Ọgbakọ Zuru ọha
Ịhụ Ezi na ụlọ nke Chineke site na Anya nke Nnyocha
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2023


Ịhụ Ezi na ụlọ nke Chineke site na Anya nke Nnyocha

E kwere m na anyị pụrụ ime, site n’anya nke okwukwe, bupụ anya ma lee onwe anyị na ndị ezi na ụlọ anyị jiri olileanya na ọńụ.

Mgbe nwaada anyị kachasị nta, Berkeley, dịịrị obere, e bidoro m iyi ugegbe anya eji agụ ihe―ụdị nke na-ewebata nso ma gbasaa ihe niile. Otu ụbọchi, dị ka anyị nọdụkọtara ọdụ ọnụ na-agụ otu akwụkwọ, e lere m ya anya n’ịhụnaanya mana kwa n’obi mwute niihi na, n’otu ntabi anya, ọ dịịrị ka o tolitekwuola. E chere m, “Olee ebe oge gaworo? O buru oke ibu!”

Dị ka m welitere ugegbe anya m ji agụ ihe ihichapụ anya mmiri, amatara m, “chere O—o bughị oke ibu; ọ bụ nnọọ ugegbe anya ndịa! Enyela onwe gị nsogbu!”

Oge ụfọdụ ihe niile anyị nwere ike ịhụ nọ nnọọ nso nke ọma, anya gbasara agbasa nke ndị ahụ anyị hụrụ naanya. Na abalị a, ana m akpọku unu ibupụ anya ma lee anya site na ihe anya dị iche—ihe anya dị ebighị ebi nke na-elekwasị anya na foto nke nnukwu, akụkọ gị dị ukwuu karịa

N’oge isimbụ nke nkwalite ụmụ mmadụ baa niime mbara igwe, rọkeetị ahụ na-enweghị mmadụ enweghị ọnụ mpio. Mana site na mishọn Apollo 8 gaa n’ọnwa, ndị astronaut nwere otu. Mgbe ha na-ese na mbara igwe, ike nke ịhụ ụwa anyị kụrụ ha nahụ ma ha sere foto nke a dị egwu, na-enwete uche nke ụwa dum! Ndị astronauts ahụ nwetere nhụmiihe ọgba aghara dị oke ike na-enyewo ya aha nke ya: mpụtara nnyocha.

Foto, oyiyi
Ụwa dị ka a hụrụ site na mbara igwe.

NASA

Ikiri site n’ebe dị mma ọhụrụ na-agbanwe ihe niile. Otu onye njem mbara igwe kwuru na ọ “na-ebelata ihe niile ruo nha nke i chere ihe niile kwere njikwa. … Anyị pụrụ ime nke a. Udo n’elu ụwa—enweghị nsogbu. Ọ na-enye ndị mmadụ ụdị ume ahụ … ụdị ike ahụ.”1

Dị ka ụmụ mmadụ, anyị nwere echiche nke ụwa, mana Chineke na-ahụta nnukwu nkọwa nke eluigwe na ala. Ọ na-ahụta okike niile, anyị niile, ma o jupụtara n’olileanya.

Ọ ga-ekwe omume ịmalite ịhụ dị ka Chineke si ahụta ọbụna mgbe ebi n’elu ụwa nke a—inweta mmetụta nghọta nke a? E kwere m na anyị pụrụ ime, site n’anya nke okwukwe, bupụ anya ma lee onwe anyị na ndị ezi na ụlọ anyị jiri olileanya na ọńụ.

Akwụkwọ nsọ kwetere. Moronaị na-ekwu banyere ndị ahụ ndị okwukwe ha “siri ike nke ukwuu” nke mere na ha hụrụ nezie jiri anya nke okwukwe, ma obi tọrọ ha ụtọ .”2

Site anya elekwasịrị na Onye Nzọpụta, ha nwetere mmetụta nke ọńụ ma maara eziokwu nke a: niihi Kraịst, ihe niile na-aga nke ọma. Ihe niile gị na gị na gị na-enwe nchekasị banyere—ha niile ga-adị MMA! Ma ndị ahụ na-eji anya nke okwukwe ele anya nwere ike inwe mmetụta na ọ ga-adị MMA ugbu a.

Agabigara oge siri ike nafọ ụlọakwụkwọ sekọndrị m mgbe na-adịghị eme nhọrọ ndị dị mma. Echetere m ịhụta mama m ka ọ na-ebe akwa ma m na-eche ọ bụrụ ma m adakpọwo olileanya ya. N’oge ahụ, enwere m nchegbu na anya mmiri ya pụtara na olileanya ya na m efuwo, ma ọ bụrụ na o nweghị olileanya maka m, enwere ike enweghị ụzọ ịlaghachi azụ.

Mana papa m na-enwekarị ezi uche na-ịlatụ azụ ma lezie anya site n’ebe dị anya. Ọ mụtawo site na nhụmiihe na nchekasị na-adịkarị ka ịhụnaanya, mana ọ bụghị otu ihe ahụ.3 O jiiri anya nke okwukwe iji hụta na ihe niile ga-emezu, ma agwa ya nke jupụtara n’olileanya gbanwere m.

Mgbe m gụsịrị site na ụlọakwụkwọ sekọndịrị ma gaa na BYU, papa m ziteere m ọtụtụ leta na-echetere m onye m bụ. Ọ bụziiri onyeisi obi ụtọ m, ma onye ọbụla kwesịrị inwe onyeisi obi ụtọ—onye nke na-adịghị agwa gị, “Ị naghị agba ọsọ ọsọ nke ọma”; ha ji ịhụnaanya na-echetere gị na ị pụrụ ime ya.

Papa m gosiri ịma atụ nrọ nke Lehi. Dị ka Lehi, ọ maara na gị ekwesịghị ịchụrụ ndị ị hụrụ naanya ndị chere na ha efuwo. “Ị nọrọ ebe ị nọ ma kpọọ ha. Ị gaa n’ebe osisi ahụ, nọrọ n’ebe osisi ahụ, nọgide na-eri mkpụrụ osisi ahụ ma, jiri ihu ọchị n’ihu gị, nọgịde na-akpọ ndị ahụ ị hụrụ naanya ma gosi ihe ịma atụ na iri mkpụrụ osisi ahụ bụ ihe obi ụtọ!”4

Foto nke a enyewooro m aka n’oge ịda mba niile mgbe m chọtara onwe m n’akụkụ osisi ahụ, na-eri mkpụrụ osisi ahụ ma na-ebekwa akwa niihi na ana m echegbu; ma n’ezie, olee otu nke ahụ si enyeaka? Kama, ka anyị họrọ olileanya—olileanya niime Onye Okike anyị na n’onye n’ibe ya, na-enye ike anyị ịdị mma ume karịa ka anyị dị ugbu a.

Obere oge ka Okenye Neal A. Maxwell nwụchara, otu onye kwunsara jụrụ nwa ya nwoke ihe ọ ga-akacha echeta. O sịrị nri abalị niile n’ụlọ nne na nna ya niihi na ọ na-apụkarị na-enwe mmetụta na nna ya kwenyere na ya.

Nke a bụ gburugburu oge ụmụ anyị ndị toro eto malitere ịbịa ebe obibi maka nri abalị Sọnde ha na ndị di ma ọ bụ nwunye ha. Niime izu ụka ahụtara m onwe m ị na-edepụta ihe niime obi m nke ihe ndị m nwere ike ichetara ha maka ya na Sọnde, dị ka “Enwere ike gị anwaa ma nyekwuo aka maka ụmụaka mgbe ị nọ n’ụlọ” ma ọ bụ “Echefukwala ị bụ onye na-ege ntị nke ọma.”

Mgbe m gụrụ okwu nke Nwanne nwoke Maxwell, atụfuru m ndepụta ahụ ma kuchie ọnụ nke olu ahụ dị egwu, ya mere mgbe m hụrụ ụmụ m ndị toro eto na nwa oge ahụ izu ụka ọbụla, elekwasịrị m anya n’elu ọtụtụ ihe ndị dị mma ha naara na-eme. Mgbe ọkpara m, Ryan, nwụrụ afọ ole ma ole gasịrị, echetara m inwe obi ekele oge anyị nwekọtara ọnụ ma nweere obi ụtọ ma nwee ezi uche.

Tupu anyị na onye ahụrụ naanya akpakọrịta, anyị nwere ike ịjụ onwe anyị ajụjụ “Ọ bụ na ihe m dị njikere ime ma ọ bụ ikwu ga-enye aka ma ọ bụ merụọ ahụ?” Okwu anyị bụ otu niime ike anyị dị ukwuu, ma ndị otu ezi na ụlọ dị ka ụgbọojii mmadụ, neguzoro niihu anyị na-asị, “Dee ihe i chere maka m!” Ozi ndị a, ma akpachapụrụ anya ma ọ bụ akpachapụghị anya, kwesịrị inye olileanya ma gbaa ume.5

Ọrụ anyị abụghị ikuziri mmadụ ihe onye na-agabiga oge ọjọọ ma ha dị njọ ma ọ bụ na-adakpọ olileanya. Noge ndị na-anaghị adịkarị anyị nwere ike nwee mkpali ikutazi, mana mgbe kachasị ka anyị gwa ndị anyị hụrụ naanya nokwu ekwuru ekwu na ụzọ ndị a na-adịghị ekwu ekwu ozi ndị na-agụ ha ịnụ: “Ezi na ụlọ anyị na-enwe mmetụta izu oke ma zuo ezuo niihi ị nọ na ya.” “Aga ahụ gị na-anya n’oge ndụ gị fọdụrụ—na-agbanyeghị ihe ọbụla.”

Mgbe ụfọdụ ihe anyị chọrọ bụ ọmịiko karịa ndụmọdụ; na-ege ntị karịa nkuzi; otu onye na-anụ ma na-atụle, “Olee otu m kwesịrị i si enwe mmetụta iji kwuo ihe ha ka kwuru ugbu a?”

Chetanụ, ezi na ụlọ niile bụ ụlọ nnyocha Chineke nyere ebe anyị nọ na-aghọta ụmụ ihe, ya mere nzọghie ụkwụ niile na mgbakọ niile abụghị nnọọ nke ga-ekwe omume mana nke enwere ike ime. Ma ọ bụ na ọ gaghị atọ ụtọ ma, na nsọtụ nke ndụ anyị, anyị ga-enwe ike ahụ na mmekọrịta ndị ahụ, ọbụna oge aka mgba ndị ahụ, bụụrụ nnọọ ihe ndị nyeere anyị aka ịbụzi Onye Nzọpụta anyị karịa? Mmekọrịta nke ọbụla siri ike bụ ohere iji mụọ ụzọ esi enwe ịhụnaanya ruo na ọkwa dị omimi—ọkwa nke yiri chi.6

Ka anyị lepụọ anya ịhụ mmekọrịta ezi na ụlọ niile dị ka ụgbọ zuru oke iji kuziere anyị ihe ọmụmụ anyị bịara ebe a ịmụ ihe dị ka anyị na-atụgharị chee Onye Nzọpụta ihu.

Ka anyị kweta, niime ụwa dara ada enweghị ụzọ iji bụrụ di ma ọ bụ nwunye, nne na nna, nwa nwoke ma ọ bụ nwaada, nwa nwa, onye ndu, ma ọ bụ enyi, zuru oke—mana ụzọ nde kwuru nde ịbụrụ nke dị mma.7 Ka anyị nọrọ n’akụkụ osisi ahụ, rie ịhụnaanya nke Chineke, ma kesaa ya. Site n’ibuli ndị gbara anyị gburugburu, anyị na-arịgorokọta ọnụ.

Dịrị mwute, ncheta nke iri mkpụrụ osisi ahụ ezughị ezu; anyị kwesịrị ị na-eri ugboro ugboro n’ụzọ ndị na-edozigharị anya anyị ma jikọọ anyị na nghọta nke eluigwe site na-imeghe akwụkwọ nsọ, nke jupụtara na ìhè, ịchụpụ ọchịchịrị, na-anọgịde n’ikpere anyị tutu ruo mgbe ekpere nkịtị anyị dịịrị ike. Nke a bụ mgbe obi niile diworo nro, ma anyị amalite ịhụta dị ka Chineke si ahụ.

Niime ụbọchị ikpeazụ ndị a, eleghị anya ọrụ anyị kachasị ukwuu ga-abụ anyị na ndị anyị hụrụ naanya—ezigbo ndị mmadụ bi niime ụwa ọjọọ. Olileanya anyị na-agbanwe ụzọ ha si ahụta onwe ha na ndị ha bụ n’ezie. Ma site naanya nke ịhụnaanya nke a, ha ga-ahụ onye ha ga abụ.

Mana onye iro achọghị ka anyị ma ọ bụ ndị anyị hụrụ naanya ịlọghachikọta ebe obibi ọnụ. Ma niihi na anyị bi n’ụwa nke oge na ọnụọgụgụ nke afọ na-enweghị oke kechiri,8 ọ na-eme ka ezigbo uche nke ụjọ na-adịgide adịgide. Ọ rara ahụ ịhụta, mgbe anyị lara azụ, na ụzọ anyị dị mkpa karịa ọsọ ọsọ anyị.

Chetanụ, “Ọ bụrụ na ị chọrọ ịga ngwangwa, gaa naanị gị. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịga ebe dị anya, gakọta ọnụ.”9 N’ekele, Chineke anyị na-efe abụghị na oge kechiri ya. Ọ na-ahụta ndị ndị anyị hụrụ naanya bụ n’ezie na onye anyị bụ n’ezie.10 Otu ọ dị Ọ na-enwere anyị ndidi, na-atụ anya na anyị ga-enwe ndidi onye n’ibe ya.

Aga m ekwete na enwere oge ndị mgbe ụwa, ebe obibi nke ụwa, na-adị ka agwaetiti nke mwute—oge ndị mgbe m nwere otu anya nke okwukwe ma anya nke ọzọ na-ebe akwa.11 Ị maara mmetụta nke a?

Enwetere m ya na Tuesde.

Anyị nwere ike kama họrọ ọnọdụ kwesịrị ntụkwasị obi nke onye amụma anyị mgbe o kwere nkwa ọrụ ebube niile niime ezi na ụlọ anyị? Ọ bụrụ ma anyị mee, ọńụ ga-amụba ọbụna ọ bụrụ ma ọgba aghara mụbaa. Ọ na-ekwe nkwa na mpụtara nnyocha ka enwere ike inwe nhụmiihe ya ugbu a, na-agbanyeghị ọnọdụ anyị niile.12

Inwe anya nke okwukwe nke a ugbu a bụ nke mweghachi, ma ọ bụ nkwughachi, nke okwukwe anyị nwebuuru tupu anyị abịa n’ụwa nke a. Ọ na-ahụfe ejighị n’aka nke oge, na-ekwe anyị iji “obi ụtọ mee ihe niile nke nọ n’ike anyị; ma emesịa … guzosie ike.”13

Enwere ihe siri ike niime ndụ gị ugbu a, ihe na-echegbu gị na-enweghị ike idozi? Ma enweghị anya nke okwukwe, nke ahụ nwere ike dị ka Chineke elufuwo nlekọta nke ihe niile, ma nke ahụ ọ bụ eziokwu?

Ma ọ bụ enwere ike ụjọ gị kacha bụrụ na ị na-aga isite n’oge nke a siri ike naanị m, mana nke ahụ ga-apụta na Chineke agbaghapụwo gị, ma nke ahụ ọ bụ eziokwu?

Ọ bụ aka ebe m na Onye Nzọpụta nwere ike ahụ, niihi Aja mgbaghara mmehie Ya, ịtụgharị nrọ ọjọọ ọbụla ị na-agabiga ịbụrụ ngọzi. O nyewo nkwa “jiri ọgbụgba ndụ na-enweghị mgbanwe” na dị ka anyị na-agba mbọ inwe ịhụnaanya ma soro Ya, “ihe niile nke e jiworo taa [anyị] ahụhụ ga-arụkọta ọrụ ọnụ maka ọdịmma [anyị].”14 Ihe Niile

Ma niihi na anyị bụ ụmụ nke ọgbụgba ndụ, anyị nwere ike jụọ maka mmetụta nke a jupụtara n’olileanya ugbu a!

Mgbe ezi na ụmọ anyị anọghị niime ezi na ụlọ zuru oke, anyị nwere ike mee ịhụnaanya anyị maka ndị ọzọ zuo oke tutu ruo ya abụrụzie nke a na-adịgide adịgide, adịghị agbanwe, na-agbanyeghị ụdị ịhụnaanya—ụdị ịhụnaanya na-akwado mgbanwe ma kwere maka uto na nlaghachi.

Ọ bụ ọrụ nke Onye Nzọpụta ịkpọtaghachị ndị anyị hụrụ naanya. Ọ bụ ọrụ Ya na oge Ya Ọ bụ ọrụ anyị iwete olileanya na obi nke ha nwere ike iji lọghachi ebe obibi. “Anyị nwere ọ bụghị ikike [nke Chineke] iji maa ikpe ma ọbụghị ike ya iji gbapụta, mana enyewo anyị ikike itinye n’ọrụ ịhụnaanya Ya.”15 Onyeisi Nelson akuziwokwa na ndị ọzọ nwere mkpa ịhụnaanya anyị karịa ikpe anyị. “Ha kwesịrị inweta nhụmiihe ịhụnaanya Jizọs Kraịst na-enweghị ntụpọ egosịpụtara n’okwu na ihe omume [anyị] niile.”16

Ịhụnaanya bụ ihe ahụ nke na-agbanwe obi dum. Ọ bụ ebumnobị kachasị dị ọcha nke ihe niile, ma ndị ọzọ nwere ike inwete mmetụta ahụ. Ka anyị jidisie ike nokwu amụma ndị ahụ enyere afọ 50 gara aga: “Ọ dịghị ebe obibi dara ada ọgwụla ma ọ kwụsịrị ịnwa.”17 N’ezie, ndị ahụ anyị kacha na-ahụ naanya na-emeri!

Niime ezi na ụlọ nke ụwa, anyị n’ụzọ dị mfe na-eme ihe Chineke soworo anyị mee—na-atụ aka n’ụzọ ahụ ma na-enwe olileanya na ndị anyị hụrụ naanya ga-aga n’ụzọ ahụ, mara na ụzọ nke ha mere njem bụ nke ha ịhọrọ.

Ma mgbe ha gafere n’aka akwa mgbochi nke ọzọ ma bịaruo nso na nkwali ndọda ịhụnaanya ahụ nke ebe obibi ha dị n’eluigwe,18 e kwere m na ọ ga-adị ka ihe ama ama niihi otu e siri hụ ha naanya ebe a.

Ka anyị jiri anya nnyocha ahụ ma hụta ndị ahụ anyị hụrụ naanya ma bikọọ dị ka ndị nsiso n’elu ọmarịcha ụwa nke a.

Mụ na gị? Anyị pụrụ ime nke a! Anyị pụrụ inwe ndidi ma na-enwe olileanya! Anyị nwere ike ịnọ n’akụkụ osisi ahụ, rie mkpụrụ osisi jiri ọchị na mbara ihu anyị, na-ekwe ka Ìhè nke Kraịst dị niime anya anyị bụrụzie ihe ndị ọzọ nwere ike ijigide n’awa ndị kachasị gbaara ha ọchịchịrị. Dị ka ha na-ahụ otu ìhè si egosipụta na mbara ihu anyị, aga adọta ha na ya. Anyị nwere ike mgbe ahụ nyee aka tụgharịa uche ha nye nsinambụ nsipụta nke ịhụnaanya na ìhè, “kpakpando nke ụtụtụ na-egbuke egbuke,” Jizọs Kraịst.19

Ana m agba ama m na nke a—nke a niile—na-adị mma karịa dị ka anyị nwere ike iche eche! Jiri anya nke okwukwe na Jizọs Kraịst, ka anyị hụta na ihe niile ga-adị mma na ngwụcha ma nwee mmetụta na ọ ga-adị mma ugbu a N’aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. Anousheh Ansari, niime “Mpụtara Nnyocha na Echiche ndị ọzọ banyere Ụwa na Ụmụ Mmadụ, dị ka otu Ndị Njem Mbara Igwe Siri Dị,” cocre.co

  2. Ita 12:19; okwu ka agbakwunyere.

  3. Lee Jody Moore, “Otu esi Ekwu Ihe ndị Siri ike,” Dị mma Karịa Obi Ụtọ (podcast), Sept. 18, 2020, episode 270.

  4. Ronald E. Bartholomew, e jiri ikike mee ihe; lee kwa 1 Nefi 8:10; 11:21–22.

  5. Lee James D. MacArthur, “Ezi na ụlọ Na-arụ Ọrụ,” Alụmdi na nwunye na Ezi na ụlọ niile, vol. 16 (2005), 14.

  6. Made possible as we “kpere Nna ekpere jiri ike niile nke obi, ka [anyị] nwee ike jupụta n’ịhụnaanya nke a” (Moronaị 7:48).

  7. Paraphrase of a statement attributed to Jill Churchill.

  8. Lee Richard Eyre, Ndụ Tupu Ndụ: Mmalite nke Mkpụrụ obi … Ị Mara Ebe I Si Bịa na Onye Ị Bụ N’ezie (2000), 99.

  9. Ilu nke Omenaala

  10. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 93:24, 26

  11. Lee Robert Frost, “Birches,” niime Mountain Interval (1916), 39.

  12. See Russell M. Nelson, “Ọñụ na Nlanahụ Ime Mmụọ,” Liahona, Nov. 2016, 81–84; lee kwa Russell M. Nelson, “Kwe ka Chineke Merie,” Liahona, Nov. 2020, 92–95.

  13. Ozizi na Ọgbụgba ndụ nile 123:17

  14. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 98:3; agbakwunyere nkọwa.

  15. Wayne E. Brickey, Ịkpọbata Ya Niime: Otu Aja Mgbaghara Mmehie Nwere ike Isi Gbanwee Ezi na ụlọ Gị (2003), 144.

  16. Lee Russell M. Nelson, “Ndị Ome udo Ka A Chọrọ,” Liahona, Me 2023, 100.

  17. Nkuzi niile nke Ndịisi Nzụkọ a: Harold B. Lee (2000), 134.

  18. Lee Paul E. Koelliker, “Ọ Hụrụ Anyị Naanya N’ezie,” Liahona, May 2012, 18.

  19. Mkpughe 22:16.