Ọgbakọ Zuru ọha
Niihi Ụmụ Ụmụ Gị
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2023


Niihi Ụmụ Ụmụ Gị

Abụkwala njikọ na-adịghị ike dị na ọmarịcha eriri nke okwukwe nke a ịmalitere, ma ọ bụ ịnataworo, dị ka ihe si n’aka ndị nna nna ochie feere ụmụ ụmụ ha. Bụrụ onye nke dị ike.

Afọ ole ma ole gara aga, mgbe m naara eje ozi na Mpaghara South Amerịka Northwest ma biri na Peru, e nwere otu ọmarịcha nhụmiihe nke ga-amasị m ịkọrọ unu.

O mere mgbe m naara alọta n’ebe obibi ka ọrụ ndị na-enyeghị m ohere na ngwụcha izu gasịrị. Mgbe m mesịrị usoro nke ndị imigreshọn na ọdọ ugbọ elu n’ikpeazụ, a hụtara m ọkwọ ụgbọala taịzi dị ka enyi nọ na-eche m site n’ebe anyị na-anọkarị enweta taịzi. O duuru m gaa n’ụgbọala ya, ma a nọdụrụ m ọdọ na-azụ, dị na njikere ịdabere nwee ọńụ na njem ịlawa ebe obibi na-enweghị mkpọtụ. Ka anyị gbafechara ụlọ ole ma ole, onye ọkwọ ụgbọala natara oku ekwentị site n’aka onyeisi ya, na-agwa ya na m weere taịzi nke na-abụghị ya. Ụgbọala dị iche ka edokwaara m, ma onyeisi ahụ gwara ya ka o bughachi m azụ na ọdọ ụgbọ elu ma ọ bụrụ na m chọrọ ịgbanwe ụgbọala. Agwara m ya na ọ baghị uru, na anyị nwere ike ịdị na-aga. Mgbe nkeji ole ma ole nke na-ekwughị okwu gasịrị, o lere m anya site na enyoihu ma jụọ, Ị bụ onye Mọmọn, ị bụghị ya?”

Ọdịmma, mgbe ajụjụ mkpọbata ahụ gasịrị, a matara m na oge ịdị jụụ m niile agwụsịwo. Enweghị m ike ịgbanarị ịchọpụta ebe ajụjụ ya ga-eduga anyị.

Amatara m na aha ya bụ Ọmar, aha nwunye ya bụ Marịa Teresa, ma ha nwere ụmụ abụọ—Carolina, gbara afọ 14, na Rodrigo, gbara afọ 10. Ọmar bụrịị onye otu Nzukọ nsọ ahụ kemgbe ọ bụ nwata. Ezi na ụlọ ya dị nkọ, mana o nwere mgbe o ruru, ndị nne na nna ya kwụsịrị ịga nzukọ nsọ. Ọma wee nyụọ ka ọkụ kpam kpam mgbe ọ gbara afọ 15. Ọ gbaala afọ 40 oge ahụ.

Na nwa oge nta ahụ a matara m na m agbaghị taịzi nke na-abụghị ya. Ọ bụghị ihe ndaba! A gwara m ya onye m bụ nakwa na a nọ m na taịzi ya niihi na Onyenwe anyị na-akpọghachite ya azụ na-otu Ya.

Emesịa anyị kwuru okwu banyere oge ahụ ya na ezi na ụlọ ya bụụrụ ndị otu Nzukọ nsọ dị nkọ. O chetara ihe ndị na-enye obi ụtọ banyere oge ndị e nwere nnọkọ mgbede ezi na ụlọ dị ụtọ, na ụfọdụ ukwe nke ndị Praịmarị. Mgbe ahụ o jiri nwayọọ kwee ukwe mkpụrụ okwu ole ma ole nke “Abụ m Nwa Chineke.”1

Mgbe m nwetachara adịresị ya, akara ekwe ntị, na ikike ịkọ ha mụ na bishọp ya, a gwara m ya na m ga-achọta otu m ga-esi abịa na chapụl ahụ n’ụbọchị mbụ nke nlọghachi ya na nzukọ nsọ. Anyị mesịrị njem anyị site n’ọdọ ụgbọ elu rute ebe obibi m, tinyekwara obere njem anyị anyị na ndụ ya oge gara aga, ma anyị gawara n’ụzọ anyị dị iche iche.

Mgbe izu ụka ole ma ole gara bishọp ya kpọrọ m, na-agwa m na Ọmar na-eme atụmatụ ịbịa nzukọ n’otu Sọnde a maara amara. A gwara m ya na m ga-abịa ebe ahụ. Na Sọnde ahụ, Ọmar nọ ebe ahụ ya na nwa ya nwoke. Nwunye ya na nwa ya nwanyị aka enwebeghị mmasị. Ka ọnwa ole ma ole gasịrị, bishọp ya kpọkwara m ọzọ, oge nke a ịgwa m na Ọma ga-eme nwunye ya na ụmụ ya abụọ baptizim, na ọ kpọkuru m ịnọ ebe ahụ. Nke a bụ foto nke Sọnde ahụ ebe e mere ha ndị otu Nzukọ nsọ.

Foto, oyiyi
Okenye Godoy ya na ezi na ụlọ Ọmar na Sọnde ahụ e mere ha ndị otu.

Otu Sọnde ahụkwa, a gwara m Ọmar na ezi na ụlọ ya na ọ bụrụ na ha dị na njikere, n’otu afọ, aga m enwe ugwu ime nrachi ha na Lima Peru Tempụl. Nke a bụ foto nke oge ahụ a na-agaghị echefu echefu maka anyị niile, e sere ka otu afọ gasịrị.

Foto, oyiyi
Okenye Godoy ya na ezi na ụlọ Ọmar nebe tempụla ahụ.

Olee ihe m ji a kọrọ unu nhụmiihe ndị a niile? Ana m akọ ya niihi ebumnobi abụọ.

Nke mbụ, iji gwa ndị otu ọma ahụ bụ ndị site n’otu ihe ma ọ bụ ọzọ adapụwo site n’ozi ọma nke Jizọs Kraist eweghachitere. Nke abụọ, ịgwakwa ndị otu ahụ so eme ihe taa ndị ikekwe bụ ndị na-ekwesịchaghị ntụkwasị obi nye ọgbụgba ndụ ha dị ka ha kwesịrị. Niime ọnọdụ abụọ ndị a, ndudugandu ndị dị ha niihu na-eketa oke ma ngọzi niile na ngwa niile edokwara maka ụmụ ụmụ ha nọkwa na njọ.

Ka anyị bido site na ndapụta nke mbụ, ezigbo ndị otu na-ahapụwo ụzọ ọgbụgba ndụ, dị ka o mere site na enyi Peruvia m Ọmar. Mgbe m jụrụ ya ihe mere o jiri kpebie ichighata, ọ siri ọ bụ niihi na ya na nwunye ya chere na ụmụ ha ga-aka nwee obi ụtọ na ndụ site n’ozi ọma nke Jizọs Kraịst. O chere na oge eruwo ilaghachi na nzukọ nsọ niihi ụmụ ha.

Ọ jọgburu onwe ya na njọ mgbe anyị zutere ndị otu na-adịghị nkọ ma ọ bụ ndị na-abụghị ndị otu Nzukọ nsọ ndị nweburu ozi ọma niime ezi na ụlọ ha otu mgbe ma tufuo ya niihi mkpebi ndị nne na nna ha ma ọ bụ nke ndị nne na nna nke ukwu ha iji kwụsị ịbịa Nzukọ nsọ. Mkpebi ahụ nwere ike imetụta ụmụ ụmụ ha ruo ebighị ebi!

Ụmụ ha na ụmụ ụmụ ha abụrụwo ndị ewezugara site na nchekwa na ngọzi niile nke ozi ọma Jizọs Kraịst niime ndụ ha. Ọbụna nke kacha agbawa obi, ha etufuwo nkwa niile nke ezi na ụlọ dị ebighị ebi nke dịịrị ebe ahụ otu ụbọchị. Mkpebi nke otu onye emetatụwo otu eriri nke ndị agbụrụ dum. Okwukwe si n’aka ndị nna nna ochie feere ụmụ adọbiwo.

Otu osila dị, dị ka anyị maara, ihe ọbụla dọbiri adọbi ka enwere ike imezi site na Jizọs Kraịst. Niihi nke a, biko tulee ọkpụkpọ oku nke a sitere n’aka Onyeisi Russell M. Nelson: “Ugbua, ọ bụrụ na ị zọpụwo ụkwụ n’ụzọ ahụ, ka m jiri olileanya niile dị niime obi m kpọkuo gị si biko lọghachi azụ. Ihe ọbụla bụ ihe na-echegbu gị, ihe ọbụla bụ ihe ndị chere gị aka mgba, enwere oghere nọọrọ gị n’ime n’ebe a, Nzukọ nsọ nke Onyenwe anyị. Gị na ndudugandu ndị a na-amụbeghị ka aga agọzi site na omume gị niile ugbua ịlọghachi n’ụzọ nke ọgbụgba ndụ ahụ.”2

Ugbua, ka anyị kwuo okwu mbụ ndapụta nke abụọ, ndị otu so eme ihe taa ndị nke ikekwe bụ ndị na-ekwesịchaghị ntụkwasị obi dị ka ha kwesịrị ị bụ. Dị nnọọ ka mkpebi echi gara aga na-emetụta ihe ndị na-eme taa, mkpebi ndị nke taa ga-emetụta ọdịniihu anyị na ọdịniihu nke ndị otu ezi na ụlọ anyị.

Onyeisi Dallin H. Oaks kuziiri anyị:

Ozi ọma nke Jizọs Kraịst eweghchitere eweghachitere n’agba anyị ume iche echiche gbasara ọdịnihu. … Ọ na akuzi echiche ndị dị ukwuu gbasara ọdịnihu iji duo ihe omume anyị taa.

N’aka nke ọzọ, anyị mara ndị mmadụ ndị mkpa ha bụ naanị ịma ihe gbasara oge ugba: mefuo ya taa, nwee ọńụ niime ya taa, ma echela echiche ọbụla maka ọdịniihu.

“… Dị ka anyị na-eme mkpebi ndị nke oge ugbua, anyị kwesịrị ịdị na-ajụ mgbe niile, ‘Ebee ka nke a ga-eduba?’”3 Mkpebi ndị anyị na-eme oge ugbua ọ ga-eduba anyị n’ọńụ ugbua na n’oge ebighị ebi, ma ọ bụ ha ga-eduba anyị na mwute na anya mmiri?

Ụfọdụ nwere ike chee, “Anyị enweghị mkpa ị na-aga nzukọ Sọnde niile,” ma ọ bụ “Anyị ga-akwụ otu ụzọ n’ụzọ iri ma ihe dị mma,” ma ọ bụ “Aga m akwado ndị ndu Nzukọ nsọ n’isiokwu nke a,”

“Mana,” ha sịrị, “anyị maara na Nzukọ nsọ ahụ bụ eziokwu, ma anyị enweghị ike ịhapụ ozi ọma nke Jizọs Kraịst.”

Ndị ahụ nwere ụdị echiche ndị dị ka ndị a anaghị amata mmetụta ọjọọ nke “adịghị ọkụ na adịghị oyi” ụdị ịbụ onye otu nke a ga-enwe na ndụ ha nakwa na ndụ nke ụmụ ụmụ ha. Nne na nna nwere ike nọgide dị nkọ, mana ọghọm nke ụmụ ha ifu dị elu—niime ndụ nke a na n’oge ebighị ebi.

Gbasara ndị ahụ na-agaghị eketa ebube alaeze selestịal ha na ndị ezi na ụlọ ha, Onyenwe anyị na-asị, “Ndị a bụ ha ndị na-esighị ike na ọgbụgba ama nke Jizọs; ya mere, ha anataghị okpueze nke alaeze Chineke anyị.”4 Ihe ahụ ọ bụ ihe anyị chọrọ maka onwe anyị ma ọ bụ maka ụmụ anyị? Ọ bụ na anyị agaghị adị ike karịa ma dịkarịa nta na ị bụ ọkụ na mmiri niihi onwe anyị nakwa niihi ụmụ ụmụ anyị?

Onyeisi M. Russell Ballard kwukwara okwu banyere ihe yiri nchekasị nke a:

“N’ebe ụfọdụ nọ, ọkpụkpọ oku nke Kraịst ikwere ma nọgide ka nọkwa na-esi ike. … Ụfọdụ ndị na-eso ụzọ na-agba mbọ ịghọta atụmatụ ma ọ bụ nkuzi nke nzukọ nsọ a kpọrọ aha. Ụfọdụ na-ahụta nsogbu na agụgụala anyị ma ọ bụ na-ezughị oke nke ụfọdụ ndị otu na ndị ndu, oge gara aga na oge ugbua. …

“… Mkpebi nke ‘esokwaghị’ ndị otu Nzukọ nsọ na ndị ndu nke Onyenwe anyị họrọworo ọzọ ga-enwe mmetụta ga-ewe ogologo oge nke a na-agaghị enwe ike ahụta ozugbo ugbua.”5

Olee ụdịrị ajọọ ihe si n’aka ndị nna nna ochie feere ụmụ ha a ga-enyefe—na maka olee ihe eji eme ya? Ihe ọbụla ọ bụ, o zughị oke ịgbanyere mmetụta nke ime mmụọ jọrọ njọ ọ ga-ebute maka ndudugandu ndị dị niihu azụ

Ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, ọ bụrụ na unu na-agabiga otu niime ọnọdụ abụọ ndị a m kpọtụrụ aha n’ozi m, biko tụgharịa uche niihe ndị ị na-eme. Ị maara na enwere otu atụmatụ anyị nwere na ndụ nke a. Ị maara na ezi na ụlọ niile nwere ike ịdị ebighị ebi. Gịnị mere iji etinye ndị nke gị na njọ? Abụkwala njikọ na-adịghị ike dị na ọmarịcha eriri nke okwukwe nke a ịmalitere, ma ọ bụ ịnataworo, dị ka ihe si n’aka ndị nna nna ochie feere ụmụ ụmụ ha. Bụrụ onye nke dị ike. Ọ bụ oge nke gị ime ya, ma Onyenwe anyị nwere ike inyere gị aka.

Site n’ala ala obi m, ana m akpọku unu iche echiche banyere ya, ilewakwa anya niihu ma chọpụta “ebe nke a ga-eduba” ma, ọ bụrụ ọ dị mkpa, isi ezigbo ike ịhazigharị ụzọ gị niihi ụmụ ụmụ gị. N’aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. “A bụ M Nwa nke Chineike,” Akwụkwọ egwu nke Ụmụ ntakịrị, 301.

  2. Russell M. Nelson, “Dịka Anyị Na-Agakọrịta Ọnụ Niihu,” Liahona,, Apr. 2018, 7; nkwusi ike agbakwunyere.

  3. Dallin H. Oaks, “Ebee Ka Ihe Nke a Ga-eduba,” Liahona, Me 2019, 60; nkwsi ike agbakwunyere.

  4. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 76:79; nkwusi ike agbakwunyere.

  5. M. Russell Ballard, “Onye Ka Anyị Ga-agakwuru?,” Liahona, Nov. 2016, 90–91; nkwusi ike agbakwunyere.