwu; ma ha ekweghị n’omenala nke ndị nna ha.

“Ha ekweghị ihe e kwuworo gbasara mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ ahụ, ọbụghị ma ha kwere gbasara ọbịbịa nke Kraịst. …

“Ma ha achọghị ime baptism; ọbụghị ma ha chọrọ isonye na nzukọ-nsọ ahụ. Ma ha bụ ndị nọ iche dị ka okwukwe ha”.9

Ụdị echiche n’emetụ n’obi! Maka ọgbọ na-etolite, o zughị maka okwukwe nime Jizọs Kraịst ịbụ “omenala nke ndị nna ha.” Ha kwesịrị inwe okwukwe nime Kraịst n’onwe ha. Dịka ndị ọgbụgba ndụ nke Chineke, olee otu anyị ga-esi kụnye nime obi ụmụ anyị ọchịchọ ime na idobe ọgbụgba ndụ niile anyị na Ya?

Anyị nwere ike bido site na isoro atụmatụ nke Nefi: “Anyị na-ekwu maka Kraịst, anyị na-an̄ụrị-ọn̄ụ n’ime Kraịst, anyị na-ekwusa maka Kraịst, anyị na-ebu amụma maka Kraịst, ma anyị na-ede dịka ibu amụma anyị nile siri dị, ka ụmụ anyị wee mata ebe ha ga-esi wee lee anya maka nsachapụ nke mmehie ha nile.”10 Okwu niile nke Nefi na-egosi mbọ, na-aga nihu ịkụziri ụmụ anyị gbasara Kraịst. Anyị nwere ike hụ na olu nke ndị ọgbụgba ndụ anaghị agbachi nkịtị na ntị nke ọgbọ na-etolite nakwa Jizọs abụghị nanị isiokwu Sọnde.11

Olu nke ndị ọgbụgba ndụ ka a na-achọta nime okwu niile nke ịgba akaebe anyị. A na-ahụ ya nime okwu niile nke ndị amụma dị ndụ. Ma echekwara ya nke ọma nime akwụkwọ nsọ niile. Ọ bụ n’ebe ahụ ka ụmụ anyị ga-amata Jizọs ma nweta aziza nye ajụjụ ha niile. Ọ bụ n’ebe ahụ ka ha ga-amụta n’onwe ha ozizi nke Kraịst. Ọ bụ n’ebe ahụ ka ha ga-achọta olile anya. Nke a ga-akwado ha maka ndụ nke ịchọ eziokwu na ibi ndụ n’ụzọ ọgbụgba ndụ ahụ.

A hụrụ m ndụmọdụ a Onyeisi Russell M. Nelson n’anya:

“Ebee ka anyị nwere ike ịga ịnụrụ Ya?

“Anyị nwere ike gaa na akwụkwọ nsọ niile. Ha na-akuzirị anyị banyere Jizọs Kraịst na oziọma Ya, ịdị ukwuu nke Aja mgbaghara mmehie Ya, na nnukwu atụmatụ nke ańụrị na mgbapụta nke Nna anyị. Imikpu onwe anyị kwa ụbọchị n’okwu nke Chineke dị oke mkpa maka ịdị ndụ ime mmụọ, kacha nke n’ime ụbọchi ndịa niile na-amụba n’ọgba aghara. Dịka anyị n’amụsike n’okwu nke Kraịst kwa ụbọchị, okwu niile nke Kraịst ga-agwa anyị otu esi ezute ihe isi ike niile anyị atụghị anya na anyị ga-emeli.”12

Yabụ kedu ihe ọ dị ka iri oriri n’okwu niile nke Kraịst ma wee nụ Ya? Ọ dị mma, ọ dị ka ihe ọ bụla ga-agara gị nke ọma! O nwere ike ịbụ na gị na ezinaụlọ na-ezukọ ka ị kparịta ụka gbasara ihe ndị Mmụọ Nsọ kuziri gị nime akwụkwọ nsọ gị site n’iji Bịa, Soro M. O nwere ike ịbụ na gị na ụmụ gị na-ezukọ kwa ụbọchị ịgụ amaokwu ole na ole dị na akwụkwọ nsọ ma na-achọ ohere niile iji kwurịta ihe unu mụtara ka unu na-anọkọ ọnụ. Naanị chọta ihe na-adabara gị na ezinaụlọ gị mgbe ahụ wee gbalịa ime ntakịrị mma karịa kwa ụbọchị.

Tụlee nghọta a sitere na Nkuzi n’Ụzọ nke Ọnye nzọpụta: “N’otu n’otu, otu nnọkọ mgbede n’ebe obibi, nnọkọ ọmụmụ akwụkwọ nsọ, ma ọbụ mkprịta ụka oziọma nwere ike ọ gaghị adị ka ọ na-arụ ọrụ nke ukwuu. Mana nchịkọta nke obere, mbọ niile dị mfe, nke a na-eme ugboro ugboro ka oge na-aga, nwere ike ịdị ike ma na-ewusi ike karịa oge nnukwu oge ma ọ bụ nkuzi dị ịrịba ama. … Ya mere adala mba, ma echegbula onwe gị banyere imezu ihe dị ebube mgbe ọbụla. Naanị kwụsie ike na mbọ gị niile.”13

Otu nime ọrụ anyị kacha dị nsọ bụ inyere ụmụ anyị aka ịmata nke ọma na Jizọs bụ Kraịst ahụ, Ọkpara nke Chineke dị ndụ, Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta nke onwe ha, onye na-eguzo n’isi Nzukọ nsọ Ya! Anyị enweghị ike ikwe ka olu ọgbụgba ndụ anyị dajụọ ma ọbụ gbachie nkịtị mgbe ọ gbasara Ya.

Ị nwere ike iche na izughị oke na ọrụ a, mana ịkwesịghị inwe mmetụta na ịnọ naanị gị. Dịka ọmụmatụ, ndị kansụl ngalaba ukwu ka enyere ikike ịhazi ọgbakọ kansụl ndị nkuzi maka ndị nne na nna. Na nzukọ nke otu ụzọ na ụzọ anọ ndị a, ndị nne na nna nwere ike ịgbakọta ka ha mụta ihe site na nhụmihe niile ibe ha, tụlee otu ha si n’agba ezinaụlọ ha niile ume, ma mụta ụkpụrụ niile bụ isi nke ozizi yiri nke Kraịst. Ekwesịrị inwe nzukọ a n’oge awa nke abụọ nke nzukọ nsọ.14 Ọ bụ onye otu ngalaba ukwu nke bishọp họpụtara na-edu ya ma na-agbaso usoro ọgbakọ kansụl ndị nkuzi oge niile, na-eji Nkuzi n’Ụzọ nke Ọnye nzọpụta dịka isi ihe akụrụngwa.15 Ndị bishọp, ọ bụrụ na ngalaba ukwu gị anaghị enwe nzukọ kansụl ndị nkuzi maka ndị nne na nna, soro onyeisi Ụlọ akwụkwọ Sọnde gị na kansụl ngalaba ukwu rụọ ọrụ ịhazi onwe unu.16

Ndị enyi m nime Kraịst, unu na-eme nke ọma karịa ka unu chere. Naanị na-arụ ọrụ dị na ya. Ụmụ unu na-ekiri anya, na-ege ntị ma na-amụta ihe. Dịka ị na-akuziri ha, ị ga-abịa mara ezi ọdịdị ha dịka ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị Chineke hụrụ n’anya. Ha nwere ike chefuo Onye Nzọpụta ruo otu oge, mana a na m ekwe unu nkwa na Ọ gaghị echefu ha ma ọlị! Oge ndị ahụ mgbe Mmụọ Nsọ na-agwa ha okwu ga-adịgide nime obi na n’uche ha. Ma otu ụbọchị ụmụ unu ga-ekwughachi ọgbụgba ama nke Ịnos: A matara m na nne na nna m bụ ziri-ezi, “n’ihi na [ha] kụziri m … na nzulite na ịdọ aka na ntị nke Onyenwe anyị—ma ngọzi na-adịrị aha nke Chineke m maka ya.”17

Ka anyị nabata ọkpụkpọ oku nke Onye Nzọpụta ma kpọtara Ya ụmụ anyị. Dịka anyị na-eme nke a, ha ga-ahụ Ya. Ha ga-emetụ Ya aka. Ha ga-amara Ya. Ọ ga-akuziri ha ihe. Ọ ga-agọzi ha. Ma, oh, otu Ọ ga esi hụ ha n’anya. Ma, oh, otu M si hụ ha n’anya. ,N’aha nsọ Ya, Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. 3 Nefi 10:18.

  2. 3 Nifaị 17:23-24; lee kwa 3 Nifaị 17:11-22.

  3. Lee 4 Nifaị 1:1–22.

  4. Lee Luk 6:47–49; Hilaman 5:12

  5. Luk 6:48.

  6. HIlaman 5:12.

  7. Lee Mosaịa 2-5.

  8. Mozaya 5:2, 5. Mata na “enweghị otu mkpụrụ-obi, e wezuga ụmụ-ntakịrị, bụ ndị banyeworo n’ime ọgbụgba-ndụ ma bukwasịwo onwe ha aha nke Kraịst” (Mosiah 6:2).

  9. Mozaya 26:1– 2, 4.

  10. 2 Nifaị 25:26.

  11. “E nwere ọtụtụ ihe a ga-akuzi gbasara ozi ọma nke Jizọs Kraịst eweghchitere—ụkpụrụ niile, iwu nsọ niile, amụma niile, na akụkọ niile akwụkwọ nsọ. Kama ndị a niile bụ alaka nke otu osisi, nihi na ha niile nwere otu nzube: iji nyere mmadụ aka ịbịakwute Kraịst ma bụrụ ndị e mereka ha zuo oke nime Ya (lee Jarọm 1:11; Moronaị 10:32). Ya mere nagbanyeghị ihe ị na-akụzi, cheta na ị na-akụzi na ezie banyere Jizọs Kraịst na otu ị ga-esi eme ka Ya” (Nkuzi n’Ụzọ nke Ọnye nzọpụta: Maka ndị niile na-akuzi nime Ebe-obibi na nime Nzukọ nsọ [2022], 6).

  12. Russell M. Nelson,“Nụrụ Ya,” LiahonaMee 2020, 89.

  13. Nkuzi ihe n’Ụzọ nke Ọnye nzọpụta, 31.

  14. Enwere ike ịme ebe obibi pụrụ iche maka ndị nne na nna na-akụzi na Praịmarị, dị ka nzukọ nime nkeji 20 nke oge abụ ma ọbụ inwe nzukọ dị iche noge ọzọ (lee Akwụkwọ Ntụziaka Izube: Ije ozi nime Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a, 17.4, Ọba akwụkwọ nke Ozi-ọma ).

  15. Ndị otu na ndị ndu nwere ike ịtụ Ịkuzi ikuzi ihe n’Ụzọ nke Ọnye nzọpụta site na Ebe Nkesa niile. Ọ nọ kwa na digital nime Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

  16. Lee General Handbook, 13.5.

  17. Ịnọs 1:1. Cheta na n’etiti ọgbọ na-etolite nke ndị na- ekweghị ekwe nime Akwụkwọ nke Mọmọn bụ Alma nke nta na ụmụ nwoke nke Mosaia. Mgbe Alma nke nta mechara mata na ọ dị ya mkpa ịgbanwe ndụ ya, o chetara ihe nna ya kuziri gbasara Jizọs Kraịst—nkuzi niile nke Alma leghara anya n’oge ga aga. Mana ncheta ya ka dị,ma ncheta ahụ zọpụtara Alma nime mmụọ (lee Alma 36:17–20.).