Ọgbakọ Zuru ọha
Onye Mmefu na Okporo ụzọ Nke na Eduga N’ụlọ
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2023


Onye Mmefu na Okporo ụzọ Nke na Eduga N’ụlọ

N’agbanyeghị na nhọrọ nwere ike dọba gị n’ebe dị anya site n’ebe Onye Nzọpụta na Nzukọ nsọ Ya nọ, Nna-ukwu Onye ọgwọ ọrịa guzoro n’ụzọ nke na-eduga n’ụlọ, na-anabata gị.

Otu Nwoke Nwere Ụmụ ndị Nwoke Abụọ

Ụfọdụ akpọla ya akụkọ dị mkpirisi kachasị a kọrọ.1 Ịbụ ihe a tụgharịrị na ọtụtụ puku asụsụ n’ofe ụwa, ọ ga-ekwe omume na nime puku afọ abụọ gara aga, anyanwụ adabeghị ma arụtụghị aka n’akụkọ ahụ n’otu ebe nime ụwa.

A kọrọ ya site n’aka Jizọs Kraịst, Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta anyị, onye bịara na ụwa “ịzọpụta ihe ahụ furu efu.”2 O na-eji okwu ndị a dị mfe amalite: “Otu nwoke nwere ụmụ ndị nwoke abụọ.”3

Ozugbo ka anyị nụrụ banyere esemokwu na-agbawa obi. Otu nwa nwoke4 gwara nna ya na ike ụwa agwula ya na ụlọ. Ọ chọrọ inwere onwe ya. Ọ chọrọ ịhapụ omenala na nkuzi niile nke ndị nne na nna ya. Ọ rịọrọ maka oke ya nke ihe nketa—ugbua.5

Ị nwere ike ichetụ nechiche otu obi dị nna ahụ mgbe ọ nụrụ nke a? Mgbe ọ chọpụtara na ihe nwa ya nwoke chọrọ karịsia bụ ị hapụ ezinaụlọ ahụ ma nwee ike hara ịlọghachi ọzọ ma ọlị?

Nnukwu Njem Ahụ

Ọ ga-abụrịrị na nwa nwoke ahụ nwere mmasị nke njem ahụ. Na ikpeazụ, ọ nọrọ naanị ya. Nihi ọtọghapụwo onwe ya site na ụkpụrụ na iwu niile nke omenala oge ntorobịa ya, o nweziri ike ime nhọrọ nke ya n’emeghị ka uche ndị nne na nna ya mmetụta ya. Enweghịzi ikpe ọmụma. O nwere ike ririwe ndụ n’etiti ndị na-eche echiche dị ka ya ma bie ndụ n’ụzọ nke ya.

Ka ọbatara nime mba dị anya, o mere ndị enyi ọhụrụ ngwa ngwa ma malite ibi ndụ ahụ ọ na-arọ nrọ ya. Ọ ga abụrịrị onye ọtụtụ mmadụ hụrụ n’anya, n’ihi na ọ na-emefu ego n’efu. Ndị enyi ọhụrụ ya—ndị na-eri ego ya—amaghị ya ikpe. Ha mere mmemme, kụọrọ ya aka, ma kwado nhọrọ ya niile6

Ọ bụrụ na enwere social media oge ahụ, n’ezie foto niile ebe ndị enyi ya na-achị ya ọchị gara ejupụta ọtụtụ ibe akwụkwọ: #ebigambdụkachamma! #enwebeghimobiụtọkarịrịnkea! #ekwesiwomimenkeakemgbe!

Ụnwụ Nri Ahụ

Kama nnọkọ ahụ anọteghị aka—ọ naghị emekarị. Ihe abụọ mere: nke mbụ, ego ya gwụrụ, na nke abụọ, ụnwụ nri jupụtara na ala ahụ.7

Dịka nsogbu niile na-abawanye njọ, ụjọ tụrụ ya. Onye ahụ na-adịghị akwụsị akwụsị, na-ebi ndụ ugbua enweghị ike iri otu nri, ma ọbụkwanụ ebe obibi. Olee ka ọ ga esi mee nke a?

Ọ na-emesapụ aka n’ebe ndị enyi ya nọ—ha ga enyere ya aka ugbua? A na m ahụ ya ebe ọ na-arịọ nri—nanị maka ugbua—ruo mgbe ọ ga-akwụrụ n’ụkwụ ya ọzọ.

Akwụkwọ nsọ niile gwara anyị,“O nweghị onye nyere ya.”8

Ka ọ na-agba mbọ ịdị ndụ, ọ chọtara onye ọrụ ugbo nọ n’ogbe ahụ nke goro ya n’ọrụ ịzụ ezi.9

Ka ezigbo agụụ ji ya ugbua, ka ọ nọ naanị ya, ọ ga-abụrịrị na nwa okorobịa ahụ nọ na-eche otu ihe niile siri jọọ oke njọ.

Ọ bụghị naanị afọ ghe oghe bụ nsogbu ya. Ọ bụ mkpụrụ obi ghekwa oghe. O kwenyebụrụ na imezu ọchịchọ nke ụwa ya ge-eme ya obi ụtọ, na iwu niile nke ezi omume ga-abụ ihe mgbochi nye obi ụtọ ahụ. Ugbua ọ matala ihe. Ma oh, kedu ọnụ ahịa ọ kwụrụ maka ọmụma ihe ahụ!10

Dịka agụụ nke anụ arụ na ime mmụọ na-abawanye, echiche ya niile laghachiri ebe nna ya nọ. Ọ ga-enyere ya aka mgbe ihe niile a mechara? Ọ bụna onye kachasị dị umeala n’obi n’etiti ndị odibo nna ya nwere ihe-oriri na ebe-mgbaba n’oke ifufe niile.

Kama ọ ga-alaghachi nye nna ya?

Ma ọlị.

Kwupụtara obodo ya na o mefuola ihe nketa ya?

Ọgaghị ekwe omume.

Hụ ndị agbata obi ndị dọworo ya aka na ntị n’ezie na ọ na-emenye ezinaụlọ ya ihere ma na-agbawa ndị mụrụ ya obi? Laghachikwuru ndị enyi ya ochie ka o tochara ọnụ na tọghapuwo onwe ya?

Enweghị ike idi.

Kama agụụ ahụ, owu ọmụma, na nchegharị ekweghị apụ apụ—ruo “mgbe o nwetara onwe ya.”11

Ọ maara ihe o kwesịrị ime.

Nlọghachi ahụ

Ugbua ka anyị laghachi ebe nna ahụ, nna ukwu nke ụlọ obi gbawara agbawa. Ole ọtụtụ narị narị, ikekwa puku puku, nke awa ole ka o jiworo na-eche banyere nwa ya nwoke?

Ugboro ole ka o ledara anya n’ụzọ ahụ nwa ya nwoke jere ma chee maka ihe lara n’iyi nke o nwere mgbe nwa ya nwoke na-apụ? Ekpere ole ka okperela nime abalị, na-arịọ Chineke ka ọ dịrị nwa ya mma, ka ọ chọpụta eziokwu, ka o were lọta?

Ma mgbe ahụ otu ụbọchị, nna ahụ lepụrụ anya n’ụzọ ahụ—ụzọ nke n’eduga n’ụlọ— ma hụ onye nọ ebe anya na-abịakwute ya.

O kwere omume?

N’agbenyeghị na onye ahụ nọ ebe dị anya, nna ahụ maara n’otu ntabi anya na ọ bụ nwa ya nwoke.

Ọ gbakwuru ya, makụọ ya, ma susuo ya ọnụ.12

“Nna,” ka nwa nwoke ahụ tiri, nime okwu ọ mụrụla puku ugboro, “E mmehiela m eluigwe na gị. E tozughị kwa m oke ịkpọ m nwa gị nwoke. Ihe niile m chọrọ bụ ka ị were m dị ka onye ọrụ e goro ego.”13

Kama nna ahụ ekweghị ka o kwucha. Anya mmiri juru ya nanya, o nyere ndị ọrụ ya iwu: “Weta uwe-nbokwasi kachasị mma n’ụlọ ma tụkwasị ya n’ubu nke nwa m nwoke. Tinye ọla-aka na mkpịsị aka ya na akpụkpọ ụkwụ n’ọkpa ya. Mee oriri nke ọńụ. Nwa m nwoke alọtala!”14

Mmemme Ahụ

Nime ụlọ ọrụ m ka ekowere ihe osise site n’aka omenka German Richard Burde. Harriet na Mụ hụrụ eserese a n’anya. Ọ na-egosịpụta otu ọnọdụ dị nrọ site nilu nke Onye Nzọpụta n’ụzọ miri emi.

Foto, oyiyi
Nlaghachi nke Nwa Mmefu.

Ebe onye ọbụla na-enwe ọńụ nke ukwuu maka nlọghachi nke nwa nwoke ahụ, otu onye enweghị— nwanne ya nwoke nke okenye.15

Ọ na-ebu ụfọdụ ihe ibu mmetụta uche.

Ọ nọrọla ebe ahụ mgbe nwanne ya nwoke rịọrọ ihe nketa ya. O jiri anya ya hụ na nna ya na-eru uju nke ukwuu.

Kemgbe nwanne ya nwoke hapụrụ, ọ nara agbalị ị buli ibu nna ya bu. Kwa ụbọchị, ọ rụrụ ọrụ iweghachi obi nna ya tiwara etiwa.

Ma ugbua nwa mmefu a lọghachila, ma ndị mmadụ akwụsịghị ilegide nwanne ya nke na-enupụ isi anya.

“Afọ niile ndị a,” ọ na-agwa nna ya ,“ọ dịbeghị mgbe m jụrụ ime otu ihe ị jụrụ m. Ma noge ahụ niile,ị mereghim m mmemme.”16

Nna ahụ hụrụ ụmụ ya nanya zara, “Ezigbo nwa m, ihe niile m nwere bụ nke gị! Nke a bụghị maka iji ụgwọ ọrụ ma ọbụ mmemme atụnyere. Nke a bụ maka ọgwụgwọ. Nke a bụ oge anyị na-atụ anya ya maka afọ ndị a niile. Nwanne gị nwoke nwụrụ anwụ ma dị ndụ ọzọ! O furu efu ma ugbua achọtawo ya!”17

Ilu maka Oge Anyị

Ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị m hụrụ nanya, ezigbo ndị enyị m, dị ka ilu niile nke Onye Nzọpụta, nke a abụghị naanị maka ndị mmadụ biri ndụ ogologo gara aga. Ọ bụ maka mụ na gị, taa.

Onye n’etiti anyị na-ahapụbeghị ụzọ nke ịdị nsọ, na-eche echiche nzuzu na anyị ga-enweta obi ụtọ karịa na-ịga n’ụzọ nke ọdịmma onwe anyị?

Onye n’etiti anyị nke na-enwebeghị iweda onwe ya ala, obi mgbawa, na achọghị mgbaghara na ebere?

Ikekwa ụfọdụ echeela, “Ọ ga-ekwe omume ịlaghachi azụ? Ndị enyi m mbụ ha ga-akpọ m aha ruo mgbe ebighị ebi, jụ, ma gbanarị m? Ọ ka mma ifu efu? O lee ka Chineke ga-esi meghachi omume ma m nwaa ịlaghachite?

Ilu nke a na-enye anyị aziza ya.

Nna anyị nke Eluigwe ga-agbakwuru anyị, obi Ya na ejupụta nịhụnanya na ọmịiko. Ọ ga-amakụ anyị; tụkwasị uwe mwụda n’ubu anyị, mgbanaka na mkpịsị aka anyị, akpụkpọ ụkwụ n’ụkwụ anyị, ma kwuo, “Taa anyị ga-eme mmemme! N’ihi na nwa m, onye nke nwụrụ anwụ, adiwo ndụ!”

Eluigwe ga-ańụ ọńụ na nlọghachi anyị.

Ọńụ apụghị Ikwu ma Juputara N’ebube

Enwere m ike iwepụta oge ugbu a gwa unu okwu n’otu n’otu?

N’agbanyeghị ihe ọbụla nwere ike ime na ndụ unu, A na m akwado ma kwusaa okwu nke enyị m m hụrụ n’anya na Onye ozi ibe m Okenye Jeffrey R. Holland: “Ọ gaghị ekwe omume unu imikpu n’ala gafee ebe ihé na-enweghị ngwụcha nke [aja mgbaghara mmehie] nke Kraịst na-adịghị egbuke.”18

N’agbanyeghị na nhọrọ nwere ike dọba gị n’ebe dị anya site n’ebe Onye Nzọpụta na Nzukọ nsọ Ya nọ, Nna-ukwu Onye ọgwọ ọrịa guzoro n’ụzọ nke na-eduga n’ụlọ, na-anabata gị. Ma anyị dịka ndị otu nke Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst na-achọ ịsoro ịma-atụ Ya ma makụọ unu dị ka ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, dịka ndị enyi anyị. Anyị na-enwe ọńụ ma soro unu mee mmemme.

Ịlọghachite agaghị ebelata ngọzi niile nke ndị ọzọ. N’ihi na onyinye nke Nna enweghị ngwụcha, ma ihe enyere mmadụ adịghị ebelata ntakịrị ọkpara nke ndị ọzọ.19

A naghị m eme ka a ga-asị na ịlọghachi bụ ihe dị mfe ime. E nwere m ike ịgba ama nke a. O nwere ike, n’ezie, bụrụ nhọrọ kacha sie ike ị ga-enwe ike mee.

Ma A na m agba ama na oge ị kpebiri ịlaghachi ma na-eje ije n’ụzọ nke Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta anyị, ike Ya ga-aba na ndụ ma gbanwe ya.20

Ndị mmụọ ozi nọ n’eluigwe ga-ańụrị ọńụ.

Ma otu a ka anyị ga-esi, ezinaụlọ gị nime Kraịst. Emesịa, anyị mara ihe ọ dị ka ịbụ onye mmefu. Anyị niile na-adabere kwa ụbọchị na otu ike mgbaghara mmehie nke Kraịst ahụ. Anyị mara ụzọ nke a, ma anyị ga-eso gị jee ije ahụ.

Mba, ụzọ anyị agaghị enwe onwe ya pụọ na iru uju, mwute, ma ọbụ mgbu. Mana anyị bịarutere ebe a “site n’okwu nke Kraịst jiri okwukwe nke akwaa-akwụrụ n’ebe ọ nọ, na ịdabere kpam-kpam n’ịdị mma nke ya, onye bụ dike na nzọpụta.” Ma nijikọta ọnụ anyị ga “na-aga n’iru kwudesie ike nime Kraịst, na-enwe ihé zuru oke nke olileanya, na ịhụnaanya nke Chineke na nke [mmadụ] niile.”21 Anyị ga-ejkọta ọnụ “ńụrịa ọńụ nke ọnụ na-apụghị ikwu ma jupụta n’ebube,”22 nihi na Jizọs Kraist bụ ike anyị!23

Ọ bụ ekpere m na onye ọbụla nime anyị ga-anụ, nime ilu a dị omimi, olu Nna na-akpọ anyị ịbanye n’ụzọ nke na-eduga n’ụlọ—ka anyị nwee obi ike chegharịa, nata mgbaghara, ma soro ụzọ ahụ nke na-eduga azụ na Chineke anyị nwere ọmịko na obi ebere. Nke a ka m na agba-ama ma hapụrụ unu ngozi m na-aha Jịzọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. Hụrụ na Luk 15, ilu ahụ bụ otu nime atọ (atụrụ ahụ furu efu, mkpụrụ ego ahụ furu efu, na nwa-nwoke ahụ furu efu) nke na-egosi uru nke ihe ndị furu efu bara na mmemme a na-eme mgbe a chọtara ihe ahụ furu efu.

  2. Luk 19:10.

  3. Luk 15:11.

  4. Nwa nwoke a nwere ike ịbụ nwata. Ọ lụbeghị nwunye, nke nwere ike ịbụ ihe na-egosi na ọ bụ okorobịa, ma ọ bụghị nwata nke mere na o nweghị ike ịchọ ihe nketa ya ma hapụ ụlọ ozugho ọ nwetara ya.

  5. Site na iwu na omenala nke ndị Juu, nke okenye ụmụ nwoke abụọ nwere ikike inweta ụzọ abụọ n’ụzọ atọ nke ihe nketa nna ahụ. Nwa nwoke nke nta, ya mere, nwere ikike inweta otu ụzọ n’ụzọ atọ. (Lee Ditronomị 21:17.)

  6. Lee Luk 15:13.

  7. Lee Luk 15:14.

  8. Luk 15:16.

  9. Nye ndị Juu, a na-ewere ezi ka ihe “adịghị ọcha” (lee Ditronomị 14:8) ma na-akpasu iwe. Ndị na-eme omenala ndị Juu agaraghị azụ ezi, nke na-egosi na onye nlekọta ahụ bụ onye Gentile. Ọ nwere kwa ike gosi otu nwa okorobịa ahụ si mee njem ka ọ ghara ịbụ onye Juu.

  10. Okenye Neal A. Maxwell kuziri: “Nezie, ọ ka mma ma ọ bụrụ na anyị dị umeala n’obi nihi okwu ahụ kama ịbụ ndị e wedara ala site n’ọnọdụ, ma nke ikpeazụ nwere ike ime! (Lee Alma 32:13-14). Ụnwụ nwere ike ịkpata agụụ ime mmụọ” (“Ndọkpụ ahụ na Ndọta nke Ụwa,” Liahona, Jan. 2001, 45).

  11. Luk 15:17.

  12. Lee Luk 15:20.

  13. Lee Luk 15:18–19, 21.

  14. Lee Luk 15:22–24.

  15. Chetakwa, nwa nwoke nke nta anataworị ihe nketa ya. Maka nke okenye, nke ahụ pụtara na ihe niile ndị ọzọ bụ nke ya. Inye nwa nke nta ihe ọbụla pụtara ịnapụ ya n’aka nwa ya nwoke nke nọrọ.

  16. Lee Luk 15:29.

  17. Lee Luk 15:31–32.

  18. Jeffrey R. Holland, “Ndị ọrụ nime Ubi vaịn,” Liahona, Me 2012, 33.

  19. Ihe enyere mmadụ adịghị ebelata ntakịrị ọkpara nke ndị ọzọ. Onye Nzọpụta kuziri ụkpụrụ a mgbe O nyere ilu ahụ nke ndị ọrụ nimeMatiu 20:1-16.

  20. Lee Alma 34:31.

  21. 2 Nifaị 31:19-20.

  22. 1 Pita 1: 8.

  23. Lee Psalm 28:7.