Ọgbakọ Zuru ọha
Olee Otu Ịdị Ukwuu Ọn̄ụ Unu Ga-adị
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2023


Olee Otu Ịdị Ukwuu Ọn̄ụ Unu Ga-adị

Ana m akpọku unu ugbua iwere mmara otu esi eme, unu tinyekọta ama oge gboo unu, ma gaa mishọn.

Ezigbo ụmụnne m nwoke na ụmụnne m nwanyị, uche m taa dabeere na mkpọkọta nke Izrel, ihe Onyeisi Russell M. Nelson na-akpọ “ihe kachasị mkpa na-eme n’ụwa taa. Enweghi ihe ọzọ eji atụnyere ịdị ukwuu ya, enweghị ihe ọzọ eji atụnyere ịdị mkpa ya, enweghị ihe ọzọ eji atụnyere ebube ya.”1

Mkpọkọta ahụ bụ mmata ihe kacha na “uru mkpụrụ obi niile dị ukwuu naanya Chineke.”2 Otu a ka ọ dị mfe dị ka ya. Anyị na-ekpokọta ụmụ Chineke n’ụbọchi ikpeazụ ndị a na ha nwere ike inwe “ngọzi ndị awụkwasịrị n’isi ha”3 na nkwa niile nke “akụnụba niile nke ebighị ebi.”4 Ọ na-esote na ikpokọta Izrel anyị nwere mkpa ndị mgbasa ozi ọma—ọtụtụ ndị ọzọ karịa ndị na-eje ozi ugbua.5 Taa ana m agwa ọtụtụ ndị agadi nwere nhụmiihe okwu dị niime Nzukọ nsọ ndị nwere ike ije ozi dị ka ndị mgbasa ozi ọma. Onyenwe anyị chọrọ unu. Anyị chọrọ unu na New York na Chicago, Australia na Africa, Thailand na Mexico, na ebe ọbụla niile.

Ka m kpọghachi unu azụ n’afọ 2015. A bụ m onye otu ọhụrụ nke Kworum Ndị ozi Iri na Abụọ. Otu niime ọrụ dị ịtụnaanya anyị nwere dị ka Ndị Ozi bụ ikenye ndị mgbasa ozi ọma n’ubi ọrụ ha. Esonyewo m dị ka onye otu Iri Asaa n’usoro ahụ,6 mana ugbu a dị ka Onye Ozi, enwetere m uju arọ nke ọrụ ahụ. A malitere m n’oke ikpe ekpere na-etinye ọtụtụ ọnụọgụgụ nke ndị okenye nta na ụmụnne nwanyị nta, otu otu, niime mishọn dị iche iche gburugburu ụwa. Emesịa mụ amalite na ndị di na nwunye. Enwere 10 dị na ndepụta ahụ. Ha ebughị ibu. N’ịtụnaanya, a jụrụ m onye otu m sitere na Ngalaba Mgbasa Ozi ọma, “Olee ka anyị chọrọ izu a iji mejuo arịrịọ ndị ahụ?”

Ọ zaghachiri, “300.”

Oge echiche ahụ anọgidewo m: di na nwunye 10 imejupụta mkpa 300.

Onyeisi Russell M. Nelson agbawo anyị ndị di na nwunye ume “isekpu n’ikpere ha ma rịọ Nna nke Eluigwe ma oge ahụ ọ dịịrị ha mma ije ozi mishọn.”7 Nke ntozu niile, o kwuru, “otu ọchịchọ ije ozi nwere ike bụrụ nke kachasị mkpa.”8

Dị ka akwụkwọ nsọ na-ekwu, “Ọ bụrụ na i nwere mmasị ijere Chineke ozi akpọwo gị n’ọrụ.”9 Ọrụ ahụ bụ ihe niile banyere iwu nke owuwe ihe ubi. Anyị na-agụ na Jọn, “Ma onye nke na-akụ ihe na onye nke na-eri nwere ike ṅụrịkọta ọṅụ ọnụ.”10

Ahụwo m iwu nke owuwe ihe ubi ka emejupụtara ya niime ezi na ụlọ nke m.

Afọ ole ma ole gara aga a naara m eleta ezi na ụlọ, mgbe bishọp gwara m imechi nzukọ oriri nsọ.11 Dị ka m na-agbada site n’ebe dị elu, otu nwanyị bịakwutere m ya na ụmụ ya asaa ma kọwaa onwe ya dị ka Nwanne nwanyị Rebecca Guzman.

Ọ jụrụ sị, “Okenye Rasband, ị matara Rulon na Verda Rasband?”

A chakasịrị m anya ma zaghachi, “Ha bụ nne na nna m.”

Unu nwere ike ịhụ ebe ihe a na-aga. Jiri ikike nke Rebecca, onye ya na ezi na ụlọ nọ niime Ogige Ọgbakọ nke a, ana m akọ akụkọ nke ezi na ụlọ ya.12

Foto, oyiyi
Nwanne nwanyị Verda na Okenye Rulon Rasband.

Nne na nna m, Okenye Rulon na Nwanne nwanyị Verda Rasband, naara eje ozi dị ka di na nwunye agadi niime Mishọn Florida Fort Lauderdale.13 Ha naara ekwusara ndị mmadụ ozi ọma ma site n’odudu si n’igwe kụrụ aka n’ọnụ ụzọ ebe obibi nke Rebecca. Ọ bụụrụ naanị onye gbara afọ iri na ụma ma nwere mmasị ige egwu nke ndị Osmond, ọ kachasị enyi anyị Donny—onye nọnyeere anyị ebe a taa.14 O geworịị ajụjụ ọnụ midia ha ma mata na ha bụ ndị otu nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a. O nwere mmetụta na enwere ihe dị iche banyere ha, ma n’iche na o nwere ike ịbụ okpukperechi ha, o were Rebecca afọ abụọ inyochagharị nkwenye niile nke Nzukọ nsọ a niime ọba akwụkwọ ụlọakwụkwọ. Ya mere, mgbe di na nwunye yiri ndị obi ọma kụrụ aka n’ọnụ ụzọ nke ezi na ụlọ ya ma kọwaa onwe ha dị ka ndị mgbasa ozi ọma Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a, o cheteere ya ihe.

“Nne m gwara m ịchụpụ ha,” Rebecca mechara dee, “mana obi m gwara m, ‘Mba.’ E leruru m anya na mbara ihu ha, ma e nwetere m mmetụta udo na ịhụnaanya. Ncheta ahụ ka na-ebutere m anya mmiri naanya na mmetụta miri emi n’obi m.”15

Rebecca kpọkuru ha bata, ma nne na nna m ndị mgbasa ozi ọma kesaara ya, ụmụnne ya ndị nwannyị nta abụọ, ma, na-agbanyeghị ijupuisi ya niile, nne ya ozi.

Rebecca kọwaara m: “Ma nne gị ma nna gị dịịrị ịtụnaanya n’ịkọwa ajụjụ ọbụla ndị anyị nweburu. A ka nọ m na-ahụ mbara ihu ha dị ka enwere ìhè gbara ha gburugburu. Anyị na-amakọkarị nne gị mgbe ọ na-apụ, ma ọ na-atụkarị uche nke inyere nne m aka nwete mmetụta nkasiobi na nsọpụrụ. Nna gị na-enwekarị mmuke dị na anya ya dị ka ọ na-akuziri anyị banyere Jizọs Kraịst. Ọ gbalịrị ịgụnye nna m na mkparịta ụka ndị ahụ ma n’ikpeazụ nwete ya. Nna m bụ osinri na klọbụ dị n’ala obodo ma malite isiri nne na nna gị nri abalị, gụnyekọta isi nke kacha masị nna gị, key lime pie.”16

Mgbe Okenye na Nwanne nwanyị Rasband rịọrọ Rebecca na ezi na ụlọ ya ịgụ Akwụkwọ nke Mọmọn, Rebecca gụrụ ya n’ụbọchi ise. Ọ chọrọ ime baptizim ozugbo, mana ndị otu ezi na ụlọ ndị nke ọzọ adịbeghị njikere. Mgbe ọnwa anọ gasịrị, Rebecca siri ọnwụ na ya ga-eme baptizim ma sonye ezi Nzukọ nsọ ahụ. O chetere, “Eriri niile nke mkpụrụ obi m maara na ọ bụ eziokwu.”17 Na Eprel 5, 1979, ndị mgbasa ozi ọma mere Rebecca gbara afọ 19, nne ya, na ụmụnne ya ndị nwanyị abụọ baptizim. Nna m bụụrụ onye aka ebe na baptizim ahụ.

Mgbe m zutere Rebecca na ezi na ụlọ ya na nzukọ nsọ, anyị na ezi na ụlọ ya sere foto. Ewegaara m ya nne m meworo agadi, ma o tinyere ya nso n’obi ya. Emesịa ọ gwara m, “Ronnie, nke a bụ otu niime ụbọchi ndị kachasị enye obi ọma na ndụ m.”

Foto, oyiyi
Ndị Guzmans, ndị Rasbands, na ndị Osmonds.

Azịza nke nne m na-akpali ajụjụ maka ndị agadi anyị: “Gịnị ka unu na-eme n’oge nke a nke ndụ unu?” Enwere imerime ụzọ ndị mgbasa ozi ọma agadi nwere ike ime ihe n’ọdịghị onye ọzọ nwere ike ime ya. Unu bụ ike pụrụ iche maka ezi ihe, nwere ahụmiihe niime Nzukọ nsọ, ma dị njikere inye mgbam ume na nnapụta nye ụmụ Chineke.

Ụfọdụ niime unu nwere ike na-eche: “Mana kedụ maka ịhapụ ụmụ ụmụ? Ihe ịrịba ama ezi na ụlọ, ụbọchị ọmụmụ, ndị enyi, ma ọbụna anụ ụlọ anyị ga atụ anyị n’uche.” Ọ bụrụ na m ajụwo nne m ihe kpatara ya na Nna jiri gaa mishọn, a ma m na ọ gaara ekwu nke a: “E nwere m ụmụ ụmụ. A chọrọ m ka ha mara na mụ na nna gị jere ozi n’ubi mishọn, anyị chọburu igosi ihe ịma atụ maka ụmụ ụmụ anyị ha, ma a gọziri anyị, otú a gọziri agọzi.”

Dị ka m letaworo ọtụtụ mishọn gburugburu ụwa, a hụwo m ije ozi dị ịrịba ama nke igwe ndị mgbasa ozi ọma agadi anyị. O doro anya na obi dị ha ụtọ idi na-eme “uche Onyenwe anyị” ma bụrụ gbasara “ọrụ nke Onyenwe anyị.”18

Nye ụfọdụ, ma anyị nwere olileanya na puku kwuru puku niime unu, ije ozi mgbasa ozi ọma n’uju oge n’akụkụ ọzọ nke ụwa ga-abụ nnọọ ebe kwesịrị ekwesị.19 Maka ndị ọzọ, mishọn ije ozi Nzukọ nsọ nebe obibi nwere ike kara mma. Niihi nsogbu ahụike niile na ọnọdụ ndị ọzọ, enwere ndị ahụ na-enweghị ike ije ozi. Anyị ghọtara ọnọdụ ndị ahụ, ma ọ ga-abụ olileanya m na gị ga-enwe ike chọta ụzọ ndị eji akwado ndị ahụ na-eje ozi. Soro ndụmọdụ nke onye amụma ma kpee ekpere ịmara ihe Onyenwe anyị ga-achọ ka gị mee.

Ogige mishọn gburugburu ụwa na-arịọ maka enyemaka gị. Onyeisi Nelson e kwuwo banyere ndị mgbasa ozi ọma agadi anyị, “Ha dị nwata niime mmụọ, maara ihe, ma dị njikere ịrụ ọrụ.”20

N’ihu ọrụ, unu nwere ohere ndị dịgasị iche iche: i nwere ike ije ozi n’ụlọọrụ mishọn dị iche iche ma ọ bụ tempụl niile, gbaa ndị mgbasa ozi ọma nta ume, kwadoo ụmụ obere ngalaba nta, rụọ ọrụ na ngalaba FamilySearch ma ọ bụ saịtị agụgụala, kuzie institutu, wete ije ozi nnyere aka obi ọma, soro ndị okenye nta rụkọọ ọrụ, nyee aka na ngalaba ana m achọ ọrụ ma ọ bụ ubi Nzukọ nsọ niile. Nkọwa ụzọ niile iji jee ozi, ihe kacha dabaara gị, ebe achọrọ gị, na otu i nwere ike isi dị njikere ịga ka akọwara na websaịtị “Onye Mgbasa ozi ọma Agadi.”21 I nwekwara ike ikwu okwu gị na bishọp ma ọ bụ onyeisi ngalaba nta gị.

A kpọwo m ọtụtụ di na nwunye ije ozi ma na-ele dị ka Ìhè nke Kraịst jupụtaworo mbara ihu ha.22 Na nlọghachi ha, ha akọwawo ịgarụ Onyenwe anyị nso ma garuokwa otu onye na ibe ha nso, na-enwe mmetụta nke Mmụọ nke Onyenwe anyị ka ọ wụdara n’isi ha, ma mara na ha na-emepụta ihe dị iche.23 Kedụ onye na-achọghị nke ahụ?

Mishọn nwere ike bụrụ isi ihe kachasị na ndụ otu di na nwunye. Aha dị mma nwere ike bụrụ “Onyenwe anyị Ga-achọ M.”24 I nwere ike nọrọ ebe ị maghị ama; kosiladị, ike nke Mmụọ ga-eme ka obi ruo gị ala.

Ndị nne na nna m na iri puku kwuru iri puku nke di na nwunye mgbasa ozi ọma lọtara agbawo ama nke ọńụ ha chọtara n’ọrụ mgbasa ozi ọma. Onyenwe anyị ekwuwo nakwụkwọ nsọ ụbọchi ikpeazụ a, “Ma ọ bụrụ na ị ga-arụsị ọrụ ike n’ụbọchị gị niile n’iti mkpu nchegharị nye ndị a, ma kpọta, ọbụna otu mkpụrụ obi nye m, olee otu ịdị ukwuu nke ọn̄ụ gị na ya n’alaeze nke Nna m!”25

Aịzaya nyere anyị nkọwa abụ nke ihe ọ pụtara ije ozi niime “ubi” mishọn. Akwụkwọ nsọ na-agwa anyị na “ubi ahụ bụ ụwa.”26 Nnukwu onye amụma mgbe ochie nke a dere, “Niihi na unu ga-eji ọńụ pụọ, a ga-esikwa n’ebe ahụ dupụta unu n’udo: ugwu ukwu niile, na ugwu nta niile na osisi niile nke ubi, ga-eti mkpu ọńụ, kụọkwa aka n’obi ụtọ.”27 Ugwu ukwu niile, ugwu nta niile, ubi ama niile, na osisi niile ka e nwere ike ịtụnyere ndịisi mishọn, ndị bishọp, ndị ndu distrịkt, ndị otu, na ndị ahụ na-achọ eziokwu mana “ha amaghị ebe ha ga-achọta ya.”28 Ha ga-agba ama na ndị agadi mgbasa ozi ọma na-gbanwe ọdịdị ahụ n’ezie jiri ama ha nke Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta, Jizọs Kraịst.

Dị ka Onye Ozi nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, a na m arịọ unu ije ozi dị ka ndị mgbasa ozi ọma n’ikpokọta Izrel ma elemaanya ọbụna jeekwa ozi ọzọ. Anyị chọrọ gị—anyị chọrọ gị. Anyị na-ekele unu ndị agadi maka ndụ ndị unu biworo na ọmụmaatụ ndị unu bụworo n’ebe obibi unu, ngalaba unu, na stek unu. Ana m akpọku unu ugbua iwere mmara otu esi eme, unu tinyekọta ama oge gboo unu, ma gaa mishọn. Ana m ekpe ekpere na mgbe ọzọ m ga-anọdụ ọdụ enye di na nwunye agadị ọrụ, a ga-enwe narị kwuru narị unu nọgidere na-eche maka ọkpụkpọ oku unu.

A nakwa m ekwe nkwa na dị ka unu n’eje ozi, unu ga-enwete mmetụta ịhụnaanya nke Onyenwe anyị niime ndụ unu, unu ga-ama Ya, Ọ ga-ama unu, ma “lee otu ịdị ukwuu ka ọṅụ unu ga-adị.”29 Ije ozi nrara nye unu nye Jizọs Kraịst ga-akpate mmụọ ma gọzie ezi na ụlọ unu, ụmụ unu, na ụmụ ụmụ ụmụ unu. “Udo, na ịhụnaanya [ga] amụba”30 niime ndụ ha n’afọ ndị na-abịa. Ana m ekwe nkwa. Site n’aha Jizọs Kraịst, amen

Hụba ama

  1. Russell M. Nelson, “Olile anya nke Izrel” (worldwide youth devotional, June 3, 2018), Gospel Library.

  2. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18:10.

  3. 3 Nefi 10:18

  4. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 78:18

  5. Nzukọ nsọ nwere ndị mgbasa ozi ọma n’uju oge dị 62,544 na mishọn 411 gburugburu ụwa site na mpaghara Ugwu na Ndịndị Emerịka ruo Europe na Afrịịka, Eshịa, na Ọstrelịa/Oceanịa. Enwere 34,000 ndị mgbasa ozi ọma agadi nke ije ozi Nzukọ nsọ. (Missionary Department data, Sept. 2023.)

  6. Lee Ronald A. Rasband, “Okpụkpọ oku Chi nke ndị Mgbasa ozi ọma,” Liahona, Me 2010, 52–53.

  7. Russell M. Nelson, “Oge Mgbasa ozi ọma Agadi,” Liahona, Apr. 2016, 27.

  8. Russell M. Nelson, “Ndị Mgbasa ozi ọma Agadi na Ozi ọma ahụ,” Liahona, Nov. 2004, 81.

  9. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 4:3

  10. John 4:36.

  11. A nọ m na New York, USA, na-aga baptizim nke nwa nwa Brooklyn na inye ngọzi nke nwa nwa Ella, Eprel 2006.

  12. Akwụkwọ ozi sitere n’aka Rebecca Guzman nye Okenye Ronald A. Rasband, Sept. 8, 2009.

  13. Ndị nne na nna m jere ozi na Mishọn Florida Fort Lauderdale n’afọ 1979.

  14. Ezi na ụlọ Osmond bụụrụ otu egwu Emerịka a maara ama maka egwu pọọpụ ha. Otu ahụ toruru ogo ama ama n’etiti afọ 1970 ha, na-eme ihe ngosi televishọn dị iche iche. Donny na Marie garaniihu n’ọrụ ogbo televishọn, ebe ụmụnne nwoke ha rụrụ ọrụ ruo ọtụtụ iri afọ dị ka ndị omenkà obodo niime Branson, Missouri.

  15. Akwụkwọ ozi sitere n’aka Rebecca Guzman, Sept. 8, 2009.

  16. Akwụkwọ ozi sitere n’aka Rebecca Guzman, Sept. 8, 2009.

  17. Akwụkwọ ozi sitere n’aka Rebecca Guzman, Sept. 8, 2009.

  18. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 64:29.

  19. Ohere niile nke mdị mgbasa ozi ọma agadi na-ewere ọtụtụ fọm, ma di na nwunye ma ọ bụ ụmụnwanyị agadi nwere ike depụta mmasị ha dị ka kwa ọrụ uju oge ma ọ bụ ije ozi Nzukọ nsọ. N’ikpeazụ, onye amụma nke Nzukọ nsọ na-akpọ oku maka ije ozi n’uju oge. Ndịisi stek na-enye ọrụ ije ozi Nzukọ nsọ. Ije ozi nwere ike site ọnwa 6 ruo ọnwa 23, ma ndị mgbasa ozi ọma agadi na-enwekarị ohere ịgbanwe ma nwee ihe omume belatara nisi ike karịa ndị mgbasa ozi ọma nta. Lee seniormissionary.ChurchofJesusChrist.org.

  20. Russell M. Nelson, “Ndị Mgbasa ozi ọma Agadi na Ozi ọma ahụ,” Liahona, Nov. 2004, 79.

  21. Lee seniormissionary.ChurchofJesusChrist.org.

  22. Lee Alma 5:14 “Mbara ihu” ka enwere ike ịkọwa dị ka ịtụgharị uche n’agwa na ọnọdụ uche ime mmụọ nke otu onye.

  23. Lee Jud 1:22; Mozaya 4:20

  24. Lee “Aga M Aga Ebe Ị Chọrọ Ka M Gaa,” Abụ niile, no. 270.

  25. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18:15

  26. Onyenwe anyị kọwara, “Ubi ama ahụ bụ ụwa; … owuwe ihe ubi bụ nsọtụ nke ụwa” (Matiu 13:38–39).

  27. Aịzaya 55:12

  28. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 123:12

  29. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18:15

  30. Jud 1:2