Ọgbakọ Zuru ọha
Eziokwu Dị Ebighị ebi
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2023


Eziokwu Dị Ebighị ebi

Mkpa anyị ịmata eziokwu enwebeghị mgbe ọbụla ọ dịrị mkpa karịa!

Ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị, unu emeela maka nnukwu ịhụnaanya unu nye Chineke Nna na Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst, ma unu emeela maka ịhụnaanya na ije ozi unu nye onye na ibe ya. N’ezie ị bụ onye eji amaatụ!

Ndubata

Mgbe mụ na nwunye m natasịrị oku nke ije ozi dị ka ndị ndu mishọn n’uju, ezi na ụlọ anyị kpebiri ịmụ aha onye mgbasa ozi ọma ọbụla tupu ịbịarute ngalaba mgbasa ozi oma. Anyị nwetere ọtụtụ foto, kewapụta ọtụtụ flash kaadị, ma malite ịmụ ọtụtụ aha na ibu aha niile n’uche.

Ozugbo anyị rutere, anyị mere ọgbakọ nke ndubata anyị na ndị mgbasa ozi ọma. Dịka anyị na-agwakọta a nụrụ m ka nwa anyị nwoke gbara afọ iteghete kwuru:

“Obi dị m ụtọ izute gị, Sam!”

Rechel, ebee ka i si?”

Ewo, Devid, i toro ogologo!”

Na-ịtụ egwu, a gakwuru m nwa anyị nwoke ma takaa, “Hei, ka anyị cheta ịkpọtụrụ ndị mgbasa ozi ọma dị ka Okenye ma ọ bụ Nwanne nwanyị.”

O lere m anya na mgbagwoju anya ma sị, “Papa, e chere m ma anyị kwesịrị i buru aha ha n’isi.” Nwa anyị nwoke mere ihe o chere bụ ihe ziri ezi nke dabeere na nghọta ya.

Ya mere,gịnị bụ nghọta anyị banyere eziokwu n’ụwa nke taa? Ana awụkwasị anyị ọtụtụ echiche dị ike, ime mkpesa ihu abụọ, na data ndị na-ezughị oke esepụghị aka. N’otu oge ahụkwa, nsiripụta niile na ukwu ozi nke a na-amụba amụba. Mkpa anyị ịmata eziokwu enwebeghị mgbe ọbụla ọ dịrị mkpa karịa!

Eziokwu dị oke mkpa ma na-akwado mmekọrịta anyị na Chineke, chọta udo na ọńụ, ma rute ike dị niime anyị si na chi. Taa, ka anyị tulee ajụjụ ndịa na-esote:

  • Gịnị bụ eziokwu, ma gịnị mere o ji dị mkpa?

  • O lee otu anyị ga-esi achọta eziokwu?

  • Mgbe anyị chọtara eziokwu, kedụ otu anyị ga-esi akọ ya?

Eziokwu Dị Ebighị ebi

Onyenwe anyị akuziworo anyị na akwụkwọ nsọ na, “eziokwu bụ ọmụma ihe nke ihe niile dị ka ha dị, na dị ka ha dịịrị, na dị ka ha ga-adị n’oge na-abịa abịa ” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 93:24). Ọ “bụghị ihe ekere eke ma ọ bụ ihe e mere eme” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 93:22) ma “nweghị nsọtụ ọbụla” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:66).1 Eziokwu bụ kpoo, dịgịde, ma nweghị ike ịgbanwe. Ikwu ya n’ụzọ ọzọ eziokwu dị ebighị ebi2

Eziokwu na-enyere anyị aka gbochie nduhie,3 hụzie nke ọma ihe ọma site niihe ọjọọ4 nata nchekwa,5 ma chọta nkasi obi na ọgwụgwọ.6 Eziokwu nwekwara ike iduzi ihe omume anyị niile7 mee ka anyị nwere onwe anyị8 doo anyị nsọ,9 ma duruo anyị na ndụ ebighị ebi.10

Chineke Na-ekpughe Eziokwu Dị Ebighị ebi

Chineke na-ekpughere anyị eziokwu site n’usoro nke esi ekpughe mmekọrịta niile Gụnyere YaOnwe Ya, Jizọs Kraịst, Mmụọ Nsọ, ndị amụma, na anyị. Ka m kọwaa ihe dị iche mana nwee njikọ ya na ọrụ nke onye ọbụla na ndị so eme ihe na-arụ n’usoro nke a.

Nke mbụ, Chineke bụ nsiripụta ahụ nke eziokwu dị ebighị ebi.11 Ya na Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst,12 nwere nghọta nke eziokwu zuru oke ma na-emekọta ihe ọnụ n’ịdị n’otu mgbe niile jiri ezi ụkpụrụ niile na iwu niile.13 Ike nke a na-enye Ha ohere iji kee ma chịa ụwa niile14 tinyekwara inwe ịhụnaanya, iduzi, na inye onye ọbụla niime anyị ọzụzụ n’ụzọ zuru oke.15 Ha chọrọ ka anyị ghọta ma tinye eziokwu n’ọrụ ka anyị nwee ike ńụrịa na ngọzị ndị Ha na-enwe.16 Ha nwere ike tinye eziokwu niime mmadụ ma ọ bụ, ebe a na-ahụkarị, site na ndị ozi ụdị dị ka Mmụọ Nsọ, ndị mmụọ ozi, ma ọ bụ ndị amụma dị ndụ.

Nke Abụọ bụ, Mmụọ Nsọ na-agba ama banyere eziokwu niile.17 Ọ na-ekpughere anyị eziokwu kpọm kwem na ndị na-agba ama eziokwu ndị ọzọ kuziri. Nkwagide sitere na Mmụọ a na-ahụkarị na-abịa dị ka echiche nye uche anyị na mmetụta niile nye mkpụrụ obi anyị.18

Nke atọ, ndị amụma na-anata eziokwu site n’aka Chineke ma kesaara anyị eziokwu ahụ.19 Anyị na-amụta eziokwu site n’aka ndị amụma oge gara aga dị niime akwụkwọ nsọ20 na site na ndị amụma dị ndụ n’ọgbakọ zuruọha na site n’ụzọ ndị ọzọ esi ezi ozi nke iwu kwadoro.

N’ikpeazụ, mụ na gị na-arụ ọrụ dị mkpa n’usoro nke a. Chineke tụrụanya n’aka anyị ịchọ, ịmata, ma were eziokwu ahụ mee ihe. Ike anyị iji nata ma tinye eziokwu n’ọrụ dabeere na ume nke mmekọrịta anyị na Nna na Ọkpara ahụ, ịdị njikere anyị nye ike nke Mmụọ Nsọ, na nkwụrụ na ahịrị anyị anyị na ndị amụma ụbọchị ikpeazụ a.

Anyị kwesịrị icheta na Setan na-arụ ọrụ ijichi anyị site n’eziokwu. Ọ maara na ma eziokwu adịghị, anyị enweghị ike inwete ndụ ebighị ebi. Ọ na-efegharị agịrị nke eziokwu jiri filọsọfị ndị ụwa iji megherie anyị anya ma kwapụ uche anyị site n’ozi e ziri site n’aka Chineke.21

Ịchọta, Ịmata, na Itinye n’ọrụ Eziokwu dị Ebighị ebi

Dị ka anyị na-achọ eziokwu dị ebighị,22ajụjụ abụọ ndị a na-esote nwere ike nyere anyị aka mata ma ihe kpatara esi eme ihe o sitere n’aka Chineke bịa ma ọ bụ site na nsiripụta ọzọ.

  • Ihe kpatara esi mee ya ọ bụ ihe akuziri niime akwụkwọ nsọ ma site naka ndị amụma dị ndụ?

  • Ekwetewo na echiche ahụ bụ eziokwu site n’aka ebe nke Mmụọ Nsọ?

Chineke na-ekpughe eziokwu niile banyere ozizi site n’aka ndị amụma, ma Mmụọ Nsọ na-eme ka anyị mara maka eziokwu ndị ahụ ma nyere anyị aka tinye ha n’ọrụ.23 Anyị ahaghị ịchọ ma dị na njikere ịnata nkwagide nke ime mmụọ ndị a mgbe ha bịara.24 Anyị na-akachasị anabata aka ebe nke Mmụọ ahụ mgbe anyị wedara obi ala,25 kpee ekpere jiri obi anyị niile ma mụọ okwu niile nke Chineke,26 ma dobe iwu nsọ Ya niile.27

Ozugbo anyị natasịrị nkwenye eziokwu sitere na Mmụọ Nsọ banyere otu ọkpụrụkpụ eziokwu, nghọta anyị na-emikpu dị ka anyị na etinye ụkpụrụ ahụ n’ọrụ. Ka oge na-aga, mgbe anyị na-ebi ndụ ụkpụrụ ahụ na-esepụghị aka, anyị na-enweta ọmụma ihe dị ire banyere eziokwu ahụ.28

Na-ịmaatụ emewo m ọtụtụ mmejọ ma nwee mwute maka nhọrọ ndị jọrọ njọ. Mana site na ekpere, ọmụmụ ihe, na okwukwe niime Jizọs Kraịst, anatara m aka ebe banyere ụkpụrụ nke nchegharị.29 Dị ka m garaniihu na-ichegharị, nghọta m banyere nchegharị bịara sie ike karịa. A bịara m dị Chineke na Ọkpara Ya nso karịa. A maara m ugbua na enwere ike ịgbaghara mmehie site na Jizọs Kraịst, niihi na ana m enweta ngọzi niile nke nchegharị ụbọchị ọbụla.30

Ịtụkwasị Chineke obi Mgbe Ana Ekpughebeghị Eziokwu

Ya mere, gịnị ka anyị ga-eme mgbe anyị ji obi anyị niile chọọ eziokwu nke ana ekpughebeghị? E nwere m ọmịiko dị ukwuu maka anyị onwe anyị ndị na-enwe oke agụụ maka azịza nke ndị na-eyighị ka ha na-abịa.

N’ebe Josef Smit nọ, Onyenwe anyị nyere ndụmọdụ, “Jide udo gị tutu ruo mgbe m ga-ahụ na ọ dị mma ime ka amata ihe niile … gbasara okwu ahụ” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 10:37).

Ma n’ebe Ema Smit nọ, Ọ kọwara, “Atamula ntamu ọbụghị niihi ihe ndị na ị hụbeghị, maka ha ka ejichiri site na gị nakwa site n’ụwa, nke bụ amamihe n’ime m n’oge na-abịa abịa” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 25:4).

Mụ onwe m, kwa, achọwo ọtụtụ azịza nye ajụjụ ndị si m n’obi. Ọtụtụ azịza abịawo; ụfọdụ abịabeghị.31 Dị ka anyị na-akwụdosị ike—na-atụkwasị obi n’amamiihe na ịhụnaanya nke Chineke, na-edobe iwu nsọ Ya niile, ma na-adabere n’elu ihe nkeanyị maara—Ọ na-enyere anyị aka chọta udo tutu ruo mgbe Ọ ga-ekpughe eziokwu banyere ihe niile.32

Ịghọta Ozizi na Ụkpụrụ

Mgbe ana achọ eziokwu, ọ na-enye aka ịghọta ihe dị iche n’etiti ozizi na ụkpụrụ. Ozizi na-arụtụ aka na eziokwu ndị dị ebighị ebi, ụdị dị ka ọdịdị nke Ndị Bụ Chị, atụmatụ nke nzọpụta, na aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst. Ụkpụrụ bụ itinye ozizi n’ọrụ site na ndabere nke ọnọdụ ndị dị ugbua dị ka eburu na-amụma. Ụkpụrụ na-enyere anyị aka lekọta Nzukọ nsọ n’ụzọ a haziri ahazi.

Ebe ozizi na-adịghị agbanwe agbanwe, usoro ka ana edebezi nke ọma site n’oge ruo n’oge. Onyenwe anyị na-arụ ọrụ site n’aka ndị amụma Ya iji kwadozie ozizi Ya na iji gbanweta ụkpụrụ Nzukọ nsọ niile dị ka otu mkpa nke ụmụ Ya siri dịrị.

Na mwute, anyị mgbe ụfọdụ na-agwakọta ụkpụrụ ya na ozizi. Ọ bụrụ na anyị aghọtaghị ihe dị iche, anyị nọ n’ọghọm inwe obi ịda mba mgbe ụkpụrụ niile gbanwere ma nwere ike malite ịjụ amamiihe nke Chineke ajụjụ ma ọ bụ ọrụ nke ibu amụma nke ndị amụma.33

Ikuzi Eziokwu Dị Ebighị ebi

Mgbe anyị nwetara eziokwu site n’aka Chineke, Ọ na-agba anyị ume ikesa ọmụma ihe ahụ anyị na ndị ọzọ.34 Anyị na-eme nke a mgbe anyị na-akuziri ndị klass ihe, eduzi nwata, ma ọ bụ na-akparịta ụka eziokwu ndị nke ozi ọma anyị na otu enyi.

Mbunoobi anyị bụ ikuzi eziokwu n’ụzọ nke ga-akpọbata ike ntọghata nke Mmụọ Nsọ35 Ka m kọọ maka ụfọdụ mkpọku dị mfe sitere n’aka Onyenwe anyị na ndị amụma Ya nwere ike inyere anyị aka.36

  1. Tụkwasị obi na Nna nke Eluigwe, Jizọs Kraịst, na ozizi Ha dị oke mkpa.37

  2. Kwesie ike n’akwụkwọ nsọ na nkuzi niile nke ndị amụma ụbọchi ikpeazụ a.38

  3. Dabere n’ozizi ehiwere site na ụbara ndị aka ebe ji ikike.39

  4. Gbanarị ntụnye uche, echiche niile nke onwe, ma ọ bụ echiche nke ndị ụwa bu n’obi.40

  5. Kuzie otu isi ihe ozizi dị niime ọnọdụ metụtara eziokwu niile nke ozi ọma.41

  6. Jiri usoro niile nke nkuzi nke ihe na-akpọbata ike nke Mmụọ ahụ.42

  7. Zie ozi n’ụzọ doro anya iji gbanarị nghọtahie.43

Ịdị na-ekwu Eziokwu n’Ịhụnaanya

Otu anyị si na-akuzi eziokwu dị mkpa n’ezie. Pọl gbara anyị ume ikwu “eziokwu n’ịhụnaanya ” (lee Ndị Efesọs 4:14–15). Eziokwu nwere ohere kachasị mma nke ịgọzi onye ọzọ mgbe ekwuru ya n’ịhụnaanya dị ka nke Kraịst.44

Eziokwu a kuziri na-ejighị ịhụnaanya nwere ike ịkpata mmetụta nke ịda mba, na owu ọmụma. Ọtụtụ mgbe ọ na-edubakarị n’iwe iwe na nkewa—ọbụna esemokwu. N’aka nke ọzọ, ịhụnaanya na-enweghị eziokwu gba ọtọ ma nweghị nkwa nke ito eto.

Ma eziokwu ma ịhụnaanya ha abụọ dịcha oke mkpa maka uto nke ime mmụọ anyị.45 Eziokwu na-ewete ozizi, ụkpụrụ niile na iwu niile dị mkpa iji rite ndụ ebighị ebi, ebe ịhụnaanya bụ ihe na-eweta mkpali a chọrọ iji nabata ma mee ihe niihe bụ eziokwu.

Obi m na-anọgide n’ekele ruo ebighị ebi maka ndị ọzọ jiri ndidi kuziere m eziokwu dị ebighị ebi site na ịhụnaanya.

Mpịachi

Na mpịachi, ka m kọọ akụkọ eziokwu ndị dị ebighị ebieternal truths na-aghọwo ihe na-enye mkpụrụ obi m nkwụsi ike. Abịawo m na mmata nke eziokwu ndị a site n’isoro ụkpụrụ ndị ahụ akpara nkata ha taa.

Ama m na Chineke bụ Nna anyị nke Eluigwe.46 Ọ mazuru ihe niile,47 ji ike niile,48 ma nwee ịhụnaanya zuru oke.49 O kepụtara atụmatụ maka anyị inweta ndụ ebighị ebi ma ghọọ ndị dị ka Ya.50

Dị ka akụkụ nke atụmatụ ahụ, O zitere Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst, inyere anyị aka.51 Jizọs Kraịst kuziiri anyị ime ihe bụ uche nke Nna52 na ịhụrịta onye na ibe ya n’anya.53 Ọ chụrụ aja maka mmehie anyị54 ma nyefee ndụ Ya n’elu obe.55 O bilitere site na ndị nwụrụ anwụ mgbe mkpụrụ ụbọchị atọ gasịrị.56 Site na Kraịst na amara Ya, anyị ga-ebilite n’ọnwụ,57 e nwere ike ịgbaghara anyị,58 ma anyị nwere ike chọta ume niime mkpagbu.59

N’oge ije ozi Ya n’elu ụwa, Jizọs hiwere Nzukọ nsọ Ya.60 Ka oge na-aga, Nzukọ nsọ ahụ ka agbanwere, ma eziokwu niile wee fuo.61 Jizọs Kraịst weghachitere Nzukọ nsọ Ya na eziokwu niile nke ozi ọma site n’aka Onye amụma Josef Smith.62 Ma ụbọchị taa, Kraịst na-aganiihu idu Nzukọ nsọ Ya site n’aka ndị amụma na ndịozi dị ndụ taa.63

Amaara m na dị ka anyị na-abịakwute Kraịst, anyị nwere ike mesịa “bụrụ ndị tozuru oke niime Ya” (Moronaị 10:32), nwete “ojuju nke ọńụ” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 93:33), ma nata “ihe niile [ahụ] nke Nna nwere” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:38). Nye eziokwu ndị a dị ebighị ebi ka m na-agba ama n’aha dị nsọ nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. Leekwa Abụ ọma 117:2; Ozizi na Ọgbụgba ndụ nile 1:39.

  2. “Na-agbanyeghị obi abụọ nke ụfọdụ ndị, n’ezie enwere ụdịrị ihe dị ka ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi. E nwere n’ezie eziokwu bụ kpoo bụ— eziokwu dị ebighị ebi. Otu niime ajọọ ọrịa na-efe efe nke ụbọchị anyị taa bụ na ndị kacha dị ole ma ole n’ọnụọgụgụ maara ebe ha ga-atụgharị maka eziokwu” (Russell M. Nelson, “Eziokwu Na-enweghị Ntụpọ, Ozizi Na-enweghị Ntụpọ, na Mkpughe Na-enweghị Ntụpọ,” Liahona, Nov. 2021, 6).

  3. Lee Josef Smith—Matiu 1:37

  4. Lee Moronaị 7:19

  5. Lee 2 Nifaị 1:9; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 17:8.

  6. Lee Jekọb 2:8.

  7. Lee Abụ ọma 119:105.); 2 Nifaị 32:3

  8. Lee Jọn 8:32; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 98:8

  9. Lee Jọn 17:17

  10. Lee 2 Nifaị 31:20

  11. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 88:11–13; 93:36

  12. Lee Jọn 5:19–20; 7:16; 8:26; 18:37; Moses 1:6.

  13. Lee Alma 42:12–26; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:41

  14. Lee Mozis 1:30–39

  15. Lee 2 Nifaị 26:24

  16. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 82:8–9

  17. Lee Jọn 16:13; Jekọb 4:13; Moronaị 10:5; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 50:14; 75:10; 76:12; 91:4; 124:97

  18. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6:22–23; 8:2–3

  19. Lee Jeremaya 1:5, 7; Emọs 3:7; Matiu 28:16–20; Moronaị 7:31Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 1:38; 21:1–6; 43:1–7 Onye amụma bụ “onye nke akpọworo site n’aka ma na-ekwu okwu maka Chineke. Dị ka onye na-ejere Chineke ozi, onye amụma na-anata iwu nsọ niile, amụma niile, na mkpughe niile site n’aka Chineke. Oke na ọrụ ya bụ ime ka a mara uche Chineke na ezi agwa Ya nye ụmụ mmadụ na igosịpụta ihe otu Ya na ha si na-eme ihe pụtara. Onye amụma na-akatọ mmehie ma na-ebu amụma banyere ihe na-esi na ya apụta. Ọ bụ onye nkwusa nke ezi omume. Mgbe ọ dapụtara, ndị amụma nwere ike nwee mkpatemmụọ ibu amụma banyere ọdịniihu maka ọdịmma nke ụmụ mmadụ. Isi ọrụ ya bụ, otu osila dị, ịgba ama banyere Kraịst. Onyeisi Nzụkọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ bụ onye amụma nke Chineke n’elu ụwa taa Ndị otu nke Otù Ndịisi Mbụ na Ndị Ozi Iri na Abụọ ka ana akwado dị ka ndị amụma, ndị ọhụụ, na ndị mkpughe” (Nduzi nye Akwụkwọ nsọ, “Onye amụma,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma). Ọmụmaatụ niile nke ụkpụrụ ndị a ka a na-ahụ niime ndụ nke Adam (lee Moses 6:51–62), Enọk (lee Moses 6:26–36), Noa (lee Moses 8:19, 23–24), Abraham (lee Genesis 12:1–3; Abraham 2:8–9), Moses (lee Ọpụpụ 3:1–15; Moses 1:1–6, 25–26), Pita (lee Matiu 16:13–19), na Josef Smith (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 5:6–10; 20:2; 21:4–6).

  20. Lee 2 Timoti 3:16

  21. Lee Jọn 8:44; 2 Nifai 2:18; Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 93:39; Moses 4:4

  22. Lee 1 Nefi 10:19. Onyeisi Dallin H. Oaks kuziri: “Anyị kwesịrị ịkpachara anya dị ka anyị na-achọ eziokwu [nke Chineke] ma họrọ isi ihe niile maka nchọcha ahụ. Anyị ekwesịghị iwere mpụtara ihe zuru ụwa ma ọ bụ ikike dị ka ụzọ ndị tozuru oke. … Mgbe anyị na-achọ eziokwu gbasara okpukpere chi, anyị kwesịrị iji usoro niile nke ime mmụọ dabara adaba maka nchịchọ ahụ: ekpere, aka ebe nke Mmụọ Nsọ, na ọmụmụ akwụkwọ nsọ na okwu niile nke ndị amụma oge ugbua” (“Eziokwu na Atụmatụ ahụ,” Liahona, Nov. 2018, 25)

  23. Okenye D. Todd Christofferson kuziri: Ndịozi na ndị amụma … mara ọkwa okwu Chineke, mana na mgbakwunye, anyị kwere na ndịikom na ndịinyom n’ụzọ niile na ọbụna ụmụntakịrị nwere ike ịmụ ihe site na ma nwee odudu site na mkpatemmụọ si na Chi na-azịza nye ekpere na ọmụmụ nke akwụkwọ nsọ. … Ndị otu Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst ka enyere onyinye nke Mmụọ Nsọ, nke na-akpalite ozi nke na-aganiihu ugbua ha na Nna ha nke Eluigwe. … Nke a abụghị ikwu na onye otu ọbụla na-ekwu okwu maka Nzukọ nsọ ma ọ bụ nwere ike ịkọwa ozizi ya niile mana na onye ọbụla nwere ike ịnata nduzi si na Chi n’izute aka mgba niile na ohere niile nke ndụ ya bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị” (“Ozizi Ahụ nke Kraịst,” Liahona, Me 2012, 89–90, nootu 2).

  24. Lee 2 Nifaị 33:1–2

  25. Lee Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 1:28

  26. Lee Moronaị 10:3–5; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 9:7–9; 84:85

  27. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 5:35; 63:23; 93:27–28 Na-agbanyeghị ezi mbọ anyị niile, ụfọdụ niime anyị nwekwara ike na-agba mbọ inweta mmetụta Mmụọ ahụ niihi aka mgba niile nke ọrịa uche. Ume ịda mba, obi nkoropu, na ọnọdụ akwara ozi niile nwere ike gbakwunye mgbagwoju anya na- ịmata Mmụọ Nsọ ahụ. Nụdị ọnọdụ ndị dị otu ahụ, Onyenwe anyị na-akpọku anyị ịganiihu na-ebi ndụ ozi ọma, ma Ọ ga-agọzi anyị (lee Mozaya 2:41). Anyị nwere ike chọọ maka mgbakwunye ihe omume niile—ụdị dị ka ịńa ntị nauri ndị dị nsọ, ịneje ozi, ma ọ bụ ịna etinye oge na ọdịdị—nke na-enyere anyị aka nweta mkpụrụ niile nke Mmụọ ahụ (lee Ndị Galeshia 5:22–23) ma mee ka njikọ anyị ruo na Chineke sie ike.

    Okenye Jeffery R. Holland kọwara: “Ya mere kedụ otu kachasị mma i si eme mgbe aka mgba niile nke uche na nke mmetụta obi na-erute gị na ndị ahụ ịhụrụ na anya? Karịsịa ihe niile, ahapụkwala okwukwe niime Nna gị nke Eluigwe, onye hụrụ unu naanya karịa ka unu nwere ike ịghọta. … Jiri okwukwe chụwa emume niile nke ofufe a maara kemgbe gboo nke na-eweta Mmụọ nke Onyenwe anyị niime ndụ gị. Chọọ ndụmọdụ nke ndị ahụ ji ọtụghe niile maka ọdịmma nke ime mmụọ gị Rịọ maka ma were ngọzi niile nke ọkwa nchụaja kpọrọ ihe. Rie oriri nsọ izu ụka niile, ma jisie aka ike na nkwa izu oke niile nke Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst. Kwere n’ọrụ ebube niile. Ahụwo m ọtụtụ niime ha na-abịa mgbe ihe ngosịpụta ndị ọzọ ga-asị na olileanya agwụsịwo. Olileanya enweghị mgbe ọbụla ọ gwụrụ” (“Dị ka Ụgbọ mmiri Tiwara etiwa,” Liahona, Nov. 2013, 40– 41).

  28. Lee Jọn 7:17; Alma 32:26-34 Emesịa, Chineke chọrọ ka anyị nweta eziokwu “ahịrị n’elu ahịrị,usoro n’elu usoro,” tutu ruo mgbe anyị ga-aghọta ihe niile (lee Ilu 28:5; 2 Nefi 28:30; ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:67; 93:28).

  29. Lee 1 Jọn 1:9–10; 2:1–2

  30. Onyeisi Russell M. Nelson kọwara: “Enweghi ihe na-akarị ntọghapụ mmadụ, na-akarị enye mmadụ ugwu, mọbụ siri ike nye ọganiihu nke mmadụ karịa ka nchegharị nke ana elekwasị anya ụbọchị niile na-adịgide adị. Nchegharị abụghị otu mmemme; ọ bụ ịhe nwere usoro. Ọ bụ otụghe nke añụrị na udo nke uche. Mgbe agbakwụnyere ya okwukwe, nchegharị na-emeghere anyị ụzọ i nweta ike nke Aja Mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst” (“Anyị Nwere ike Mee Nke Ọma Karịa ma Dị Mma Karịa,” Liahona, Me 2019, 67).

  31. Amaghị m ihe niile mere Chineke ji ejichi ụfọdụ eziokwu dị ebighị ebi site n’ebe anyị nọ, mana Okenye Orson F.Whitney wetere otu ihe nghọta dị mmasị: “Ọ bụ ngọzi nye ikwere na-ahụghị naanya, ebe ọ bụ site n’itinye okwukwe n’ọrụ ka ntolite nke ime mmụọ sị abịa, otu niime nnukwu ihe ebu n’obi nke mmadụ ji dị ndụ nụwa; ebe mmata ihe, site n’iloba okwukwe, na-egbochi itinye ya n’ọrụ, ma site otu ahụ na-adọla ntolite ahụ azụ. ‘Ọmụma ihe bụ ike’; ma ihe niile ka aga amata mgbe oge ya ruru. Mana ọmụma ihe na-erughị eru—ịmata ihe mgbe na-abụghị oge ya—na-ebute mbibi nye ma na-ọganiihu ma na nye ańụrị” (“Ịdị Nsọ nke Jizọs Kraịst,” Improvement EraJan. 1926, 222; Leekwa LiahonaDec. 2003, 14–15).

  32. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 76:5–10 Onyenwe anyị nyekwara Hyrum Smith ndụmọdụ, “ka aghara ịchọ ịma ọkwa okwu m, kama ka ebu ụzọ chọọ i nweta okwu m. … Jide onwe gị [ma] mụọ okwu m” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 11:21–22). Onye amụma Alma wetere otu ọmụmaatụ maka ijikwa ajụjụ ndị na-asabeghị: “Ihe omimi ndị a ka e mebeghị ka m mata ha n’uju; ya mere aga m enwe ndidi” (Alma 37:11). Ọ kọwakwaara nwa ya nwoke Kọrịantọn na “e nwere ọtụtụ ihe omimi ndị edokwara, na ọdịghị onye maara ha ma ọ bụghị Chineke n’onwe ya” (Alma 40:3). Enwetawokwa m ike site na azịza nke Nefi mgbe a jụrụ ya otu ajụjụ na o nweghị ike ịza: “Ama m na [Chineke] hụrụ ụmụ ya n’anya; otu o sila dị, amaghị m ihe ihe nile pụtara” (1 Nefi 11:17).

  33. N’otu aka ahụkwa, omenaala ejiri mara ndị abụghị ozizi ma ọ bụ ụkpụrụ. Ha nwere ike baa uru ma ọ bụrụ na ha nyere anyị aka soro ozizi na ụkpụrụ, mana ha nwekwara ike nye aka gbochie ito eto nke ime mmụọ anyị ma ọ bụrụ na ha adabeereghị nụkpụrụ ndị bụ eziokwu. Anyị ga-agbanarị omenaala ndị na-adịghị ewulite okwukwe anyị niime Jizọs Kraịst ma ọ bụ enyere anyị aka eme nke ọma chewe ihu na ndụ ebighị ebi.

  34. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 15:5; 88:77–78

  35. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 50:21–23

  36. Ewetere site na dọkumentị “Ụkpụrụ niile maka Iji hụ maka Ịdị ọcha Nke Ozizi,” akwadoro site n’aka nke Otu Ndịisi Mbụ na Kworum nke Ndị Ozi Iri na abụọ na Febrụwarị 2023.

  37. Lee 1 Nifaị 15:14 Onyenwe anyị nyere ndị odibo Ya ntuzi aka ịgbanarị ilekwasị anya na nkwenye, ma ọ bụ echiche ndị, na-agbakwasaghị ụkwụ n’ozi ọma Ya: “Na maka nkwenye ndị unu na-agaghị ekwu, mana unu ga-ama ọkwa nchegharị na okwukwe n’Onye Nzọpụta, na mgbaghara nke mmehie niile site na baptism, na site n’ọkụ, ee, ọbụna Mmụọ Nsọ” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 19:31

    Okenye Neil L. Andersen kọwara: “Ka anyị lekwasị anya na Onye Nzọpụta Jizọs Kraịst na n’ebe onyinye nke aja mgbaghara mmehie Ya nọ. Nke a apụtaghị n’anyị enweghị ike ekwu maka otu nhụmiihe sitere na ndụ nke onwe anyị ma ọ bụ kọọ akụkọ echiche sitere na nke ndị ọzọ. Ebe isiokwu anyị nwere ike bụrụ ihe banyere ezi na ụlọ niile ma ọ bụ ije ozi, ma ọ bụ tempụl niile, ma ọ bụ ije ozi mgbasa ozi ọma na-adịbeghị anya, ihe niile … kwesịrị irụtụ aka n’ebe Ọnyenwe anyị Jizọs Kraịst nọ“ (“Anyị n’Ekwu maka Kraịst,” Liahona, Nov. 2020, 89–90).

  38. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 28:2–3, 8 Onye amụma Alma dọrọ ndị ahụ ahọpụtara ikwusa ozi ọma aka na ntị “ikuzi ihe ọbụla na-abụghị ihe ndị ọ kụziworo, na nke e kwuworo site n’ọnụ nke ndị amụma dị nsọ” (Mozaya 18:19).

    Onyeisi Henry B. Eyring mara ọkwa, “Anyị ahaghị ikuzi ozizi niile dị mkpa nke Nzukọ nsọ dị ka e dere niime akwụkwọ nsọ na nkuzi niile nke ndị amụma, ndị oke na ọrụ ha ọ bụ ịma ọkwa ozizi“ (“Onyenwe anyị Ga-Amụba Owuwe Ihe Ubi ahụ” [evening with a General Authority, Feb. 6, 1998], niime Ikuzi Semịnarị: Mmalite Ihe Ọgụgụ Mbụ [2004], 96).

    Okenye D. Todd Christofferson gbara ama na “niime Nzukọ nsọ taa, dị nnọọ ka mgbe ochie, ihiwe ozizi nke Kraịst ma ọ bụ idozigharị nke ọma ndapụ ụzọ niile nke ozizi bụ ihe gbasara mkpughe si na chi nye ndị ahụ Onyenwe anyị tere mmanụ site na ikike nke ndị ozi” (“Ozizi nke Kraịst Ahụ,” 86).

  39. Lee 2 Ndị Korịnt 13:1; 2 Nifaị 11: 3; Ita 5: 4; Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 6:28 Okenye Neil L. Andersen hụtara: “Ole ma ole na-ajụ okwukwe ha ajụjụ mgbe ha hụrụ okwu onye ndu Nzukọ nsọ kwuru ọtụtụ iri afọ gara aga nke yiri ihe ya na ozizi anyị na-adabaghị. E nwere otu ụkpụrụ dị mkpa nke na-achị ozizi nke Nzukọ nsọ. Ozizi ahụ ka akuziri site n’aka ndị otu 15 niile nke Otu Ndịisi Mbụ na Kworum nke ndị Iri na abụọ. Ọ bụghị ihe ezoro ezo na nkeji edemede zoro ezo nke otu okwu e dere ede. Ụkpụrụ ndị bụ eziokwu ka ana akuzi mgbe na mgbe ma site n’aka ọtụtụ ndị. Ozizi anyị anaghị ara ahụ ịchọta” (“Mnwale nke Okwukwe Gị,” Liahona, Nov. 2012, 41).

    Okenye Todd Christofferson n’ụzọ yiri nke a kuziri: “Ọ bụ ihe a ga-echeta na ọ bụghị okwu niile ndị ndu Nzukọ nsọ kwuru, ndị gara aga ma ọ bụ ndị nọ ugbua, bụcha nnọọ ihe mejuputara ozizi. Ọ bụkarị ihe a na-aghọta niime Nzukọ nsọ na okwu ekwuru site n’ọnụ otu onye ndu n’otu mmemme ọtụtụ mgbe na-anọchi uche, nke onwe, na-agbanyeghị na e chere ya nke ọma, na-abụghị nke e mere ịbụ ụkara ma ọ bụ nragide maka Nzukọ nsọ dum” (“Ozizi nke Kraịst Ahụ,” 88).

  40. Lee 3 Nifaị 11:32, 40 Onyeisi Gordon B. Hinckley sịrị: E kwuwo m okwu mbụ gbasara mkpa ọ dị idobe ozizi nke Nzukọ nsọ ọcha. … Nke a na-eche m uche. Obere mmelu niile dị na nkuzi banyere ozizi nwere ike iduba na nnukwu ikwu okwu asị dị ọjọọ” (Nkuzi niile nke Gordon B. Hinckley [1997], 620).

    Onyeisi Dallin H. Oaks adọwo aka na ntị na enwere ndị ụfọdụ “ndị na ahọrọ ahịrị okwu ole ma ole sitere na nkuzi niile nke onye amụma ma jiri ihe ndị a iji kwadoo ajenda ndọrọ ndọrọ ọchịchị ha ma ọ bụ ihe omume nke onwe ndị ọzọ. … Ịpụrụ okwu niile nke onye amụma iji kwadoo ajenda nke onwe, nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ma ọ bụ nke ego, ma ọ bụ ihe ọzọ, bụ ịgba mbọ imegherị onye amụma anya, ịghara iso ya” (“Ume Anyị Nwere ike Ịghọ Ọdịda Anyị” [Brigham Young University devotional, June 7, 1992], 7, speeches.byu.edu).

    Onyeisi Henry B. Eyring gbara ama: “Ozizi na-enweta ike ya dị ka Mmụọ Nsọ na-akwado na ọ bụ eziokwu. … Niihi na anyị chọrọ Mmụọ Nsọ, anyị ahaghị ị na-agba ama ma kpachapụ anya ka ahapụ ịgafe karịa nkuzi ezigbo ozizi. Mmụọ Nsọ bụ Mmụọ nke Eziokwu. Nkwado eziokwu Ya ka ana anabata site na anyị igbochi ịma amụma ntapịa nke onwe. Nke ahụ nwere ike ịra ahụ ime. … Ọ na-eto akpịrị ịgba mbọ ime ihe dị ọhụụ ma ọ bụ nke ịkpachara anya kpakee mmụọ. Mana anyị na-anabata Mmụọ Nsọ dị ka onye nsiso anyị mgbe anyị kpachapụrụ anya ikuzi naanị ezigbo ozizi. Otu niime ụzọ ndị kachasị mma iji gbochie ọbụna ịgaru nso ozizi ụgha bụ ị họrọ ịdị mfe n’ikuzi nkuzi anyị. Ana enweta nchekwa site na-ịdị mfe, ma ihe dị obere na-efu” (“Ike nke Ikuzi Ozizi,” Liahona, Julaị 1999, 86).

    Okenye Dale G. Renlund kuziri:“Ịchọ nghọta kacha ukwuu bụ otu akụkụ dị mkpa nke mwulite nke ime mmụọ anyị, mana biko kpachara anya. Iche echiche a gaghị enwe ike ịnọchi mkpughe. Nchefe echiche agaghị eduba na mmata ihe nke ime mmụọ kacha ukwuu, mana o nwere ike duba anyị na nduhie ma ọ bụ bupụ echiche anyị site niihe nke ekpugheworo” (“Ọdịdị Si na chi na Akaraka Dị Ebighị ebi Gị,” Liahona, Me 2022, 74).

  41. Lee Matiu 23:23 Onyeisi Josef S. Smith dọrọ aka na ntị: “Ọ bụ ezigbo ihe nzuzu iwere otu iberibe eziokwu ma mee ya dị ka ọ bụ ihe dum. … Ụkpụrụ niile nke Ozi ọma Kraịst ekpughere dịcha mkpa ma dị oke mkpa niime atụmatụ nke nzọpụta.” Ọ garaniihu kọwaa: “Ọ bụ ma ọbụghị atụmatụ ziri ezi ma ọ bụ na ọ bụ ozizi zuru oke iwere otu niime ndị a, gụpụta ya iche site na atụmatụ dum nke ozi ọma bụ eziokwu, mere ya ọrụ na-abụghị aka ọrụ pụrụ iche, ma dabere na ya maka nzọpụta na ọganiihu anyị. … Ha niile dịcha mkpa” (Gospel Doctrine5th edition [1939], 122).

    Okenye Neal A. Maxwell kọwara: “Ụkpụrụ niile nke ozi ọma… chọrọ ndabakọrịta. Anyị gawara iche iche site n’ebe onye na ibe ya nọ ma ọ nọpụ iche, ntapịa niile na ntinye n’ọrụ niile nke ụmụ mmadụ banyere ozizi ndị a nwere ike ịgba ara. Ịhụnaanya, ọ bụrụ na-ejikwaghị ya site na iwu nsọ nke asaa, nwere ike ghọọ nke anụ ahụ. Iwu nsọ nke ise kwusiri ike ebe o hiri ụda banyere ịkwanyere ndị nne na nna ugwu, ma ọ bụghị ma ejikwara ya site na iwu nsọ nke mbụ, nwere ike nwee ndapụta nke nrube isi na-enweghị ọnọdụ nye ndị nne na nna na-emehie karịa inye Chineke. … Ọbụna ndidi dị nhata nha site na ‘ịba mba mgbe ụfọdụ jiri oke olu, mgbe Mmụọ Nsọ kwalitere gị’ [Ozizi na Ọgbụgba ndụ 121:43]” (“Lee, Onye iro ahụ Agbakụtawo Aka,” Ensign, Me 1993, 78–79).

    Onyeisi Marion G. Romney kuziri, “Inyochagharị [akwụkwọ nsọ] niihi ebumnuuche nke ịchọta ihe ha na-akụzi dị ka a tụrụ iwu site na Jizọs bụ ihe nta site na ịchụgbugharị ha niihi ebumnuuche nke ịchọta edereede ndị nke enwere ike ifanye n’ọrụ iji kwadoo mkpebi ebuworo ụzọ mee” (“Ndekọihe ndị Bara Oke Uru,” Ensign, Sept. 1980, 3).

  42. Lee 1 Ndị Kọrịntị 2:4; Moronaị 6:9. Okenye Jeffrey R. Holland kwusiri ya ike mkpa ọ dị izisa ozi ọma nke Jizọs Kraịst nụzọ na-eduba na mbuli elu nke ime mmụọ site n’ike nke Mmụọ Nsọ: “Enwebeghị mgbe Onyenwe anyị nyere Nzukọ nsọ ndụmọdụ kacha bụrụ eziokwu karịa na anyị ga na-akuzi ozi ọma ‘site na Mmụọ, ọbụna Onye Nkasị obi nke ezipụrụ ikuzi eziokwu.’ Anyị na-akuzi ozi ọma ‘site na Mmụọ nke eziokwu?’ Ọ jụwo ajụjụ. Ma ọ bụ na anyị na-akuzi ya ‘n’ụzọ ọzọ? Ma ọ bụrụ na ọ bụ n’ụzọ ọzọ,’ Ọ na-adọ aka na ntị, ọ bụghị nke Chineke’ [Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 50:14, 17–18]. … E nweghị ịmụ ihe dị ebighị ebi nwere ike ime na-abụghị ime ka Mmụọ ahụ si n’eluigwe dị ọsịsọ. … Nke ahụ bụ ihe ndị otu anyị chọrọ n’ezie.… Ha chọrọ ka okwukwe ha kwụsie ike ma olileanya ha agbanwee. Ha chọrọ, na nke nke, inwete ọzụzụ site n’okwu ọma nke Chineke, iji nweta mgbam ume site n’ike niile nke eluigwe” (“Onye Nkuzi Na-abịa site n’áka Chineke,” Ensign, Me 1998, 26).

  43. Lee Alma 13:23 Ikwu okwu banyere Nna anyị nke Eluigwe, Onyeisi Russell M. Nelson gbara ama, “Ọ na-ezi ozi n’ụzọ dị mfe, dị jụụ, ma nwere ụdịrị ikwe nghọta na-ebu ajụ nke na anyị enweghị ike ghọtahie Ya” (“Nụrụ olu Ya,” Liahona, Me 2020, 89).

  44. Lee Abụ ọma 26:3; Ndị Rom 13:10; 1 Ndị Kọrịnt 13:1–8; 1 Jọn 3:18

  45. Lee Abụ ọma 40:11

  46. Lee Ndị Rom 8:16

  47. Lee 1 Samuel 2:3, Matiu 6:8; 2 Nefi 2:24; 9:20

  48. Lee Genesis 17:1; Jeremaya 32:17; 1 Nephi 7:12; Alma 26:35

  49. See Jeremiah 31:3; Jọn 4:7–10Alma 26:37

  50. Lee 2 Nephi 9; Ozizi na Ọgbụgba ndụ nile 20:17–31; Moses 6:52–62

  51. Lee Jọn 3:16; 1 Jọn 4:9-10

  52. Lee Jọn 8:29; 3 Nifaị 27:13

  53. Lee Jọn 15:121 Jọn 3:11

  54. Lee Luk 22:39–46

  55. Lee Jọn 19:16–30

  56. Lee Jọn 20:1–18

  57. Lee 1 Ndị Kọrịnt 15:20–22; Mozaya 15:20–24; 16:7–9; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 76:16–17.

  58. Lee Ọrụ 11:17–18; 1 Timothy 1:14–16; Alma 34:8–10; Moroni 6:2–3, 8; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 19:13–19.

  59. Lee Matiu 11:28–30; 2 Ndị Kọrịnt 12:7–10; Ndị Filipi 4:13; Alma 26:11–13.

  60. Lee Matiu 16:18-19:; Ndị Efesọs 2:20

  61. Lee Matiu 24:24; Ọlụ 20:28–30

  62. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 21:1–7; 21:1–7; 27:12; 110; 135:3; Agụgụala—Josef Smith 1:1–20

  63. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 1:14, 38; 43:1–7; 107:91–92