Ọgbakọ Zuru ọha
Karịa Dike
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2023


Karịa Dike

Jizọs Kraịst abụghị naanị dike anyị; Ọ bụ Onyenwe anyị na Eze anyị, Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta nke ụmụ mmadụ.

Site n’afọ 1856 ruo 1860, puku kwuru puku ndị mbuụzọ Ndị nsọ Ụbọchi Ikpeazụ dọọrọ ihe onwunwe ha na ụgbọaka ruo maịlụ 1,000 (1,600 km) dị ka ha mere njem gaa Ndagwurugwu Salt Lake. Afọ Otu narị iri isii na asaa gara aga n’izu ụka nke a nnọọ, na Ọktoba 4, 1856, Onyeisi Brigham Young nwere ịtụnaanya ịmata na otu ụgbọaka abụọ, nke Edward Martin na Jemis Willie na-edu, ka nọ mailụ narị kwuru narị site Salt Lake, ebe oge oyi winta na-agba na-abịa.1 Ụbọchi ahụ nnọọ na-esote ya, na-adịghị anya site n’ebe anyị na-ezute taa, Onyeisi Young guzooro niihu Ndị Nsọ ma maa ọkwa: “Ọtụtụ niime ụmụnne anyị ndị nwoke na ụmụnne nwanyị nọ n’ụzọ larịị jiri ụgbọ aka, ma a ga-akpọtarịrị ha ebe a. … Gaanụ ma kpọlatanụ ndị ahụ nọ n’ụzọ larịị ugbu a.”2

Naanị mkpụrụ ụbọchi abụọ gasịrị, igwe ndị nnapụta mbụ pụwara ịga chọọ ndị mbu ụzọ ụgbọ aka ahụ.

Onye otu nsoro Willie kọwara ọnọdụ enweghị olile anya ahụ tupu nrute nke ndịisi otu nnapụta. Ọ kwuru: “[Mgbe ahụ] nnọọ ọ dịrị ka ihe niile ọ ga-efu, … ma ya adị ka obere ihe fọdụrụ iji dị ndụ maka ya, dị ka égbè eluigwe pụtara site na mbara eluigwe chapụrụ achapụ, Chineke zara ekpere anyị. Otu ndị nnapụta, na-ewete nri na ihe ndị ọzọ eji adị … , ka ahụrụ anya. … Otu anyị si kelee Chineke maka nnapụta anyị.”3

Ndị nnapụta ndị a bụụrụ ndị dike nye ndị mbu ụzọ ahụ, n’etinye ndụ nke onwe ha n’ọghọm n’ọnọdụ ihu igwe kachasị njọ ịkpọlata ka ha ra bụ ole o kwere omume na-ebe obibi n’udo. Otu ụdị dike a bụ Ifrem Hanks.

N’etiti Ọktoba, ma amaghị maka nsogbu nke ndị ụgbọ aka ahụ, Hanks naara alọghachi n’ebe obibi ya dị niime Salt Lake site na njem mgbe, n’oge abalị, otu olu kpọlitere ya na-asị, “Ndị ụgbọ aka ahụ nọ na nsogbu ma achọrọ gị; ị ga-aga ma nyere ha aka?”

Ebe ajụjụ ahụ na-ada ya nuche, ọ gbara ọsọ laghachi Obodo ukwu Salt Lake. Ma n’ịnụta oku Onyeisi Heber C. Kimball maka ndị ọrụ obi ọma ọzọ, Hanks kwadoro ụbọchi ahụ na-esote, n’onwe ya, gaa na nnapụta ahụ. N’ịga ngwa ngwa, ọ gbafere ndị nnapụta nke ọzọ nọ n’ụzọ, ma n’irute otu Martin ahụ, Hanks chetara, “Ihe anya m hụrụ dị ka m banyere kampụ ha apụghị ihichapụ site n’echiche m … [ma] o zuru iji metụ obi nke kachasi sie ike.”4

Ifrem Hanks gagharịrị ọtụtụ ụbọchi site n’otu ụlọikwuu baa n’otu ụlọikwuu na-agọzi ndị ọrịa. Ọ kọrọ na “n’ọtụtụ oge, mgbe anyị gọziri ndị ọrịa, ma chụpụ ọrịa ndị ahụ n’aha nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, onye ahụ na-ata ahụhụ ga-ebili ozugbo; a gwọrọ ha ihe gaara abụ ozugbo.”5 Ifrem Hanks ga-abụ dike ruo mgbe ebighị ebi nye ndị mbuụzọ ụgbọaka ahụ.

N’otu aka nnapụta ahụ pụrụiche, ihe omume niile nke na-emetụta ndụ anyị na ọbụna ụzọ nke agụgụala na-abụkarị rezọọtụ nke mkpebi na mmeta ihe ndị nke ndịikom na ndịinyom n’otu n’otu—ndị omenka dị egwu, ndị sayensị, ndị ndu azụmahịa, na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ụmụ mmadụ ndị a pụrụ iche ka a na-akwanyere ugwu ọtụtụ mgbe dị ka ndị dike, jiri ihe ncheta niile na emume ncheta niile ewuru iji na-echeta nrigbu ha.

Mgbe m bụ nwata nwoke, ndị dike nke mbụ m bụụrụ ndị na-eme egwuregwu. Ncheta m ndị kacha mbụ bụ nke ị na-anakọta kaadị baseball nwere foto na ọnụ ọgụgụ niile nke ndị ọgbaa Nnukwu Ịsọmpi Baseball. “Ofufe Dike” dị ka nwata nwere ike ịtọ ụtọ ma dịrị ọcha n’obi, dị ka mgbe ụmụntakịrị na-ejikere dị ka oke dike kacha masị ha maka Halowiin. Na-agbanyeghị na anyị na-enwe mmasị ma na-asọpụrụ ọtụtụ ụmụnwoke na ụmụnwanyị nwere nka ma dị ịrịba ama maka ike ha na onyinye ha, ogo nke e jiri sọpụrụ ha, ọ bụrụ ma emefee ya oke, nwere ike ịbụ nhata ụmụ Izrel na-efe nwa ehi ọlaedo niime ọzara Saịnaị.

Dị ka ndị dimkpa, ihe bubuuru egwuregwu obi ụtọ nwata n’ebughị ihe ọjọọ n’obi nwere ike bụrụzie ihe ịsụ ngọngọ mgbe “ofufe dike” nke ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị blọga, ndị mmetụta, ndị egwuruegwu, ma ọ bụ ndị egwu na-akpatara anyị “ilefe anya n’oke ahụ”6 ma ghara ịhụta ihe ahụ nke dị ezigbo mkpa.

Maka ụmụ Izrel, aka mgba abụghị ọlaedo nke ha jiri bịa na njem ha ịga n’ala ahụ e kwere nkwa mana kama ihe ha kwere ka ọlaedo ahụ bụrụ: arụsị, nke mesịrị bụrụ ihe nke ofufe ha, na-atụgharị uche ha pụọ site na Jehova, onye kewaworo Oke Osimiri Uhie ahụ ma napụta ha site n’ịbụ ohu. Ntụkwasị uche ha na nwa ehi ahụ metụtara ike ha ife ezi Chineke.7

Dike ahụ —dike anyị, ugbua na mgbe niile—bụ Jizọs Kraịst, ma ihe ọbụla ma ọ bụ onye ọbụla na-emegharị anyị anya site na nkuzi Ya niile, dị ka a hụrụ niime akwụkwọ nsọ ma site n’okwu niile nke ndị amụma dị ndụ, nwere ike metụta ọganiihu anyị n’ụzọ na-adịghị mma n’ụzọ ọgbụgba ndụ ahụ. Tupu okike nke ụwa, anyị tụkwasịrị obi na Jizọs Kraịst mgbe o doro anya na atụmatụ a tụrụ aro site n’aka Nna bi N’eluigwe, nke gụnyere ohere anyị nwere ịganiihu ma dịrị ka Ya, ka a na-ama aka.

Ọbụghị naanị na Jizọs Kraịst bụ onye ndu n’ichekwa atụmatụ nke Nna anyị, mana Ọ gakwa arụ ọrụ kacha mkpa n’imejuputa iwu ya. Ọ zaghachiri Nna ma wepụta onwe ya n’obi ọma inye Onwe Ya “ihe mgbapụta maka onye niile,”8 iji kwụọ ụgwọ nke onye ọbụla niime anyị ga-emete site na mmehie mana agaghị enwe ike ịkwụ ya n’onwe anyị.

Onyeisi Dallin H. Oaks akuziwo, “[Jizọs Kraist] emewo ihe niile nke dị mkpa maka njem anyị site na ndụ anụ ahụ gaa na akara aka edepụtaworo niime atụmatụ nke Nna anyị nke Eluigwe.”9

Niime Ubi nke Getsemane, mgbe ụdị ọrụ ukwu nke a chere ya ihu, Onye Nzọpụta n’obi ike kwupụtara, “Ọ bụghị uche m, kama nke gị, ga-eme,” ma gaaniihu iwekwasị Onwe Ya mgbu niile etikọtara ọnụ, nrịa nrịa niile, na ntaram ahụhụ maka mmehie nke ndị niile ga-ebi ndụ.10 N’omume nrube isi na nranye zuru oke, Jizọs Kraịst mezuru omume dike ahụ kachasị niime okike niile, ruo n’isi Mbilite n’ọnwụ Ya dị ebube.

N’ọgbakọ zuruọha anyị kacha ọhụrụ, Onyeisi Russell M. Nelson cheteere anyị: “Ajụjụ nke ọbụla ma ọ bụ nsogbu ndị i nwere, azịza ya ka a na-achọtakarị niime ndụ na nkuzi niile nke Jizọs Kraịst. Mụtakwuo banyere Aja mgbaghara mmehie Ya, ịhụnaanya Ya, ebere Ya, ozizi Ya, na ozi ọma Ya eweghachitere nke ọgwụgwọ na ọganiihu. Tụgharịa na Ya! Soro Ya!”11 Ma aga m agbakwunye, “Họrọ Ya.”

Niime ụwa anyị na-agbagwoju anya, o nwere ike bụrụ ọnwụnwa ilekwasị anya na dike nke ndị obodo na mgbalị ime ka o doo anya mgbe ọ nwere ike ịdị mgbagwoju anya ma ọ bụ karịa. Anyị na-azụ uwe ndị ha na-akwado, anyị na-anabata ndọrọ ndọrọ ha na-akwado, ma anyị na-esoro aro ndị ha na-ekesa na soshịal midia. Nke a nwere ike ịdị mma maka ntụgharị nwa oge, mana anyị aghaghị ilezi anya ka ụdị ofufe dike nke a ghara ịbụrụ nwa ehi ọlaedo anyị Ịhọrọ ezigbo dike nwere nsọnaazụ ebighị ebi.

Mgbe ezi na ụlọ anyị bịarutere Spain ịmalite ije ozi anyị dị ka ndị ndu mishọn, anyị hụtara nṅọmị ekesara sitere n’aka Okenye Neal A. Maxwell dị mkpa banyere ndị dike anyị na-ahọrọ iso. O kwuru, “Ọ bụrụ na ị họrọbeghị alaeze Chineke na mbụ, na ngwụcha ọ gaghị adị iche ihe nke ị họworo kama.”12 Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, ọ bụ site n’ịhọrọ Jizọs Kraịst, Eze ndị eze, ka anyị na-ahọrọ alaeze Chineke. Nhọrọ nke ọbụla ọzọ bụ nhata nke ịhọrọ ogweaka nke anụ ahụ, ma ọ bụ nwa ehi ọlaedo, ma n’ikpeazụ ga-emechu anyị ihu.

Niime Agba Ochie akwụkwọ Daniel, anyị na-agụ nkọwapụta banyere Shadrak, Meshak na Abed nego, ndị maara nke ọma dike nke ha ga-ahọrọ—ma ọ bụghị chi ọbụla nke Eze Nebukadneza. Ha mara ọkwa n’obisiike:

“Chineke anyị onye anyị n’efe pụrụ ịnapụta anyị site n’ọkụ a na-enwusike. …

“Ma ọ bụrụ na ọ bụghị, marakwa na, O Eze, na anyị agaghị efe chi gị ndị a, ma ọ bụ fee oyiyi ọlaedo gị.”13

Dị ka Onye ozi Pọl kuziri, Enwere ọtụtụ chi,”14 ma, enwere m ike ịgbakwunye, ọtụtụ ndị dike bụ ndị akpọkuru anyị ịkpọrọ isi ala, ife ofufe, na ịnabata. Mana dị ka nnọọ ndị enyi Daniel atọ maara, enwere naanị Otu onye kwere nkwa ịnapụta—niihi na O mewo ya ma Ọ ga na-eme ya mgbe niile.

Maka anyị na njem anyị ịlaghachi azụ ruo niihu Chineke, ruo na ala e kwere anyị na nkwa, ọbụghị onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, onyeegwu, onye na-eme egwuregwu, ma ọ bụ onye vlọga bụ nke bụ okwu mana, kama, na-ahọrọ ikwe ka ha bụrụ isi ihe nke ntụkwasị uche na nlekwasị anya anyị iji dochie Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta anyị.

Anyị na-ahọrọ Ya, Jizọs Kraịst, mgbe anyị na-ahọrọ ịsọpụrụ ụbọchi Ya ma anyị nọ n’ụlọ ma ọ bụ nọ na-eme njem ezumike. Anyị na-ahọrọ Ya mgbe anyị na-ahọrọ okwu Ya niile site n’akwụkwọ nsọ na nkuzi niile nke ndị amụma dị ndụ. Anyị na-ahọrọ Ya mgbe anyị na-ahọrọ inwe rekọmend tempụl bie ndụ ntozu oke ojiji ya. Anyị na-ahọrọ Ya mgbe anyị bụ ndị ome udo ma jụ ị na-ese okwu, “tụmadị mgbe anyị nwere uche dị iche iche.”15

Enwebeghị onye ndu gosiworo mgbe ọbụla mgbam ume karịa, enweghị onye ozi ọdị mma ụmụ mmadụ gosiworo ịdị obi ọma karịa, enweghị dibia bekee gwọworo ọrịa karịa, ma enweghị omenkà mepụtaworo ihe karịa Jizọs Kraịst.

Niime ụwa nke ndị dike, jiri ụmụ ihe ncheta na ọba nkaọkpụ raara onwe ya nye nrigbu niile nke ndịikom na ndịinyom pụrụ ịnwụ anwụ, enwere Otu onye guzooro n’isi ndị ọzọ niile. Ana m agba ama na Jizọs Kraịst abụghị naanị dike anyị; Ọ bụ Onyenwe anyị na Eze anyị, Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta nke ụmụ mmadụ. Site n’aha nke Jizọs Kraịst, amen

Hụba-ama

  1. Ihe mmụta niile raara onwe nye Willie na Martin handcart companies gụnyere LeRoy R. na Ann W. Hafen, Handcarts to Zion: The Story of a Unique Western Migration, 1856–1860 (1960); Rebecca Cornwall na Leonard J. Arrington, Rescue of the 1856 Handcart Companies (1981); Howard K. na Cory W. Bangerter, Tragedy and Triumph: Your Guide to the Rescue of the 1856 Willie na Martin Handcart Companies, 2nd ed. (2006); and Andrew D. Olsen, The Price We Paid: The Akụkọ pụrụiche nke Willie na Martin Handcart Pioneers (2006).

  2. Brigham Young, “Remarks,” Deseret News, Oct. 15, 1856, 252.

  3. John Oborn, “Nke nke Agụgụala nke John Oborn, Pioneer of 1856,” 2, in John Oborn reminiscences and diary, circa 1862–1901, Church History Library, Salt Lake City.

  4. Nkọwapụta nke Ephraim K. Hanks, niime Andrew Jenson, “Church Emigration,” Contributor, Mar. 1893, 202–3.

  5. Hanks, niime Jenson, “Church Emigration,” 204.

  6. Jekọb 4:14

  7. Lee Ọpụpụ 32.

  8. 1 Timoti 2:6; leekwa Matiu 20:28.

  9. Dallin H. Oaks, “Gịnị Ka Onye Nzọpụta Anyị Mewooro Anyị?,” Liahona, Me 2021, 75.

  10. Lee Luk 22:39–44.

  11. Russell M. Nelson, “Azịza Ahụ Na-abụkarị Jizọs Kraịst,” Liahona, Me 2023, 127.

  12. Attributed to 18th-century English clergyman William Law; quoted in Neal A. Maxwell, “Response to a Call,” Ensign, May 1974, 112.

  13. Lee Daniel 3:13–18.

  14. 1 Ndị Korịnt 8:5.

  15. Russell M. Nelson, “Ndị Ome udo Ka A Chọrọ,” Liahona, Me 2023, 98.