Ọgbakọ Zuru ọha
A Na-ekwu Ịhụnaanya N’ebe a
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2023


A Na-ekwu Ịhụnaanya N’ebe a

Ka onye ọbụla nime anyị kwuo ma nụ ịhụnaanya Ya n’ebe a, niime obi na n’ebe obibi anyị, ma niime ọkpụkpọ oku ozi ọma, emume niile, ije ozi nlekọta na ije ozi anyị.

Ndị ụmụaka Praịmarị anyị na-agụ, “A Na-ekwu ịhụnaanya n’ebe a.”1

E nwere oge m nyere Nwanne nwanyị Gong otu ntakịrị ọlaolu. E mere m ka a kanye n’elu ya dot-dot, dot-dot, dot-dot-dash. Ndị mazuru koodụ nke Morse ọfụma ga-amata mkpụrụ edemede I,I U. Mana agbakwụnyere m kode nke abụọ. N’asụsụ Mandarin nke ndị China, “ai” pụtara “ịhụnaanya” Nihi ya, ekoduru ya ụzọ abụọ, ozi ahụ bụ “a hụrụ m gị naanya.” Susan ọdịmnobi, “I, ai (爱), U.”

Anyị na-ekwu ịhụnaanya jiri ọtụtụ asụsụ. A gwara m na ezi na ụlọ nke ụmụmmadụ na-asụ asụsụ dị ndụ ruru 7,168.2 Nime Nzukọ nsọ anyị na-asụ asụsụ edekọrọ ruru 575, nke nwere ọtụtụ olumba. Anyị na-ekwupụta ebumnuche, ụda ọlụ, na mmetụta uche site na nka, egwu, ịgba egwu, akara niile, ma ngosipụta nkeonwe dị n’etiti mmadụ na mmadụ.3

Taa, k’anyị kwuo maka asụsụ atọ nke ozi ọma ịhụnaanya: asụsụ nke obi dị jụụ na nsọpụrụ, asụsụ nke ije ozi na ịchụ aja, na asụsụ nke ọgbụgba ndụ isonye.

Nke mbụ, asụsụ nke obi dị jụụ na nsọpụrụ.

Jiri obi dị jụụ na nsọpụrụ, Nwanne nwanyị Gong na-ajụ ụmụntakịrị na ndị ntoroọbịa, “Kedụ otu unu siri mata na ndị nne na nna unu na ndị ezi na ụlọ unu hụrụ unu naanya?”

Na Guatemala, ụmụntakịrị kwuru, “Nne na nna m na-arụsi ọrụ ike iji nye ndị ezi na ụlọ anyị ihe oriri.” Na North America, ụmụntakịrị kwuru, “Ndị nne na nna m na-agụ akụkọ ma na-akpọba m n’akwụm n’abalị.” N’Ala Nsọ, ụmụntakịrị kwuru, “Ndị nne na nna m na-echekwam.” Na Ghana, West Africa, ụmụntakịrị kwụrụ, “Ndị nne na nna m na-enyere m aka na ebumnuche nke Ụmụntakịrị na Ndị ntoroọbịa.”

Otu nwata nwanyị kwuru, “Nagbanyeghi na ike gwụrụ ya mgbe ọ rụsiworo ọrụ ogologo ụbọchị, nne m na-apụta n’ezi igwuso m egwuruegwu.” Nne ya bere akwa mgbe ọ nụrụ na ejiri ịchụ aja ya nke kwa ụbọchị kpọrọ ihe. Otu agbọghọbịa kwuru, “Nagbanyeghi na mụ na nne m a naghị ekwekọrịta mgbe ụfọdụ, atụkwasịrị m nne m obi.” Nne ya bekwere akwa.

Mgbe ụfọdụ anyị kwesịrị ịmata na a na-anụ ma nwe obi ekele maka ịhụnaanya ekwuru n’ebe a.

Jiri obi dị jụụ na nsọpụrụ, ọgbakọ oriri nsọ anyị na ndị ọzọ na-elekwasị anya na Jizọs Kraịst. Anyị ji nsọpụrụ ekwu maka Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst, nke dịịrị onwe ma dịrị ire, nabụghị naanị nke aja mgbaghara mmehie nke igbirigbi ọnụ. Anyị na-akpọ Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst eweghachitere site na aha Ya, Nzukọ-nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndi nsọ Ụbọchi Ikpeazụ a. Anyị ji asụsụ ekpere dị nsọpụrụ mgbe anyị na-akpọ Nna nke Eluigwe ma nsọpụrụ si niime obi dị jụụ mgbe anyị na-ekwukọrịtara onwe anyị okwu. Dị ka anyị na-amata na Jizọs Kraịst nọ n’etiti ọgbụgba ndụ niile nke tempụl, anyị ejichaghị ike ekwu ya otu a “ị ga tempụl” kama ọ bụzi otu a karịa “ịbịakwute Jizọs Kraịst niime ụlọ nke Onyenwe anyị.” Ọgbụgba ndụ ọbụla na-eme ntaka nke a, “A Na-ekwu Ịhụnaanya n’ebe a.”

Ndị otu ọhụrụ na-ekwu na mkpụrụokwu nke Nzukọ nsọ bụ nke na-achọkarị nkọwa. Echiche nke a na-atọ anyị ọchị na “stake house” nwere ike ịpụta nrị abalị nke anụ ehi; “ward buidling” nwere ike ịbụ ụlọ ọgwụ; “opening exercises” nwere ike ịkpọ anyị oku ịme isi, ubu, ikpere, na mkpịsị ụkwụ n’ebe ogige ụgbọala nke Nzukọ nsọ. Mana, biko, k’anyị nwee nghọta ma nwe obi ebere dị ka anyị na-amụkọrịta asụsụ ọhụrụ nke ịhụnaanya ọnụ. Dị ka onye ọhụrụ na Nzukọ nsọ, otu onye atọghatara atọghata ka agwara na uwe ya agbadaghị agbada. Kama iwe iwe, ọ zaghachiri n’ezie, “Atọghatawo obi m, biko nwee ndịdi dị ka uwe m chụkwutem.”4

Okwu nịịle anyị na-ekwu nwere ike ịkpọta anyị nso ruo ma ọ bụ chụpụ anyị site na ndị n’eso Kraịst na ndị enyị ndị ọzọ. Mgbe ụfọdụ anyị na-ekwu maka ọru mgbasa oziọma, ọrụ nke tempụl, ọrụ obiọma na ọdịmma n’ụzọ nwere ike ime ndị ọzọ chee n’anyị kwere n’anyị n’eme ọrụ ndịa n’aka anyị. K’anyị n’oge niile jiri obi dị jụụ na obi ekele dị nsọpụrụ kwuo maka ọrụ na otuto nke Chineke ma ikwesi ekwesi, na obi ebere, na amara nke Jizọs Kraịst na aja mmehie Ya.5

Nke abụọ, asụsụ ozi ọma nke ije ozi na ịchụ aja.

Dị ka anyị na-agbakọ ọzọ na Nzukọ nsọ izuụka ọbụla iji sọpụrụ ma ṅụrịa ọṅụ nime ụbọchị Ezumiike, anyị nwere ike gosipụta ọgbụgba ndụ itinye uchu anyị n’ebe Jizọs Kraịst nọ ma n’ebe onye ọbụla niime anyị nọ site n’ọkpụkpọ oku niile anyị nke Nzukọ nsọ, mkparịkọta, mmekọrịta, na ije ozi.

Mgbe m jụrụ ndị ndu Nzukọ nsọ ime obodo ihe na-echegbu ha, ndị ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị kwuru, “Ụfọdụ ndị otu anyị anaghị anabata ọkpụkpọ oku nke Nzukọ nsọ.” Ọkpụkpọ oku ijeere Onyenwe anyị na ibe anyị ozi niime Nzukọ nsọ Ya na-enye ohere iji mụbaa ọmịiko, ikike, na umeala. Dị ka a na-edopu anyị iche, anyị nwere ike nata mkpate mmụọ nke Onyenwe anyị iji bulie ma gbaa ndị ọzọ na onwe anyị ume. N’ezie, ọnọdụ na oge ndị ahụ na-agbanwe agbanwe niime ndụ anyị nwere ike metụta ịdị ike eji eje ozi, ma na nchekube, ọ gaghị emetụta ọchịchọ anyị ma ọlị. Isoro Eze Benjamin, anyị ga-ekwu, “Ọbụrụ na m nwere a gaara m enye”6 ma nye ihe niile anyị nwere ike.

Ndị ndu stek na nke ngalaba ukwu, k’anyị mee nke dịịrị anyị. Dị ka anyị na-akpọ (ma na-atọghapụ) ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị ije ozi niime Nzukọ nsọ nke Onyenwe anyị, biko k’anyị jiri nkwanye ugwu na mkpate mmụọ mee ya. Nyere onye ọbụla aka mata na ejiri ha kpọrọ ihe ma na ha nwere ike ị ga nke ọma. Biko gị na ndị ụmụnnne nwanyị bụ ndị ndu dụkọrịta ọdụ ma gee ha ntị. K’anyị cheta, dị ka Onyeisi J. Reuben Clark kuziri, niime Nzukọ nsọ nke Onyenwe anyị anyị na-eje ozi ebe akpọrọ anyị, “ebe mmadụ anaghị achọ ya achọ ma ọ bụ jụ ya ajụ.”7

Mgbe Nwanne nwanyị Gong na Mụ gbara akwụkwọ, Okenye David B. Haight nyere ndụmọdụ: “Jide otu ọkpụkpọ oku niime Nzukọ nsọ mgbe niile. Tụmadị mgbe ndụ jupụtara nihe aga eme eme,” O kwuru, “ị kwesịrị ịnwe mmetụta ịhụnaanya Onyenwe anyị maka ndị ahụ ị na-ejere ozi ma maka gị onwe gị dị ka ị na-eje ozi.” A na m ekwe nkwa na a na-ekwu ịhụnaanya n’ebe a, ma ebe niile dị ka anyị na-aza eeh nye ndị ndu Nzukọ nsọ maka ijeere Onyenwe anyị ozi niime Nzukọ nsọ Ya site na Mmụọ Ya na ọgbụgba ndụ anyị.

Nzukọ nsọ nke Onyenwe anyị eweghahitere nwere ike bụrụ ebe nzulite nke obodo Zayọn. Dị ka anyị na-efe ofufe, na-eje ozi, na-enwe obi ụtọ, ma na-amukọrịta maka ịhụnaanya Ya ọnụ, anyị na emikpukọrịta onwe anyị niime ozi ọma Ya. Anyị nwere ike nwee ekweghi ekwe banyere ndọrọ ndọrọ ma ọ bụ ihe obodo ndị ọzọ mana nwete nkwekọ dị ka anyị na-agụkọ egwu ọnụ niime otu abụ nke ngalaba ukwu. Anyị na-azulite njikọ ma na-ebụso nnọpụ iche agha dị ka anyị mgbe na mgbe n’eji obi anyị niile eje ozi nlekọta n’ebe obibi ibe anyị nọ ma n’ebe agbatobi anyị niile.

N’oge nleta ndị otu ha na ndị isi stek, a na m ahụta ịhụnaanya ha nke dị omimi maka ndị otu niime ọnọdụ ọbụla. Dị ka anyị na-anya gafee ebe obibi ndị otu nke stek ya, otu onyeisi stek kwuru na m’anyị bi n’ebe obibi nwere ọdọmmiri a na-egwu egwu ma ọ bụ n’ebe obibi ala ya ruru inyi, ije ozi Nzukọ nsọ bụ ohere nke mgbe ụfọdụ na-agụnyekota ịchụ aja. Nagbanyeghi, o jiri amamịhe chọpụta, mgbe anyị na-eje ozi ma na-achụkọrịta aja niime ozi ọma ọnụ, anyị na-achọtakarị ntakịrị mmejọ ma chọta nnukwu udo. Mgbe anyị nyere Ya ohere, Jizọs Kraịst na-enyere anyị aka kwuo maka ịhụnaanya Ya n’ebe a.

N’oge sọma nke a, ezi na ụlọ anyị zutere ndị otu ọma Nzukọ nsọ na ndị enyi na Loughborough na Oxford, England. Ọgbakọ ndị ahụ nke nwere isi chetara m otu emume niile ngalaba ukwu nke mkparịkọta na ije ozi si nwee ike iji wulite njikọ ozi ọma nke ọhụrụ na nke na-adịgide. Ruo oge ụfọdụ ugbu a enwetawo m mmetụta na, n’ọtụtụ ebe niime Nzukọ nsọ, emume ngalaba ukwu ole n’ole ọzọ, tụmadị nke ahaziri ma mejupụta jiri ebumnuche ozi ọma, nwere ike jikọta anyị ọnụ jiri isonye na ịdị n’otu karịrị akarị.

Otu onyeisi na ndị kọọmit emume ngalaba ukwu nwere mkpate mmụọ na-azụlite ndị mmadụ na otu obodo Ndị nsọ. Emume nke ha haziri ọfụma na-enyere onye niile aka mata na eji ha kpọrọ ihe, na ha sonyere, ma na akpọrọ ha oku itinye aka n’ebe dị mkpa. Ụdị emume ndị ahụ na-ewulite mmekọ nagbenyeghi afọ a gbara na nzulite, rọpụta ncheta n’adịgide, ma enwere ike ị mee ha jiri ntakịrị ego ma ọ bụ n’ejighi. Emume ozi ọma ndị n’eme obi ụtọ na-adọtakwa ndị agbata obi na ndị enyi.

Mkparịta na ije ozi mgbe ụfọdụ na-agakọta ọnụ. Ndị Okenye nta niile maara na ọ bụrụ na ịchọrọ nnọọ ị mata mmadụ, mgbe ahụ guzo n’akụkụ n’akụkụ n’elu ubube ma tee agba n’ọrụ ije ozi.

Foto, oyiyi
Ndị Okenye nta n’ete agba n’oge ọrụ ije ozi.

N’ezie, enweghi emume nke otu onye ma nke ezi na ụlọ zuru oke. Anyị niile chọrọ enyemaka iji kwuo ịhụnaanya n’ebe a n’ụzọ ka mma. “Ịhụnaanya zuruoke na-achụpụ egwu.”8 Okwukwe, ije ozi, na ịchụ aja na-adọtaa anyị gafee onwe anyị ma bịarukwuo Onye Nzọpụta anyị nso. Ka ije ozi anyị na ịchụ aja anyị n’eme niime Ya na-enwekwu ọmịiko, kwesị ntụkwasị obi, na achọghị ọdịmma naanị nke onwe, mgbe ahụ ka anyị ga-amalite ịghọta ọmịiko na amara aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst nwere maka anyị.

Ma nke ahụ na-akpọta anyị ruo n’asụsụ ozi ọma na nke ọgbụgba ndụ isonye.

Anyị bi niime ụwa na-eche maka naanị onwe. Ọtụtụ ihe bụ “A họọrọ m onwe m.” Ọ dị nnọọ nanyị kwere na-ọbụ anyị kacha mara mmasị nke onwe anyị ma otu anyị si achụ ya.

Mana nke a abụghị eziokwu. Jizọs Kraịst na-egosipụta niime onwe ya eziokwu nke a dị ike na nke n’adịghị aka nka:

“Nihi na onye ọbụla nke na-achọ ịzọpụta ndụ ya, ọ ga atufu ya: ma onye ọbụla tufuru ndụ ya nihi m ga ahụ ya.”

“N’ihi na uru gịnị ka ọ ga-abara nwoke [ma ọ bụ nwanyị], ma ọ buru na o ga-erita uwa dum n’uru, ma wee tufuo mkpụrụ obi ya?”9

Jizọs Kraịst na-enye ụzọ ka mma—njikọ niile ewulitere n’elu ọgbụgba ndụ sinachi, dị ike karịa ụdọ nile nke ọnwụ. Ọgbụgba ndụ isonye anyị na Chineke na anyị n’ibe anyị nwere ike gwọọ ma mee ka njikọ niile ndị anyị kacha hụ naanya dịrị nsọ. Nke bụ eziokwu, Ọ maara ma hụ anyị naanya karịa otu anyị si mara ma ọ bụ hụ onwe anyị naanya. Nke bụ eziokwu, mgbe anyị ji ihe nile anyị bụ gbaa ndụ, anyị nwere ike ịbụ karịa ihe anyị bụ. Ike na amamiihe Chineke nwere ike jiri onyinye ọbụla dị mma gọzie anyị, n’oge ma n’ụzọ Ya.

Artificial intelligence (AI) enweela ọganihu dị ukwuu na ntụgharị asụsụ. Ụbọchị ndị ahụ agafeworịrị mgbe otu kọmputa nwere ike tụgharịa akpaalaokwu nke a “Mmụọ ahụ dị njikere, mana anụ ahụ adịghị ike” dị ka “Mmanya ahụ dị mma, mana anụ ahụ emebiwo.” Ọ na-akpalị mmasị na igosigharị ọtụtụ ọmụmatụ nke asụsụ na-akacha akụziri kọmputa asụsụ karịa ikụziri kọmpụta iwu niile nke ụtọ asụsụ.

N’otu aka ahụ, nhụmịhe nke onwe anyị emegharịrị mgbe na mgbe nwere ike kacha bụrụ ụzọ ime mmụọ anyị ji amụta asụsụ niile nke ozi ọma na nsọpụrụ, ije ozi na ịchụ aja, ma ọgbụgba ndụ isonye.

Nihi nke a, kedụ na otu Jizọs Kraịst si na-ekwuru gị okwu jiri ịhụnaanya?

Olee ebe na otu isi na-anụ ịhụnanya Ya ka a na-ekwu ya n’ebe a?

Ka onye ọbụla nime anyị kwuo ma nụ ịhụnaanya Ya n’ebe a, niime obi na n’ebe obibi anyị, ma niime ọkpụkpọ oku ozi ọma, emume niile, ije ozi nlekọta na ije ozi anyị.

Nime atụmatụ nke Chineke, anyị n’otu n’otu ga-agafe otu ụbọchị site na ndụ nke a gafee na ndụ nke ọzọ. Mgbe anyị ga-ezute Onyenwe anyị, a na m atule uche ka ọ na-ekwu, jiri okwuọnụ niile nke nkuzi na nkwa. “Ịhụnaanya m ka a na-ekwu n’ebe a.” Site na aha dị nsọ nke Jịzọs Kraịst, amen