Ọgbakọ Zuru ọha
Ọjịja mma diri Nwoke ahụ
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2023


Ọjịja mma diri Nwoke ahụ

Lee ka esi gọzie anyị nke ukwuu ị mara ihe niile nke anyị ma niihi na anyị nwere Josef Smith, onye amụma nke ọgbọ ikpeazụ nke oge nke a.

Ezigbo ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị, ọ bụ ihe ugwu nye m ịnọnyere ụnụ n’ụtụtụ nke a. Ana m ekpe ekpere na Onyenwe anyị ga-agọzi m.

Anya m abụghị ihe ha naara a bụ. A gara m ma hụ dọkịnta anya, ma a sịrị m, “Anaghị m enwe ike ahụ teleprompta.”

Ma ọ sịrị, “N’ezie, anya gị a kaala nka. Ha agaghị agbanwe.”

Ya mere aga m eme nke m nwere ike imeli.

Ọ ga-amasị m ị kọrọ unu ụfọdụ ihe ndị nowororịị niime obi m. Abịawo m buru Onye amụma Josef Smith n’obi m ọnwa ole ma ole ndị a gara aga. A nọduwo m ọdụ ma na-eche oke na ọrụ ya dị ebube n’ịbụ onye amụma nke a, ọgbọ nke uju oge.

Ana m eche ụdị obi ekele anyị nwere dị ka ndị otu Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a, nwantakịrị nwoke onye chọrọ ịmata ihe o kwesịrị ime iji nwete mgbaghara mmehie ya, chọtara mgbam ume ịbanye niime ọdọ ọtụtụ osisi dị n’akụkụ ebe obibi ya niime Palmyra, New York, ma n’ebe ahụ sekpuru ala n’ekpere, ma—site n’okwu nke onwe ya—kpee ekpere n’olu dara ụda oge mbụ (lee Josef Smith—Agụgụala 1:14).

N’oge ahụ, dị ka Josef sekpuuru n’ikpere ya n’ebe anyị na-akpọ Ọdọ Osisi Dị Nsọ, eluigwe meghere. Ndị mmadụ abụọ, na-egbuke egbuke karịa anyanwụ ehihie, pụtara n’ihu ya. Otu niime ha gwara ya okwu ma sị, “[Josef,] onye a bụ Ọkpara M Hụrụ Naanya. Nụrụ Ya!” (Josef Smith—Agụgụala 1:17). Site otu a ka mmalite nke Mweghachite uju nke ozi ọma ebighị ebi nke Jizọs Kraịst.

Niihi na Jizọs, Onye Nzọpụta anyị na Onye Mgbapụta anyị, gwara nwantakịrị Josef okwu ma meghee ọgbọ oge nke a anyị bi niime ya ugbua, anyị na-agụ, “Otito dịrị nwoke ahụ ya na Jehova kwuru!” (“Otito dịrị nwoke ahụ ya na Jehova kwuru,” Hymns, no. 27). Anyị na-ekele Onyenwe anyị maka Josef Smith na maka mgbam ume ya ịga niime ọdọ ọtụtụ osisi n’afọ 1820, dị nso nso ebe obibi ya niime Palmyra, New York.

A nọwo m na-eche banyere ihe niile dị ịtụnaanya nke anyị maara na ihe niile nke anyị nwere. Ezi ụmụnne m nwoke na nwanyị, ama m nye unu n’ụtụtụ a bụ otu esi gọzie anyị nke ukwuu ị mara ihe niile nke anyị maara niihi na anyị nwere Josef Smith, onye amụma nke ọgbọ ikpeazụ nke oge nke a.

Anyị nwere nghọta nzube nke ndụ, nke onye anyị bụ.

Anyị maara onye Chineke bụ; anyị maara onye Onye Nzọpụta bụ, niihi na anyị nwere Josef, onye banyere niime ọdọ ọtụtụ osisi dị ka nwantakịrị nwoke, na-achọ mgbaghara nke mmehie ya.

Echewo m na ọ bụ otu niime ihe ndị kacha dị ebube ma dị ịtụnaanya na onye ọbụla dị niime ụwa nke a nwere ike ịma—na Nna anyị nke Eluigwe na Onyenwe anyị Jizọs Kraịst ekpughewo Onwe Ha n’ụbọchi ikpeazụ nke a ma na eweliteworịị Josef iweghachite uju nke ozi ọma ebighị ebi nke Jizọs Kraịst.

Anyị nwere Akwụkwọ nke Mọmọn. Lee ụdị onyinye dị ebube ma dị ịtụnaanya Akwụkwọ nke Mọmọn bụ nye ịbụ onye otu nke Nzukọ nsọ. Ọ bụ ihe aka ebe ọzọ, testament ọzọ na Jizọs bụ Kraịst ahụ. Anyị nwere ya niihi na Josef tozuru oke iwere epekele ndị ahụ, nwetere nkwalite mmụọ sitere n’eluigwe iji tụgharịa asụsụ ha site n’onyinye na ike nke Chineke ma nye ụwa akwụkwọ ahụ.

Agbanyeghị ozi m n’ụtụtụ a dị mfe, ọ dị omimi, ma o jupụtara n’ịhụnaanya maka Onye amụma Josef Smith na maka ndị ahụ niile, ụmụnne m nwoke na ụmụnne m nwanyị, ndị kwadoworo ya ma dịrịị njikere ịkwado ya na ntoroọbịa ya.

Ọ ga-amasị m ikwu okwu dị mma n’ụtụtụ a maka nne ya. Echewo m mgbe niile otu ọ dịịrị ịtụnaanya na mgbe Josef lọtara site na nhụmiihe ahụ niime Ọdọ Osisi Dị Nsọ ahụ ma gwa nne ya ihe mewororịị, Lucy Mack Smith kweere ya.

Obi juru m n’ekele nye nna ya na ụmụnne ya ndị nwoke na ụmụnne ya ndị nwanyị na ezi na ụlọ ya, ndị kwadoro ya n’oke ọrụ nke a nke Onyenwe anyị tụkwasịworo n’isi ya ịbụ onye amụma ga-eweghachite uju nke ozi ọma ebighị ebi nke Jizọs Kraịst ọzọ kwa n’elu ụwa.

Ya mere ama m n’ụtụtụ nke a bụ na a mam na Jizọs Kraịst bụ Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta nke ụwa. Ama kwa m na Nna anyị nke Eluigwe na Onyenwe anyị Jizọs Kraịst pụtara ma gwa Josef okwu ma kwadoo ya ịbụ onye amụma.

Ọ na-atụ m naanya, ma obi siri m ike na ọtụtụ niime unu maarakwa, n’otu esi gọzie anyị ịmara ihe anyị ma banyere nzube nke ndụ, ihe mere anyị jiri nọrọ ebe a, ihe anyị kwesịrị ịnọ na-agbalị ime ma mepụta niime ndụ anyị kwa ụbọchi. Anyị nọ n’ụzọ nke ịnwa ikwado onwe anyị, otu ụbọchi n’otu ụbọchi, ịdịtụ mma karịa, ịdịtụ obi ọma karịa, ịdịtụ njikere karịa maka ụbọchi ahụ, nke ga-abịarịrị n’ezie, mgbe anyị ga-alaghachi niihu nke Nna anyị nke Eluigwe na Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.

Nke ahụ adịtụwala nso nye m. Aga m agba 95 n’oge na-adịghị anya. Ụmụ m na-agwa na ha na-eche na m karịrị otu ahụ oge ụfọdụ, mana ọ dị MMA. Ana m eme nke m nwere ike imeli.

Mana ihe ruru niime afọ 50, ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, enwewo m ohere ịgaru ụwa niile n’ọrụ m dị ka Onye Ji Ikike Zuru ọha nke Nzukọ nsọ. Ọ bụrụwo ihe ngọzi pụrụiche. Echere m na m agawo ihe gaara ezu akụkụ ụwa niile. Ezutewo m ndị otu Nzukọ nsọ gburugburu ụwa.

O, otu m si hụ unu naanya. Lee ụdị nhụmiihe dị ebube nke ahụ bụworo—ileba anya niime mbara ihu unu, nọrọ niihu unu, ma nwete mmetụta ịhụnaanya unu nke unu nwere maka Onyenwe anyị na maka Mweghachite ozi ọma nke Jizọs Kraịst

Ka Nna anyị nke Eluigwe chegide anyị ugbu a ma gọzie usoro niile nke ọgbakọ a. Ma ka anyị nwee Mmụọ nke Onyenwe anyị ịnọzi niime obi anyị nke ọma, ma ka ịhụnaanya anyị maka ozi ọma nke Jizọs Kraịst—Onye Nzọpụta anyị hụrụ naanya, Onyenwe anyị Jizọs Kraịst—bawanye dị ka anyị na-agbalị ijere Ya ozi ma debe iwu nsọ Ya niile ma dịrị ka Ya karịa dị ka resọọtụ nke ọbịbịa anyị n’ọgbakọ zuru ọha. Ebe ọbụla unu nọ niime ụwa nke a, ka Chineke gọzie unu. Ka Mmụọ nke Onyenwe anyị nọnyere anyị. Ka anyị nwete mmetụta ike nke eluigwe dị ka anyị na-efekọrịta ofufe ọnụ niime nzukọ ọgbakọ nke a.

Ana m ahapụrụ unu aka ebe m na ama m na a maara m na Jizọs bụ Kraịst ahụ. Ọ bụ Onye Nzọpụta anyị, Onye Mgbapụta anyị. Ọ bụ ezigbo enyi anyị. N’aha dị nsọ nke Jịzọs Kraịst, amen.