Ọgbakọ Zuru ọha
Ije ije na Mmekọrịta Ọgbụgba ndụ anyị na Kraịst
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2023


Ije ije na Mmekọrịta Ọgbụgba ndụ anyị na Kraịst

Onye ahụ nke emerụrụ ahụ ma gbajie niihi anyị ga-ekwe ka ndụ a pụrụ ịnwụ anwụ rụọ ọrụ ya niime anyị, mana Ọ naghị asị anyị zute ihe aka mgba ndị ahụ naanị n’onwe anyị.

E dubatara m n’ụzọ kacha ọhụrụ na Izrel site n’aka ezi enyi m Ilan. “A na-akpọ ya Nzọ Ụkwụ Jizọs ahụ,” ka ọ sịrị, “niihi na ọ bụ ụzọ ahụ sitere na Nazareth ruo na Capernaum nke ọtụtụ ndị kwere na Jizọs jere.” Ekpebiri m ebe ahụ ozugbo na m chọrọ ije ije na nzọ ụkwụ ahụ, ya mere amalitere m ịtụ atụmatụ imega njem na Izrel.

Izu ụka isii tupu njem ahụ, agbajiri m nkwonkwo ụkwụ m. Di m nwere nchekasị ahụ gbasara mmerụ ahụ ahụ; ihe kachasị ewute m bụụrụ otu m ga-esi aga ije “nzọ ụkwụ Jizọs ahụ” mgbe otu ọnwa gasịrị. Abụ m ekwe ekwe na ọdịdị m, ya mere akagbughị m tiketị ụgbọelu ahụ.

Echetara m izute onye ndu Izrel anyị n’ọmarịcha ụtụtụ Jun ahụ. A wụdatara m site na van ahụ ma mesịa dọpụta krọchis abụọ na otu skuta ikpere. Mya, onye ndu anyị, lere anya na ihe nkedo ụkwụ m ma sị, “Ewo, echeghị m na ị nwere ike ịga ije na nzọ ụkwụ nke a n’ọnọdụ dị otu ahụ.”

Azara m , “Enwere ike mba.” “Mana enweghị ihe gbochiri m site na-ịgbalị.” O kwere n’isi obere, ma anyị amalite. A hụrụ m ya naanya niihi nke ahụ, maka ikwere na m nwere ike ije ije na nzọ ụkwụ ahụ na mgbaji ukwu.

A gagharịrị m n’ụzọ mkpọda ahụ na nnukwu nkume nwa oge n’onwe m. Emesịa, na mmetụta site n’ezi mkpebi m, Mya mịpụtara eriri dị ngịrịgị, kedo ya n’ebe njide aka nke skuta m, ma malite ịdọ ya. Ọ dọgotara m n’elu ugwu nta ahụ, site n’ebe a kụrụ kịrịkịrị oroma, na n’ala dị n’akụkụ abụọ nke Oke Osimiri nke Galili. Na ngwụcha nke njem ahụ, e kwupụtara m afọ ojuju m maka ezigbo onye ndu m, onye nyeere m aka mezuo ihe nke m na-agaraghị enwe ike emezu n’onwe m.

Mgbe Onyenwe anyị kpọkuru Enọk ịgagharị n’ala ahụ ma gbaa ama banyere Ya, Enọk akaghị obi.1 Ọ bụụrụ nnọọ nwata ntakịrị, na-anaghị ekwusi okwu ike. Olee otu ọ ga-esi gaa ije n’ụzọ ahụ n’ọnọdụ ya? Ọ dara mba niihi adịghị ike ya. Ọsịsa nke Onyenwe anyị nye ihe dọlara ya azụ dịịrị mfe ma ozugbo ozugbo: “Soro m gaa ije.”2 Dị ka Enọk, anyị ahaghị icheta na Onye ahụ nke emerụrụ ahụ ma gbajie niihi anyị3 ga-ekwe ka ndụ a pụrụ ịnwụ anwụ rụọ ọrụ ya niime anyị, mana Ọ naghị asị anyị zute ihe aka mgba ndị ahụ naanị n’onwe anyị.4 Na-agbanyeghị otu akụkọ anyị si dị arọ, ma ọ bụ usoro nke ụzọ anyị dị ugbua, Ọ ga-akpọku anyị i soro Ya jee ije.5

Chee echiche maka nwata nwoke ahụ nọ na nsogbu onye nke zutere Onyenwe anyị n’ebe alaịkpa. Jekọb ejewo ije ebe tere anya site n’ebe obibi. Niime abali ahụ itiri gbara, ọ rọrọ nrọ nke na-abụghị naanị na o nwere ubube mana nwekwara nkwa ọgbụgba ndụ ndị bara uru, gụnyekwara ihe ọ ga-amasị m ịkpọ nkwa mkpịsịrị aka ise.6 N’abalị ahụ, Onyenwe anyị guzooro n’akụkụ Jekọb, kọwaa Onwe Ya dị ka Chineke nke nna Jekọb, ma mesịa kwe nkwa:

  • A nọnyeere m gị.

  • Aga m echekwa gị.

  • Aga m akpọlata gị n’ebe obibi ọzọ.

  • Agaghị m ahapụ gị

  • Aga m edobe nkwa m kwere gị.7

Jekọb nwekwara nhọrọ ime. O nwere ike ịhọrọ ibi ndụ ya site naanị ịmara Chineke nke nna ya, ma ọ bụ O nwere ike họrọ ibi ndụ na mmekọrịta ọgbụgba ndụ ekpebiworo ya na Ya. Ka ọtụtụ afọ gasịrị Jekọb gbara ama banyere ndụ ebiri niime nkwa ọgbụgba ndụ niile nke Onyenwe anyị: “Chineke … zara m n’ụbọchị nke nnukwu nsogbu m, ma nọnyeere m n’ụzọ ahụ nke m gara.”8 Dị nnọọ dị ka O meere Jekọb, Onyenwe anyị ga-aza onye ọbụla niime anyị n’ụbọchị nke nnukwu nsogbu anyị ma ọ bụrụ ma anyị họrọ itikọta ndụ anyị na Ya. O kwewo nkwa ije ije anyị na ya n’ụzọ ahụ.

Anyị na-akpọ ije ije nke a ụzọ ọgbụgba ndụ ahụ—ụzọ nke na-ebido site na ọgbụgba ndụ nke baptizim ma duba na ọgbụgba ndụ ndị kacha mie emie anyị nwere ike ime na tempụl. Ikekwe ị na-anụ mkpụrụ okwu ndị ahụ ma chee echiche banyere checkboxes. Elemanya ihe niile ị na-ahụ bụ ụzọ nke ihe ndị a chọrọ. Anya eleruru nke ọma kpughere ihe na-adị mmanye karịa. Ọgbụgba ndụ abụghị naanị ihe gbasara nkwekọrịta, na-agbanyeghị nke ahụ dị mkpa. Ọ bụ ihe gbasara mmekọrịta. Onyeisi Russell M. Nelson kuziri, “Ụzọ ọgbụgba ndụ bụ ihe niile gbasara mmekọrịta anyị na Chineke.”9

Tụlee uche banyere ọgbụgba ndụ alụm di na nwunye. Ụbọchị agbam akwụkwọ dị mkpa, mana mmekọrịta e mere site na ndụ ebikọtara ọnụ ma emesịa dịkwa mkpa. Otu ihe ahụ bụkwa eziokwu na mmekọrịta ọgbụgba ndụ anyị na Chineke. Ehiwego ọnọdụ niile, ma aga enwe ihe ndị a tụrụ anya ha n’ụzọ ahụ. Ma otu ọ dị Ọ na-akpọku onye ọbụla niime anyị ka anyị bịa dị ka anyị nwere ike, jiri ebumnoobi zuru oke, ma “na-aganiihu”10 ebe Ọ nọ n’akụkụ anyị, na-atụkwasị obi na ngọzi ndị O kwere na nkwa ga-abịa. Akwụkwọ nsọ na-echetara anyị na ọtụtụ mgbe ngọzi ndị ahụ na-abịa n’oge nke Ya onwe Ya: afọ 38,11 afọ 12,12 ozugbo ozugbo.13 Dị ka nzọ ụkwụ ahụ ga-achọ, otu ahụ ka enyem aka Ya ga-adị.14

Ọ bụ ozi nke mbuda onwe onye ala. Jizọs Kraịst ga-ezute anyị ebe anyị nọ dị ka anyị dị. Nke a bụ gịnị nke ubi nta ahụ, obe ahụ, na ili ahụ. Ezitere Onye Nzọpụta iji nyere anyị aka nwee mmeri.15 Mana ị nọrọ ebe anyị nọ agaghị ewete nnapụta ahụ anyị na-achọ. Dị nnọọ dị ka na Ọ hapụghị Jekọb ebe ahụ niime unyi, Onyenwe anyị ebughị n’obi ịhapụ onye ọbụla niime anyị n’ebe anyị nọ.

Ọ bụkwa ije ozi nke nrịgoro n’elu. Ọ ga-eje ije niime anyị16 ibuli anyị elu ruo ebe Ọ nọ ma, n’usoro ahụ nyere anyị aka ịdị dị ka Ọ dị. Jizọs Kraịst bịara ibuli anyị elu.17 Ọ chọrọ inyere anyị aka ghọọ dị ka. Nke a bụ gịnị nke tempụl ahụ.

Anyị ahaghị icheta, ọ bụghị naanị ụzọ ahụ nke ga-ebuli anyị elu, ọ bụ onye nsiso ahụ––Onye Nzọpụta anyị. Ma nke a bụ gịnị nke mmekọrịta ọgbụgba ndụ.

Mgbe m nọọrọ na Izrel, a gara m leta Western Wall ahụ. N’ebe ndị Juu nọ, nke a bụ ebe kachasị nsọ na Izrel. Ọ bụ naanị ihe fọdụrụ na tempụl ha. Ọtụtụ niime ha na-eyi uwe ha ndị kachasị mma mgbe ha na-aga nleta ebe nke a dị nsọ; nhọrọ nke uwe ha bụ ọdịmara nke nnukwu ịhụnaanya ha nye mmekọrịta ha na Chineke. Ha na-aga eleta mgbidi ahụ ije gụọ akwụkwọ nsọ, ife ofufe, na ịwụpụta ekpere ha. Arịrịọ maka tempụl ịdị n’etiti ha na-ewe oge ha ụbọchị niile, ekpere ha niile, nnukwu agụụ nke a maka otu ụlọ ọgbụgba ndụ. Nnukwu ịhụnaanya ha na-amasị m.

Mgbe m lọtara n’ebe obibi site na Izrel, egeziri m ntị nke ọma na nkata niile dị na gburugburu m gbasara ọgbụgba ndụ niile. A hụtara m ka ndị mmadụ na-ajụ, Gịnị mere m ji eje ije n’ụzọ ọgbụgba ndụ? Ọ bụ na m ga-abanye niime otu ụlọ maka ime ọgbụgba ndụ niile? Gịnị mere m ji eyi gament dị nsọ? Aga m etinye ndụ niime mmekọrịta ọgbụgba ndụ mụ na Onyenwe anyị? Azịza nye ajụjụ ndị a dị mma ma dị mkpa bụ ihe dị mfe: Ọ dabeere n’otu ogo nke mmekọrịta ị chọrọ inweta n’ebe Jizọs Kraịst nọ.18 Onye ọbụla niime anyị ga-enwe ike ịchọpụta azịza nke onwe anyị nye ajụjụ nke onwe ndị ahụ miri emi.

Nke a bụ nke m: Ana m eje ije n’ụzọ nke a dị ka nwaada nne na nna nke eluigwe “hụrụ naanya,”19 n’ụzọ dị nsọ a maara20 ma n’ụzọ dị omimi atụkwasịrị obi.21 Dị ka nwa nke ọgbụgba ndụ, etozuru m oke ịnata ngọzi niile ekwere na nkwa22 Mụ onwe m a họrọwo23 ije ije mụ na Onyenwe anyị. A kpọwo m oku24 iguzoro dị ka onye aka ebe nke Kraịst. Mgbe ụzọ ahụ dịrị ka ọ na-anyịgbu m, ana m enweta mgbam ume25 ya na amara na-enye ike. Oge ọbụla m kufere ọnụ ụzọ nke ụlọ Ya, ana m enweta nhụmiihe mmekọrịta ọgbụgba ndụ mụ na Ya dị omimi karịa. A sachawo m26 site na Mmụọ Ya, enyefeworo27 ike Ya, ma dopụ iche28 iwu alaeze Ya. Site n’usoro nke nchegharị kwa ụbọchị na iri oriri nsọ izu ụka niile, ana m amụta ịghọ onye kwụsiri ike29 ma na-agagharị eme ihe ọma.30 Ana m eso Jizọs Kraịst eje ije n’ụzọ nke a, na-atụanya nye ụbọchị ahụ e kwere na nkwa mgbe Ọ ga-abịa ọzọ. Mgbe ahụ a ga-arachi m ịbụ nke Ya31 ma bulie m elu dị ka nwaada nke Chineke dị nsọ32.

Nke a bụ ihe mere m ji eje ije n’ụzọ ọgbụgba ndụ.

Ọ bụ nke a mere m jiri jigidesie aka ike na nkwa ọgbụgba ndụ niile.

Ọ bụ ya mere m jiri banye n’ụlọ ọgbụgba ndụ Ya.

Ọ bụ ya mere m ji na-eyi garment dị nsọ dị ka ihe ncheta mgbe niile.

Niihi na m chọrọ ibi ndụ nwere mkpebi niime mmekọrịta ọgbụgba ndụ mụ na Ya.

Ikekwe ị na-emekwa. Bido site n’ebe ị nọ.33 Ekwela ka ọnọdụ gị gbochie gị. Cheta, nzọ ụkwụ ma ọ bụ idota n’ụzọ ahụ adịchaghị mkpa dị ka ọganiihu.34 Rịọ onye ịtụkwasịrị obi, onye nke nọ n’ụzọ ọgbụgba ndụ, idubata gị nye Onye Nzọpụta ha na-abịawo mata. Mụtakwuo ihe banyere Ya. Tinye oge na mmekọrịta ahụ site na-ịbanye niime ọgbụgba ndụ gị na Ya. O nweghị ihe afọ ole ịgbara ma ọ bụ ọnọdụ gị mere. I nwere ike i so Ya jee ije.

Mgbe anyị gasịrị ije Nzọ ụkwụ Jizọs ahụ, Mya ewereghị eriri ya ọzọ. Ọ hapụrụ ya ebe ekedoro ya na skuta m. N’ụbọchị ole ma ole ndị ọzọ sotere, ụmụ nwanne m ndị nwoke na-eto okoroọbịa na ndị enyi ha n’otu n’otu pụgharịrị m n’okporo ama niile nke Jerusalem.35 Ha hụrụ na onweghị akụkọ niile banyere Jizọs nke gafere m. E chetaara m maka ike nke ndudugandu na-eto eto. Anyị nwere ike ịmụta ihe site n’aka gị. I nwere ọchịchọ ziri ezi ịma onye ndu ahụ, Jizọs Kraịst. Ị tụkwasịrị obi na ume nke eriri ahụ na-ekedo anyị na Ya. I nwere onyinye i duru ndị ọzọ nye Ya.36

Chineke emeela, anyị gakọtara ụzọ nke a ọnụ, na-arịọ maka mgbam ume nụzọ ahụ.37 Mgbe anyị na-akọkarịta nhụmiihe nke onwe anyị anyị na Kraist, anyị ga-eme ka nnukwu ugwu nke onwe onye sie ike. Nke a ka m na-agba ama ya n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. Ndị nke Enọk akpafuworịị, ha agọnarịwo Kraịst, ma ha “chọrọ ndụmọdụ nke onwe ha niime itiri” (lee Moses 6:27–28). N’oge mgbe na ọ dapụwo n’okwukwe na ndị mmadụ, Enọk chigharịrị n’ebe Onyenwe anyị nọ maka nduzi. Oku nke a akpọrọ Enọk bụkwa otu oku nke Onyenwe anyị na-akpọ anyị niile: “Soro m jee ije” (Moses 6:34; leekwa Matiu 11:28). Mana elemanya, dị ka Enọk, ịmachaghị ma ị ga-enwe ike jee ije n’ụzọ nke a n’ọnọdụ gị. Ikekwe, i chere na inwere ihe mgbochi n’ụzọ dị ańaa. Ikekwe, isi ihe kpatara anyị ji chọọ ije ije n’ụzọ ọgbụgba ndụ bụ niihi ọnọdụ anyị, niihi na anyị nwere mgbochi n’ụzọ dị ańaa ma anyị nwere mkpa enyemaka Ya.

  2. Lee Moses 6:23–34

  3. Lee “Jizọs nke Nazareth, Onye Nzopụta na Eze,” Abụ, no. 181.

  4. Lee Ita 12:27

  5. Lee Matiu 11:28-30

  6. Ụmụ m ndị nwanyị chọrọ ịtakanyere ụmụ ha (ụmụ ụmụ m) nkwa mkpịsị aka ise nke a ụtụtụ niile—ihe ncheta banyere Nna nke Eluigwe onye maara nụzọ dị nsọ nke ọbụla n’ụmụ Ya.

  7. Lee Genesis 28:10–22 Ọgbụgba ndụ nke Abraham bụkwa rịị nkwusi ike pụtara ihe nke abalị ahụ. Mmewere nke ọgbụgba ndụ nke Abraham ndị a na-arụ nke bụ isi ọrụ niime ndụ anyị na niime ozi ọma nke Jizọs Kraịst: 1. nkwa nke ihe nketa dị ebighị (amaokwu 13); (2) ụmụ ụmụ dị ebighị ebi (amaokwu 14); na (3) ngọzi na oke na ọrụ ịgọzi mba niile nke ụwa (amaokwu 14).

  8. Genesis 35:3; nkwusi ike agbakwunyere. Nne na nna Jekọb gwara ya ka o si nebe obibi pụọ iwezuga onwe ya site nebe Esọ nọ, onye na-eyiwo egwu igbu ya, nainwe ohere izute onye o nwere ike ịlụ niime ọgbụgba ndụ (lee Genesis 27:41–45; 28:1–2, 5).

  9. Russell M. Nelson, “Ọgbụgba ndụ Dị Ebighị ebi,” Liahona, Oct. 2022, 11.

  10. 2 Nifaị 31:20

  11. Lee Jọn 5:5, akụkọ banyere olulu mmiri nke Bethesda.

  12. Lee Jọn Mak 5:25, akụkọ banyere nwanyị nke metụrụ uwe nke Kraịst aka.

  13. Lee Matiu 14:31, akụkọ banyere Pita na-eje ije n’elu mmiri.

  14. Lee “How Firm a Foundation,” Hymns,no. 85.

  15. Lee 1 Nifaị 11:16–33

  16. Lee Ndị Filipi 1:6; 2:13; Okwu niile nke Mọmọn 1:7.

  17. Lee Jọn 12:32

  18. Ụzọ bụ ọtụtụ mgbe ihe a na-akọwa site n’isi njiri mara niile ụdị dị ka ihe ndị na-enye ntụzi aka ma ọ bụ akara maịlụ niile. Ọ bụ ụzọ iji hụ na ị nọ nụzọ ziri ezi ma ọ bụ na-eme nke ọma n’ebe kwesịrị ekwesị. Mmekọrịta nwekwara ike bụrụ ihe a kọwara site n’isi njiri mara niile. Ụfọdụ ihe ndị a gụnyere ihe a na-atụanya (lee Jeremaya 29:11; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 132:7); ịdị na-adanye (lee Mozaya 3:19; Alma 7:23; 13:28); ịdị umeala nobi; irube isi; ndidi; ị na-adanye; ntụkwasị obi (lee Ilu 3:5); and ịhụnaanya (lee Ndị Rom 8:31–39).

  19. Isiokwu nke otu Ndịinyom Nta,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma, nkwusi ike agbakwunyere; leekwa Bonnie H. Cordon, “Ụmụada A Hụrụ naanya,” Liahona, Nov. 2019, 67.

  20. Lee Jọn 4: 1– 29, akụkọ banyere onyeinyom nọ n’olulu mmiri.

  21. Lee Alma 38:1–3

  22. Lee Ọnụọgụgụ 6:23-27

  23. Lee Joshua 24:22.

  24. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 25:3, akụkọ banyere Ema Smith.

  25. Lee 1 Ndị Kọrịnt 15:9–10

  26. Lee 2 Ihe e mere 20:1–17, kachasị amaokwu 14.

  27. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 109:1–46

  28. Lee 1 Samuel 16:11–13

  29. Lee Matiu 4:16, akụkọ banyere Esta.

  30. Lee Ọlụ 10:38

  31. Lee Aịzaya 43:1-6

  32. Lee Ditronomị 28:1–9

  33. Otu ezi enyi chetara m na oku ime ihe dị mkpa niime mmekọrịta ọbụla.

  34. Nkata mụ na Kristen Olsen, Sept. 2023.

  35. Nye Mack Oswald, Camden Oswald, Ashton Matheny, na Jack Butler, unu emeele maka ịpụgharị m.

  36. Unu ga-echeta na akpọkuwo m ndị ntorobịa ndị Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a ka ha bata nime ndị agha ntorobịa nke Onyenwe anyị, i soro nime ọrụ nke kachasị mkpa n’ụwa taa—mkpọkọta nke Izrel. A kpọrọ m ndị ntorobịa anyị oku a n’ihi ha nwere onyinye pụrụ iche nke isetịpụ aka ruo ndị ọzọ ma kesara ha ịhe ha kwenyere n’ụzọ kwere nnabata ” (Russell M. Nelson, “Witnesses, Aaronic Priesthood Quorums, and Young Women,” Liahona, Nov. 2019, 39).

  37. Alaeze Chineke … dị ka obodo ukwu awakporo nke ọnwụ gbara gburugburu n’akụkụ niile. Mmadụ ọbụla nwere ebe nke ya na mgbidi ahụ ichekwa ma ọ dịghị onye nwere ike iguzoro ebe onye ọzọ guzo, manao nweghị ihe gbochiri anyị site nịrịọ maka mgbam ume nye onye na ibe ya’” (Martin Luther, in Lewis William Spitz, The Renaissance and Reformation Movements [1987], 335).