Ọgbakọ Zuru ọha
Chee Maka Celestial!
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2023


Chee Maka Celestial!

Nhọrọ gị niile ga-ekpebi ebe ị ga-ebi mgbe ebighị ebi, ụdị anụ ahụ ị ga-eji bilite nọnwụ, na ndị gị na ha ga-ebi mgbe ebighị ebi.

Ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, eji m obi ekele na-agwa unu okwu taa. N’afọ ndụ m, ụbọchị ọhụrụ ọbụla na-eweta ihe ịtụnanya na ihe ịma-aka dị egwu. Izu-ụka atọ gara aga, E merụrụ m ahụ na akwara azụ m. Ya mere, ebe m nyeferela ihe karịrị okwu ọgbakọ zuru ọha 100 guzoro ọtọ, taa echere m na m ga-eme otu ahụ ịnọdụ ala. Ekpere m bụ ka Mmụọ ahụ ga-eburu ozi m tinye na obi unu taa.

E mere m emume ụbọchị ọmụmụ m na nso nso a wee si otu ahụ malite afọ 100 nke ndụ m. A na-ajụkarị m ihe nzuzo nke ịdị ogologo ndụ. Ajụjụ nke ka mma ga-abụ “Gịnị ka m mụtarala na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ narị afọ nke ndụ?

Oge agaghị ekwe m taa ị zaa ajụjụ ahụ nke ọma, mana ka m kọọ otu nime ihe mmụta kacha mkpa m mụtara.

A mụtala m na atụmatụ nke Nna nke Eluigwe maka anyị dị ebube, na ihe anyị mere nime ndụ a dị ezigbo mkpa, ma na aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta bụ ihe mere atụmatụ nke Nna anyị jiri kwee omume.1

Dịka m gbaworo mgba oke mgbu nke mmerụ ahụ m nwere na nso nso a kpatara, enwere m ekele miri emi maka Jizọs Kraịst na onyinye a na-apụghị ịghota nke aja mgbaghara mmehie Ya. Chee maka ya! Onye Nzọpụta ahụ tara ahụhụ “mgbu na mkpagbu na ọnwụnwa niile n’ụdị ọbụla”2 ka onwe ike ịkasi anyị obi, gwọọ anyị, napụta anyị na oge mkpa.3 Jizọs Kraịst kọwara nhụmihe Ya na Getsemani na Calvarị: “Ahụhụ nke mere ka mụ onwe m, ọbụna Chineke, onye kachasị elu, maa jijiji n’ihi mgbu, ma gbaa ọbara site na ntakịrị oghere ọbụla.”4 Ihe mmerụ ahụ m emewo ka m na-atụgharị uche ugboro ugboro banyere “ịdị ukwuu nke Onye Nsọ nke Izrel.”5 N’oge ọgwụgwọ m, Onyenwe anyị egosipụtawo ike dị nsọ Ya n’ụzọ niile nke udo na enweghị mgbagha

N’ihi aja mgbaghara mmehie na-enweghị nsọtụ nke Jizọs Kraịst, atụmatụ nke Nna anyị nke Eluigwe bụ atụmatụ zuru oke! Nghọta nke atụmatụ nke Chineke dị egwu na-ewepụ ihe omimi ahụ na ndụ na ihe ejighi n’aka na ọdịnihu anyị. Ọ na enye onye ọbụla nime anyị ị họrọ otu anyị ga-esi bie ndụ ebe a na ụwa na ebe anyị ga-ebi mgbe ebighị ebi. Echiche na-enweghị isi na anyị kwesịrị “iri ihe, ńụọ ihe, ma nwee ọńụ, n’ihi na echi anyị ga-anwụ; ma ọ ga-adịrị anyị mma”6 bụ otu nime ụgha na-enweghị isi na mbara igwe.

Ebe a bụ nnukwu ozi nke atụmatụ nke Chineke: ihe ndị ga-eme ka ndụ gị nke ịnwụ anwụ bụrụ nke kacha mma o nwere ike bụrụ otu ihe ahụ nke ga-eme ka ndụ gị mgbe ebighị ebi kacha mma o nwere ike bụrụ! Taa, iji nyere gị aka tozuo maka ngọzi niile bara ụba nke Nna nke Eluigwe dobere gị, A na m akpọ gị oku ka ị mụta omume nke “iche maka celestial”!7 Iche maka celestial pụtara inwe obi ime mmụọ. Anyị na-amụta site na onye amụma Jekọb nke Akwụkwọ nke Mọmọn na “itinye uche n’ihe nke mmụọ bụ ndụ ebighị ebi.”8

Ndụ anụ ahụ bụ klaasị nke mmụta nịmụ ịhọrọ ihe ndị kachasị mkpa nke ndụ ebighị ebi. Ọtụtụ mmadụ na-ebi ndụ ka a ga-asị na ndụ a bụ naanị ihe dị. Ka o si dị, nhọrọ gị niile taa ga-ekpebi ihe atọ: ebe ị ga-ebi mgbe ebighị ebi, ụdị anụ ahụ ị ga-eji bilite nọnwụ, na ndị gị na ha ga-ebi mgbe ebighị ebi. Ya mere, chee maka celestial.

Na ozi nke mbụ m dịka Onye Isi nke Nzukọ-nsọ, a gbara m unu ume ka unu bido ma buru njedebe ya n’uche. Nke a pụtara ime alaeze seletịal ọchịchọ ebighị ebi nke gị ma mgbe ahụ kpachara anya lee ebe mkpebi gị niile na elu ụwa ga-edobe gị nime ụwa nke na-abịa.9

Onyenwe anyị kuziri nke ọma na naanị ndị nwoke na ndị nwanyị ndị arachiri ka dị na nwunye nime tempụl, ma dobe ọgbụgba-ndụ ha niile, ga-anọkọ ọnụ n’ụwa ebighị ebi. O kwuru: “Ọgbụgba ndụ nile, ọrụngo nile, enweghị onwe nile, nkwa di nsọ nile, ịn̄ụ-iyi nile, nkwa nile, ihe omume nile, njikọ nile, otu nile, ma-ọbu nchekwube nile, ndị nke na-emeghị na banye na ya na rachie site na Mụọ Nsọ nke e kwere na nkwa … nwere ọgwụgwụ mgbe ndị mmadụ nwụrụ ọnwụ.”10

Ya mere, ọ bụrụ na anyị na-amaghị ihe họrọ ibi ndụ iwu telestial ugbu a, anyị na-ahọrọ ibilite n’ọnwụ jiri ahụ telestial. Anyị na-ahọrọ na anyị agaghị anọkọ anyị na ezinaụlọ anyị ruo mgbe ebighị ebi.

Ya mere, ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị m hụrụ naanya, kedụ otu na kedụ ebe ma gịnị na-onye ka gị chọrọ ibi ndụ ebigh ebi? Ị ga-ahọrọ.11

Mgbe ị na-eme mkpebi niile, A na m asị ka ilezie anya—anya mgbe ebighị ebi. Tinye Jizọs Kraịst mbụ, n’ihi na ndụ ebighị ebi gị dabere na okwukwe gị nime Ya na Aja mgbaghara mmehie Ya.12 Ọ daberekwa na nrube isi gị nye iwu Ya niile. Irube isi na-emepe ụzọ maka inwe ọńụ na ndụ gị taa na nnukwu ụgwọ ọrụ ebighị ebi echi.

Mgbe nsogbu chere gị ihu, chee maka celestial! Mgbe a nwara gị site nọnwụnwa, chee maka celestial! Mgbe ndụ ma ọbụ ndị ịhụnaanya gharịpụrụ gị, chee maka celestial! Mgbe mmadụ nwụchuru ọnwụ, chee maka celestial. Mgbe mmadụ nọ nime oke ọrịa ogologo oge, chee maka celestial. Mgbe nrụgide nke ndụ na-adakwasị gị, chee maka celestial! Dịka ị na-agbake site na ihe mberede ma ọbụ mmerụ ahụ dịka m na-eme ugbu a, chee maka celestial!

Ka ị na-elekwasị anya n’iche maka celestial na-atu anya izute mmegide.13 Ọtụtụ afọ gara aga, otu onye ọrụ ibe m katọrọ m maka inwe “nnukwu tempụl” nime m, ma ihe karịrị otu onye nlekọta tara m ahụhụ n’ihi okwukwe m. E kwenyesịrị m ike, na agbanyeghị, na iche maka Celestial kwalitere ọrụ m.

Dịka ị na-eche maka celestial, obi gị ga-eji nwayọọ na-agbanwe. Ị ga-achọ ịdị na-ekpe ekpere ugboro ugboro na ezi obi. Biko e kwela ka ekpere gị dị ka ndetu ihe ahịa. Echiche nke Onyenwe anyị karịrị amamihe nke ịnwụ anwụ. Aziza Ya nye ekpere unu nwere ike ịtụ unu naanya ma ọ ga-enyere unu aka iche maka celestial.

Tulee ihe Onyenwe anyị zara Josef Smit mgbe ọ rịọrọ maka enyem aka n’ụlọ mkpọrọ Libati. Onyenwe anyị kuziri Onye amụma ahụ na ụfụ niile ga-enye ya uche ma bụrụ maka ọdịmma nke ya.14 “Ọ bụrụ na ị nagide ya nke ọma,” Onyenwe anyị kwere nkwa, “Chineke ga-ebuli gị n’elu.”15 Onyenwe anyị naara akuziri Josef iche maka celestial ma lee anya maka ihe nrita nke ebighị ebi karịa ịlekwasị anya na ihe mgbu niile nke ụbọchị ahụ. Ekpere anyị niile nwere ike bụrụ—ma kwesịrị ịbụ—mkparịta ụka dị ndụ anyị na Nna nke Eluigwe.

Dịka ị na-eche maka celestial, ị ga-ahụ ebe ị na-ezere ihe ọbụlana anapụ gị ike nke nhọrọ gị. Ihe ọbụla riri ahụ—ọ bụ egwuregwu, ịgba chaa chaa, ụgwọ, ọgwụ ọjọọ, mmanya, iwe, ikiri ndịgba ọtọ, mmekọahụ, ma ọbụ ọbụna nri—na-ewe Chineke iwe. Gịnị mere? N’ihi na ihe ị na-achọsi ike na-aghọ chi gị. Ị na-ele ya karịa Yamaka nkasị obi. Ọbụrụ na gị na ihe riri gị ahụ na-alụ, chọọ enyemaka ime mmụọ na nke ọkachamara ị chọrọ. Biko ekwela ka ihe ị na-achọsi ike napu gị nnwere onwe gị isoro atụmatụ ọma nke Chineke.

Iche maka celestial gakwa enyere gị aka irube isi na iwu nke ịdị-ọcha mmekọrịta. Ihe ole na ole ga-eme ka ndụ gị sie ike ngwa ngwa karịa imebi iwu Chineke a. Maka ndị ahụ ha na Chineke gbara ọgbụgba ndụ, omume rụrụ arụ bụ otu ụzọ kacha dị ngwa iji tufuo ịgba ama gị.

Ọtụtụ nke ọnwụnwa ndị na-adịghị akwụsị akwụsị nke onye iro gụnyere imebi ịdị ọcha nke omume. Ikike nke ike ndụ bụ otu ihe ugwu nke ịbụ chineke nke Nna nke Eluigwe na-ekwe ka ụmụ Ya na anwụ anwụ mee. Ya mere, Chineke setịpụrụ ụkpụrụ nduzi niile maka ojiji nke ike a dị nsọ. Mmekọrịta nke anụ ahụ bụ naanị maka otu nwoke na otu nwanyị lụrụ di na nwunye.

Ọtụtụ nime ụwa ekweghị nke a, ma echiche ọha mmadụ abụghị onye na-ekpebi eziokwu. Onyenwe anyị ekwuola na o nweghị onye na-adịghị ọcha ga-enweta alaeze seletịal. Yabụ mgbe ị na-eme mkpebi niile gbasara omume ọma, biko chee maka celestial. Ma ọbụrụ na ị dịghị ọcha, a na m arịọ gị ka ichegharịa. Biakwute Kraịst ma nata nkwa Ya nke mgbaghara zuru oke dịka ị na-echegharị na mmehie gị niile.16

Dịka ị na-eche maka celestial, ị ga-ahụ ọnwụnwa niile na mmegide n’ụzọ ọhụrụ. Mgbe onye ị hụrụ naanya busoro eziokwu agha, chee maka celestial, ma ajụla ịgba-ama gị ajụjụ. Onye ozi Pọl buru amụma na “n’oge ikpeazụ ụfọdụ ga-esi n’okwukwe pụọ, na-enyefe igwe atụrụ na-eduhie mmụọ, na ozizi niile nke ndị mmụọ ọjọọ.”17

Ọdịghị ọgwụgwụ nye aghụghọ niile nke onye iro. Biko dịrị njikere. Anatala ndụmọdụ site n’aka ndị na-ekweghị ekwe. Chọọ odudu site na olu niile inwere ike ịtụkwasị obi— site na ndị amụma, ndị ọhụ ụzọ, na ndị mkpughe ma site nokwu ntakịrị niile nke Mmụọ Nsọ, ndị “ga-egosi gị ihe niile unu kwesịrị ime.”18 Biko rụọ ọrụ nke ime mmụọ ka iwulite ike gị ịnata mkpughe nke onwe.19

Dịka ị na-eche maka celestial, okwukwe gị ga-amụba. Mgbe m bụ nwa dọkịnta, ego a na-akwu m na ọnwa bụ $15. Otu abalị, nwunye m Dantzel jụrụ ma m nara akwụ otu ụzọ n’ụzọ iri na obere ego ahụ. A naghị m akwụ. E chegharịrị m ma bido ịkwụ $1.50 mgbakwụnyere kwa ọnwa.

Nzukọ nsọ ọ gbanwere n’ihi na anyị meliri ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri anyị? Mba n’ezie. Agbanyeghị, ị bụ onye na-akwụzu otu-ụzọ-na-ụzọ-iri gbanwere m. Mgbe ahụ ka m matara na ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri bụ ihe gbasara okwukwe, ọbụghị ego. Dịka M bụrụ onye na-akwụzu otu ụzọ n’ụzọ iri ya, windo nilie nke elu-igwe bidoro n’emepere m. A na m ekweta na ọtụtụ ohere ọkachamara na-esote bụ maka ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri niile nke kwesịrị ntụkwasị obi.20

Ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri chọrọ okwukwe, ma ọ nakwa ewulite okwukwe nime Chineke na Ọkpara Ya Ọ hụrụ n’anya.

Ịhọrọ ibi ndụ dị mma nime ụwa nke a na-enwe mmekọahụ na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-ewulite okwukwe.

Ịtinyekwu oge nime tempụl na-ewulite okwukwe. Ma ije ozi na ife-ofufe unu nime tempụl ga-enyere unu aka iche maka celestial. Tempụl bụ ebe nke mkpughe. Ebe ahụ ka a na-egosi unu ka esi aga n’ihu ndụ selestịal. Ebe ahụ ka a na-adọta unu nso n’ebe Onye Nzọpụta nọ ma nye unu ohere ka ukwuu inweta ike Ya. Ebe ahụ ka a na-eduzi unu n’idozi nsogbu ndị nọ na ndụ unu, ọbụna nsogbu ndị na-agbagwoju unu anya.

Emume nsọ na ọgbụgba-ndụ niile nke tempụl bụ ihe ndị nwere uru ebighị ebi. Anyị na-aga n’ihu na-ewu tempụl niile ndị ọzọ iji mee ka ohere ndị a dị nsọ bụrụ eziokwu nime ndụ nke onye ọbụla. Anyị nwere obi ekele ịkwpụta atụmatụ anyị niile ịrụ tempụl n’ebe ọbụla nime obodo ndị a niile.

  • Savai’i, Samoa

  • Torreón, Mexico

  • Piura, Peru

  • Huancayo, Peru

  • Viña del Mar, Chile

  • Goiânia, Brazil

  • João Pessoa, Brazil

  • Calabar, Nigeria

  • Cape Coast, Ghana

  • Luanda, Angola

  • Mbuji-Mayi, Democratic Republic of the Congo

  • Laoag, Philippines

  • Osaka, Japan

  • Kahului, Maui, Hawaii

  • Fairbanks, Alaska

  • Vancouver, Washington

  • Colorado Springs, Colorado

  • Tulsa, Oklahoma

  • Roanoke, Virginia

  • Ulaanbaatar, Mongolia

Onyenwe anyị na-eduzi anyị ịrụ tempụl ndị a inyere anyị aka ichee maka celestial. Chineke dị ndụ. Jizọs bụ Kraịst ahụ. Eweghachiwo Nzukọ nsọ Ya maka ịgọzi ụmụ nke Chineke niile. Ana m agba ama n’aha dị nsọ nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. Lee Jọn 6:38.

  2. Alma 7:11.

  3. Lee Alma 7:12.

  4. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 19:18.

  5. 2 Nifaị 9:40.

  6. 2 Nifaị 28:7.

  7. Ọ ga-adị mfe ichegharị na ịga nihu nke ime mmụọ ebe a, ka mmụọ anyị na ahụ anyị dị otu, karịa n’ụwa nke na-abịa n’etiti oge anyị ga-anwụ na oge a ga-akpọlite anyị. Dịka Amiulek kuziri ndị Zorọm dapụrụ na n’ezi ofufe “ndụ nke a bụ oge … mmadụ nwere iji kwadoo izute Chineke.” (lee Alma 34:32-35).

  8. 2 Nifaị 9:39.

  9. Lee Mosiah 4:30, ebe Eze Benjamin dụrụ ndị ya ọdụ: “ọbụrụ na unu elezighị onwe unu anya, ma echiche unu niile, na okwu unu niile, na omume unu niile, ma debe iwu-nsọ niile nke Chineke, ma gaa n’iru n’ime okwukwe … , unu ga-alarịrị-n’iyi.”

  10. Ozizi na ọgbụgba-ndụ niile 132:7; okwu ka agbakwunyere.

  11. Nezie, ike nhọrọ gị enweghị ike ịkagbu nke onye ọzọ ya na nsonazụ niile ndị na-eso. Enwere m oke ọchịchọ ka arachie mụ na ndị mụrụ m. Ka ọ dị, e chere m ruo mgbe ha họọrọ ịnata onyinye dị nsọ, mgbe ha gbara ihe karịrị afọ 80. Mgbe ahụ ka arachiri ha dị ka di na nwunye, ma anyị bụ ụmụ ka arachiri nye ha.

  12. Akwụkwọ nsọ niile na-agba aka-ebe ugboro ugboro na onyinye nke ndụ ebighị ebi dị ire naanị site na uru niile, ebere, na amara nke Onye Nzọpụta Jizọs Kraịst (lee, ịma atụ, Moronaị 7:41, lee kwa 2 Nephi 2:6–8, 27

  13. Lee 2 Nifaị 2:11.

  14. Lee Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 122:7.

  15. Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 121:8.

  16. Lee Aisaia 1:16-18; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 58:43.

  17. 1 Timothy 4:1. The next verse continues, “Speaking lies in hypocrisy; having their conscience seared with a hot iron” (amaokwu 2). Pọl kwpụtakwara na ndị niile “na-ebi ndụ nsọpụrụ Chineke nime Kraịst Jizọs ga-ata ahụhụ mkpagbu” (2 Timoti 3:12).

  18. 2 Nifaị 32:5okwu agbakwunyere. Ọ bụrụ na anyị ga-arịọ, anyị nwere ike “ị nata mkpughe n’elu mkpughe, amamiihe n’elu amamiihe” (Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 42:61).

  19. Lee Russell M. Nelson, “Mkpughe maka Nzukọ-nsọ, Mkpughe maka Ndụ Anyị,” Liahona, Mee 2018, 96.

  20. Nke a abụghị igosi mmekọrịta nke cause na effect. Ụfọdụ ndị na anaghị akwụ otu ụzọ n’ụzọ iri na enweta ohere niile, ebe ụfọdụ ndị na-akwụ otu ụzọ n’ụzọ iri anaghị enweta. Nkwa ahụ bụ na windo niile nke eluigwe gaemepere onye n’akwụ otu ụzọ n’ụzọ iri. Ụdị nke ngọzi niile ga-adị iche iche.